Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jefta Mezuru Nkwa O Kwere Jehova

Jefta Mezuru Nkwa O Kwere Jehova

Jefta Mezuru Nkwa O Kwere Jehova

OTU dike nwere mmeri lọghachiri ka ọ napụtasịrị mba ya n’aka ndị na-akpagbu ha. Ada ya gbapụtara izute ya, jiri obi ụtọ na-ayọ ọsa ma gbara egwú na-abịakwute ya. Mgbe ọ hụrụ ada ya, kama ịṅụrị ọṅụ, ọ dọwara uwe ya. N’ihi gịnị? Obi ọ́ dịghị ya mma otú ahụ ọ dị ada ya nwanyị na ọ lọtara n’udo? Olee agha o meriri na ya? Onye bụ dike a?

Nwoke ahụ bụ Jefta, otu n’ime ndị ikpe e nwere n’Izrel oge ochie. Ma iji zaa ajụjụ ndị nke ọzọ ma ghọta uru akụkọ ahụ baara anyị, ọ dị anyị mkpa ịtụle ihe mere tupu nzute a pụrụ iche.

Nsogbu E Nwere n’Izrel

Jefta dịrị ndụ n’oge e nwere nsogbu n’Izrel. Ndị Izrel ibe ya jụrụ ofufe dị ọcha ma na-efe chi ndị Saịdọn, Moab, Amọn, na nke ndị Filistia. N’ihi ya, Jehova raara ndị ya nye n’aka ndị Amọn na ndị Filistia, ha kpagburu ha ruo afọ 18. Ndị a kasị kpagbuo bụ ndị bi na Gilied, bụ́ obodo dị n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Jọdan. * N’ikpeazụ, ndị Izrel bịara ghọta onwe ha, chegharịa ma chọọ enyemaka Jehova, malite ife ya, ma wepụsịa chi ala ọzọ ndị ahụ n’etiti ha.—Ndị Ikpe 10:6-16.

Ndị Amọn mara ụlọikwuu ha na Gilied, ndị Izrel zukọtakwara ibuso ha agha. Ma ndị Izrel enweghị ọchịagha. (Ndị Ikpe 10:17, 18) Ka ọ dị mgbe ahụ, Jefta nwere nsogbu nke ya. Ndị nwoke nna ji ha na ya bụ́ ndị anyaukwu chụpụrụ ya n’ụlọ iji nwee ike izuru ihe ndị o ketara. N’ihi ya Jefta kwagara Tob, bụ́ ógbè dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Gilied ma nọrọ ebe ndị iro Izrel ga na-ahụ ya. “Ndị ikom efu,” ndị bụ́ ma eleghị anya ndị ndị na-emegide Izrel napụrụ ọrụ ha ma ọ bụ ndị nupụụrụ ndị mmegide ahụ isi, bịakwutere Jefta. Ha “soro ya pụọ,” bụ́ nke nwere ike ịpụta na ha na-eso Jefta ka ọ na-awakpo ndị agbata obi ha ahụ nwere obi ọjọọ. Akwụkwọ Nsọ kpọrọ Jefta “dike nke bụ́ dimkpa,” ma eleghị anya n’ihi ike dị ukwuu na obi ike o nwere n’ịlụ agha. (Ndị Ikpe 11:1-3) Oleezi onye ga-edu ụmụ Izrel gaa lụso ndị Amọn agha?

“Bịa, Bụụrụ Anyị Onye Ọchịagha”

Ndị okenye Gilied gbara Jefta ume, sị: “Bịa, bụụrụ anyị onye ọchịagha.” Ọ bụrụ na ha chere na ọ ga-awụliwe elu na ọ hụla ohere ọ ga-eji laghachi n’ala nna ya, ha hiere ụzọ. Ọ zara ha, sị: “Ùnu onwe unu akpọghị m asị, chụpụkwa m n’ụlọ nna m? ma gịnị mere unu bịakwuteworo m ugbu a mgbe unu nọ ná mkpagbu?” Lee otú o si bụrụ ikpe na-ezighị ezi na ha buru ụzọ jụ Jefta ma mesịa bịakwute ya ka o nyere ha aka!—Ndị Ikpe 11:4-7.

Ọ bụ nanị otu ihe ga-eme ka Jefta bụrụ onye ndú na Gilied. O kwuru, sị: ‘Ọ bụrụ na Jehova arara ndị Amọn nye m, m ga-aghọrọ unu onyeisi!’ Ọ bụrụ na Jefta emerie, nke ahụ ga-egosi na Chineke nọnyeere ya, ma Jefta chọkwara ijide n’aka na ndị ahụ agaghị agbahapụ Chineke dị ka onye ọchịchị ha ozugbo nsogbu ahụ gasịrị.—Ndị Ikpe 11:8-11.

Otú O Si Mesoo Ndị Amọn Ihe

Jefta gara ka ya na ndị Amọn mee udo. O zigaara eze ha ndị ozi iji mara ihe na-ewe ndị Amọn iwe. Eze ndị Amọn boro ndị Izrel ebubo n’azịza o nyere Jefta, nke bụ́: Mgbe ndị Izrel si n’Ijipt pụta, ha weere ala ndị Amọn, ha kwesịkwara iweghachi ya.—Ndị Ikpe 11:12, 13.

Ebe Jefta maara akụkọ banyere ụmụ Izrel nke ọma, Jefta ji akọ gwa ndị Amọn na ebubo ahụ bụ ụgha. Ọ gwara ha na ndị Izrel enyeghị ndị Amọn, Moab, ma ọ bụ ndị Idọm nsogbu mgbe ha pụtara n’Ijipt; gwakwa ha na ọ bụghị ndị Amọn nwe ala ahụ na-ese okwu n’oge Ọpụpụ ndị Izrel. Ọ bụ ndị Amọraịt nwe ya, ma Chineke mere ka ndị Izrel merie eze ha bụ́ Saịhọn. Ọzọkwa, ndị Izrel ebiela n’ebe ahụ ruo narị afọ atọ. Oleezi ihe mere o ji bụrụ ugbu a ka ndị Amọn ji bịa zọwa ya?—Ndị Ikpe 11:14-22, 26.

Jefta lekwasịkwara anya n’ihe bụ́ isi kpatara nsogbu nile ndị Izrel na-enwe, nke bụ́: Ònye bụ ezi Chineke? Ọ̀ bụ Jehova ka ọ̀ bụ chị ndị dị n’ala ahụ ụmụ Izrel bi na ya? Ọ bụrụ na Kemọsh nwere ikike n’ezie, ọ́ gaghị eji ya mee ka a ghara ịnara ndị na-efe ya ala ha? Nke a bụ ihe ịma aka n’etiti okpukpe ụgha, bụ́ nke ndị Amọn na-akwado, na ezi okpukpe. N’ihi ya, Jefta kwubiri n’ụzọ kwesịrị ekwesị, sị: “Jehova, bụ́ Onyeikpe, ga-ekpe ikpe taa n’etiti ụmụ Izrel na ụmụ Amọn.”—Ndị Ikpe 11:23-27.

Eze Amọn egeghị ntị n’ozi Jefta ji obi ike zie ya. “Mmụọ nke Jehova wee dịkwasị Jefta, o wee gabiga Gilied na Manase,” eleghị anya na-akpọ ndị dimkpa ka ha bịa lụọ agha.—Ndị Ikpe 11:28, 29.

Nkwa Jefta

Ebe ọ bụ na Jefta chọsiri ike ka Chineke duzie ya, o kwere Ya nkwa, sị: “Ọ bụrụ na I nye ụmụ Amọn n’aka m n’ezie, ọ ga-erukwa, na ihe ọ bụla nke ga-esi n’ọnụ ụzọ ụlọ m pụta izute m, mgbe m siri n’ụmụ Amọn lọta n’udo, Jehova ga-enwe ya, m ga-esurekwa ya ka ọ bụrụ àjà nsure ọkụ.” Chineke mekwara ihe ahụ Jefta rịọrọ ya site n’inyere ya aka itigbu obodo 20 nke ndị Amọn “oké ntigbu ukwuu,” si otú ahụ merie ndị iro Izrel.—Ndị Ikpe 11:30-33.

Mgbe Jefta si n’agha ahụ na-alọta, onye bịara zute ya bụ ada ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ nanị nwa o nwere! Ihe ndekọ ahụ kwuru, sị: “Mgbe ọ hụrụ ya, . . . ọ dọwara uwe ya nile, sị, Ewo, ada m! i mewo ka m huru ala nke ukwuu, gị onwe gị adịwokwa n’etiti ndị na-emekpa m ahụ́: ma mụ onwe m, asaghepụworo m Jehova ọnụ m, apụkwaghị m ịlaghachi azụ.”—Ndị Ikpe 11:34, 35.

Jefta ọ̀ gaje iji ada ya chụọ àjà n’ezie? Ee e. Nke ahụ agaghị abụ ihe o bu n’uche. Jehova na-asọ iji mmadụ achụ àjà n’ụzọ nkịtị asọ, nke bụ́ otu n’ime ihe ọjọọ ndị Kenan mere. (Levitikọs 18:21; Deuterọnọmi 12:31) Ọ bụghị nanị na mmụọ Chineke rụrụ ọrụ n’ahụ́ Jefta mgbe o kwere nkwa ahụ, Jehova gọzikwara mgbalị ndị o mere. Akwụkwọ Nsọ jara Jefta mma n’ihi okwukwe ya na ọrụ ọ rụrụ nke mezuru nzube Chineke. (1 Samuel 12:11; Ndị Hibru 11:32-34) N’ihi ya, ọ dịtụghị mgbe ọ ga-echewe echiche iji mmadụ achụ àjà, ya bụ igbu mmadụ. Ya bụrụ otú ahụ, olee ihe Jefta bu n’obi mgbe o kwere Jehova nkwa inye ya mmadụ?

O doro anya na ihe Jefta bu n’obi bụ na ya ga-arara onye zutere ya nye ijere nanị Chineke ozi. Iwu Mozis kwadoro ikwe Jehova nkwa inye ya mkpụrụ obi. Dị ka ihe atụ, ndị inyom jere ozi n’ebe nsọ, eleghị anya ịrụ ọrụ ikute mmiri. (Ọpụpụ 38:8; 1 Samuel 2:22) A maghị ihe dị ukwuu banyere ozi dị otú ahụ ma ọ bụ ma ndị mmadụ hà na-ejikarịdị ndụ ha nile eje ya. O yiri ka ọ̀ bụ ozi a pụrụ iche ka Jefta bu n’obi mgbe ọ na-ekwe nkwa ahụ, o yikwara ka nkwa ya ọ̀ pụtara ozi a na-agaghị akwụsị akwụsị.

Ma ada Jefta ma Samuel bụ́ onye a mụrụ ka e mesịrị rubere isi iji hụ na ndị mụrụ ha bụ́ ndị na-atụ egwu Chineke mezuru nkwa ndị ha kwere. (1 Samuel 1:11) Ebe ọ bụ na ada Jefta bụ onye na-efe Jehova nke na-ekwesị ntụkwasị obi, o doro ya anya dịkwa ka o doro nna ya na e kwesịrị imezu nkwa ahụ o kwere. Àjà dị otú ahụ a chụrụ abụghị obere ihe, n’ihi na ọ pụtara na ọ dịghị mgbe ọ ga-alụ dị. Ọ kwara ákwá maka ịbụ onye na-agaghị ama nwoke, n’ihi na onye Izrel ọ bụla na-achọ ịmụta nwa iji chebe aha ezinụlọ ha na ihe nketa ha. Nye Jefta, imezu nkwa ahụ pụtara na ya na otu nwa ya ọ hụrụ n’anya agakwaghị anọ.—Ndị Ikpe 11:36-39.

Ndụ nwata nwanyị a na-alụghị di alaghị n’iyi. Ije ozi oge nile n’ụlọ Jehova bụ ụzọ magburu onwe ya, nke na-enye afọ ojuju na nke e kwesịrị ịja mma o si sọpụrụ Chineke. N’ihi ya, “ụmụ ndị inyom Izrel na-eje kwa afọ ịkọ akụkọ nwa nwanyị Jefta onye Gilied.” (Ndị Ikpe 11:40) O dokwara anya na Jefta ṅụrịrị ọṅụ n’ozi ada ya jeere Jehova.

Ọtụtụ ndị taa n’etiti ndị Chineke na-ahọrọ ịbanye n’ozi oge nile dị ka ndị ọsụ ụzọ, ndị ozi ala ọzọ, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ma ọ bụ ndị ezinụlọ Betel. Nke a nwere ike igbochi ha ịdị na-ahụ ndị ezinụlọ ha mgbe nile otú ha si chọọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị nile na-eje ozi oge nile na ndị ezinụlọ ha pụrụ ịṅụrị ọṅụ n’ozi ahụ a na-ejere Jehova.—Abụ Ọma 110:3; Ndị Hibru 13:15, 16.

Ịgbahapụ Nduzi Chineke

Ọ bụrụ na anyị echee echiche banyere oge Jefta, anyị ga-ahụ na ọtụtụ ndị Izrel jụrụ nduzi Jehova. N’agbanyeghị na ndị Ifrem hụrụ otú Chineke si gọzie Jefta, ha sesara ya okwu. Ha chọrọ ịma ihe mere o ji ghara ịkpọ ha mgbe ọ na-aga agha. Ha medịrị atụmatụ ‘isure ụlọ Jefta ọkụ n’isi ya’!—Ndị Ikpe 12:1.

Jefta kwuru na ya kpọrọ ndị Ifrem, ma ha azaghị ya. Ma ihe ka mkpa bụ na Chineke meriri n’agha ahụ. Ihe na-ewe ha iwe ugbu a ọ̀ bụ na ndị Gilied ajụghị ha ajụ tupu ha ahọrọ Jefta dị ka ọchịagha ha? N’ezie, iwe ndị Ifrem na-egosi na ha na-enupụrụ Jehova isi, ọ dịghịkwa ihe ọzọ e kwesịrị ime ma ọ́ bụghị ịlụso ha agha. N’agha sochirinụ, e meriri ndị Ifrem. Ebe ndị ikom Ifrem na-agbapụ agbapụ na-akpọtalighị okwu e ji chọọ ịmata ndị ha bụ, nke bụ́, “Shibọlet” nke ọma, ọ raghị ahụ́ ịmata ha. Ná ngụkọta, e gburu ndị Ifrem puku iri anọ na abụọ n’agha ahụ.—Ndị Ikpe 12:2-6.

Oge ahụ bụ oge iru újú n’akụkọ ihe mere eme nke Izrel! Agha ndị ndị ikpe bụ́ Ọtniel, Ehud, Berak, na Gidiọn lụrụ wetara udo. N’oge a, e kwughị ihe ọ bụla banyere udo. Ihe ndekọ ahụ kwuru nanị, sị: “Jefta wee kpee Izrel ikpe afọ isii. [O] . . . wee nwụọ, e lie ya n’obodo Gilied.”—Ndị Ikpe 3:11, 30; 5:31; 8:28; 12:7.

Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe a nile? Anyị pụrụ ịmụta na n’agbanyeghị na ndụ Jefta jupụtara n’ọgba aghara, o kwesịrị ntụkwasị obi nye Chineke. Nwoke a nwere obi ike kwuru banyere Jehova mgbe ọ gwara ndị okenye Gilied, ndị Amọn, ada ya, na ndị Ifrem okwu, n’ezie, nakwa mgbe o kwere nkwa ahụ. (Ndị Ikpe 11:9, 23, 27, 30, 31, 35; 12:3) Chineke gọziri Jefta n’ihi nrara ọ raara onwe ya nye ya, jiri ya na ada ya kwalite ofufe dị ọcha. N’oge ndị ọzọ jụrụ ụkpụrụ Chineke, Jefta jigidesiri ha ike. Dị ka Jefta, ị̀ ga-erubere Jehova isi mgbe nile?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Obi tara nnọọ ndị Amọn mmiri. Ihe na-erudịghị afọ 60 ka nke ahụ gasịrị, ha gwara ndị bi n’otu obodo Gilied ha na-eyi egwu na ha ga-aghụpụta anya aka nri nke onye nke ọ bụla n’ime ha. Onye amụma bụ́ Emọs kwuru banyere oge ha bọwara ụmụ nwanyị Gilied dị ime afọ.—1 Samuel 11:2; Emọs 1:13.