Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inweta Olileanya n’Ụwa nke Nsogbu Jupụtara

Inweta Olileanya n’Ụwa nke Nsogbu Jupụtara

Inweta Olileanya n’Ụwa nke Nsogbu Jupụtara

“NDỊ nkịtị nweziri ike imere ọhaneze ihe ọma na idozi obere nsogbu dị iche iche karịa mgbe ọ bụla ọzọ n’akụkọ nke ụmụ mmadụ.” Onye bụ́bu president America bụ́ Bill Clinton kwuru nke ahụ mgbe ọ na-ekwu okwu n’otu nzukọ e nwere n’Ottawa, Canada, na March 2006. O kwuru na ndị mmadụ emewekwuorola ibe ha ihe ọma kemgbe ala ọma jijiji ahụ mere n’oké osimiri n’afọ 2004 gasịrị ma jiri obi ike kwuo na ‘ndị bi n’ụwa dabeere n’ibe ha ugbu a karịa ka ọ dịtụrụla.’

Ànyị pụrụ ịtụ anya ka ọdachi ndị na-emere onwe ha kpalie ndị mmadụ n’ebe nile ịrụ ọrụ iji weta ọdịnihu ka mma? Ndị mmadụ ‘ịdabere n’ibe ha ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ’ ò kwesịrị ime ka anyị nwee olileanya na a ga-enwe ezi udo na nchebe na-adịgide adịgide n’ọdịnihu?

Onye Na-enye Ezi Olileanya

Akụkọ nke ụmụ mmadụ kemgbe puku afọ isii gosiri na ụmụ mmadụ anaghị ekwesịkarị ntụkwasị obi nye ibe ha. N’ihi ya, Akwụkwọ Nsọ sitere n’ike mmụọ nsọ nwere ezigbo ihe mere o ji dụọ anyị ọdụ, sị: “Unu atụkwasịla obi n’ahụ́ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ́ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere.” (Abụ Ọma 146:3) Nanị ihe inwe olileanya n’òtù dị iche iche nke ụwa a, n’ihe onwunwe ya, na n’ebumnobi ya ga-eme bụ iduga anyị n’inwe obi nkoropụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na “ụwa na-agabiga, otú ahụkwa ka ọ dị ọchịchọ ya.”—1 Jọn 2:17.

N’agbanyeghị nke ahụ, ndị ezi omume atụkwasịwo Chineke obi ha nile kemgbe ụwa n’ihi na ọ bụ onye na-ekwesị ntụkwasị obi. Bible kpọrọ Chineke “olileanya Izrel [oge ochie]” na “olileanya nke ndị bụ́ nna [Izrel],” o jikwa ọtụtụ okwu ndị ọzọ na-egosi olileanya, ntụkwasị obi, na obi ike n’ebe ọ nọ mee ihe. (Jeremaịa 14:8; 17:13; 50:7) N’ezie, Akwụkwọ Nsọ na-agba anyị ume ka anyị “na-ele anya Jehova.”—Abụ Ọma 27:14.

Ilu 3:5, 6 na-agba anyị ume, sị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.” I nwere ezigbo ihe mere ị ga-eji nwee nnọọ obi ike ná nkwa dị otú ahụ n’ihi na Jehova Chineke adịghị agbanwe agbanwe, ọ bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi, nakwa onye na-emezu okwu ya mgbe nile. (Malakaị 3:6; Jems 1:17) Ọ na-achọ ihe ga-akasị abara gị uru, ọ bụrụkwa na ị na-aṅa ntị mgbe nile n’ihe e kwuru n’Okwu ya, bụ́ Bible, ọ ga-echebe gị n’oge ndị a na-emenye egwu.—Aịsaịa 48:17, 18.

Onye ji obi ya nile na-agbaso nduzi Chineke pụrụ ịdabere ná nkwa a, bụ́: “Atụla egwu, gị ka M nọnyeere: elela anya gburugburu n’ụjọ, n’ihi na Mụ onwe m bụ Chineke gị: M ga-agba gị ume; ee, M ga-enyere gị aka; ee, M ga-eji aka nri nke ezi omume m kwagide gị.” (Aịsaịa 41:10) Ikpesi ekpere ike na ịtụgharị uche n’okwu a na-emesi obi ike na-akasi ndị nile ji obi ha hụ Jehova Chineke n’anya obi, n’ihi na ọ na-enyere ha aka idi ọnọdụ ndị siri ike na ịnagide nchegbu dị iche iche.

Tụlee ọnọdụ Andrea, bụ́ nwanyị bụ́ Onyeàmà Jehova nke ji ụmụ abụọ. O kwuru, sị: “Mgbe ihe ọjọọ ndị m na-atụghị anya ha dakwasịrị m, ọ bụ nanị ikpe ekpere na ịtụgharị uche ná nkwa ndị Jehova kwere na-eme ka m nwetaghachi onwe m. Ọ bụrụ na Jehova abụụrụ m onye na-adịghị agbanwe agbanwe, ọ ga-akara m nnọọ mfe ịnagide ọnọdụ ndị m na-atụghị anya ha.”

Mee Ka Olileanya I Nwere na Jehova Sie Ike

Mgbe otu onye ọbụ abụ na-ekwu banyere ihe mere o ji dị mkpa ịtụkwasị Jehova obi, o kwuru, sị: “Udo nke hiri nne ka ndị na-ahụ iwu Gị n’anya nwere; ọ dịghịkwa ihe ịsụ ngọngọ ha nwere.” (Abụ Ọma 119:165) Ọ bụrụ na i jiri obi gị nile na-amụ Okwu Chineke, ọ ga-eme nnọọ ka uche na obi gị jupụta ‘n’ihe ndị bụ́ eziokwu, kwesịrị nchebara echiche, bụ́ ezi omume, dị ọcha, na-akpali ịhụnanya, a na-ekwu okwu ọma banyere ha, bụ́ omume ọma, na ndị kwesịrị otuto’ bụ́ ndị ga-ewuli okwukwe gị elu. Ọ bụrụ na i jiri obi gị nile mee mgbalị iji nụrụ, mụọ, nabata, ma mee ihe ndị dị otú ahụ, “Chineke nke udo ga-anọnyekwara [gị].”—Ndị Filipaị 4:8, 9.

Mgbe John na-ekwu ihe ọ mụtarala site n’ihe ndị meworo ya kemgbe ọtụtụ iri afọ, o kwuru, sị: “Tupu m gbanwee otú m si ele ọdịnihu anya, amụtara m na aghaghị m ịgbanwe ọtụtụ ihe n’àgwà m na echiche m tupu m nwee olileanya mụ na Chineke zuru okè nke a na-adịghị ahụ anya ịdị ná mma. Nanị ụzọ m ga-esi mee nke ahụ bụ ịmụta iji ihe ndị metụtara Chineke akpọrọ ihe. Nke ahụ gụnyere ịmalite ime uche Chineke, na-ele ihe anya otú Chineke si ele ha site n’ịgụ Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ na ịtụgharị uche na ya.”

Ọ bụrụ na ị na-agụ eziokwu ndị na-eme ka ahụ́ ruo mmadụ ala, ndị na-enyekwa ndụ bụ́ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ e dere n’ike mmụọ nsọ, ị ga na-enweta ihe ọmụma dị irè ga-enyere gị aka ịnagide ọtụtụ ihe ọjọọ ndị a na-anụ n’usoro mgbasa ozi kwa ụbọchị. Ime ihe ndị dị na Bible eme pụkwara ime ka ịhụnanya dị n’ezinụlọ gị sikwuo ike ma nye aka mee ka nchegbu gị belata. Ọzọkwa, Chineke na-ekwe nkwa na ya dị njikere “igosi Onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe Ọ nọ.” (2 Ihe E Mere 16:9) Ọ ga-edozi nsogbu nile nke na ọ dịtụghị ihe ọ bụla mere ị ga-eji tụọ egwu.

Phinehas, bụ́ onye ji anya ya hụ agha na ogbugbu nke ìgwè mmadụ kwuru, sị: “Amụtala m itinye ndụ m n’aka Jehova, bụ́ onye na-eche banyere anyị. Ịgbaso ụkpụrụ Bible enyerela m aka izere ọtụtụ nsogbu.” Ọ bụrụ na ị tụkwasịrị Jehova Chineke obi n’ezie, ọ pụrụ inyere gị aka ịnagide ụdị nsogbu ọ bụla. (Abụ Ọma 18:29) Obere nwa nke ya na ndị mụrụ ya na-emekọrịta ihe nke ọma na-atụkwasị ha obi nke ukwuu ma nwee obi ike n’otú ha si elekọta ya ọbụnadị mgbe ọ na-arịa ọrịa ma ọ bụ nọrọ ná nsogbu. Ọ pụkwara ịdị gị otú ahụ ma ọ bụrụ na i mee mgbalị ma nabata oku a na-akpọ gị ile anya Jehova.—Abụ Ọma 37:34.

Ihe Ga-eme Nnọọ Ka Anyị Nwee Olileanya

Jizọs Kraịst gwara ụmụazụ ya, sị: “Kpeenụ ekpere otú a: ‘Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.’” (Matiu 6:9, 10) Alaeze eluigwe—nke bụ́ ọchịchị nke dị n’aka Jizọs Kraịst—bụ ngwá ọrụ Chineke ga-eji gosi na ọ bụ Ya ka o ruuru ịchị ụwa.—Abụ Ọma 2:7-12; Daniel 7:13, 14.

Ọtụtụ ihe ndị na-emenye egwu bụ́ ndị na-emetụta mmadụ nile taa na-egosi nnọọ na enyemaka Chineke dị anyị mkpa. Ọ bụ ihe obi ụtọ na enyemaka ahụ dị nso! Ugbu a Chineke chirila Jizọs Kraịst Eze Mezaịa, e nyewo ya ikike iwepụ ọbụbụeze Jehova n’ụta na ido aha Ya nsọ. (Matiu 28:18) N’oge na-adịghị anya, ọchịchị Alaeze ahụ ga-erute n’ụwa iji bibie ihe nile na-eyi egwu ma na-akpata nchegbu. Aịsaịa 9:6 kọwara ihe ndị na-egosi na Jizọs ruru eru ịbụ Onye Ọchịchị nke pụrụ ime ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’egwu. Dị ka ihe atụ, a kpọrọ ya “Nna Nke bụ́ Nna mgbe nile ebighị ebi,” “Onye ndụmọdụ,” na “Onyeisi Udo.”

Ka anyị tụlee okwu ahụ na-emetụ n’ahụ́, bụ́ “Nna Nke bụ́ Nna mgbe nile ebighị ebi.” N’ihi ọkwá ahụ Jizọs nọ na ya, o nwere ikike—nakwa ọchịchọ—ime ka ụmụ mmadụ na-erube isi nweta ndụ ebighị ebi n’elu ala dabere n’uru nke àjà mgbapụta ya. Nke a pụtara na a ga-atọhapụ ha n’ikpeazụ ná mmehie na ezughị okè ha ketara n’aka nwoke mbụ mere mmehie, bụ́ Adam. (Matiu 20:28; Ndị Rom 5:12; 6:23) Kraịst ga-ejikwa ikike Chineke nyere ya kpọlite ọtụtụ ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.—Jọn 11:25, 26.

Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o gosiri na ya bụ “Onye ndụmọdụ.” N’ihi otú Jizọs si mara Okwu Chineke na ụmụ mmadụ nke ọma, ọ maara otú e si edozi nsogbu ndị a na-enwe kwa ụbọchị. Kemgbe e chiri Kraịst eze n’eluigwe, ọ nọgidere na-abụ “Onye ndụmọdụ,” na-eje ozi dị ka onye bụ́ isi Jehova si n’aka ya na-agwa ụmụ mmadụ okwu. Ndụmọdụ Jizọs, bụ́ ndị e dekọrọ na Bible, na-egosi amamihe mgbe nile, ọ dịghịkwa nke ọ bụla n’ime ha gbara ọrụ. Ịmara na ikwere nke a pụrụ iduga gị ná ndụ nke inwe olileanya na nke atụghị oké egwu.

Aịsaịa 9:6 kọwakwara Jizọs dị ka “Onyeisi Udo.” Dị ka Onyeisi Udo, Kraịst ga-eji ike ya wepụ ahaghị nhata nile n’isi nso—n’ihe ndị metụtara ọchịchị, ọha mmadụ, na akụnụba. Olee otú ọ ga-esi mee nke a? Ọ bụ site n’ime ka ụmụ mmadụ nọrọ n’okpuru otu ọchịchị udo nke Alaeze Mezaịa ahụ.—Daniel 2:44.

N’oge ọchịchị Alaeze ahụ, udo ga-adịgide adịgide ga-ezu ụwa ọnụ. Olee ihe mere obi ji sie gị ike na nke a ga-eme? E kpughere ihe mere obi ji sie anyị ike n’Aịsaịa 11:9, bụ́ ebe anyị na-agụ, sị: “Ha [ndị Alaeze ahụ ga-achị] agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.” N’ikpeazụ, mmadụ nile nọ n’ụwa ga-enweta ezi ihe ọmụma banyere Chineke ma na-erubere ya isi. Ihe ndị ahụ gaje imenụ ọ̀ na-eme gị obi ụtọ? Ọ bụrụ na ọ na-eme gị, egbula oge n’inweta “ihe ọmụma Jehova” nke dị oké ọnụ ahịa.

Ị pụrụ irite uru n’ihe ọmụma Chineke nke na-ewuli okwukwe elu na nke na-enye ndụ site n’ịtụle ihe Bible na-akụzi n’ezie banyere ihe ndị na-eme n’oge anyị a na banyere ọdịnihu dị mma e kwere nkwa ya na Bible. N’ihi ya, anyị na-agba gị ume ka ị nakwere ọmụmụ Bible Ndịàmà Jehova na-eduzi n’efu n’ógbè gị. Nke a bụ ụzọ ị ga-esi kwụsị ịtụ egwu ma nwee ezigbo olileanya n’ụwa a nsogbu jupụtara.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ihe Mere Ọchịchị Alaeze ahụ Ji Eme Ka Anyị Nwee Olileanya

Ebe Jizọs Kraịst bụ Eze nke Alaeze Chineke, e nyewo ya ikike ịchị eluigwe na ụwa. (Matiu 28:18) Ọ ga-eme ka ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ dịghachi ná mma, meekwa ka ha kwụsị ibibi mbara ụwa. Ọ ga-ewepụkwa ọrịa. Ọrụ ndị dị ike Jizọs rụrụ n’ụwa bụ ihe atụ nke ngọzi bara ụba karị a ga-enweta n’oge ọ ga-achị dị ka Eze zuru okè na nke a pụrụ ịtụkwasị obi. Olee àgwà Eze Mezaịa a ndị kasị masị gị n’ime àgwà ya ndị e depụtara n’okpuru ebe a?

Ọ bụ onye ọ na-adịrị ndị mmadụ mfe ịgakwuru.Mak 10:13-16.

Ọ bụ onye nwere ezi uche na onye na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu.Mak 10:35-45.

Ọ bụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi na onye na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị.Matiu 4:5-7; Luk 6:19.

Ọ bụ onye ezi omume na onye na-ekpe ikpe ziri ezi.Aịsaịa 11:3-5; Jọn 5:30; 8:16.

Ọ bụ onye na-echebara ndị ọzọ echiche, na onye dị obi umeala.Jọn 13:3-15.

[Foto dị na peeji nke 4]

Ịgụ Bible na ịtụgharị uche na ya pụrụ ime ka anyị nwee olileanya na Jehova