Ị̀ Na-atụ Ọdịnihu Egwu?
Ị̀ Na-atụ Ọdịnihu Egwu?
E NWERE ọtụtụ ihe mere ndị mmadụ ji atụ egwu. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị na-atụ egwu otú ụwa ga-adị n’ọdịnihu. Magazin Time nke April 3, 2006 kwuru, sị: “Oké okpomọkụ, idei mmiri, ọkụ ọgbụgba, na ọtụtụ ice ndị na-agbazenụ gosiri na ọnọdụ ihu igwe nke ụwa anyị a aghasaala.”
Na May 2002, Ngalaba Mba Ndị Dị n’Otu nke Na-ahụ Maka Gburugburu Ebe Obibi wepụtara akụkọ nke a kpọrọ “Ọnọdụ Ebe Obibi n’Ọdịnihu-Akụkụ nke Atọ.” A chịkọtara ya site n’aka ihe karịrị otu puku mmadụ. Otu akụkọ ụwa kwuru na akụkọ ahụ kwuru, sị: “Mbara ala anyị nọ n’ọnọdụ chọrọ nlezianya n’ihi na mkpebi ndị e mere taa ga-emetụta ọdịnihu nke oké ọhịa, oké osimiri, osimiri, ugwu, ụmụ anụmanụ na ihe ndị ọzọ na-akwado ndụ bụ́ ndị ọgbọ dị ugbu a na ndị a ga-enwe n’ọdịnihu dabeere na ha.”
Otú ọnọdụ ụwa dị ugbu a so na-akpatara ụmụ mmadụ nchegbu. Ndị nọ n’akụkụ nile nke ụwa nọzi n’egwu n’ihi ndị na-eyi ọha egwu. Osote onyeisi ndị uwe ojii nzuzo Canada kwuru, sị: “Anyị na-amụ anya n’abalị na-echegbu onwe anyị banyere ihe ọjọọ anyị na-amaghị ma ọ̀ ga-eme eme.” N’ezie, nanị ikiri akụkọ ụwa a na-akọ na televishọn ná mgbede nwere ike ịkpatara mmadụ nchegbu!
Ọtụtụ ndị toro eto na-arụsi ọrụ ike na-atụ egwu na e nwere ike ịchụ ha n’ọrụ. Ịchụ ndị mmadụ n’ọrụ, imechi ụlọ ọrụ, mmarịta aka n’ebe ọrụ, na ndị a na-arụrụ ọrụ ịchọ ihe gabigara ókè n’aka ndị ọrụ ha nwere ike ime ka ndị mmadụ gharakwa iji ọrụ ha n’aka. Ndị na-eto eto na-atụ egwu na ndị ọgbọ ha ga-ajụ ha. Ụmụaka nwere ike ịdị na-atụ egwu na ndị mụrụ ha ahụchaghị ha n’anya. Ma olee otú ihe ndị na-eme gburugburu ha n’ụwa si emetụta ha? Otu nwanyị nwere ụmụ bụ́ onye
na-echegbu onwe ya kwuru, sị: “Ihe ụmụaka na-enwebeghị ihe ha ma na-ahụ ma ha si n’ụlọ pụọ aghaghị ịdị na-atụ ha ụjọ mgbe ụfọdụ.” Ọtụtụ ndị nne na nna na-echegbukwa onwe ha banyere otú ndụ rere ure ndị mmadụ na-ebi n’ụwa a ga-esi emetụta ndị ha hụrụ n’anya, karịsịa ụmụ ha.Ndị agadi na-atụkarị egwu isi n’elu steepụ daa ma ọ bụ ndị omekome ịwakpo ha n’ụzọ. Ee, “ha ga-atụ egwu ihe dị elu, ihe ụjọ dị iche iche ga-adịkwa n’ụzọ.” (Eklisiastis 12:5) Ndị mmadụ na-atụkwa egwu ọrịa ọjọọ. Akụkọ anyị na-anụ banyere ọrịa ndị na-egbu egbu a na-ebute n’ikuku, cancer, na ọrịa ndị na-efe efe nwere ike ime ka anyị tụwa ụjọ na anyị ma ọ bụ ndị ezinụlọ anyị nwere ike ibute ọrịa ndị ọhụrụ nwere ike ịkwarụ ma ọ bụ gbuo anyị. N’ezie, mgbe anyị hụrụ ka ndị ahụ́ dị, bụ́kwa ndị gbasiri ike dara ọrịa, anyị nwere ike ichewe na ihe dị otú ahụ ga-eme anyị ma ọ bụ ndị anyị hụrụ n’anya. Ọ na-ewutekwa ewute ileba onye na-arịa ọrịa anya ná mkpụrụ anya ma hụ na o nwekwaghị olileanya!
Ebe ọ bụ na e nwere ọtụtụ ihe na-eme ka anyị na-atụ egwu, ò nwere ezi ihe mere anyị ga-eji na-enwe olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu? Ọ̀ dị ihe ga-enyere anyị aka ịnọgide na-enwe olileanya na ihe ga-adị mma? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
© Jeroen Oerlemans/Panos Pictures