Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kwe Ka Okwu Chineke Na-eduzi Nzọụkwụ Gị

Kwe Ka Okwu Chineke Na-eduzi Nzọụkwụ Gị

Kwe Ka Okwu Chineke Na-eduzi Nzọụkwụ Gị

“Okwu Gị bụ oriọna dịịrị ụkwụ m, ọ bụkwa ìhè dịịrị okporo ụzọ m.”—ABỤ ỌMA 119:105.

1, 2. Gịnị mere ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ụmụ mmadụ achọtabeghị ezi udo na obi ụtọ?

Ị̀ PỤRỤ icheta otu oge ị rịọrọ mmadụ ka o zi gị ụzọ ị ga-esi ruo ebe ị na-eje? Ikekwe i ruwela ebe ị na-aga ma ị machaghịzi ụzọ nke ị ga-esi esi. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na i fuola ụzọ ya adịkwa mkpa na ị ga-alaghachi azụ. Nke ọ bụla ọ sọrọ ya ya bụrụ, ọ̀ gaghị abụ ihe amamihe dị na ya ma ị gbasoo ntụziaka nke onye maara ụzọ? Onye ahụ pụrụ inyere gị aka iru ebe ị na-aga.

2 Kemgbe ọtụtụ puku afọ, ụmụ mmadụ agbalịwo iduzi onwe ha n’achọghị enyemaka Chineke. Ma, ụmụ mmadụ na-ezughị okè enwetụghị ike iduzi onwe ha n’adabereghị na Chineke. Ha enwetụghị ike ịchọta ụzọ isi nwee udo na ezi obi ụtọ. Gịnị mere ha enwebeghị ike ịchọta ezi udo na obi ụtọ? Ihe karịrị puku afọ abụọ na narị afọ ise gara aga, Jeremaịa onye amụma kwuru, sị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Onye ọ bụla nwara iduzi onwe ya n’achọghị enyemaka nke onye ka ya mara anaghị enwe ihe ịga nke ọma. N’ezie, ụmụ mmadụ chọrọ onye ga-eduzi ha!

3. Gịnị mere o ji bụrụ nanị Jehova Chineke kasị ruo eruo iduzi ụmụ mmadụ, gịnịkwa ka o kwere nkwa ime?

3 Ọ bụ nanị Jehova Chineke kasị ruo eruo iduzi anyị. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ ka onye ọ bụla ọzọ mara ụmụ mmadụ nke ọma. Ọ maara nnọọ otú ụmụ mmadụ siri kpafuo, marakwa ihe ha kwesịrị ime iji laghachikwute ya. E wezụga nke ahụ, Jehova maara mgbe nile ihe ga-akasị bara anyị uru n’ihi na ọ bụ ya kere anyị. (Aịsaịa 48:17) N’ihi ya, obi pụrụ isi anyị nnọọ ike na nkwa o kwere, bụ́ nke e dekọrọ n’Abụ Ọma 32:8, ga-emezu. Ọ sịrị: “M ga-eme ka i nwee uche, M ga-ezikwa gị ihe n’ụzọ nke ị ga-eje ije n’ime ya: M ga-adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa gị n’ahụ́.” Ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya na Jehova na-enye nduzi kasị mma. Ma olee otú o si eduzi anyị?

4, 5. Olee otú okwu Chineke pụrụ isi na-eduzi anyị?

4 Otu ọbụ abụ kpegaara Jehova ekpere, sị: “Okwu Gị bụ oriọna dịịrị ụkwụ m, ọ bụkwa ìhè dịịrị okporo ụzọ m.” (Abụ Ọma 119:105) A na-achọta okwu Chineke na ihe ndị ọ chọrọ ka anyị na-echeta na Bible, ha pụkwara inyere anyị aka imeri ihe mgbochi ndị anyị pụrụ izute ná ndụ. N’ezie, mgbe anyị gụrụ Bible ma kwe ka ihe ndị anyị gụtara na ya na-eduzi anyị, ihe ahụ e dere n’Aịsaịa 30:21 ga-emezu n’ahụ́ anyị. O kwuru, sị: “Ntị gị abụọ ga-anụkwa okwu n’azụ gị, sị, Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya.”

5 Ma, rịba ama na Abụ Ọma 119:105 na-eme ka anyị mata ọrụ abụọ yiri ibe ha Okwu Chineke na-arụ. Nke mbụ, ọ na-arụ ọrụ dị ka oriọna dịịrị ụkwụ anyị. Mgbe anyị zutere ihe ịma aka ndị a na-enwe ná ndụ kwa ụbọchị, ụkpụrụ ndị dị na Bible kwesịrị iduzi anyị ka anyị wee nwee ike ime mkpebi ndị amamihe dị na ha ma zere ọnyá ndị e sijuru ebe nile n’ụwa a. Nke abụọ, ihe ndị Chineke na-echetara anyị na-eme ka okporo ụzọ anyị na-enwu gbaa, na-enyere anyị aka ịhọrọ ime ihe ndị kwekọrọ n’olileanya anyị nke bụ́ ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs ahụ Chineke kwere ná nkwa. Ebe e meworo ka okporo ụzọ anyị na-enwu gbaa, anyị ga-enwe ike ịmata ma ihe ọ bụla anyị họọrọ ime ọ̀ ga-arụpụtara anyị ezi ihe ma ọ bụ ihe ọjọọ. (Ndị Rom 14:21; 1 Timoti 6:9; Mkpughe 22:12) Ka anyị tụlee n’ụzọ sara mbara otú ihe ndị Chineke kwuru na Bible pụrụ isi bụrụ oriọna dịịrị ụkwụ anyị na ìhè dịịrị okporo ụzọ anyị.

“Oriọna Dịịrị Ụkwụ M”

6. Olee mgbe okwu Chineke pụrụ ịbụ ìhè nke dịịrị ụkwụ anyị?

6 Anyị na-eme mkpebi kwa ụbọchị. Mkpebi ụfọdụ anyị na-eme adịchaghị oké mkpa, ma mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike izute ọnọdụ ndị pụrụ ịnwa anyị ọnwụnwa itinye aka n’omume ọjọọ, ịgha ụgha, ma ọ bụ itinye aka n’ihe ndị ọzọ megidere ofufe anyị na-efe Jehova. Iji merie ọnwụnwa ndị a, anyị aghaghị ‘ịzụ ikike nghọta anyị ịmata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ.’ (Ndị Hibru 5:14) Mgbe anyị mụtara Okwu Chineke nke ọma ma ghọta ụkpụrụ ndị dị na ya, anyị na-azụ akọ na uche anyị iji nwee ike ime mkpebi ndị na-amasị Jehova.—Ilu 3:21.

7. Nye ihe atụ nke ọnọdụ pụrụ ime ka Onye Kraịst chọọ iso ndị na-ekweghị ekwe ya na ha na-arụkọ ọrụ kpakọrịta.

7 Tụlee ihe atụ a. Ị̀ bụ onye toworo eto nke na-agbalị n’ezie ime ka obi Jehova ṅụrịa? (Ilu 27:11) Ọ bụrụ na ị bụ, e kwesịrị ịja gị mma. Ma ka e were ya na ndị ọrụ ibe gị gbataara gị tiketi ka i soro ha ga kirie bọl. Ọ na-amasị ha ka gị na ha na-anọ n’ihi otú i si eme, ha chọkwara nnọọ ka i soro ha gaa. Obi gị pụrụ ịdị na-agwa gị na ha abụghị ndị ọjọọ. Ha nwedịrị ike ịdị na-akpa àgwà dị mma. Gịnị ka ị ga-eme? Ò nwere ihe dị njọ n’iso ha gaa? Olee otú Okwu Chineke pụrụ isi nyere gị aka ime mkpebi ziri ezi n’okwu a?

8. Olee ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-enyere anyị aka ịtụle okwu banyere iso ndị ọzọ na-akpakọrịta?

8 Tụlee ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ole na ole. Nke mbụ nwere ike ịgbata n’uche bụ nke ahụ dị ná 1 Ndị Kọrịnt 15:33, bụ́ nke na-asị: “Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà bara uru.” Ịgbaso ụkpụrụ a ọ̀ pụtara na ị ga na-agbara ndị na-ekweghị ekwe ọsọ kpamkpam? Akwụkwọ Nsọ na-aza ee e. A sị kwuwe, Pọl onyeozi n’onwe ya gosiri mmasị n’ebe “ụdị mmadụ nile” nọ, gụnyere ndị na-ekweghị ekwe. (1 Ndị Kọrịnt 9:22) Igosi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ—gụnyere ndị anyị na ha na-anọghị n’otu okpukpe—ka e ji ama ndị bụ́ Ndị Kraịst. (Ndị Rom 10:13-15) A sị kwuwe, olee otú anyị pụrụ isi gbasoo ndụmọdụ ahụ bụ́ ka anyị “na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ” ma ọ bụrụ na anyị ana-agbara ndị chọrọ enyemaka anyị ọsọ?—Ndị Galeshia 6:10.

9. Olee ndụmọdụ dị na Bible nke na-enyere anyị aka ịmara ụdị mkpakọrịta anyị na ndị ọrụ ibe anyị kwesịrị inwe?

9 Otú ọ dị, e nwere nnukwu ọdịiche dị n’imeso onye gị na ya na-arụkọ ọrụ omume ọma na ịbụ ezigbo enyi ya. E nwere ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ọzọ pụrụ inyere anyị aka na nke a. Pọl onyeozi dọrọ Ndị Kraịst aka ná ntị, sị: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ.” (2 Ndị Kọrịnt 6:14) Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “unu . . . ekekọtala onwe unu n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ” pụtara? Bible ụfọdụ sụgharịrị okwu a ịbụ ‘unu esola ha anọ n’otu òtù,’ ‘unu anwala iso ha arụkọ ọrụ n’ụzọ ga-eme ka ọ dị ka unu na ha ọ̀ bụ otu,’ ma ọ bụ ‘unu na ha ejikọla aka n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị.’ Olee mgbe mmekọrịta mmadụ na onye ọrụ ibe ya na-aghọ nke na-ekwekọghị ekwekọ? Olee ebe ọ ga-eru ya abụrụ na gị na ya na-ekekọta onwe unu n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ? Okwu Chineke, bụ́ Bible, pụrụ iduzi gị n’okwu a.

10. (a) Olee otú Jizọs si họrọ ndị enyi ya? (b) Olee ajụjụ ndị pụrụ inyere mmadụ aka ime mkpebi ndị ziri ezi banyere ndị ya na ha ga na-akpakọrịta?

10 Tụlee ihe banyere Jizọs, bụ́ onye hụrụ ụmụ mmadụ n’anya kemgbe e kere ụwa. (Ilu 8:31) Mgbe ọ nọ n’ụwa, ya na ndị na-eso ụzọ ya dị n’ezigbo mma. (Jọn 13:1) Ọbụna ‘o nwere ịhụnanya’ n’ahụ́ otu nwoke nke na-amaghị okpukpe nke ọ ga-eso eso. (Mak 10:17-22) Ma Jizọs mere ka o doo anya ndị bụ́ ezigbo ndị enyi ya. Ya na ndị na-enweghị ezi ọchịchọ ime uche Nna ya akpachighị anya. N’otu oge, Jizọs kwuru, sị: “Unu bụ ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu emee ihe m na-enye unu n’iwu.” (Jọn 15:14) Ọ bụ eziokwu na e nwere ike nwee onye ọrụ ibe gị nke gị na ya dị nnọọ na mma. Ma jụọ onwe gị, sị: ‘Ònye a ọ dị njikere ime ihe Jizọs nyere n’iwu? Ọ̀ chọrọ ịmụta banyere Jehova, bụ́ onye Jizọs nyere anyị iwu ka anyị na-efe ofufe? Ọ̀ na-eme ụdị omume ọma mụ onwe m bụ́ Onye Kraịst na-eme?’ (Matiu 4:10) Ka ị na-agwa ndị ọrụ ibe gị okwu ma nọgide na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, azịza nke ajụjụ ndị a ga-apụta ìhè.

11. Kwuo oge ndị okwu Chineke kwesịrị iduzi anyị.

11 E nwere ọtụtụ ọnọdụ ndị ọzọ bụ́ ebe a pụrụ iji okwu Chineke tụnyere oriọna nke dịịrị ụkwụ anyị. Dị ka ihe atụ, Onye Kraịst na-achọ ọrụ nwere ike inweta ọrụ dị ya ezigbo mkpa. Ma, ọ pụrụ ịbụ na ọrụ ahụ ga-ewekọrọ oge ya, ọ bụrụkwa na o kweta ịrụ ọrụ ahụ, ọ gaghị na-agazu ọmụmụ ihe nile, ọ gaghịkwa na-ekere okè n’ihe ndị ọzọ metụtara ofufe anyị na-efe Jehova. (Abụ Ọma 37:25) Onye Kraịst ọzọ pụrụ ịbụ onye ọ na-agụsi agụụ ike ikiri fim ndị megidere ụkpụrụ Bible. (Ndị Efesọs 4:17-19) Onye ọzọ pụkwara ịbụ onye na-ewekarị iwe ọsọ ọsọ mgbe ndị kwere ekwe ibe ya mejọrọ ya. (Ndị Kọlọsi 3:13) N’ọnọdụ ndị a nile, anyị kwesịrị ikwe ka Okwu Chineke bụrụ oriọna dịịrị ụkwụ anyị. N’ezie, site n’ịgbaso ụkpụrụ Bible, anyị pụrụ imeri ihe ịma aka ndị anyị na-ezute ná ndụ. Okwu Chineke bara “uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume.”—2 Timoti 3:16.

“Ìhè Dịịrị Okporo Ụzọ M”

12. Olee otú okwu Chineke si bụrụ ìhè dịịrị okporo ụzọ anyị?

12 Abụ Ọma 119:105 kwukwara na okwu Chineke pụrụ ịbụ ìhè dịịrị okporo ụzọ anyị, na-eme ka anyị hụ ebe anyị na-eje. Anyị maara ihe ga-eme n’ọdịnihu n’ihi na Bible na-akọwa ihe ọnọdụ ọjọọ ndị juru n’ụwa taa na-egosi nakwa ihe ga-esi na ha pụta. Ee, anyị maara na anyị na-ebi “n’ụbọchị ikpeazụ” nke ajọ usoro ihe a. (2 Timoti 3:1-5) Ọmụma anyị maara ihe na-aga ime n’ọdịnihu kwesịrị ịkpali anyị ịma otú anyị ga-esi na-ebi ndụ ugbu a. Pita onyeozi dere, sị: “Ebe a ga-esi otú a gbazee ihe ndị a nile, lee ụdị mmadụ unu kwesịrị ịbụ n’àgwà dị nsọ na omume nke ịsọpụrụ Chineke, na-echere ma na-eburu ọnụnọ nke ụbọchị Jehova n’uche!”—2 Pita 3:11, 12.

13. Eziokwu ahụ bụ́ na oge anyị a chọrọ ka e mee ihe ngwa ngwa kwesịrị isi aṅaa metụta echiche anyị na otú anyị si ebi ndụ?

13 Echiche anyị na otú anyị si ebi ndụ kwesịrị igosi na anyị kwenyesiri ike na “ụwa na-agabiga, otú ahụkwa ka ọ dị ọchịchọ ya.” (1 Jọn 2:17) Itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ga-enyere anyị aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha banyere ihe mgbaru ọsọ ndị anyị chọrọ iru n’ọdịnihu. Dị ka ihe atụ, Jizọs kwuru, sị: “Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile.” (Matiu 6:33) Ọ bụ nnọọ ihe kwesịrị ịja mma ịhụ ọtụtụ ndị na-eto eto ka ha na-egosipụta okwukwe ha nwere na Jizọs site n’ịbanye n’ozi oge nile. Ndị ọzọ—ndị nile nọ n’ezinụlọ—akwagawo n’ebe a chọsiri ndị nkwusa Alaeze ike.

14. Olee otú otu ezinụlọ bụ́ Ndị Kraịst si mụbaa ozi ha?

14 Tụlee ihe banyere otu ezinụlọ bụ́ Ndị Kraịst dị mmadụ anọ, bụ́ ndị si na United States kwaga Dominican Republic iji sonyere ọgbakọ dị n’otu obodo nke iri puku mmadụ ise bi na ya. Ndị nkwusa nọ n’ọgbakọ ahụ dị ihe dị ka otu narị na iri atọ. Ma n’April 12, 2006, ihe dị ka otu puku mmadụ na narị atọ bịara ncheta nke ọnwụ Kraịst! Ubi e nwere n’ebe ahụ ‘achawo nnọọ nke ọma maka owuwe ihe ubi’ nke na mgbe nanị ọnwa ise gasịrị, ezinụlọ a na-amụrụ ihe ha ka mmadụ iri atọ Bible. (Jọn 4:35) Nna nwe ezinụlọ ahụ kwuru, sị: “E nwere ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị iri atọ kwatara ebe a iji nye aka. Ihe dị ka mmadụ iri abụọ n’ime ha si United States, ebe ndị ọzọ si Bahamas, Canada, Ịtali, New Zealand, na Spen. Mgbe ha rutere, ọ dị ha nnọọ ọkụ n’obi iso gaa ozi ọma, ha akpaliwokwa ụmụnna ndị ebe a iji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi.”

15. Olee ngọzi ndị i nwetaworo n’ihi ibute Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ gị?

15 O kwere nghọta na ọtụtụ ndị agaghị enwe ike ịkwaga ná mba ọzọ iji jee ozi n’ebe a chọsiri ndị nkwusa ike. Ma ndị nwere ike ime otú ahụ—ma ọ bụ ndị nweliri ike ịhazigharị oge ha ma wepụta onwe ha maka ọrụ dị otú a—ga-enweta ọtụtụ ngọzi na-abịa site n’ije ụdị ozi a. N’agbanyeghị ebe ị nọ na-eje ozi, ekwela ka ọṅụ mmadụ na-enweta mgbe o ji ume ya nile na-ejere Jehova ozi kwaa gị. Ọ bụrụ na i buru ụzọ na-achọ Alaeze ahụ ná ndụ gị, Jehova na-ekwe nkwa ‘ịwụsa gị ngọzi, ruo mgbe ọnọdụ agaghị ezu ịnagide ya.’—Malakaị 3:10.

Irite Uru Site ná Nduzi Jehova

16. Uru dị aṅaa ka anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị ekwere ka okwu Chineke na-eduzi anyị?

16 Dị ka anyị hụworo, okwu Jehova na-eduzi anyị n’ụzọ abụọ yiri ibe ha. Ha bụ oriọna dịịrị ụkwụ anyị, nke na-enyere anyị aka ije ije n’ụzọ ziri ezi ma na-eduzi anyị mgbe anyị chọrọ ime mkpebi. Ha na-emekwa ka ìhè dịrị n’okporo ụzọ anyị, na-eme ka anyị hụ ihe dị anyị n’ihu nke ọma. Nke ahụ na-emezi ka anyị gbasoo ndụmọdụ Pita bụ́: “Meenụ ka obi unu sie ike maka ịrụ ọrụ, nọgidenụ na-enwe uche ziri nnọọ ezi; tụkwasịnụ olileanya unu n’obiọma na-erughịrị mmadụ bụ́ nke a ga-ewetara unu ná mkpughe nke Jizọs Kraịst.”—1 Pita 1:13.

17. Olee otú ịmụ Bible ga-esi nyere anyị aka ịgbaso nduzi Chineke?

17 Ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya na Jehova na-eduzi anyị. Ma ajụjụ bụ, Ị̀ ga-anakwere nduzi ya? Iji ghọta nduzi Jehova na-enye, kpebisie ike ịdị na-agụ akụkụ ụfọdụ nke Bible kwa ụbọchị. Na-atụgharị ihe ndị ị na-agụ n’uche, gbalịa ghọta ihe bụ́ uche Jehova banyere ihe ọ bụla, ma chee ụzọ dị iche iche ị pụrụ isi jiri ihe ahụ ị gụtara mee ihe ná ndụ gị. (1 Timoti 4:15) Jirizie ‘ikike iche echiche’ gị mee ihe mgbe ị chọrọ ime mkpebi.—Ndị Rom 12:1.

18. Olee ngọzi ndị anyị ga-enweta ma ọ bụrụ na anyị ekwere ka Okwu Chineke na-eduzi anyị?

18 Ọ bụrụ na anyị ejiri ụkpụrụ ndị dị n’Okwu Chineke na-eme ihe, ha ga-eme ka anyị mara ihe, ma duzie anyị mgbe anyị chọrọ ime mkpebi banyere ihe anyị ga-eme ná ndụ. Ka obi sie anyị ike na okwu Jehova e dere ede na-eme ka “onye na-enweghị uche mara ihe.” (Abụ Ọma 19:7) Mgbe anyị kwere ka Bible na-eduzi anyị, anyị ga-enwe akọ na uche dị ọcha na obi ụtọ a na-enweta site n’ime ihe na-atọ Jehova ụtọ. (1 Timoti 1:18, 19) Ọ bụrụ na anyị ekwere ka okwu Chineke na-eduzi ije ụkwụ anyị kwa ụbọchị, Jehova ga-eji ngọzi na-enweghị atụ, nke bụ́ ndụ ebighị ebi, kwụghachi anyị ụgwọ.—Jọn 17:3.

Ì Chetara?

• Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị kwere ka Jehova Chineke na-eduzi ije ụkwụ anyị?

• N’ụzọ dị aṅaa ka okwu Chineke pụrụ isi bụrụ oriọna dịịrị ụkwụ anyị?

• Olee otú okwu Chineke pụrụ isi bụrụ ìhè dịịrị okporo ụzọ anyị?

• Olee otú ịmụ Bible ga-esi nyere anyị aka ịgbaso nduzi Chineke?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 15]

Olee ebe mkpakọrịta anyị na onye na-ekweghị ekwe ga-eru ya aghọọ nke amamihe na-adịghị na ya?

[Foto dị na peeji nke 16]

Ezigbo ndị enyi Jizọs bụ ndị mere uche Jehova

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Otú anyị si ebi ndụ anyị ọ̀ na-egosi na anyị na-ebute Alaeze Chineke ụzọ?