Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Nwere Ike Isi Nyere Ụmụ M Aka Ịghọ Ndị Maara Ihe n’Ezie?

Olee Otú M Nwere Ike Isi Nyere Ụmụ M Aka Ịghọ Ndị Maara Ihe n’Ezie?

Olee Otú M Nwere Ike Isi Nyere Ụmụ M Aka Ịghọ Ndị Maara Ihe n’Ezie?

A PỤRỤ iji ịkụziri nwatakịrị ihe tụnyere njem siri ike ma na-enye ọṅụ. Ọ bụ njem gị na ụmụ gị na-agakọta ọnụ. Ị na-agba ha ume ma jiri ịhụnanya na-eduzi ha, na-enyere ha aka inwe ọganihu n’ụzọ nke ndụ. Ọ dị ọtụtụ ihe ha ga-amụta!

Ka ụmụaka nwee ike inwe nnọọ ihe ịga nke ọma ná ndụ ma nwee obi ụtọ, ha aghaghị ịmụta iji àgwà ọma na ofufe Chineke akpọrọ ihe, mụta ịmata ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ. Ọ bụrụ na ha amata Jehova ma hụ ya n’anya, ihe a na-akụziri ha ga-abara ha nnọọ uru ọbụna ruo mgbe ebighị ebi. Dị ka nne ma ọ bụ nna, ị na-arụ ọrụ dị mkpa n’ikpebi ihe ụmụ gị ga-amụta na otú ha ga-esi lee ihe ha mụtara anya ma ọ bụ ghọta ya.

E nwere ọtụtụ ihe isi ike unu ga-enweta na njem a. Obi ụmụaka na-anabata ihe ọsọ ọsọ, ha pụkwara ịmụta ọtụtụ ihe ọjọọ site n’èzí. Anyị bi n’ụwa Setan bụ́ Ekwensu na-achị. (1 Jọn 5:19) O nwere mmasị n’ọzụzụ ụmụ gị, ma ọ bụtụghị iji nyere ha aka. Setan bụ onye nkụzi nwere nkà, bụrụkwa aka ochie n’ịkụzi ihe—ma ọ bụ nnọọ ajọ onye nkụzi. N’agbanyeghị na ọ na-eme onwe ya ka o yie “mmụọ ozi nke ìhè,” ihe ọ na-akụzi na-eduhie eduhie ma na-emegide Okwu Jehova na uche Ya. (2 Ndị Kọrint 4:4; 11:14; Jeremaịa 8:9) Ma Ekwensu ma ndị mmụọ ọjọọ ya bụ aka ochie n’ịghọ aghụghọ, na-akwalite mmụọ ịchọ ọdịmma onwe onye, akwụwaghị aka ọtọ, na omume rụrụ arụ.—1 Timoti 4:1.

Olee ihe i nwere ike ime iji chebe ụmụ gị ka a ghara iduhie ha? Olee otú i nwere ike isi kụziere ha ihe ka ha wee nabata ihe ndị ziri ezi ma baa uru? Ihe dị mkpa ị ga-eme bụ ileru onwe gị anya. I kwesịrị ịdị na-esetịpụ ezi ihe nlereanya. Ọ dịkwa mkpa ka ị nabata ọrụ dịịrị gị nke bụ́ ịzụ ụmụ gị ma wepụta oge a chọrọ iji mee otú ahụ. Ma, tupu anyị atụlee ihe ndị a, ka anyị tụlee ihe bụ́ ntọala nke ezi amamihe.

Ntọala nke Ezi Amamihe

Anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka Eze Solomọn nke Izrel, bụ́ otu n’ime ndị kasị mara ihe dịtụrụla ndụ. Bible na-agwa anyị, sị: “Chineke nyekwara Solomọn amamihe na nghọta hiri nne nke ukwuu, na obi sara mbara, dị ka ájá nke dị n’ụsọ oké osimiri. Amamihe Solomọn wee baa ụba karịa amamihe ụmụ Ihu anyanwụ nile, karịakwa amamihe Ijipt nile.” Solomọn ‘tụrụ puku ilu atọ, abụ ya dịkwa otu puku na ise.’ Ọ maara ihe banyere ihe ọkụkụ na anụmanụ nke ọma. (1 Ndị Eze 4:29-34) Eze Solomọn duzikwara ọrụ owuwu ihe n’Izrel, nke gụnyere owuwu nke ụlọ nsọ ahụ dị ebube e wuuru Jehova na Jeruselem.

Ihe ndị Solomọn dere, ndị gụnyere ndị o dere n’akwụkwọ Eklisiastis, gosiri na ọ maara ihe banyere ụmụ mmadụ nke ọma. Chineke nyere ya ike mmụọ nsọ ikwu ihe bụ́ ntọala nke ezi amamihe. Solomọn kwuru, sị: “Egwu Jehova bụ mmalite ihe ọmụma.” Eze ahụ maara ihe kwukwara, sị: “Mmalite amamihe ka egwu Jehova bụ: ihe ọmụma nke Onye Nsọ bụkwa nghọta.”—Ilu 1:7; 9:10.

Ọ bụrụ na anyị na-atụ egwu Chineke, anyị ga na-asọpụrụ ya ma na-akpachara anya ịghara imejọ ya. Anyị na-aghọta na ọ bụ Onye Kasị Elu nakwa na anyị nile nọ n’okpuru ya. Ndị mmadụ nwere ike ịkpọ ndị leghaara onye ji ha ndụ anya ndị maara ihe, ma amamihe dị otú ahụ bụ “ihe nzuzu n’ebe Chineke nọ.” (1 Ndị Kọrint 3:19) Ọ dị ụmụ gị mkpa ka e jiri “amamihe nke sitere n’elu” kụziere ha ihe.—Jems 3:15, 17.

E nwere nnọọ ihe jikọrọ ịtụ egwu Jehova na ịhụ ya n’anya. Jehova na-achọ ka ndị ohu ya na-atụ ya egwu ma hụ ya n’anya. Mozis kwuru, sị: “Izrel, gịnị ka Jehova, bụ́ Chineke gị, na-arịọ n’aka gị, ma ọ́ bụghị ịtụ egwu Jehova, bụ́ Chineke gị, ije ije n’ụzọ Ya nile, na ịhụ Ya n’anya, na iwere obi gị nile na mkpụrụ obi gị nile fee Jehova, bụ́ Chineke gị, ofufe, idebe ihe nile Jehova nyere n’iwu, na ụkpụrụ Ya nile, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa ka o wee dịrị gị mma?”—Deuterọnọmi 10:12, 13.

Ọ bụrụ na anyị akụnye egwu Jehova n’ime ụmụ anyị, ọ pụtara na anyị na-atọ ntọala nke ga-eme ka ụmụ anyị nweta ọzụzụ nke ga-eme ka ha mara ihe n’ezie. Ka ha na-amụba egwu ha na-atụ Chineke, ha ga-ejikwu Onye Okike ha, bụ́ Onye amamihe nile si n’aka, kpọrọ ihe. Nke a ga-eme ka ụmụ anyị ghọta ihe ndị ha na-amụta nke ọma, ghara ịghọtahie ha. Ha ga-amụta “ịmata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ.” (Ndị Hibru 5:14) Ịtọrọ ha ntọala dị otú ahụ ga-enyekwara ha aka ịnọgide na-adị umeala n’obi ma zere ime ihe ọjọọ.—Ilu 8:13; 16:6.

Ụmụ Gị Na-ele Ihe Ị Na-eme!

Ma olee otú anyị nwere ike isi nyere ụmụ anyị aka ịhụ Jehova n’anya ma na-atụ egwu ya? Azịza nke ajụjụ ahụ dị n’Iwu ahụ Jehova nyere ụmụ Izrel site n’aka onye amụma bụ́ Mozis. A gwara ndị Izrel mụrụ ụmụ, sị: “Ị ga-ewerekwa obi gị nile, werekwa mkpụrụ obi gị nile, werekwa ike gị nile, hụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya. Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị: ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.”—Deuterọnọmi 6:5-7.

Akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na-akụziri ndị mụrụ ụmụ ihe ndị dị mkpa. Otu n’ime ha bụ: Dị ka nne ma ọ bụ nna, ị ghaghị isetịpụ ezi ihe nlereanya. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịkụziri ụmụ gị ịhụ Jehova n’anya, gị onwe gị aghaghị ịhụ Chineke n’anya, okwu ya aghaghịkwa ịdị n’obi gị. Olee ihe mere nke a ji dị mkpa? Ọ bụ n’ihi na ọ bụ gị bụ onye bụ́ isi na-akụziri ụmụ gị ihe. Ihe ha mụtara site n’ihe nlereanya gị ga-emetụta ndụ ha nke ukwuu. Ọ dịghịkwa ihe na-emetụta ndụ nwatakịrị karịa ihe nlereanya nke nne na nna ya.

Ọ bụghị nanị okwu ọnụ gị ka e ji amata ọchịchọ gị, ihe ndị i ji kpọrọ ihe, na ihe ndị na-amasị gị, kama nke ahụ, a na-ejikwa omume gị amata ha. (Ndị Rom 2:21, 22) Site na mgbe ụmụaka bụ ụmụ ọhụrụ, ha na-amụta ihe site n’ileru anya n’ihe ndị mụrụ ha na-eme. Ụmụaka na-aghọta ihe ndị dị ndị mụrụ ha mkpa, ọ bụkwa ihe ndị a ka ụmụaka na-ejikarị akpọrọ ihe. Ọ bụrụ na ị hụrụ Jehova n’anya n’ezie, ụmụ gị ga-achọpụta ya. Dị ka ihe atụ, ha ga-ahụ na ịgụ na ịmụ Bible dị gị mkpa. Ha ga-aghọtakwa na i debere ihe ndị metụtara Alaeze ahụ n’ọnọdụ mbụ ná ndụ gị. (Matiu 6:33) Gị ịgachi ọmụmụ ihe anya na ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ ga-egosi ha na ijere Jehova ozi dị nsọ bụ ihe kasị mkpa nye gị.—Matiu 28:19, 20; Ndị Hibru 10:24, 25.

Rụọ Ọrụ Dịịrị Gị

Ihe ọzọ ndị mụrụ ụmụ nwere ike ịmụta na Deuterọnọmi 6:5-7 bụ nke a: Ọ bụ ọrụ dịịrị gị ịzụ ụmụ gị. N’etiti ndị Jehova n’oge ochie, ọ bụ ndị nne na nna na-akụziri ụmụ ha ihe. N’oge Ndị Kraịst narị afọ mbụ, ndị nne na nna nọgidere na-ebute ụzọ n’ịkụziri ụmụ ha ihe. (2 Timoti 1:5; 3:14, 15) Mgbe Pọl onyeozi na-edegara Ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ ozi, o kwuru na ndị bụ́ nna karịsịa ‘ga-anọgide na-azụlite ụmụ ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.’—Ndị Efesọs 6:4.

Mkpa ndị e nwere n’oge a, ọrụ, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị mkpa bụ́ ndị na-eri oge ndị nne na nna nwere ike ime ka ha nyefee ọzụzụ nke ụmụ ha n’aka ndị ọzọ, dị ka ndị nkụzi na ndị ji ilekọta ụmụaka mere aka ọrụ. Ma, ọ dịghị onye ga-anọchili anya nne ma ọ bụ nna na-ahụ n’anya ma na-eche banyere nwa ya. Ya adịla mgbe ị ga-eleghara mkpa ị dị nwa gị na mmetụta i nwere n’ahụ́ ya anya. Ya bụrụ na ị chọrọ enyemaka n’ịkụziri ụmụ gị ihe, jiri amamihe họrọ onye ga-enyere gị aka, ma ya adịkwala mgbe ị ga-ahapụziri onye ọzọ ọrụ ahụ dị nsọ Chineke nyere gị.

Wepụta Oge Zụọ Ụmụ Gị

Ihe ọzọkwa ndị mụrụ ụmụ na-amụta na Deuterọnọmi 6:5-7 bụ nke a: Ịzụ ụmụ na-achọ oge na mgbalị. A gwara ndị Izrel mụrụ ụmụ ka ha ‘zi’ ụmụ ha eziokwu nke Chineke. Okwu Hibru oge ochie a sụgharịrị ịbụ ‘izi ihe’ n’ebe a pụtara “ikwughachi ihe,” “ikwu ihe ugboro ugboro.” A ga-eme nke a n’oge nile n’ụbọchị, ee, site n’ụtụtụ ruo n’abalị, “n’ụlọ gị” nakwa “n’ụzọ.” Ọ na-ewe oge na mgbalị ịkụziri ụmụ gị ihe na ịkpụzi àgwà na omume ha ka ha kwekọọ n’uche Chineke.

N’ihi ya, olee ihe i nwere ike ime iji nyere ụmụ gị aka ịghọ ndị maara ihe n’ezie? Ọ dị ọtụtụ ihe i nwere ike ime. Kụziere ha ịhụ Jehova n’anya ma na-atụ egwu ya. Na-esetịpụrụ ha ezi ihe nlereanya. Buru ibu ọrụ nke ịkụziri ụmụ gị ihe, ma wepụta oge dị mkpa iji zụọ ha. I zughị okè, a ga-enwekwa ihe ndị ị ga-emejọ. Ma ya bụrụ na i ji obi gị nile na-agbalị ime uche Chineke, o yikarịrị ka ụmụ gị hà ga-eji mgbalị gị kpọrọ ihe ma rite uru na ya. Ilu 22:6 kwuru, sị: “Zụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị, ọbụna mgbe o mere okenye ọ gaghị esi n’ime ya wezụga onwe ya.”

Ịkụziri ụmụ gị ihe bụ njem gị na ha ga-eme ná ndụ unu nile. Ọ bụrụ na gị na ụmụ gị hụrụ Chineke n’anya, ọ bụ njem unu ga-enwe ike ime ruo mgbe ebighị ebi. Nke ahụ bụ n’ihi na ọ dịghị mgbe anyị ga-amụtacha ihe nile banyere Jehova na ụzọ anyị pụrụ isi mezuo nzube ya.—Eklisiastis 3:10, 11.

[Foto dị na peeji nke 15]

Gị na ụmụ gị ùnu na-agụkọ Bible ọnụ?

[Foto dị na peeji nke 16]

Wepụta oge iji kụziere ụmụ gị banyere Onye Okike