Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Mere Ahụhụ Nile Ga-eji Kwụsị n’Isi Nso

Ihe Mere Ahụhụ Nile Ga-eji Kwụsị n’Isi Nso

Ihe Mere Ahụhụ Nile Ga-eji Kwụsị n’Isi Nso

“Oké nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ Ya bụ.”—DEUTERỌNỌMI 32:4.

1, 2. (a) Gịnị mere i ji were olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi kpọrọ ihe? (b) Olee ihe na-egbochi ọtụtụ ndị ikwere na Chineke, bụ́ onye kwere nkwa ndị magburu onwe ha maka ọdịnihu?

Ọ̀ NA-AMASỊ gị iche echiche otú ndụ ga-adị na Paradaịs? Ma eleghị anya ị na-eji anya nke uche gị ahụ onwe gị ebe ị na-aga ụwa a magburu onwe ya gburugburu ma na-amata ụdị ihe dị iche iche dị ndụ na ya. Ma ọ bụ ya abụrụ na ị na-eche banyere obi ụtọ ị ga-enwe ka gị na ndị ọzọ na-arụ ọrụ ilekọta ụwa ma nye aka ime ka akụkụ ya nile ghọọ Paradaịs. Ma ọ bụ gị ana-eche banyere nkà ndị i nwere ike inweta n’ise ihe osise, n’ịtụ ụkpụrụ ụlọ, n’ịgụ egwú ma ọ bụ n’ọrụ ndị ọzọ ndụ nke oge a jupụtara na gbalụ gbalụ na-enyeghị gị ohere ịmụta. Otú o sina dị, i ji olileanya nke ịdị ụdị ndụ Bible kpọrọ “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie”—bụ́ ndụ Jehova zubere ka anyị bie ruo mgbe ebighị ebi—kpọrọ ihe.—1 Timoti 6:19.

2 Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ na ihe ùgwù magburu onwe ya ịkọrọ ndị ọzọ banyere olileanya ahụ dabeere na Bible, ọ́ bụghị ya? Otú ọ dị, ọtụtụ ndị jụrụ olileanya dị otú ahụ. Ha na-ele ya anya dị ka nkwenkwe ụgha na nrọ nke ndị na-enweghị uche na-arọ. Ọ pụdịrị isiri ha ike ikwere na Chineke, bụ́ onye kwere nkwa ndụ ebighị ebi na Paradaịs. N’ihi gịnị? Ihe mekwaranụ ụfọdụ ekweghị ná nkwa Chineke bụ ihe ọjọọ jupụtara n’ụwa. Ha kweere na ọ bụrụ na Chineke dị, ma bụrụ onye pụrụ ime ihe nile na onye na-ahụ n’anya, ihe ọjọọ na ahụhụ ekwesịghị ịdị. Ha na-eche na Chineke ọ bụla kwere ka ihe ọjọọ dịrị bụ Chineke na-adịghị adị—ma ọ bụkwanụ ya bụrụ na ọ dị adị, ma ọ́ bụghị na ọ bụghị onye pụrụ ime ihe nile ya abụrụ na ọ naghị eche banyere anyị. Ụfọdụ ndị kwenyere na echiche a ziri ezi. Setan egosiwo n’ezie na ya bụ ọkà site n’ime ka uche ụmụ mmadụ kpuo ìsì.—2 Ndị Kọrint 4:4.

3. Olee ajụjụ tara akpụ anyị nwere ike inyere ndị mmadụ aka ịza, n’ihi gịnịkwa ka anyị ji nọrọ n’ọnọdụ pụrụ iche ime otú ahụ?

3 Dị ka Ndịàmà Jehova, anyị nọ n’ọnọdụ pụrụ iche inyere ndị Setan na amamihe ụwa duhierela aka. (1 Ndị Kọrint 1:20; 3:19) Anyị ghọtara ihe mere ọtụtụ ndị ji ghara ikwere ná nkwa ndị dị na Bible. Ihe kpatara ya bụ na ha amaghị Jehova. O nwere ike ịbụ na ha amaghị aha ya ma ọ bụ ihe ọ pụtara, o nwekwara ike ịbụ na ha amachaghị àgwà ya ma ọ bụ mara na ọ bụ onye na-emezu nkwa ya. Anyị nọ n’ọnọdụ magburu onwe ya inweta ihe ọmụma dị otú ahụ. Site n’oge ruo n’oge, anyị kwesịrị ịtụleghachi otú anyị nwere ike isi nyere ndị “nọ n’ọchịchịrị n’uche” aka inweta azịza nke otu n’ime ajụjụ ndị kasị taa akpụ ụmụ mmadụ na-ajụ, nke bụ́, “N’ihi gịnị ka Chineke ji kwere ka ihe ọjọọ na ahụhụ dịrị?” (Ndị Efesọs 4:18) Ka anyị burugodị ụzọ tụlee otú anyị ga-esi zaa ajụjụ ahụ nke ọma. E mesịa anyị atụlee otú Jehova si gosipụta àgwà ya n’ụzọ o si mee ihe banyere ihe ọjọọ.

Ịchọta Ụzọ Ziri Ezi Iji Zaa Ajụjụ Ahụ

4, 5. Olee ihe ọ dị mkpa ka anyị buru ụzọ mee mgbe mmadụ jụrụ anyị ihe mere Chineke ji kwere ka ahụhụ dịrị? Kọwaa.

4 Mgbe mmadụ jụrụ anyị ihe mere Chineke ji kwere ka ahụhụ dịrị, olee otú anyị ga-esi zaa ya ajụjụ a? Anyị nwere ike ịchọ ịkọwara onye ahụ ihe nile banyere ya ozugbo, malite n’ihe mere n’ogige Iden. Nke ahụ nwere ike ịdaba adaba mgbe ụfọdụ. Ma, anyị kwesịrị ịkpachara anya. O nwere ike ịdị mkpa ka anyị buru ụzọ tọọ ntọala tupu anyị azawa ajụjụ ahụ. (Ilu 25:11; Ndị Kọlọsi 4:6) Ka anyị tụlee ihe atọ pụrụ inyere anyị aka inyere mmadụ aka tupu anyị azawa ajụjụ ahụ.

5 Nke mbụ, ọ bụrụ na ihe kasị enye onye ahụ nsogbu n’obi bụ ihe ọjọọ jupụtara n’ụwa, o nwere ike ịbụ na ihe ọjọọ adabarala ya ma ọ bụ ndị ọ hụrụ n’anya. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ ihe amamihe dị na ya ibu ụzọ metere ya ebere. Pọl onyeozi dụrụ Ndị Kraịst ọdụ, sị: “Soronụ ndị na-akwa ákwá kwaa ákwá.” (Ndị Rom 12:15) Imetere onye ahụ ebere ma ọ bụ inwe “mmetụta maka onye ọzọ” n’ebe ọ nọ, nwere ike iru ya obi. (1 Pita 3:8) Ọ bụrụ na ọ ghọta na anyị na-eche banyere ya, o nwere ike ige ntị karị n’ihe anyị chọrọ ịgwa ya.

6, 7. Gịnị mere anyị kwesịrị iji jaa onye ji ezi obi jụọ ajụjụ dabeere na Bible nke na-enye ya nsogbu n’obi mma?

6 Nke abụọ, anyị nwere ike ịja onye a obi ya ziri ezi mma maka ịjụ ajụjụ a. Ụfọdụ na-eche na ebe ọ bụ na ajụjụ ndị dị otú ahụ na-enye ha nsogbu n’obi, na ọ pụtara na ha enweghị okwukwe ma ọ bụ nkwanye ùgwù n’ebe Chineke nọ. O nwedịrị ike ịbụ na ụkọchukwu gwara ha otú ahụ. Otú ọ dị, nke ahụ egosichaghị na ha enweghị okwukwe n’ebe Chineke nọ. A sị ka e kwuwe, ndị nwere okwukwe n’ebe Chineke nọ n’oge Bible jụkwara ajụjụ ndị yiri ha. Dị ka ihe atụ, ọbụ abụ bụ́ Devid jụrụ, sị: “Jehova, n’ihi gịnị ka Ị na-eguzo n’ebe dị anya? N’ihi gịnị ka Ị na-ezobe Onwe gị na mgbe nile nke mkpa?” (Abụ Ọma 10:1) N’otu aka ahụ, Habakuk onye amụma jụrụ, sị: “Jehova, ruo ole mgbe ka m ga na-etiku Gị, ma Ị dịghị anụ? m na-etiku Gị mkpu, sị, Ihe ike! ma Ị dịghị azọpụta. N’ihi gịnị ka Ị na-eme ka m hụ ajọ ihe? N’ihi gịnị ka Ị na-elegide mmegbu? ma ịpụnara mmadụ ihe ma ihe ike dị n’ihu m: ịlụ ọgụ wee dị, esemokwu na-ebulikwa onwe ya?”—Habakuk 1:2, 3.

7 Ndị a bụ ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị kwanyeere Chineke ùgwù miri emi. À baara ha mbà n’ihi ịjụ ajụjụ ndị dị otú ahụ na-enye nsogbu n’obi? Ọ dịghị ma ọlị, kama Jehova mere ka e dee ajụjụ ndị ahụ ha ji ezi obi jụọ edee n’Okwu ya. Taa, onye ihe ọjọọ jupụtara n’ụwa na-enye nsogbu n’obi nwere ike ịbụ n’ezie na agụụ okwu Chineke na-agụ ya—na ọ na-achọ azịza nke nanị Bible nwere ike inye. Cheta na Jizọs kwuru okwu ọma banyere ndị agụụ Okwu Chineke na-agụ, ma ọ bụ ndị “maara mkpa nke ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3) Lee ihe ùgwù ọ bụ inyere ndị dị otú ahụ aka inweta obi ụtọ ahụ Jizọs kwere ná nkwa!

8. Olee ozizi na-agbagwoju anya merela ka ndị mmadụ kwere na ọ bụ Chineke kpatara ahụhụ, oleekwa otú anyị nwere ike isi nyere ha aka?

8 Nke atọ, o nwere ike ịdị anyị mkpa inyere onye ahụ aka ịmara na mmebi iwu jupụtara n’ụwa taa esighị Chineke n’aka. A na-akụziri ọtụtụ ndị na ọ bụ Chineke na-achị ụwa a anyị bi na ya, na Chineke kpebiri ihe nile na-eme anyị ogologo oge gara aga, nakwa na ọ dị ihe dị omimi mere o ji na-ata ụmụ mmadụ ahụhụ. Ozizi ndị a bụ ụgha. Ha na-eme ka a ghara ịkwanyere Chineke ùgwù ma mee ka ndị mmadụ na-eche na ọ bụ ya kpatara mmebi iwu na ahụhụ dị n’ụwa. N’ihi ya, anyị nwere ike iji Okwu Chineke mee ka ihe ndị dị otú ahụ guzozie. (2 Timoti 3:16) Ọ bụghị Jehova na-achị ụwa a rụrụ arụ; ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu na-achị ya. (1 Jọn 5:19) Jehova akaghị ọdịnihu nke ndị o kere eke nwere ọgụgụ isi aka; ọ na-enye onye nke ọ bụla n’ime ha nnwere onwe na ohere ịhọrọ ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ, ihe ziri ezi ma ọ bụ ihe na-ezighị ezi. (Deuterọnọmi 30:19) Ọ bụtụghị Jehova kpatara mmebi iwu; ọ kpọrọ mmebi iwu asị ma na-eche banyere ndị na-ata ahụhụ n’ụzọ na-ezighị ezi.—Job 34:10; Ilu 6:16-19; 1 Pita 5:7.

9. Olee ngwá ọrụ ụfọdụ “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” wepụtarala iji nyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe mere Jehova Chineke ji kwere ka ahụhụ dịrị?

9 Mgbe ị tọsịrị ntọala dị otú ahụ, i nwere ike ịchọpụta na onye na-ege gị ntị dị njikere ịmụta ihe mere Chineke ji kwere ka ahụhụ dịgide. Iji nyere gị aka, “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” ewepụtawo ọtụtụ ngwá ọrụ. (Matiu 24:45-47) Dị ka ihe atụ, e wepụtara traktị bụ́ Ahụhụ Nile Ga-akwụsị n’Isi Nso ná Mgbakọ Distrikti “Irubere Chineke Isi” nke afọ 2005 banyere na 2006. Ọ bụrụ na e nwere traktị a n’asụsụ gị, mata ihe dị n’ime ya nke ọma. N’ụzọ yiri nke ahụ, e wepụtaara ajụjụ a dị mkpa otu isiokwu n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?, bụ́ nke e nwere ugbu a n’otu narị asụsụ na iri ise na asaa. Jiri ngwá ọrụ ndị dị otú ahụ mee ihe n’ụzọ zuru ezu. Ha kọwara nke ọma ihe ndị Akwụkwọ Nsọ kwuru kpatara ihe iseokwu nke ọbụbụeze eluigwe na ala e welitere n’Iden na ihe mere Jehova ji mee ihe ndị o mere banyere ya. Burukwa n’uche na ka ị na-akọwara onye na-ege gị ntị ihe a, ị na-ekpughere ya ihe ọmụma kasị mkpa e nwere. Ọ bụ ihe ọmụma banyere Jehova na àgwà ya ndị magburu onwe ha.

Lekwasị Anya n’Àgwà Jehova

10. Olee ihe mere o ji esiri ọtụtụ ndị ike ịghọta ihe mere Chineke ji kwere ka ahụhụ dịrị, oleekwa ihe ọmụma nwere ike inyere ha aka?

10 Ka ị na-enyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe mere Jehova ji kwere ka ụmụ mmadụ na-achị onwe ha n’okpuru ikike Setan, gbalịa ka ị dọrọ uche ha gaa n’àgwà Jehova ndị magburu onwe ha. Ọtụtụ mmadụ maara na Chineke dị ike; ha na-anụkarị ka ndị mmadụ na-akpọ ya Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. Ma, o nwere ike isiri ha ike ịghọta ihe mere o ji ghara iji ike ya dị ukwuu kwụsị ikpe na-ezighị ezi na ahụhụ ozugbo. O nwekwara ike ịbụ na ha aghọtaghị àgwà Jehova ndị ọzọ, dị ka ịdị nsọ ya, ikpe ziri ezi ya, amamihe na ịhụnanya ya. Jehova na-egosipụta àgwà ndị a n’ụzọ zuru okè na n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Nke a mere Bible ji na-ekwu, sị: “Ihe zuru okè ka ọrụ Ya bụ.” (Deuterọnọmi 32:4) Olee otú i nwere ike isi mee ka àgwà ndị a pụta ìhè mgbe ị na-aza ajụjụ ndị a na-ajụkarị n’isiokwu a? Ka anyị tụlee ihe atụ ole na ole.

11, 12. (a) Olee ihe mere Chineke na-agatụghị eji gbaghara Adam na Iv mmehie ha? (b) Gịnị mere Jehova ga-eji ghara ikwe ka mmehie dịgide ruo mgbe ebighị ebi?

11 Ihe Jehova gaara eme ọ̀ bụ ịgbaghara Adam na Iv? Ihe ọ gaara eme n’okwu a abụghị ịgbaghara ha. Dị ka ụmụ mmadụ zuru okè, Adam na Iv kpachaara anya jụ ọbụbụeze Jehova ma nabata nduzi Setan. Ọ bụ ya mere na ọ dịghị ihe ndị nnupụisi ahụ mere gosiri nchegharị. Otú ọ dị, mgbe ndị mmadụ jụrụ ihe mere Jehova ji ghara ịgbaghara ha, o nwere ike ịbụ na ihe ha na-ajụ n’ezie bụ ihe mere Jehova ji ghara iwedata ụkpụrụ ya ma leghara mmehie na nnupụisi anya. Azịza ya metụtara otu àgwà dị Jehova ezigbo mkpa—ya bụ ịdị nsọ ya.—Ọpụpụ 28:36; 39:30.

12 Bible mere ka ịdị nsọ Jehova pụta ìhè ọtụtụ narị ugboro. Ma, ọ dị mwute ikwu na ọ bụ nanị mmadụ ole na ole n’ụwa a rụrụ arụ ghọtara àgwà ahụ. Jehova dị ọcha ma bụrụ onye na-enweghị ihe jikọrọ ya na mmehie. (Aịsaịa 6:3; 59:2) A bịa n’ihe banyere mmehie, o meela ndokwa ihe ọ ga-eji kpuchie ya, wepụ ya kpamkpam, ma ọ gaghị ekwe ka ọ dịgide ruo mgbe ebighị ebi. A sị na Jehova dị njikere ikwe ka mmehie dịrị ruo mgbe ebighị ebi, anyị agaraghị enwe olileanya maka ọdịnihu. (Ilu 14:12) N’oge nke ya, Jehova ga-eme ka ihe nile o kere eke dịghachi nsọ. Nke ahụ ga-emerịrị, n’ihi na ọ bụ uche nke Onye Nsọ ahụ.

13, 14. N’ihi gịnị ka Jehova ji ghara ibibi ndị nnupụisi ahụ n’Iden?

13 Jehova ọ̀ gaara nnọọ ebibi ndị nnupụisi ahụ n’Iden ma malite n’isi? O doro anya na o nwere ike ọ ga-eji mee otú ahụ; ọ ga-eji ike ahụ mee ihe n’isi nso iji bibie ndị ajọ omume nile. Ụfọdụ nwere ike ịdị na-eche, sị, ‘Olee ihe mere o ji ghara ime ya mgbe e nwere nanị ndị mmehie atọ n’eluigwe na ụwa? Nke ahụ ọ́ garaghị egbochi mgbasa nke mmehie—na ahụhụ nile anyị na-ahụ n’ụwa taa?’ Gịnị mere Jehova ji ghara ime nke ahụ? Deuterọnọmi 32:4 na-ekwu, sị: “Ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi.” Jehova anaghị eji ikpe ziri ezi egwuri egwú. N’ezie, “Jehova na-ahụ ezi ikpe n’anya.” (Abụ Ọma 37:28) N’ihi otú Jehova si hụ ikpe ziri ezi n’anya, ọ jụrụ ikpochapụ ndị nnupụisi ahụ n’Iden. N’ihi gịnị?

14 Nnupụisi Setan mara oruru o ruuru Chineke ịbụ eze aka. Ụzọ Jehova si ele ikpe ziri ezi anya chọrọ ka ọ zaghachị Setan aka ahụ ọ mara Ya dabere n’ikpe ziri ezi. Igbu ndị nnupụisi ahụ ozugbo, ọ bụ ezie na ọ bụ ihe kwesịịrị ha, agaghị enye azịza dị otú ahụ. Ọ gaara egosikwu na ọ dịghị onye ya na Jehova ha n’ike, ma ihe a mara aka abụghị ike Jehova. Ọzọkwa, Jehova agwawo Adam na Iv nzube ya. Ha ga-amụ ụmụ, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe ha, ma mee ka ihe nile e kere eke dị n’ụwa nọrọ n’okpuru ha. (Jenesis 1:28) Ọ bụrụ na Jehova gburu Adam na Iv ozugbo, nzube ya o kwupụtara banyere ụmụ mmadụ gaara abụ okwu na-abaghị uru. Ikpe ziri ezi Jehova adịtụghị mgbe ọ ga-ekwe ka ihe dị otú ahụ mee, n’ihi na nzube ya na-emezu mgbe nile.—Aịsaịa 55:10, 11.

15, 16. Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị mmadụ aka mgbe ha kwuru ihe ha chere gaara abụ “ihe ngwọta” nke ihe ịma aka ahụ bilitere n’Iden?

15 Ọ̀ dị onye ọ bụla nọ n’eluigwe na ụwa nke maara otú a ga-esi merie nnupụisi ahụ bilitere n’Iden karịa Jehova? Ụfọdụ nwere ike ikwu ihe ha chere gaara abụ “ihe ngwọta” nke nnupụisi ahụ e nwere n’Iden. Ma, ime otú ahụ ọ́ naghị egosi na ha chere na ha maara otú a ga-esi dozie nsogbu ahụ karịa Chineke? O nwere ike ịbụ na ha ebughị ihe ọjọọ n’obi kwuo otú ahụ, ma ihe ọ na-egosi bụ na ha aghọtaghị onye Jehova bụ na amamihe dị ukwuu o nwere. Mgbe Pọl onyeozi na-edegara Ndị Kraịst nọ na Rom akwụkwọ, o nyobara nnọọ anya n’amamihe Chineke, gụnyere “ihe nzuzo dị nsọ” banyere nzube Jehova nke iji Alaeze Mezaịa ahụ gbapụta ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi na ido aha nsọ Ya nsọ. Olee otú obi dị Pọl n’ihe banyere amamihe nke Chineke, bụ́ onye wepụtara nzube a? Onyeozi ahụ ji okwu ndị a mechie akwụkwọ ozi ya: “Ka Chineke, onye nanị ya maara ihe, bụrụ onye otuto dịịrị ruo mgbe ebighị ebi site na Jizọs Kraịst. Amen.”—Ndị Rom 11:25; 16:25-27.

16 Pọl ghọtara na “nanị [Jehova] maara ihe”—ọ bụ n’ebe ọ nọ ka amamihe ruru gwụ n’eluigwe na ụwa. Ọ̀ dị onye n’etiti ụmụ mmadụ na-ezughị okè nwere ike ichepụta ụzọ ka mfe a ga-eji dozie nsogbu ọ bụla—ma ya fọdụkwa ichepụta ihe ga-abụ ihe ngwọta nke aka ahụ Setan mara oruru o ruuru Chineke ịbụ eze? N’ihi ya, ọ dị anyị mkpa inyere ndị mmadụ aka ịkwanyere Chineke nke “nwere obi nke maara ihe” ụdị ùgwù anyị na-akwanyere ya. (Job 9:4) Ka anyị na-aghọtakwu amamihe Jehova, otú ahụ ka obi ga na-esikwu anyị ike na ọ bụ ụzọ o si eme ihe kasị mma.—Ilu 3:5, 6.

Ịghọta Ọrụ Àgwà Bụ́ Isi E Ji Mara Jehova Na-arụ

17. Olee otú ịghọtakwu ịhụnanya Jehova ga-esi nyere ndị ihe mere Chineke ji kwere ka ahụhụ dịrị na-enye nsogbu n’obi, aka?

17 “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Bible ji okwu ndị ahụ dị ịrịba ama gosi àgwà bụ́ isi e ji mara Jehova, bụ́ àgwà nke kasị adọrọ mmasị n’àgwà ya nile na nke kasị akasi ndị ihe ọjọọ jupụtara ebe nile na-enye nsogbu n’obi obi. Jehova egosiwo ịhụnanya n’ụzọ nile o si mee ihe banyere aka ọjọọ mmehie kpara ihe o kere eke. Ọ bụ ịhụnanya kpaliri Jehova inye ụmụ Adam na Iv na-emehie emehie olileanya. (Jenesis 3:15) Chineke kwere ka ha na-ekpegara ya ekpere ma mee ka o kwe omume ha na ya ịdị ná mma. Ịhụnanya kpalikwara Chineke inye ihe mgbapụta nke ọ ga-eji gbaghara mmehie n’ụzọ zuru ezu, ma weghachi ndụ ebighị ebi n’izu okè. (Jọn 3:16) Ọ bụkwa ịhụnanya kpaliri ya inwe ndidi n’ebe ụmụ mmadụ nọ, na-enye ndị nile ọ ga-ekwe mee ohere ịjụ Setan na ịhọrọ Jehova dị ka Eze ha.—2 Pita 3:9.

18. Olee ihe ọmụma dị mkpa anyị nwere, oleekwa ihe anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

18 Mgbe otu pastọ na-agwa ìgwè mmadụ zukọtara ọnụ iji cheta otu mkpamkpa ndị na-eyi ọha egwu kpara, o kwuru, sị: “Anyị amaghị ihe mere Chineke ji kwere ka ihe ọjọọ na ahụhụ dịgide.” Lee ihe mwute nke ahụ bụ! Ọ̀ bụ na obi adịghị anyị ụtọ na anyị maara ihe mere Chineke ji kwere ka ihe ọjọọ na ahụhụ dịrị? (Deuterọnọmi 29:29) Ma ebe ọ bụ na Jehova bụ onye maara ihe, onye na-ekpe ikpe ziri ezi, na onye nwere ịhụnanya, anyị maara na ọ ga-akwụsị ahụhụ nile n’isi nso. Nke bụ́ eziokwu bụ na o kwela nkwa ime otú ahụ. (Mkpughe 21:3, 4) È nwere olileanya dịnụ maka ndị nile nwụrụ kemgbe ọtụtụ narị afọ gara aga? Ụzọ Jehova si mee ihe banyere aka ahụ a mara ya n’Iden, ò mere ka ha ghara inwe olileanya? Ee e. Ọ bụ ịhụnanya kpaliri ya ime ka ha nweekwa olileanya site ná mbilite n’ọnwụ. Nke ahụ bụ ihe isiokwu na-esonụ ga-atụle.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee ihe anyị ga-aza onye jụrụ anyị ihe mere Chineke ji kwere ka ahụhụ dịrị?

• Olee otú ịdị nsọ Jehova na ikpe ziri ezi ya si pụta ìhè n’ụzọ o si mee ihe banyere ndị ahụ nupụụrụ ya isi n’Iden?

• Gịnị mere anyị kwesịrị iji nyere ndị mmadụ aka ịghọtakwu ịhụnanya Jehova?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 21]

Gbalịa inyere ndị ahụhụ dị n’ụwa na-enye nsogbu n’obi aka

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Devid na Habakuk bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ji ezi obi jụọ Chineke ajụjụ