Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Echiche Gị Nile Ga-eguzosi Ike’

‘Echiche Gị Nile Ga-eguzosi Ike’

‘Echiche Gị Nile Ga-eguzosi Ike’

N’ABỤ ọbụ abụ bụ́ Devid dere, o kpegaara Chineke ekpere, sị: “Keere m obi dị ọcha, Chineke; meekwa ka mmụọ nke na-eguzosi ike dị ọhụrụ n’ime m. Nyeghachi m obi ụtọ nke nzọpụta Gị: werekwa mmụọ nke a maara aha ya kwagide m.” (Abụ Ọma 51:10, 12) Devid, bụ́ onye chegharịrị site ná mmehie ya na Bat-sheba mere, rịọrọ Jehova Chineke ebe a ka o mee ka obi ya dị ọcha ma tinye n’ime ya mmụọ, ma ọ bụ ọnọdụ uche, nke ga-akpali ya ime ihe ziri ezi.

Jehova ọ̀ na-ekere anyị obi dị ọcha n’ezie, ọbụna tinye n’ime anyị mmụọ dị ọhụrụ na nke ga-akpali anyị ime ihe? Ka ànyị kwesịrị itinye mgbalị iji nweta obi dị ọcha ma chebe ya? “Jehova, na-enyocha obi,” ma olee otú ọ na-etinyeru anya n’ihe anyị na-eche n’obi anyị? (Ilu 17:3; Jeremaịa 17:10) Olee otú ọ na-achịkwaru ndụ, ebumnobi, na omume anyị?

Site n’iji aha Chineke mee ihe ugboro asatọ, Ilu isi 16 amaokwu 1 ruo nke 9 gosiri anyị otú anyị nwere ike isi nye Chineke ohere ka ọ chịkwaa ndụ anyị iji mee ka ‘atụmatụ anyị guzosie ike.’ (Ilu 16:3) Amaokwu 10 ruo 15 na-elekwasị anya n’ọrụ eze ma ọ bụ onye ọchịchị na-arụ.

Ònye Nwe “Ido Obi n’Usoro”?

Ilu 16:1a na-ekwu, sị: “Mmadụ nwe ido obi n’usoro.” O doro anya na ọ bụ anyị nwe “ido obi n’usoro.” Jehova anaghị edozi obi anyị n’ụzọ ọrụ ebube ma ọ bụ na-enye anyị mmụọ ịchọ ime ihe. Ọ dị anyị mkpa itinye mgbalị iji nweta ezi ihe ọmụma nke Okwu ya, bụ́ Bible, na-atụgharị uche n’ihe ndị anyị mụrụ, ma mee ka uche anyị kwekọọ na nke ya.—Ilu 2:10, 11.

Ma, arịrịọ Devid rịọrọ Chineke ka o nye ya “obi dị ọcha” na “mmụọ dị ọhụrụ,” na-egosi na ọ maara banyere ọchịchọ ime mmehie nke dị n’ime ya na mkpa enyemaka nke Chineke dị ya n’ime ka obi ya dị ọcha. Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, e nwere ike ịnwa anyị itinye aka “n’ọrụ nke anụ ahụ́.” (Ndị Galeshia 5:19-21) Iji ‘mee ka akụkụ ahụ́ [anyị] ndị dị n’elu ụwa nwụọ n’ihe metụtara ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ, ọchịchọ na-emerụ ahụ́, na ọchịchọ anyaukwu,’ ọ dị anyị mkpa inweta enyemaka Jehova. (Ndị Kọlọsi 3:5) Lee ka o si dị mkpa anyị ikpegara Chineke ekpere maka enyemaka iji zere ịdaba n’ọnwụnwa na iji wepụ ọchịchọ mmehie n’obi anyị!

Ànyị nwere ike inyere ndị ọzọ aka ‘ido obi ha n’usoro’? Bible kwuru, sị: “O nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha: ma ire ndị maara ihe bụ ihe na-agwọ mmadụ.” (Ilu 12:18) Olee mgbe ire anyị nwere ike ịgwọ ndị ọzọ? O bụ nanị mgbe ‘ọzịza ire sitere n’aka Jehova,’ ya bụ, mgbe anyị kwuru eziokwu sitere na Bible.—Ilu 16:1b.

Bible na-ekwu, sị: “Obi dị aghụghọ karịa ihe nile, ihe na-adịghị ngwọta ka ọ bụkwa.” (Jeremaịa 17:9) Obi ihe atụ anyị na-agọpụkarịrị onwe ya, ọ pụkwara ịghọgbu anyị. Mgbe Eze Solomọn nke Izrel oge ochie na-adọ aka ná ntị banyere ihe ize ndụ a, o kwuru, sị: “Ụzọ nile nke onye ọ bụla dị ọcha n’anya ya: ma Onye na-atụzi mmụọ nile nke mmadụ ka Jehova bụ.”Ilu 16:2.

Ịhụ onwe anyị n’anya nwere ike ime ka anyị na-agọpụrụ onwe anyị mgbe anyị mere ihe ọjọọ, na-ezochi àgwà ọjọọ anyị, ma ghara ịdị na-ahụ ihe ọjọọ ndị anyị na-eme. Ma, anyị agaghị aghọgbuli Jehova. Ọ na-enyocha mmụọ nile. Mmụọ mmadụ bụ ọnọdụ uche ya, e nwekwara ihe jikọrọ ọnọdụ uche mmadụ na obi ya. Ihe na-ekpebikarị ihe ọnọdụ uche anyị ga-abụ bụ ihe ndị dị n’obi ihe atụ anyị, bụ́ nke gụnyere ihe ndị dị ka echiche anyị, mmetụta anyị, na ebumnobi anyị. Mmụọ ka “onye na-enyocha obi” na-atụzi, ọ dịghịkwa ele mmadụ anya n’ihu n’ikpe. Ọ bụ ihe amamihe dị na ya anyị iche mmụọ anyị nche.

“Tụrụ Ọrụ Gị Nile Ruo Jehova Ahụ́”

Ime atụmatụ na-agụnye iche echiche—nke bụ́ ọrụ obi anyị na-arụ. Ọrụ na-esochikarị atụmatụ. Ànyị ga-enwe ihe ịga nke ọma n’atụmatụ anyị? Solomọn na-ekwu, sị: “Tụrụ ọrụ gị nile ruo Jehova ahụ́, echiche gị nile ewee guzosie ike.” (Ilu 16:3) Ịtụrụ ọrụ anyị ruo Jehova ahụ́ pụtara ịtụkwasị ya obi anyị, ịdabere na ya, ịnọ n’okpuru ya—iburu ibu dị n’ubu anyị n’ụzọ ihe atụ bukwasị n’ubu nke ya. Ọbụ abụ bụrụ, sị: “Kpọree ụzọ gị ruo Jehova ahụ́; tụkwasịkwa Ya obi, Ya onwe ya ga-emekwa ya.”—Abụ Ọma 37:5.

Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka atụmatụ anyị guzosie ike, ha aghaghị ikwekọ n’Okwu Chineke ma site n’ezi obi. Ọzọkwa, anyị kwesịrị ikpegara Jehova ekpere maka enyemaka ma jiri nlezianya mee ike anyị nile iji gbasoo ndụmọdụ Bible. Ọ dị anyị nnọọ mkpa ‘ịtụkwasị Jehova ihe O nyeworo anyị dị ka ibu’ mgbe anyị chere ọnwụnwa ma o bụ ihe isi ike ihu, n’ihi na ‘ọ ga-anagide anyị.’ N’ezie, “Ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya.”—Abụ Ọma 55:22.

“Ihe Nile Ka Jehova Kpụrụ n’Ihi Onwe Ya”

Olee uru ọzọ anyị ga-erite site n’ịtụrụ ọrụ anyị ruo Jehova ahụ́? Eze ahụ maara ihe kwuru, sị: “Ihe nile ka Jehova kpụrụ n’ihi onwe ya.” (Ilu 16:4a) Onye Okike nke eluigwe na ala bụ Chineke nke nwere nzube. Mgbe anyị tụụrụ ọrụ anyị ruo ya ahụ́, anyị ga-enwe ọtụtụ ọrụ ndị na-eme obi ụtọ ịrụ, anyị agakwaghị na-arụ ọrụ ndị na-abaghị uru ma ọ bụ ndị na-enweghị isi. Ihe Jehova zubekwara maka ụwa na mmadụ bi n’ime ya ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. (Ndị Efesọs 3:11) O kere ụwa “ka e wee biri n’ime ya.” (Aịsaịa 45:18) Ọzọkwa, nzube mbụ ya maka ụmụ mmadụ bi n’ụwa ga-emezurịrị. (Jenesis 1:28) Ndụ e ji jeere ezi Chineke ahụ ozi agaghị agwụ agwụ, ọ ga-enyekwa mmadụ obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.

Jehova kere “ọbụna onye na-emebi iwu na-arụrụ ụbọchị ihe ọjọọ ọrụ.” (Ilu 16:4b) O keghị ndị na-emebi iwu, n’ihi na “ihe zuru okè ka ọrụ Ya bụ.” (Deuterọnọmi 32:4) Ma, o kwere ka ha nọrọ ruo mgbe oge ya zuru imezu ihe o kpere n’ikpe n’isi ha. Dị ka ihe atụ, Jehova gwara Fero Ijipt, sị: “Ọ bụ n’ihi nke a ka M guzoworo gị, ka M wee mee ka ị hụ ike m, ka e wee kọọkwa akụkọ aha m n’ụwa nile.” (Ọpụpụ 9:16) Ihe Otiti Iri ahụ na mbibi e bibiri Fero na ndị agha ya n’Oké Osimiri Uhie bụ n’ezie ihe ndị na-echetara anyị mgbe nile na Chineke nwere ike na-enweghị atụ.

Jehova nwekwara ike ime ka ndị na-emebi iwu mezuo nzube ya n’amaghị ama. Ọbụ abụ kwuru, sị: “Ọnụma mmadụ ga-ekele Gị: Ị [Jehova] ga-eji ọnụma nile nke fọdụrụ kee n’úkwù.” (Abụ Ọma 76:10) Jehova nwere ike ikwe ka ndị iro ya wụsa ndị ohu ya ọnụma ha—ma, ọ bụ nanị iji dọọ ha aka ná ntị ma si otú ahụ zụọ ha. Chineke na-eme ka ọnụma ọ bụla karịrị nke ahụ dịkwasị ya onwe ya.

Ọ bụ ezie na Jehova na-enyere ndị ohu ya aka, oleekwanụ banyere ndị mpako ma ọ bụ ndị nganga? Eze Izrel kwuru, sị: “Ihe arụ n’anya Jehova ka onye ọ bụla bụ nke obi ya dị elu: site n’aka ruo aka, a gaghị agụ ya n’onye na-emeghị ihe ọjọọ.” (Ilu 16:5) Ndị ‘obi ha dị elu’ nwere ike ịgbakọta aka ọnụ iji nyere ibe ha aka, ma ha agaghị agbanahụ ntaramahụhụ. N’ihi ya, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịzụlite mmụọ nke ịdị umeala n’obi n’agbanyeghị otú anyị maruuru ihe, otú anyị si ruo eruo ime ihe ma ọ bụ ihe ùgwù ndị anyị nwere.

‘N’egwu Jehova’

Ebe ọ bụ na a mụrụ anyị ná mmehie, anyị nwere ike ime mmehie. (Ndị Rom 3:23; 5:12) Olee ihe ga-enyere anyị aka izere ime atụmatụ ndị ga-eme ka anyị tinye aka n’ihe ọjọọ? Ilu 16:6 na-ekwu, sị: “E ji ebere na eziokwu ekpuchi ajọ omume: ọ bụkwa egwu Jehova ka mmadụ ji esi n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya.” N’agbanyeghị na Jehova na-eji ebere na eziokwu ya ekpuchi mmehie anyị, ọ bụ egwu Jehova na-egbochi anyị ime mmehie. Lee ka o si dị ezigbo mkpa na anyị ga-azụlitekwa egwu nke imejọ Chineke n’agbanyeghị na anyị hụrụ ya n’anya ma na-ekele ya maka ebere ya!

Egwu Chineke na-abanye n’obi anyị mgbe anyị na-akwanyere Chineke ùgwù n’ihi ike dị ukwuu o nwere. Chee nnọọ echiche ike Chineke gosipụtara n’ihe ndị o kere eke! Ncheta e chetaara nna ochie ahụ bụ́ Job ihe ndị Chineke kere nyeere ya aka ịgbazi echiche ya. (Job 42:1-6) Mgbe anyị gụrụ akụkọ Bible ndị kwuru ụzọ Jehova si meso ndị ya ihe ma tụgharịa uche na ha, ọ̀ bụ na ha adịghị enyere anyị aka ịgbazi echiche anyị? Ọbụ abụ bụrụ, sị: “Jeenụ, hụ ọrụ nile nke Chineke; Onye dị egwu ka Ọ bụ n’omume Ya n’ebe ụmụ mmadụ nọ.” (Abụ Ọma 66:5) Anyị ekwesịghị iji ebere Jehova gwuo egwú. Mgbe ndị Izrel “nupụrụ isi, mee ka o wute Mmụọ Nsọ Ya: O wee chigharịa ghọọrọ ha onye iro, Ya onwe ya busoro ha agha.” (Aịsaịa 63:10) N’aka nke ọzọ, “mgbe ụzọ nile nke onye ọ bụla na-atọ Jehova ụtọ, ọ na-eme ọbụna ndị iro ya ka ha na ya dị n’udo.” (Ilu 16:7) Lee ka egwu Jehova si bụrụ ihe nchebe!

Eze ahụ maara ihe na-ekwu, sị: “Ọ dị mma inwe ihe nta n’ezi omume, karịa inwe ọtụtụ ihe omume ma ikpe ziri ezi adịghị ya.” (Ilu 16:8) Ilu 15:16 na-ekwu, sị: “Ọ dị mma inwe ihe nta n’egwu Jehova, karịa inwe ọtụtụ akụ̀ ma ọgbụgba aghara adị ya.” N’ezie, egwu Chineke dị mkpa iji nọgide na-eme ezi omume.

“Obi Mmadụ Na-eche Ụzọ Ya”

E kere mmadụ inwere onwe ya ime nhọrọ, nke bụ́ na o nwere ike ịhọrọ ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. (Deuterọnọmi 30:19, 20) Obi ihe atụ anyị nwere ike ịtụle ihe dị iche iche ma họrọ ilekwasị otu n’ime ha ma ọ bụ karịa anya. Solomọn gosiri na ime nhọrọ dị anyị n’aka, site n’ikwu, sị: “Obi mmadụ na-eche ụzọ ya.” Mgbe o mesịrị nke a, “Jehova na-eme ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Ilu 16:9) Ebe ọ bụ na Jehova pụrụ iduzi nzọụkwụ anyị, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịchọ enyemaka ya iji mee ka ‘atụmatụ anyị guzosie ike.’

Dị ka anyị kwurula, obi dị aghụghọ, ọ pụkwara ịghara anyị ụgha. Dị ka ihe atụ, mmadụ nwere ike ime mmehie, obi ya ana-agwakwa ya na ọ dịghị ihe ọjọọ o mere. Kama ịhapụ mmehie ya, onye ahụ nwere ike ịdị na-eche na Chineke nwere ịhụnanya, obiọma, bụrụ onye ebere, na onye na-agbaghara mmehie. Onye dị otú ahụ ekwuwo n’obi ya, sị: ‘Chineke echezọwo: O zobewo ihu Ya; ọ dịghị mgbe Ọ hụrụ m.’ (Abụ Ọma 10:11) Otú ọ dị, ọ dị ize ndụ ma bụrụ ihe na-ezighị ezi mmadụ iji n’ihi na Chineke bụ onye ebere na-eme ihe ọjọọ.

“Ihe Ọ̀tụ̀tụ̀ na Ihe Osìsì Ziri Ezi Dịịrị Jehova”

Solomọn hapụziri obi na omume mmadụ ma lekwasị anya na nke onye eze ma kwuo, sị: “Ọjụjụ ase dị n’egbugbere ọnụ abụọ nke eze: mgbe ọ na-ekpe ikpe ọnụ ya adịghị emekpu emekpu.” (Ilu 16:10) Nke a ga-abụ eziokwu n’ebe Eze Jizọs Kraịst ahụ nke nọkwasịrịla n’ocheeze nọ. Ọ ga-achị ụwa nile dị ka uche Chineke si dị.

Eze ahụ maara ihe gosiri ebe e si enweta ikpe ziri ezi na ezi omume mgbe o kwuru, sị: “Ihe ọ̀tụ̀tụ̀ na ihe osìsì ziri ezi dịịrị Jehova; ọrụ Ya ka nkume osìsì nile nke akpa bụ.” (Ilu 16:11) Ọ bụ Jehova na-enye ihe ọ̀tụ̀tụ̀ na ihe osìsì ziri ezi. Ọ dịghị n’aka eze inye ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ndị dị otú ahụ dị ka ọchịchọ ya si dị. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o kwuru, sị: “Apụghị m ime otu mkpụrụ ihe n’uche nke aka m; dị nnọọ ka m si anụ otú ahụ ka m si ekpe; ihe m na-ekpebi n’ikpe zikwara ezi, n’ihi na m na-achọ, ọ bụghị uche nke m, kama uche nke onye ahụ zitere m.” Anyị pụrụ ịtụ anya ikpe ziri nnọọ ezi n’aka Ọkpara ahụ, bụ́ onye Nna ahụ ‘nyefeworo ikpe ikpe nile n’aka.’—Jọn 5:22, 30.

Olee ihe ọzọ e nwere ike ịtụ anya ya n’aka eze nke na-anọchi anya Jehova? Eze Izrel ahụ kwuru, sị: “Ọ bụụrụ ndị eze ihe arụ ime mmebi iwu: n’ihi na ezi omume ka ocheeze ji eguzosi ike.” (Ilu 16:12) Alaeze Mezaịa ahụ ga-eji ụkpụrụ ezi omume Chineke na-achị. Ọ dịghị ihe jikọrọ ya na “ocheeze nke ihe ịla n’iyi nile.”—Abụ Ọma 94:20; Jọn 18:36; 1 Jọn 5:19.

Ime Ihe Na-atọ Eze Ụtọ

Olee ihe ndị nnukwu eze na-achị kwesịrị ịdị na-eme? Solomọn kwuru, sị: “Ihe na-atọ ndị eze ụtọ ka egbugbere ọnụ ezi omume bụ; ọ bụkwa onye na-ekwu ihe ziri ezi ka ha na-ahụ n’anya. Ọnụma eze bụ ndị ozi ọnwụ: ma onye maara ihe ga-ekpuchi ya.” (Ilu 16:13, 14) Ndị na-efe Jehova taa na-etinye okwu ndị a n’ọrụ ma na-arụsi ọrụ ike n’ikwusa Alaeze ahụ na ime ndị na-eso ụzọ. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Ha maara na iji egbugbere ọnụ ha eme ihe n’ụzọ dị otú a na-atọ Eze Mezaịa ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst, ụtọ. Ọ bụ nnọọ ihe amamihe dị na ya izere iwe nke nnukwu eze bụ́ mmadụ na ịchọ ime ihe na-atọ ya ụtọ. Lee ka o si bụrụ ihe amamihe dị na ya ime ihe na-atọ Eze Mezaịa ahụ ụtọ karị!

Solomọn gara n’ihu kwuo, sị: “N’ìhè ihu eze ka ndụ dị; mgbe ihe mmadụ na-atọ ya ụtọ, ọ dị ka igwe ojii nke mmiri ozuzo ikpeazụ.” (Ilu 16:15) ‘Ìhè ihu eze’ pụtara ihu ọma ya, ọbụna dị ka ‘ìhè ihu Jehova’ pụtara ihu ọma Chineke. (Abụ Ọma 44:3; 89:15) Dị nnọọ ka mmiri oruru na-egosi nnọọ na a ga-enwe mmiri ga-enyere mkpụrụ akụkụ aka ime nke ọma, ihu ọma eze bụ ihe àmà nke ihe ọma ndị gaje ịbịa. A ga-enwe nnọọ ngọzi bara ụba na ọganihu n’oge ọchịchị Eze Mezaịa ahụ, otú ahụ e si nwee ha n’ụzọ dị nta n’oge ọchịchị Eze Solomọn.—Abụ Ọma 72:1-17.

Ka anyị na-echere Alaeze Chineke ịchị ihe nile dị n’okpuru anyanwụ, ka anyị chọọ enyemaka ya iji mee ka obi anyị dị ọcha. Ka anyị tụkwasịkwa Jehova obi ma zụlite nsọpụrụ Chineke. Mgbe ahụ ka anyị pụrụ inwe obi ike zuru ezu na ‘atụmatụ anyị ga-eguzosi ike.’—Ilu 16:3.

[Foto dị na peeji nke 18]

Olee otú o si bụrụ na Jehova kere “onye na-emebi iwu na-arụrụ ụbọchị ihe ọjọọ ọrụ”?