Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mbilite n’Ọnwụ—Ì Ji n’Aka na Ọ Ga-eme Eme?

Mbilite n’Ọnwụ—Ì Ji n’Aka na Ọ Ga-eme Eme?

Mbilite n’Ọnwụ—Ì Ji n’Aka na Ọ Ga-eme Eme?

“A gaje inwe mbilite n’ọnwụ.”—ỌRỤ 24:15.

1. Olee ihe mere ọnwụ ji yie ihe a na-apụghị ịgbanahụ agbanahụ?

“N’ỤWA a, ọ dịghị ihe o doro anya na ọ ga-ewererịrị ọnọdụ ma e wezụga ọnwụ na ụtụ isi.” Ụfọdụ ndị eleela okwu ahụ otu onye ọnụ na-eru n’okwu n’America, bụ́ Benjamin Franklin dere n’afọ 1789, anya dị ka okwu amamihe dị na ya. Ma, ọtụtụ ndị na-adịghị akwụwa aka ọtọ adịghị atụ ụtụ isi ruuru ha. Ọnwụ yiri nnọọ ihe e ji n’aka na ọ ga-ewererịrị ọnọdụ karịa ụtụ isi. N’onwe anyị, ọ dịghị ihe onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ime iji zerechaa ya. Anyị agaghị agbata ya n’ọsọ. Afọ anaghị eju Shiol—ili nkịtị nke ụmụ mmadụ—eju n’iloda ndị anyị hụrụ n’anya. (Ilu 27:20) Ma tụlee otu ihe na-akasi anyị obi.

2, 3. (a) Olee ihe mere ọnwụ ji ghara ịbụ ihe e ji n’aka otú ọtụtụ ndị chere? (b) Oleekwa ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Okwu Jehova na-ekwu na olileanya mbilite n’ọnwụ bụ ihe e ji n’aka. Nke a abụghị nrọ nkịtị, ọ dịghịkwa ikike dị n’eluigwe na ụwa ga-egbochili Jehova imezu olileanya a. Ma, ọtụtụ mmadụ taa amaghị na ọ dị ụfọdụ ndị na-agaghị edetụ ọnwụ ire. N’ihi gịnị? N’ihi na “oké ìgwè mmadụ” a na-apụghị ịgụta ọnụ ga-alanahụ ‘oké mkpagbu ahụ,’ bụ́ nke ga-abịa n’isi nso. (Mkpughe 7:9, 10, 14) Mgbe nke ahụ gasịrị, ha ga-adịrị ndụ gaa n’ihu, na-enwe olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi. N’ihi ya, ọnwụ abụghị ihe e ji n’aka na ọ ga-ewererịrị ọnọdụ n’ebe ha nọ. Ọzọkwa, “a gaje ime ka ọnwụ ghara ịdị irè.”—1 Ndị Kọrint 15:26.

3 Ọ dị anyị mkpa ile mbilite n’ọnwụ anya dị ka ihe e ji n’aka, otú Pọl onyeozi si lee ya, bụ́ onye kwuru, sị: “A gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Ọrụ 24:15) Ka anyị tụlee ajụjụ atọ a na-ajụ banyere mbilite n’ọnwụ. Nke mbụ, olee ihe mere olileanya a ji bụrụ nnọọ ihe e ji n’aka? Nke abụọ, olee otú ị pụrụ isi nweta nkasi obi site n’olileanya mbilite n’ọnwụ? Nke atọ, olee otú olileanya a nwere ike isi metụta ụzọ i si ebi ndụ gị ugbu a?

Mbilite n’Ọnwụ—Ihe E Ji n’Aka

4. Olee otú mbilite n’ọnwụ si dị oké mkpa ná nzube Jehova?

4 E nwere ọtụtụ ihe mere mbilite n’ọnwụ ji bụrụ ihe e ji n’aka. Nke bụ́ isi bụ na ọ dị oké mkpa ná nzube Jehova. Cheta na Setan rabara ụmụ mmadụ ná mmehie, bụ́ nke kpatara ọnwụ anyị na-apụghị izere ezere. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kwuo banyere Setan, sị: “Onye ahụ bụ ogbu mmadụ mgbe ọ malitere.” (Jọn 8:44) Ma Jehova kwere nkwa na “nwanyị” ya ma ọ bụ nzukọ nke eluigwe ya, bụ́ nke yiri nwunye ya, ga-ewepụta otu “mkpụrụ” bụ́ onye ga-echifịa “agwọ ochie ahụ” n’isi, gwepịa Setan kpamkpam. (Jenesis 3:1-6, 15; Mkpughe 12:9, 10; 20:10) Ka Jehova ji nwayọọ nwayọọ kpughee nzube ya banyere Mkpụrụ ahụ bụ́ Mezaịa, ọ bịara doo nnọọ anya na ihe Mkpụrụ ahụ ga-eme abụghị nanị ibibi Setan. Okwu Chineke na-ekwu, sị: “N’ihi nzube a ka e mere ka Ọkpara Chineke pụta ìhè, ya bụ, iji tipịasịa ọrụ Ekwensu.” (1 Jọn 3:8) Ihe bụ́ isi n’ọrụ Setan nke Jehova zubere iji Jizọs Kraịst tipịasịa bụ ọnwụ anyị na-anwụ n’ihi mmehie anyị ketara n’aka Adam. N’ihi ya, àjà mgbapụta Jizọs na mbilite n’ọnwụ dị oké mkpa.—Ọrụ 2:22-24; Ndị Rom 6:23.

5. Gịnị mere mbilite n’ọnwụ ga-eji too aha Jehova?

5 Jehova kpebisiri ike ito aha ya dị nsọ. Setan akatọwo aha Chineke ma gbasaa ụgha. Ọ ghara ụgha mgbe o kwuru na ‘ọ dịghị ọnwụ Adam na Iv na-aghaghị ịnwụ’ ma ha rie mkpụrụ osisi ahụ Chineke machibidoro iwu. (Jenesis 2:16, 17; 3:4) Kemgbe ahụ, Setan anọwo na-agbasa ụgha ndị yiri nke ahụ, dị ka ozizi ụgha nke bụ́ na mkpụrụ obi anaghị anwụ mgbe ahụ́ nwụrụ. Otú ọ dị, Jehova ga-eji mbilite n’ọnwụ gbaa ụgha nile dị otú ahụ n’anwụ. Ọ ga-egosi ruo mgbe ebighị ebi na ọ bụ nanị ya bụ Onye nwere ike ichebe ndụ na inyeghachi mmadụ ndụ.

6, 7. Olee otú ịkpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ dị Jehova n’obi, oleekwa otú anyị si mara?

6 Ọ na-agụ Jehova agụụ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Bible kwuru hoo haa otú mbilite n’ọnwụ dị Jehova n’obi. Dị ka ihe atụ, tụlee okwu ndị a nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Job ji ike mmụọ nsọ kwuo: “Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ? Ụbọchị nile nke obubu agha m ka m ga-eche, ruo mgbe mgbanwe m ga-abịa. Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa Gị: agụụ ọrụ aka Gị ga-agụ Gị.” (Job 14:14, 15) Olee ihe okwu ndị ahụ pụtara?

7 Job maara na mgbe ya nwụsịrị, ya ga-echere n’ụra ọnwụ ruo oge ụfọdụ. O lere oge ahụ anya dị ka oge “obubu agha,” oge ọ na-aghaghị iji chere ka a tọhapụ ya. Nye Job, mgbanwe ahụ bụ ihe e ji n’aka. Job ghọtara na mgbanwe ya ga-abịa. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ maara otú obi dị Jehova. Ọ ‘na-agụ Jehova agụụ’ ịhụ ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi ọzọ. Ee, ọ na-agụ Chineke agụụ ịkpọlite ndị ezi omume nile nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Jehova ga-enyekwa ndị ọzọ ohere ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs n’elu ụwa. (Luk 23:43; Jọn 5:28, 29) Ebe ọ bụ nzube Chineke imezu nzube ahụ, ònye ga-akwụsịli ya ya?

8. Olee otú Jehova si ‘nye ihe mmesi obi ike’ banyere olileanya anyị nwere maka ọdịnihu?

8 Mbilite n’ọnwụ Jizọs mere ka olileanya anyị maka ọdịnihu bụrụ ihe e ji n’aka. Mgbe Pọl kwuru okwu n’Atens, o kwuru, sị: “O [Chineke] setịpụwo otu ụbọchị nke ọ na-ezube ikpe elu ụwa mmadụ bi ikpe n’ezi omume site n’aka otu nwoke onye ọ họpụtaworo, o nyewokwa mmadụ nile ihe mmesi obi ike ebe ọ bụ na o siwo ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite ya.” (Ọrụ 17:31) Ụfọdụ n’ime ndị gere Pọl ntị kwara ya emo mgbe ha nụrụ banyere mbilite n’ọnwụ. Ma, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole ghọrọ ndị kwere ekwe. Ikekwe ihe dọọrọ mmasị ha bụ mgbe ha nụrụ na olileanya a nwere ihe mmesi obi ike. Ọrụ ebube kasịnụ Jehova rụrụ bụ mkpọlite ọ kpọlitere Jizọs n’ọnwụ. Ọ kpọlitere Ọkpara ya n’ọnwụ ịdị ndụ dị ka mmụọ dị ike. (1 Pita 3:18) Jizọs ahụ a kpọlitere n’ọnwụ bịaziri nwee ikike ka ukwuu karịa nke o nwere n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa. Ebe Jizọs ghọworo onye na-apụghị ịnwụ anwụ na onye na-esote nnọọ Jehova n’ike, ọ nọ n’ọnọdụ dị mma ugbu a ịrụ ọrụ ndị gbara ọkpụrụkpụ Nna ya nyere ya. Jehova ga-eji Jizọs kpọlite ndị ọzọ n’ọnwụ—ịdị ndụ n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa. Jizọs n’onwe ya kwuru, sị: “Abụ m mbilite n’ọnwụ na ndụ.” (Jọn 5:25; 11:25) Jehova mesiri ndị nile kwesịrị ntụkwasị obi nye ya obi ike na olileanya ndị dị otú ahụ ga-emezu site n’ịkpọlite Ọkpara ya n’ọnwụ.

9. Olee otú akụkọ Bible si gosi na mbilite n’ọnwụ bụ ihe e ji n’aka?

9 E nwere ndị ji anya ha hụ mgbe a kpọlitere ndị mmadụ n’ọnwụ, e deekwa ha n’Okwu Chineke. Bible nyere nkọwa zuru ezu banyere mmadụ asatọ a kpọlitere n’ọnwụ ịdị ndụ ọzọ n’ụwa dị ka mmadụ. A rụrụ ọrụ ebube ndị a n’ihu ọha, mgbe mgbe n’ihu ndị mmadụ. Jizọs kpọlitere Lazarọs, bụ́ onye nwụrụ kemgbe abalị anọ n’ọnwụ, n’ihu ìgwè mmadụ na-eruru ya újú—bụ́ nke doro anya na ọ gụnyere ndị ezinụlọ ya, ndị enyi na ndị agbata obi ya. Ihe àmà a bụ́ nke na-egosi na ọ bụ Chineke zitere Jizọs siri nnọọ ike nke na ndị iro Jizọs bụ́ ndị okpukpe adịtụghị mgbe ha kwuru na o meghị eme. Kama, ha kpara nkata igbu ma Jizọs ma Lazarọs! (Jọn 11:17-44, 53; 12:9-11) Ee, anyị pụrụ inwe obi ike na mbilite n’ọnwụ bụ ihe e ji n’aka. Ihe mere Chineke ji dee mbilite n’ọnwụ ndị ahụ mere n’oge gara aga na Bible ma nye anyị ya bụ iji kasie anyị obi na iji wusie okwukwe anyị ike.

Inweta Nkasi Obi Site n’Olileanya Mbilite n’Ọnwụ

10. Olee ihe ga-enyere anyị aka inweta nkasi obi site n’akụkọ banyere mbilite n’ọnwụ ndị e dekọrọ na Bible?

10 Ọ̀ na-agụ gị agụụ inweta nkasi obi mgbe i chere ọnwụ ihu? Otu ebe e nwere ike ịchọta nkasi obi bụ n’akụkọ banyere mbilite n’ọnwụ ndị e dekọrọ na Bible. Ịgụ akụkọ ndị dị otú ahụ, ịtụgharị uche na ha, na iji anya nke uche gị ahụ ihe ndị ahụ ị na-agụ nwere ike ime ka i jidekwuo olileanya mbilite n’ọnwụ n’aka. (Ndị Rom 15:4) Akụkọ ndị a abụghị akụkọ ifo. Ọ bụ ụmụ mmadụ nkịtị dị ka anyị, ndị dịrị ndụ n’otu oge gara aga na n’otu ebe dị adị, bụ ndị a a kpọlitere n’ọnwụ. Ka anyị tụletụ otu ihe atụ—mbilite n’ọnwụ mbụ e dekọrọ na Bible.

11, 12. (a) Olee ọdachi dakwasịrị nwanyị ahụ di ya nwụrụ bi na Zarefat, oleekwa ihe mbụ o mere? (b) Kọwaa ihe Jehova nyere Ịlaịja bụ́ onye amụma ya ike ka o meere nwanyị ahụ di ya nwụrụ.

11 Were anya nke uche gị hụ ihe ahụ merenụ. Ruo ọtụtụ izu, Ịlaịja onye amụma bi n’ụlọ elu nke otu nwanyị di ya nwụrụ bi na Zarefat dị ka ọbịa. Oge ahụ bụ oge tara akpụ. Oké ọkọchị na ụnwụ nri na-akpa ógbè ahụ aka ọjọọ. Ọtụtụ mmadụ na-anwụ. Jehova ejiworị Ịlaịja rụọ ọrụ ebube nọtere aka iji kwụghachi nwanyị a di ya nwụrụ dị umeala n’obi ụgwọ maka okwukwe ya. Nwanyị a na obere nwa ya nwoke nwere nanị nri ikpeazụ ọ ga-abụ ha richaa ha anọrọ agụụ, mgbe Chineke nyere Ịlaịja ike ịrụ ọrụ ebube iji mụbaa achịcha na mmanụ o nwere. Ma, ugbu a, ọdachi adakwasịla ya. Nwa ya bịara daa ọrịa na mberede ma nwụọ. Lee nnọọ oké mwute nwanyị a nọ na ya! O siiri ya ike ịnọ n’enweghị di na-enyere ya aka, nwa ya abịakwala nwụọ. N’ihi mwute o nwere, ọ tadịrị Ịlaịja na Chineke ya, bụ́ Jehova, ụta! Olee ihe onye amụma ahụ ga-eme?

12 Ịlaịja abaraghị nwanyị ahụ di ya nwụrụ mba n’ihi ibo ya ebubo ụgha. Kama, o kwuru, sị: “Nye m nwa gị nwoke.” Mgbe Ịlaịja kuuru nwa ahụ gbagoo n’ọnụ ụlọ dị n’elu ụlọ ahụ bụ́ ebe o bi, o kpegaara Chineke ekpere ọtụtụ ugboro ka o mee ka nwa ahụ dịghachi ndụ. Jehova zara ekpere ahụ n’ikpeazụ! Cheedị echiche ụdị ọnụ ọchị wara Ịlaịja mgbe ọ hụrụ ka nwa ahụ malitere iku ume. Anya nwa ahụ emepee, ya ahụkwa na nwa ahụ adịla ndụ. Ịlaịja wee kuru nwa ahụ gbadata n’ala ma kpọnye ya nne ya, sị: “Lee, nwa gị na-adị ndụ.” Ọṅụ nwanyị ahụ enyeghị ya ọnụ okwu. O kwuru, sị: “Ugbu a amawo m nke a na onye nke Chineke ka ị bụ, na Okwu Jehova bụkwa eziokwu n’ọnụ gị.” (1 Ndị Eze 17:8-24) O mere ka okwukwe o nwere n’ebe Jehova na n’ebe onye nnọchianya ya nọ sie ike karịa mgbe ọ bụla ọzọ.

13. Gịnị mere akụkọ banyere mkpọlite Ịlaịja kpọlitere nwa nwanyị di ya nwụrụ n’ọnwụ ga-eji kasie anyị obi taa?

13 Ịtụgharị uche n’akụkọ dị otú ahụ ga-akasi gị nnọọ obi. Lee otú o si doo anya na Jehova nwere ike ọ ga-eji merie onye iro anyị bụ́ ọnwụ! Chetụdị echiche otú ọ ga-adị otu ụbọchị mgbe a ga-enwe ọtụtụ puku mmadụ ga-enwe ụdị ọṅụ ahụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ nwere bụ́ mgbe a ga-akpọlite ọtụtụ ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ! A ga-enwekwa ọṅụ dị ukwuu n’eluigwe mgbe Jehova ga-eji ọṅụ duzie Ọkpara ya ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ n’ụwa nile. (Jọn 5:28, 29) Ọ̀ dị onye ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ? Lee ka o si magbuo onwe ya ịmara na Jehova nwere ike ime ka ndị nwụrụ anwụ dịghachi ndụ, na ọ ga-emekwa otú ahụ!

Otú Olileanya Gị Si Emetụta Ụzọ I Si Ebi Ndụ Ugbu A

14. Olee otú olileanya mbilite n’ọnwụ ga-esi metụta ụzọ i si ebi ndụ gị?

14 Olee otú mbilite n’ọnwụ pụrụ isi metụta ụzọ i si ebi ndụ ugbu a? Olileanya a pụrụ iwusi gị ike mgbe ị na-eche ihe isi ike, nsogbu, mmegide ma ọ bụ ihe ize ndụ ihu. Setan chọrọ ka ị na-atụ ụjọ ọnwụ nke na ị ga-adị njikere ịtụfu ikwesị ntụkwasị obi gị n’ihi nkwa ụgha e kwere gị na a ga-echebe ndụ gị. Cheta na Setan gwara Jehova, sị: “Ihe nile nke mmadụ nwere ka ọ ga-enye n’ọnọdụ ndụ ya.” (Job 2:4) N’ikwu okwu dị otú ahụ, Setan kwutọrọ mmadụ nile, gụnyere gị. Ọ̀ bụ eziokwu na ị ga-akwụsị ife Chineke ma i chee ihe ize ndụ ihu? Site n’ịtụgharị uche n’olileanya nke mbilite n’ọnwụ, i pụrụ ime ka mkpebi i mere ịnọgide na-eme uche Nna gị nke eluigwe sikwuo ike.

15. Olee otú okwu Jizọs e dere na Matiu 10:28 pụrụ isi kasie anyị obi mgbe anyị na-eche ihe ize ndụ ihu?

15 Jizọs kwuru, sị: “Unu atụkwala egwu ndị na-egbu ahụ́ ma ha enweghị ike igbu mkpụrụ obi; kama na-atụnụ egwu onye ahụ nke pụrụ ibibi ma mkpụrụ obi ma ahụ́ n’ime Gehena.” (Matiu 10:28) Ọ dịghị anyị mkpa ịtụ Setan na ndị ọrụ ya ụjọ. Ọ bụ ezie na ụfọdụ n’ime ha pụrụ inwe ikike imerụ mmadụ ahụ́, ọbụna igbu onye ahụ egbu. Ma, ihe kasị njọ ha nwere ike ime anyị agaghị anọte aka. Jehova pụrụ iwepụ ihe ọjọọ dakwasịrị ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi, ọbụna kpọlite ha n’ọnwụ, ọ ga-emekwa otú ahụ. Ọ bụ nanị Jehova ka anyị kwesịrị ịdị na-atụ egwu, ma na-akwanyere ezigbo ùgwù. Ọ bụ nanị ya bụ onye nwere ike ịla ndụ na olileanya nile maka ndụ ọdịnihu n’iyi, na-ebibi ma ahụ́ ma mkpụrụ obi na Gehena. Ọ bụ ihe obi ụtọ ịmara na Jehova achọghị ka ụdị ihe ahụ mee gị. (2 Pita 3:9) N’ihi olileanya mbilite n’ọnwụ, obi na-esi anyị bụ́ ndị ohu Chineke ike mgbe nile na ọ dịghị ihe ga-eme anyị. Ndụ ebighị ebi na-eche anyị ihu ma ọ bụrụhaala na anyị ekwesị ntụkwasị obi, Setan na ndị na-eso ụzọ ya apụkwaghị igbochi ya.—Abụ Ọma 118:6; Ndị Hibru 13:6.

16. Olee otú mbilite n’ọnwụ si emetụta ihe ndị anyị na-ebute ụzọ ná ndụ?

16 Ọ bụrụ na anyị ji olileanya mbilite n’ọnwụ n’aka, ọ pụrụ ime ka anyị gbanwee ụzọ anyị si ele ndụ anya. Anyị ghọtara na ‘ọ bụrụ na anyị na-adị ndụ ma ọ bụ na anyị na-anwụ anwụ, anyị bụ nke Jehova.’ (Ndị Rom 14:7, 8) N’ihi ya, mgbe anyị na-ekpebi ihe ndị anyị ga-ebute ụzọ ná ndụ, anyị na-etinye ndụmọdụ Pọl n’ọrụ, nke bụ́: “Kwụsịkwanụ ịbụ ndị a na-eme ka ha yie usoro ihe nke a, kama bụrụnụ ndị e nwoghara site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ, ka unu wee na-anwapụtara onwe unu ihe bụ́ uche Chineke nke ziri ezi na nke a na-anara nke ọma na nke zuru okè.” (Ndị Rom 12:2) Ọ dị ọtụtụ ndị ọkụ n’ahụ́ inweta ihe nile na-agụ ha agụụ, inweta ihe nile ha bu n’obi na ime ihe ọ bụla gbabatara ha n’obi. N’ihi na ha na-ele ndụ anya di ka ihe dị mkpụmkpụ, ha na-eji ike ha nile achụso ihe ụtọ, ọ bụrụkwa na ha na-efe ofufe, ha anatụghị efe ya n’ụzọ kwekọrọ “n’uche Chineke zuru okè.”

17, 18. (a) Olee otú Okwu Jehova si gosi na ndụ ụmụ mmadụ dị mkpụmkpụ, ma gịnị ka Chineke zubere imere anyị? (b) Olee ihe na-akpali anyị ito Jehova kwa ụbọchị?

17 Ee, ndụ dị mkpụmkpụ. ‘Ọ na-agbapụ ọsọ ọsọ, anyị ewee felaa dị ka nnụnụ,’ ikekwe mgbe anyị dị ihe dị ka afọ 70 ma ọ bụ 80. (Abụ Ọma 90:10) Ụmụ mmadụ na-abịa ma na-ala dị ka ahịhịa ndụ, dị ka onyinyo na-agabiga agabiga, na dị ka otu nku ume. (Abụ Ọma 103:15; 144:3, 4) Ma Chineke ezubeghị ka anyị jiri iri afọ ole na ole tolite, nweta amamihe na ahụmahụ ụfọdụ, ma jirizie iri afọ ole na ole fọrọ afọ kaa nká, rịa ọrịa ma nwụọ. Jehova kenyere n’ime ụmụ mmadụ ọchịchọ nke ịdị ndụ ebighị ebi. Bible na-agwa anyị, sị: “Mgbe ebighị ebi ka O tinyeworo n’obi ha.” (Eklisiastis 3:11) Chineke ò ji obi ọjọọ tinye ọchịchọ dị otú ahụ n’obi anyị ma mee ka ọ gharazie ikwe anyị omume imezu ya? Ọ dịghị ma ọlị, n’ihi na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Ọ ga-eji mbilite n’ọnwụ mee ka o kwe ndị nwụrụ anwụ omume inweta ndụ ebighị ebi.

18 Anyị pụrụ inwe ọdịnihu ka mma n’ihi olileanya mbilite n’ọnwụ. O kwesịghị ịdị anyị ọkụ n’ahụ́ imezu ihe nile anyị nwere ike ime ugbu a. Ọ dịghịkwa anyị mkpa iji ụwa a na-anwụ anwụ “eme ihe n’újú.” (1 Ndị Kọrint 7:29-31; 1 Jọn 2:17) N’adịghị ka ndị na-enweghị ezi olileanya, anyị nwere onyinye magburu onwe ya nke ịmara na ọ bụrụ na anyị anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova Chineke, anyị ga-eto ya ma kporie ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ya mere, ka anyị mee ike anyị nile ịdị na-eto Jehova kwa ụbọchị, bụ́ onye mere ka olileanya mbilite n’ọnwụ bụrụ ihe e ji n’aka!

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee otú obi kwesịrị ịdị anyị banyere mbilite n’ọnwụ?

• Olee ihe ndị mere ka olileanya mbilite n’ọnwụ bụrụ ihe e ji n’aka?

• Olee otú i nwere ike isi nweta nkasi obi site n’olileanya mbilite n’ọnwụ?

• Olee otú olileanya mbilite n’ọnwụ pụrụ isi metụta ụzọ i si ebi ndụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 28]

Job maara na ọ na-agụsi Jehova agụụ ike ịkpọlite ndị ezi omume n’ọnwụ

[Foto dị na peeji nke 29]

“Lee, nwa gị na-adị ndụ”