Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ntorobịa—Na-achụsonụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị Na-ewetara Chineke Nsọpụrụ

Ndị Ntorobịa—Na-achụsonụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị Na-ewetara Chineke Nsọpụrụ

Ndị Ntorobịa—Na-achụsonụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị Na-ewetara Chineke Nsọpụrụ

“Jiri nsọpụrụ Chineke na-azụ onwe gị dị ka nzube gị.”—1 TIMOTI 4:7.

1, 2. (a) N’ihi gịnị ka Pọl ji jaa Timoti mma? (b) Olee otú ndị na-eto eto taa si ‘jiri nsọpụrụ Chineke na-azụ onwe ha dị ka nzube ha’?

“ENWEGHỊ m onye ọzọ nke ọchịchọ obi ya dị ka nke ya bụ́ onye ga-elekọta ihe ndị metụtara unu nke ọma. . . . Dị ka nwata ya na nna ya nọ, o so m bụrụ ohu n’ime ka ozi ọma na-aga n’ihu.” (Ndị Filipaị 2:20, 22) Pọl onyeozi denyere okwu ịja mma a na-agba ume n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst nọ na Filipaị na narị afọ mbụ. Ònye ka Pọl na-ekwu okwu ya? Ọ bụ Timoti, onye na-eto eto ya na ya so jekọọ ozi. Cheedị otú obi ga-esi tọọ Timoti ụtọ ịnụ ihe a Pọl kwuru iji gosi na ya hụrụ ya n’anya ma tụkwasị ya obi!

2 Kemgbe ụwa, ndị na-eto eto ji ofufe Chineke kpọrọ ihe dị ka Timoti dị nnọọ oké ọnụ ahịa nye ndị na-efe Jehova. (Abụ Ọma 110:3) Taa, e nwere ọtụtụ ndị na-eto eto ná nzukọ Chineke, bụ́ ndị na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ na ndị ozi ala ọzọ, ụfọdụ ewepụtakwala onwe ha iso na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ, ebe ndị ọzọkwa na-eje ozi na Betel. Ndị ọzọ e kwesịkwara ịja nnọọ mma bụ ndị na-eso ekere okè n’ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ ma ka na-arụkwa ọrụ ndị ọzọ dịịrị ha. Ndị na-eto eto dị otú a na-enwe afọ ojuju nke na-abịa site n’ịchụso ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, nsọpụrụ. N’ezie ha ‘ji nsọpụrụ Chineke na-azụ onwe ha dị ka nzube ha.’—1 Timoti 4:7, 8.

3. Olee ajụjụ ndị a ga-atụle n’isokwu a?

3 Dị ka onye na-eto eto, è nwere ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Chineke nsọpụrụ bụ́ ndị ị na-agbalị iru? Ebee ka ị pụrụ inweta enyemaka na agbamume iji mee nke ahụ? Olee otú ị pụrụ isi guzogide nrụgide ndị a na-enweta n’ụwa a nke e ji ịhụ ihe onwunwe n’anya mara? Olee ngọzi ndị ị pụrụ ịtụ anya inweta ma ọ bụrụ na ị chụsoo ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Chineke nsọpụrụ? Ka anyị chọta azịza nke ajụjụ ndị a site n’ịtụle ndụ Timoti na ozi ya.

Ụdị Ebe Timoti Nọ Tolite

4. Kọọ ná mkpirikpi akụkọ banyere ndụ Timoti dị ka Onye Kraịst.

4 Timoti tolitere na Listra, bụ́ obere obodo dị na Galeshia nke ndị Rom na-achị. O yiri ka ọ mụtara banyere Kraịst mgbe ọ dị afọ iri na ụma, bụ́ mgbe Pọl kwusara ozi ọma na Listra n’ihe dị ka n’afọ 47 O.A. Ngwa ngwa, ụmụnna nọ na Listra bịara mara Timoti nke ọma dị ka ezigbo mmadụ. Mgbe Pọl lọghachiri Listra ka afọ abụọ gasịrị ma nụ na Timoti na-eme nke ọma, ọ họọrọ ya ka o soro ya jewe ozi ala ọzọ. (Ọrụ 14:5-20; 16:1-3) Ka Timoti na-etoru ogo mmadụ, e nyere ya ibu ọrụ ndị ka ukwuu, nke gụnyere ọrụ dị oké mkpa bụ́ ịga na-agba ụmụnna ume. Mgbe Pọl si n’ụlọ mkpọrọ dị na Rom degara Timoti akwụkwọ ozi n’ihe dị ka n’afọ 65 O.A., Timoti nọ na-eje ozi dị ka okenye ọgbakọ n’Efesọs.

5. Dị ka 2 Timoti 3:14, 15 si kwuo, olee ihe abụọ nyeere Timoti aka ikpebi ịchụso ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Chineke nsọpụrụ?

5 Ihe àmà na-egosi na Timoti họọrọ ịchụso ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Chineke nsọpụrụ. Ma gịnị kpaliri ya ime otú ahụ? Pọl kwuru ihe abụọ kpaliri Timoti ime nke a n’akwụkwọ ozi nke abụọ o degaara Timoti. O dere, sị: “Nọgide n’ihe ndị ị mụtara na ndị e mere ka i kwere, ebe ị maara mmadụ ndị i sitere n’aka ha mụta ha nakwa na ọ bụ malite n’oge ị bụ nwa ọhụrụ ka ị mawooro ihe odide ndị ahụ dị nsọ.” (2 Timoti 3:14, 15) Ka anyị buru ụzọ tụlee otú Ndị Kraịst ndị ọzọ si nyere Timoti aka ịhọrọ ihe ọ ga-eme ná ndụ.

Rite Uru Site n’Ezi Ihe Nlereanya nke Ndị Ọzọ

6. Olee ụdị ọzụzụ Timoti natara, oleekwa otú o si lee ọzụzụ ahụ anya?

6 A zụlitere Timoti n’ezinụlọ na-anọghị n’otu okpukpe. Nna ya bụ onye Gris ma nne ya bụ́ Yunis, na nne nne ya bụ́ Lọịs, bụcha ndị Juu. (Ọrụ 16:1) Yunis na Lọịs malitere mgbe Timoti bụ nwa ọhụrụ kụziwere ya eziokwu ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na mgbe ha ghọrọ Ndị Kraịst, ha nyeere Timoti aka ikweta ozizi Ndị Kraịst. O doro nnọọ anya na Timoti tinyere ihe ndị ọ mụtara n’ọrụ. Pọl kwuru, sị: “M na-echeta okwukwe ahụ nke dị n’ime gị nke ihu abụọ ọ bụla na-adịghị na ya, bụkwa nke bu ụzọ dịrị n’ime nne gị ochie bụ́ Lọịs na nne gị bụ́ Yunis, ma bụrụ nke m nwere obi ike na ọ dịkwa n’ime gị.”—2 Timoti 1:5.

7. Olee ngọzi ọtụtụ ndị na-eto eto na-enweta, oleekwa otú nke a pụrụ isi baara ha uru?

7 Taa, ọtụtụ ndị na-eto eto nwere ndị nne na nna na ndị nne ochie na nna ochie na-atụ egwu Chineke bụ́ ndị, dị ka Yunis na Lọịs, ghọtara mkpa ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Chineke nsọpụrụ dị. Dị ka ihe atụ, Samira ka na-echeta mkparịta ụka na-adị na-ewe ogologo oge nke ya na ndị mụrụ ya na-adị na-enwe mgbe ọ dị afọ iri na ụma. O kwuru, sị: “Mama m na Papa m kụziiri m ile ihe anya dị ka Jehova si ele ha, kụziekwara m ibute ọrụ ikwusa ozi ọma ụzọ ná ndụ m. Ha na-agbakarị m ume ịbanye n’ozi oge nile.” Samira mere ihe ndị mụrụ ya gbara ya ume ime, ọ na-ejekwa ozi ugbu a n’ezinụlọ Betel dị n’obodo ya. Ọ bụrụ na ndị mụrụ gị agbaa gị ume ịchụso ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Chineke nsọpụrụ, chebara ya echiche. Ha bu ọdịmma gị n’obi.—Ilu 1:5.

8. Olee otú iso ndị na-agba mmadụ ume inwe ọganihu n’ọgbakọ kpachie anya si nyere Timoti aka?

8 Ọ dịkwa mkpa ka i soro ụmụnna ndị ga na-agba gị ume inwe ọganihu n’ọgbakọ na-akpakọrịta. Ndị okenye nọ n’ọgbakọ Timoti na ndị nke nọ n’Aịkoniọm nke dị ihe dị ka kilomita iri atọ site na Listra, maara Timoti nke ọma. (Ọrụ 16:1, 2) Ya na Pọl, bụ́ onye na-anụ nnọọ ọkụ n’obi, bụ ezigbo enyi. (Ndị Filipaị 3:14) Akwụkwọ ozi Pọl gosiri na Timoti na-anabata ndụmọdụ nakwa na ọ na-adị ngwa iṅomi ihe nlereanya nke ndị nwere okwukwe. (1 Ndị Kọrịnt 4:17; 1 Timoti 4:6, 12-16) Pọl dere, sị: “Ị gbasochiwo ozizi m anya, ya na ụzọ ndụ m, nzube m, okwukwe m, ogologo ntachi obi m, ịhụnanya m, ntachi obi m.” (2 Timoti 3:10) Ee, Timoti gbasochiri ihe nlereanya Pọl anya. Ọ bụrụ na gị na ndị ji ozi Jehova kpọrọ ihe a na-akpachi anya n’ọgbakọ dị ka Timoti mere, ha ga-enyere gị aka isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Chineke nsọpụrụ.—2 Timoti 2:20–22.

Na-amụ “Ihe Odide Ndị Dị Nsọ”

9. E wezụga iso ndị ji ozi Jehova kpọrọ ihe na-akpakọrịta, olee ihe ị na-aghaghị ime ‘iji wee zụọ onwe gị’ iji bụrụ onye na-asọpụrụ Chineke?

9 Ọ̀ bụ nanị ịhọrọ ezi ndị enyi na-eme ka mmadụ ruo ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Chineke nsọpụrụ? Ee e. Dị ka Timoti mere, i kwesịrị iji nlezianya na-amụ “ihe odide ndị dị nsọ.” Ọ pụrụ ịbụ na ọ na-esiri gị ike ịmụ ihe, ma cheta na Timoti aghaghị ‘iji nsọpụrụ Chineke zụọ onwe ya dị ka nzube ya.’ Ndị na-eme egwuregwu na-azụsi ahụ́ ha ike ruo ọtụtụ ọnwa iji ruo ihe mgbaru ọsọ ha. N’otu aka ahụ, a chọrọ ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà na mgbalị siri ike iji ruo ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Chineke nsọpụrụ. (1 Timoti 4:7, 8, 10) Ị pụrụ ịjụ sị, ‘Ma olee otú ịmụ Bible ga-esi nyere m aka iru ihe mgbaru ọsọ m?’ Ka anyị tụlee ụzọ atọ ọ pụrụ isi nyere gị aka.

10, 11. N’ihi gịnị ka Akwụkwọ Nsọ ga-eji kpalie gị iru ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Chineke nsọpụrụ? Nye ihe atụ.

10 Nke mbụ, Akwụkwọ Nsọ ga-akpali gị isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ziri ezi. Ọ na-eme ka anyị mata àgwà ndị magburu onwe ha Nna anyị nke eluigwe nwere, ịhụnanya na-enweghị atụ o nwere n’ebe anyị nọ, na ngọzi ebighị ebi nke na-echere ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi. (Emọs 3:7; Jọn 3:16; Ndị Rom 15:4) Ka ị na-amụtakwu banyere Jehova, nke ahụ ga-eme ka ị hụkwuo ya n’anya, ọchịchọ gị ịrara onwe gị nye ya ga-esikwukwa ike.

11 Ọtụtụ Ndị Kraịst na-eto eto ekwuola na ịmụchi Bible anya n’onwe ha bụ isi ihe nyeere ha aka ime ka eziokwu ahụ bụrụ nke ha. Dị ka ihe atụ, a zụlitere Adele n’ezinụlọ Ndị Kraịst, ma ọ dịbeghị mgbe o setịpụrụ ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Chineke nsọpụrụ. Ọ na-akọ, sị: “Ndị mụrụ m na-akpọ m aga n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma adịghị m amụ ihe n’onwe m ma ọ bụ na-ege ntị mgbe ọmụmụ ihe na-aga n’ihu.” Mgbe e mesịrị nwanne ya nwanyị baptizim, Adele malitere iji eziokwu ahụ kpọrọ ihe karịa ka ọ na-emebu. O kwuru, sị: “Ekpebiri m ịgụcha Bible. M na-eme m gụtụ obere, mụ edetuo ihe m mụtara n’ebe ahụ m gụrụ. Ihe ndị ahụ m deturu ka nọcha ya. Agụchara m Bible n’ime otu afọ.” Nke a kpaliri Adele ịrara ndụ ya nye Jehova. N’agbanyeghị na o nwere nkwarụ, ọ bụ onye ọsụ ụzọ, ma ọ bụ onye ozi oge nile, ugbu a.

12, 13. (a) Olee mgbanwe ndị ịmụ Bible ga-enyere onye na-eto eto aka ime, oleekwa otú ọ ga-esi enyere onye ahụ aka? (b) Nye ihe atụ nke ezi amamihe ndị dị n’Okwu Chineke.

12 Nke abụọ, Bible ga-enyere gị aka ịgbanwe àgwà ụfọdụ ndị na-ekwesịghị ekwesị. Pọl gwara Timoti na “ihe odide ndị dị nsọ” ‘bara uru maka izi ihe, maka ịdọ aka ná ntị, maka ime ka ihe guzozie, maka inye ọzụzụ n’ezi omume, ka onye nke Chineke wee ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu maka ezi ọrụ ọ bụla.’ (2 Timoti 3:16, 17) Ọ bụrụ na ị nọgide na-atụgharị uche n’Okwu Chineke ma na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, ị ga-ekwe ka mmụọ Chineke na-akpụzi ndụ gị. Ọ ga-eme ka i nwee àgwà ndị dị oké mkpa ndị dị ka ịdị umeala n’obi, ịnọgidesi ike n’ihe, ịdị uchu, na iji obi dum hụ ndị kwere ekwe ibe gị n’anya. (1 Timoti 4:15) Timoti nwere àgwà ndị a, ha nyekwaara ya aka ịbara Pọl na ọgbakọ ndị Timoti jeere ozi uru.—Ndị Filipaị 2:20-22.

13 Nke atọ, ezi amamihe juru n’Okwu Chineke. (Abụ Ọma 1:1-3; 19:7; 2 Timoti 2:7; 3:15) Ọ ga-enyere gị aka iji amamihe họrọ ndị enyi gị na ụdị ntụrụndụ ndị kwesịrị ekwesị, nyekwara gị aka ime mkpebi ndị ọzọ siri ike. (Jenesis 34:1, 2; Abụ Ọma 119:37; 1 Ndị Kọrịnt 7:36) Ọ dị mkpa ugbu a ka i mee mkpebi ndị amamihe dị na ha ka i wee nwee ike iru ihe mgbaru ọsọ gị ndị na-ewetara Chineke nsọpụrụ.

“Lụọ Ezi Ọgụ nke Okwukwe”

14. Gịnị mere na ọ dịghị mfe ịchụso ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Chineke nsọpụrụ?

14 Ibute ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Jehova nsọpụrụ ụzọ ná ndụ bụ ihe kasị mma ime, ma ọ dịghị mfe omume. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị chọrọ ịhọrọ ụdị ọrụ ị ga-arụ, ndị ikwu gị, ndị ọgbọ gị, ndị nkụzi gị, bụ́ ndị kweere na ịgụ akwụkwọ dị elu na inweta ọrụ a na-akwụ ezigbo ego na ya bụ isi ihe na-eme ka mmadụ nwee ihe ịga nke ọma na obi ụtọ, pụrụ ịkwanye gị ịchụso ihe nke ụwa. (Ndị Rom 12:2) Dị ka Timoti, ọ ga-adị mkpa ka ị “lụọ ezi ọgụ nke okwukwe” iji wee “jidesie aka ike ná ndụ ebighị ebi ahụ” bụ́ nke Jehova kwere nkwa inye gị.—1 Timoti 6:12; 2 Timoti 3:12.

15. Olee mmegide ndị ọ pụrụ ịbụ na Timoti zutere?

15 Mgbe ndị ezinụlọ gị na-abụghị Ndịàmà na-akwadoghị ihe ndị ị họọrọ ime, nke ahụ pụrụ ịbụrụ gị ule siri nnọọ ike. Ikekwe Timoti zutere ụdị mmegide a. Dị ka otu akwụkwọ kwuru, eleghị anya ndị ezinụlọ Timoti “so ná ndị gụrụ oké akwụkwọ na ndị bara ọgaranya.” Ọ pụkwara ịbụ na nna ya tụrụ anya ka ọ gụọ akwụkwọ dị elu ma nwee ike ilekọtawa ihe ezinụlọ ha ji akpata ego. * Cheedị ihe nna Timoti ga-emewo mgbe ọ chọpụtara na Timoti họọrọ iso Pọl na-eje ozi ala ọzọ, bụ́ nke dị ize ndụ na nke ego na-adịghị na ya!

16. Olee otú otu onye na-eto eto si merie mmegide sitere n’aka papa ya?

16 Ndị Kraịst na-eto eto na-eche ihe ịma aka yiri nke ahụ ihu taa. Matthew, bụ́ onye na-eje ozi n’otu alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova kwuru, sị: “O wutere papa m nke ukwuu mgbe m malitere ije ozi dị ka ọsụ ụzọ. O weere ya na akwụkwọ m gụrụ lara ‘n’iyi’ mgbe m malitere ịrụ ọrụ dị ka onye na-ehichasị ihe iji na-enweta ego m ji na-enyere onwe m aka n’ozi m. Ọ na-adị na-eme m akaje, na-echetara m ego ole a gaara na-akwụ m ma a sị na m na-arụ ezigbo ọrụ.” Gịnị ka Matthew mere banyere mmegide ahụ? “M na-agụchi Bible anya ma na-ekpechi ekpere anya, karịsịa mgbe e mere m ihe iwe.” Ezi ihe si ná mkpebi ahụ Matthew mere pụta. Ka oge na-aga, ya na papa ya bịakwara dịghachi ná mma. Matthew na Jehova bịakwara dịkwuo ná mma. Matthew na-ekwu, sị: “Ahụwo m otú Jehova si na-enye m ihe ndị na-akpa m, na-agba m ume, na-enyekwara m aka ịghara ime mkpebi ndị na-ezighị ezi. Agaraghị m enweta ihe ndị a nile ma a sị na achụsoghị m ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Chineke nsọpụrụ.”

Lekwasị Anya n’Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị Na-ewetara Chineke Nsọpụrụ

17. Olee otú ụfọdụ ndị pụrụ isi na-akụda ndị chọrọ ịbanye n’ozi oge nile aka n’amaghị ama? (Matiu 16:22)

17 Ndị kwere ekwe ibe gị nwedịrị ike ịbụ ndị ga-akụda gị mmụọ ka ị ghara iru ihe mgbaru ọsọ gị. Ụfọdụ pụrụ ịjụ gị sị, ‘Ọ̀ dịdị mkpa na ị ga-abụ onye ọsụ ụzọ? ‘I nwere ike ịdị na-ebi ndụ dị ka ibe gị ma ka nwee ike ikwusa ozi ọma. Nweta ezigbo ọrụ, ị ga-ahụ na ihe agaghị esiri gị ike ná ndụ.’ Ndụmọdụ a pụrụ iyi ihe amamihe dị na ya, ma ọ bụrụ na ị gbasoo ya, ọ̀ ga-egosi n’ezie na ị na-azụ onwe gị iji bụrụ onye na-asọpụrụ Chineke?

18, 19. (a) Olee otú ị pụrụ isi lekwasị anya n’ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Chineke nsọpụrụ? (b) Kọọ ihe ụfọdụ ndị ị chụrụla n’àjà dị ka onye na-eto eto n’ihi Alaeze ahụ.

18 Ihe àmà na-egosi na ụfọdụ ndị ha na Timoti bikọrọ ndụ nwere ụdị echiche ndị a. (1 Timoti 6:17) Iji nyere Timoti aka ilekwasị anya n’ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Chineke nsọpụrụ, Pọl gbara ya ume, sị: “Onye ọ bụla na-eje ozi dị ka onye agha adịghị etinye aka n’ọrụ ego nke ndụ, ka o wee nweta nnwapụta nke onye debanyere aha ya dị ka onye agha.” (2 Timoti 2:4) Onye agha nọ n’ọgbọ agha agaghị anwa anwa kwe ka ihe ọ bụla dọpụ uche ya. Ndụ ya na ndụ ndị ọzọ dabeere na ya ịdị njikere mgbe nile ime ihe ọchịagha ya gwara ya mee. Dị ka onye agha nọ n’okpuru Kraịst, ị ghaghị ilekwasị anya n’ihe mgbaru ọsọ gị ma ghara ikwe ka nchụso na-enweghị isi nke a na-achụso ihe onwunwe gbochie gị ịrụzu ọrụ gị nke na-azọpụta ndụ.—Matiu 6:24; 1 Timoti 4:16; 2 Timoti 4:2, 5.

19 Kama ichewe otú ị ga-esi bie ndụ na-enweghị mmekpa ahụ́, gbalịa nwee mmụọ nke ịchụ ihe ụfọdụ na-amasị gị n’àjà. “Dị ka onye agha Kraịst Jizọs, dị njikere ịjụ ihe ụfọdụ ndị e ji elezi ndụ anya.” (2 Timoti 2:3, dị ka e si sụgharịa ya na The English Bible in Basic English) Mgbe Timoti so Pọl na-eje ozi, o si n’aka ya mụta otú e si enwe afọ ojuju ọbụna mgbe ihe siri ezigbo ike. (Ndị Filipaị 4:11, 12; 1 Timoti 6:6-8) Ị pụrụ ime otu ihe ahụ. Ị̀ dị njikere ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà n’ihi Alaeze ahụ?

Ngọzi Ndị A Na-enweta Ugbu A na Ndị A Ga-enweta n’Ọdịnihu

20, 21. (a) Kwuo ụfọdụ ngọzi ndị na-abịa site n’ịchụso ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Chineke nsọpụrụ. (b) Gịnị ka i kpebisiri ike ime?

20 Timoti so Pọl rụkọọ ọrụ ruo ihe dị ka afọ iri na ise. Timoti ji anya ya hụ ka e hiwere ọgbakọ ọhụrụ dị iche iche ka ozi ọma ahụ fọrọ nke nta ka ọ gbasaruo n’obodo nile dị n’ebe ugwu Mediterenian. Ndụ ya na-enye ya obi ụtọ na afọ ojuju karịa otú ọ bụla ndụ ya gaara adị ma a sị na ọ họọrọ ibi ndụ otú ndị ọzọ lere anya na e “kwesịrị” isi bie ndụ. Site n’ịchụso ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Chineke nsọpụrụ, gị onwe gị ga-enwetakwa ngọzi ndị na-enweghị atụ. Gị na Jehova ga-adị n’ezigbo mma, Ndị Kraịst ibe gị ga-ahụkwa gị n’anya ma kwanyere gị ùgwù. Kama inwe ihe mgbu na obi mgbawa ndị ịchụso ihe onwunwe na-akpata, ị ga-enwe ezigbo obi ụtọ nke na-abịa site n’iji obi ọcha na-enye ndị ọzọ ihe. Nke kasịnụ, ị ‘ga-ejidesi aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie’, nke bụ́ ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala.—1 Timoti 6:9, 10, 17-19; Ọrụ 20:35.

21 Ya mere, ọ bụrụ na i mebeghị otú ahụ, anyị na-agba gị nnọọ ume ka ị malite ozugbo ịzụ onwe gị iji bụrụ onye na-asọpụrụ Chineke. Na-eru ndị nọ n’ọgbakọ, bụ́ ndị pụrụ inyere gị aka iru ihe mgbaru ọsọ gị ndị na-ewetara Chineke nsọpụrụ nso ma rịọ ha maka enyemaka. Na-amụchi Okwu Chineke anya n’onwe gị. Kpebisie ike izere mmụọ ịhụ ihe onwunwe n’anya nke juru n’ụwa a. Ya adịkwala mgbe ị ga-echefu na Chineke, bụ́ “onye na-enye anyị ihe nile n’ụba ka anyị wee nwee ọṅụ,” kwere nkwa na a pụrụ ịgọzi gị n’ụba ugbu a na n’ọdịnihu ma ọ bụrụ na ị họrọ ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara ya nsọpụrụ.—1 Timoti 6:17.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 15 Ndị Gris ejighị ịgụ akwụkwọ dị elu egwu egwu. Plutarch, bụ́ onye ya na Timoti biri ndụ n’otu oge, dere, sị: “Ịgụ akwụkwọ nke ọma na-eme ka mmadụ nweta ihe nile dị mma . . . Ọ bụ ya na-eme ka mmadụ na-akpa ezi àgwà ma nwee obi ụtọ. . . . Ihe ndị ọzọ mmadụ na-eme ná ndụ abachaghị uru, anyị ekwesịghịkwa iji ha kpọrọ oké ihe.”—Moralia, I, “The Education of Children (Ịzụ Ụmụaka n’Akwụkwọ).”

Ì Chetara?

• N’ebee ka ndị na-eto eto pụrụ ịchọta enyemaka iji ruo ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Chineke nsọpụrụ?

• Gịnị mere ịmụchi Bible anya ji dị oké mkpa?

• Olee otú ndị na-eto eto pụrụ isi zere mmụọ ịhụ ihe onwunwe n’anya nke juru n’ụwa a?

• Olee ngọzi ndị a na-enweta site n’ịchụso ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Chineke nsọpụrụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 24]

Timoti chụsoro ihe mgbaru ọsọ ndị mara mma

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

Olee ezigbo ihe nlereanya ndị nyeere Timoti aka?

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Ị̀ na-agbalị iru ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Chineke nsọpụrụ?