N’ihi Gịnị Ka Anyị Ji Ezukọta Ọnụ?
N’ihi Gịnị Ka Anyị Ji Ezukọta Ọnụ?
DI Christine gbahapụrụ ya na mberede—ka ha lụsịrịla ruo afọ 20. Di ya hapụụrụ ya ụmụ nwoke asaa na otu nwa nwanyị ịzụ nanị ya. Afọ ndụ ụmụaka ahụ dị n’agbata afọ 7 na 18. Christine kwuru, sị: “Ọ bụzi nanị m na-eme mkpebi nile dị mkpa a ga-eme. Ibu ahụ malitere ịnyị m arọ, ọ gụsikwara m agụụ ike inwe onye ga-enyere m aka ma na-eduzi m.” Olee ebe o si nweta enyemaka dị ya mkpa?
Christine kwuru, sị: “Ọmụmụ ihe Ndị Kraịst nyeere nnọọ mụ na ezinụlọ m aka. N’ọmụmụ ihe, anyị na-enweta enyemaka nke ndị enyi anyị na nduzi sitere n’Okwu Chineke. Ịgachi ọmụmụ ihe anya nyeere mụ na ezinụlọ m aka n’akụkụ nile dị mkpa nke ndụ anyị.”
‘N’oge ndị a pụrụ iche nke siri ike obibi,’ anyị nile aghaghị ịnagide ule dị iche iche. (2 Timoti 3:1) Dị ka Christine, o nwere ike ịbụ na ị na-ele ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova anya dị ka ihe na-enyere okwukwe gị aka, dị ka akụkụ dị mkpa nke ofufe ị na-efe Jehova. O nwere nnọọ ike ịbụ na ọmụmụ ihe ise a na-enwe kwa izu na-akpali gị ịhụkwu Chineke n’anya, na-eme ka ị nọgide na-enwe olileanya maka ọdịnihu, ma na-eduzi gị iji ihe ọmụma Bible na-emeri ọnwụnwa.
Ma ọ dị ndị ọ na-esiri ike ịgachi ọmụmụ ihe anya. Ha rụsịa ọrụ ụbọchị, ike na-agwụkasị ha ahụ́, ijikerekwa nke ọma gawa ọmụmụ ihe nwere ike iyi ha ihe na-agaghị ekwe omume. Ụfọdụ na-ahụ na ọrụ ha na-eme ka ha ghara ịdị na-agachi ọmụmụ ihe anya. Ịga ọmụmụ ihe nile nwere ike ibelata ego ha na-akpata ma ọ bụ mee ka a chụọ ha n’ọrụ. Ụfọdụ nwere ike ịdị na-agha ọmụmụ ihe n’ihi na ha chere na ụdị ntụrụndụ ụfọdụ ga-enye ha obi ụtọ karịa iso ọgbakọ akpakọrịta.
N’ihi ya, olee ezi ihe ndị mere anyị kwesịrị iji na-aga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst? Olee otú ị pụrụ isi mee ka ọmụmụ ihe na-atọ gị ụtọ? Iji zaa ajụjụ ndị a, ka anyị tụlee oku Jizọs ji ịnụ ọkụ n’obi kpọọ na Matiu 11:28-30. O kwuru, sị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na ndị a na-ebogbu n’ibu, m ga-emekwa ka unu nwee ume ọhụrụ. Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na enwere m obi dị nwayọọ, m dịkwa umeala n’obi, unu ga-enwetakwara mkpụrụ obi unu ume ọhụrụ. N’ihi na yok m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.”
“Bịakwutenụ M”
Jizọs kwuru, sị: “Bịakwutenụ m.” Otu ụzọ anyị pụrụ isi zaa oku ahụ bụ ịgachi ọmụmụ ihe anya. E nwere ezi ihe Matiu 18:20.
mere anyị kwesịrị iji na-aga ọmụmụ ihe, n’ihi na Jizọs kwuru n’oge ọzọ, sị: “N’ebe mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ zukọtara n’aha m, anọ m n’ebe ahụ n’etiti ha.”—Na narị afọ mbụ, Jizọs ji aka ya kpọọ ụdị ndị dị iche iche ka ha soro ya. O si otú ahụ nye ha ohere ịghọ ezi ndị enyi ya. Ụfọdụ sowere ya ozugbo. (Matiu 4:18-22) Ndị ọzọ kwere ka ihe ndị dị ka ọchịchọ ihe onwunwe gbochie ha iso Jizọs. (Mak 10:21, 22; Luk 9:57-62) Jizọs mesiri ndị kwetara iso ya obi ike site n’ịgwa ha, sị: “Ọ bụghị unu họọrọ m, kama ọ bụ m họọrọ unu.”—Jọn 15:16.
Mgbe Kraịst nwụsịrị, a kpọlitekwa ya n’ọnwụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya anọkwaghị n’anụ ahụ́. Ma ya na ha ka nọ n’ihi na ọ nọ na-eduzi ọrụ ha ma na-ele otú ha si na-agbaso ndụmọdụ ya. Dị ka ihe atụ, ihe dị ka afọ 70 ka a kpọlitesịrị Jizọs n’ọnwụ, o nyere ọgbakọ asaa dị n’Eshia Maịnọ ndụmọdụ na agbamume. Ihe ndị o kwuru gosiri na ọ maara nnọọ ebe ndị nọ n’ọgbakọ ndị ahụ na-emezi na ebe ndị ha na-adịghị emezi.—Mkpughe 2:1–3:22.
Jizọs ka nwere ezi mmasị n’ahụ́ onye ọ bụla na-eso ụzọ ya. O kwere nkwa, sị: “Lee! M nọnyeere unu ụbọchị nile ruo ọgwụgwụ nke usoro ihe.” (Matiu 28:20) Anyị bi n’oge ọgwụgwụ ugbu a, anyị kwesịkwara ịza oku Jizọs kpọrọ anyị iso ya. Otu n’ime ihe ndị iso ụzọ ya ga-achọ anyị n’aka bụ ịgachi ọmụmụ ihe anya. Jizọs chọrọ ka anyị gee ya ntị ma “bụrụ ndị e sitere n’aka ya zie ihe” site n’ọmụmụ ihe na ihe omume ndị dabeere na Bible bụ́ ihe ndị a na-emechi anya n’ọmụmụ ihe anyị. (Ndị Efesọs 4:20, 21) Ị̀ na-aza oku Jizọs nke bụ́: “Bịakwutenụ m”?
“Unu Nile Ndị Na-adọgbu Onwe Ha n’Ọrụ na Ndị A Na-ebogbu n’Ibu”
Ihe dị mkpa mere anyị ga-eji na-aga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst bụ iji nweta agbamume. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ọtụtụ n’ime anyị bụ nnọọ ndị “na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na ndị a na-ebogbu n’ibu” n’ụzọ dị iche iche. Ọ pụrụ ịbụ na ị na-echegbu onwe gị banyere ọrịa, nchekasị dị otú ahụ ana-anyịgbukwa gị. N’ọmụmụ ihe Ndị Kraịst, gị na ụmụnna gị nwere ike ịgbarịta ibe unu ume. (Ndị Rom 1:11, 12) Dị ka ihe atụ, ị ga-anụ azịza ndị na-ewusi okwukwe ike, e chetara gị olileanya dabeere na Bible i nwere, gị ahụkwa okwukwe nke ndị na-edi ọnwụnwa dị iche iche. Ihe a nile nwere ike inyere gị aka ịtachi obi ma mee ka ị mara na ọ bụghị ụwa nke gị kacha njọ.
Tụlee ihe otu nwanyị Onye Kraịst nke ọrịa na-ekweghị ala ala na-ebelata ihe ọ na-eme kwuru. Ọ kọwara, sị: “Ọrịa m na-eme m ịnọ n’ụlọ ọgwụ mgbe ụfọdụ. Ịga ọmụmụ ihe mgbe m si n’ụlọ ọgwụ lọta na-esitụrụ m ike, ma ọ bụ ebe kasị mma m kwesịrị ịga. Obi ụtọ na ịhụnanya nke ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwanyị na-eme ka m nwetaghachi ọṅụ, ihe Jehova na Jizọs na-akụzikwara m ebe ahụ na nduzi ha na-enye m na-eme ka ndụ m nwee nzube.”
“Yok M Adịghị Egbu Mgbu, Ibu M Dịkwa Mfe”
Ị̀ hụrụ na n’akụkụ Bible ebe a anyị na-atụle, Jizọs kwuru, sị: “Mụtakwanụ ihe n’aka m”? Site n’ịmụta ihe n’aka Jizọs, anyị na-aghọ ndị na-eso ụzọ ya, anyị na-anyarakwa yok ya mgbe anyị raara onwe anyị nye Chineke, e meekwa anyị baptizim. (Matiu 28:19, 20) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọgide na-abụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, anyị aghaghị ịdị na-agachi ọmụmụ ihe anya. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụ n’ọmụmụ ihe Ndị Kraịst ka a na-akụziri anyị banyere Jizọs, ozizi ya, na ụzọ ndị o si eme ihe.
Gịnị bụ ibu ahụ Kraịst chọrọ ka anyị buru? Ọ bụ ibu nke ya onwe ya bukwa—bụ́ ihe ùgwù nke ime uche Chineke. (Jọn 4:34; 15:8) Irube isi n’iwu Chineke na-achọ mgbalị n’aka mmadụ, ma ibu a adịbigaghị arọ ókè. O nwere ike iyi ihe dị arọ ma ọ bụrụ na anyị anwaa iburu ya nanị anyị. Ma, ọ bụrụ na anyị ana-ekpe ekpere maka mmụọ nsọ Chineke ma na-erite uru site n’ihe ndị dabeere na Bible a na-akụziri anyị n’ọmụmụ ihe, anyị ga-enweta “ike karịrị ike nkịtị,” bụ́ nke Chineke na-enye. (2 Ndị Kọrint 4:7) Ọ bụrụ na anyị ana-akwado akwado maka ọmụmụ ihe ma na-ekere òkè na ya, ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ ga-anọgide na-esiwanye ike. Mgbe ịhụnanya jupụtakwara anyị obi, iwu Chineke ‘anaghị adị anyị arọ.’—1 Jọn 5:3.
Ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ nwere nsogbu ndị dị ka inweta ihe e ji ebi ndụ, ọrịa, na nsogbu ndị ọzọ. Ma, anyị anaghị adabere n’amamihe mmadụ iji nweta ọgwụgwọ nke nsogbu ndị a. Ọmụmụ ihe ọgbakọ na-enyere anyị aka ‘ịkwụsị ichegbu onwe anyị,’ n’ihi na Jehova na-enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa ma na-enyere anyị aka idi nsogbu anyị. (Matiu 6:25-33) N’ezie, ọ bụ n’ihi ịhụnanya Chineke nwere n’ebe anyị nọ mere o ji mee ndokwa maka ọmụmụ ihe Ndị Kraịst.
“Enwere M Obi Dị Nwayọọ, M Dịkwa Umeala n’Obi”
Ọ bụ omenala Jizọs ịga n’ụlọ nzukọ ndị Juu bụ́ ebe a na-akụzi Okwu Chineke. Otu ụbọchị Jizọs gara ebe ahụ, o weere akwụkwọ mpịakọta Aịzaịa ma gụọ, sị: “Mmụọ Jehova dịkwasịrị m, n’ihi na o tere m mmanụ ịkpọsara ndị ogbenye ozi ọma, o zigara m ikwusa ntọhapụ nye ndị a dọọrọ n’agha na ịmaliteghachi ịhụ ụzọ nye ndị ìsì, izilaga ndị e gwepịara egwepịa dị ka ndị a tọhapụrụ atọhapụ, ikwusa afọ Jehova na-anara mmadụ nke ọma.” (Luk 4:16, 18, 19) Lee ka obi gaara esi tọọ gị ụtọ ma a sị na ị nụrụ mgbe Jizọs kọwara ihe okwu ndị ahụ pụtara site n’ikwu, sị: “Taa ka akụkụ Akwụkwọ Nsọ a nke unu ka nụpụrụ mezuru”!—Luk 4:21.
Ọ ka bụ Jizọs, bụ́ “onyeisi ọzụzụ atụrụ” nke dị umeala n’obi, na-elekọta ọzụzụ e ji Okwu Chineke na-azụ ụmụazụ ya. (1 Pita 5:1-4) O duziwo “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” ịhọpụta ndị ikom ụfọdụ dị ka ndị ọzụzụ atụrụ n’ọgbakọ zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova. (Matiu 24:45-47; Taịtọs 1:5-9) Ndị ikom a ji ịdị nwayọọ “na-azụ ọgbakọ Chineke” ma na-esetịpụrụ ha ezi ihe nlereanya site n’ịgachi ọmụmụ ihe anya. I nwere ike igosi na obi dị gị ụtọ maka ndị a bụ́ “onyinye n’ụdị mmadụ” site n’ịdị na-aga ọmụmụ ihe, bụ́ ebe ọbịbịa gị na azịza gị ga-agba ndị ọzọ ume.—Ọrụ 15:30-33; 20:28; Ndị Efesọs 4:8, 11, 12.
“Unu Ga-enwetakwara Mkpụrụ Obi Unu Ume Ọhụrụ”
Mgbe ị gara ọmụmụ ihe Ndị Kraịst, olee otú ị pụrụ isi mee ka ọ tọọ gị nnọọ ụtọ? Otu ụzọ ị pụrụ isi mee nke ahụ bụ site n’itinye ndụmọdụ a Jizọs nyere n’ọrụ, nke bụ́: “Lezienụ anya otú unu si aṅa ntị.” (Luk 8:18) Ndị ọ gụsiri agụụ ike ịmụta ihe ṅara nnọọ Jizọs ntị. Ha gwara ya ka ọ kọwaara ha ihe atụ ndị o ji mee ihe, n’ihi nke ahụkwa, ha ghọtakwuru ihe.—Matiu 13:10-16.
I nwere ike iṅomi ndị dị otú ahụ agụụ ịnụ okwu Chineke na-agụsi ike site n’ige ntị nke ọma n’ihe omume ndị a na-eme n’ọmụmụ ihe. (Matiu 5:3, 6) Iji mee ka uche gị ghara ịkpapụ, na-agbalị igbaso ihe nile ọkà okwu na-ekwu. Na-ajụ onwe gị ajụjụ ndị dị ka: ‘Olee otú m nwere ike isi tinye ihe a ọ na-ekwu n’ọrụ ná ndụ m? Olee otú m nwere ike isi jiri ya nyere ndị ọzọ aka? Olee otú m nwere ike isi kọwaa ihe a ọ na-ekwu?’ Ọzọkwa, soro ọkà okwu ahụ gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị o ji kwado ihe ọ na-ekwu. Ka ị na-elezikwu anya otú i si aṅa ntị, otú ahụ ka ọmụmụ ihe ga na-atọkwu gị ụtọ.
Mgbe a gbasara ọmụmụ ihe, gị na ndị ọzọ kwurịta ihe ndị e kwuru. Lekwasị anya n’ihe e kwuru na otú e nwere ike isi tinye ya n’ọrụ. Nkwurịta okwu ndị na-agba ume na-eme ka ọmụmụ ihe na-atọ ụtọ.
Anyị nwere nnọọ ezi ihe ndị mere anyị kwesịrị iji na-ezukọta ọnụ. Mgbe ị tụleghachisịrị uru ndị a anyị ka kwupụrụ banyere ha, gịnị ma ị jụọ onwe gị, sị, ‘Olee otú m si na-aza oku ahụ Jizọs kpọrọ, nke bụ́: “Bịakwutenụ m”?’
[Foto ndị dị na peeji nke 11]
Ihe ndị ọzọ hà na-egbochi gị ịga ọmụmụ ihe?