Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Onyenwe Anyị, Gịnị Mere I Ji Gbachi Nkịtị?”

“Onyenwe Anyị, Gịnị Mere I Ji Gbachi Nkịtị?”

“Onyenwe Anyị, Gịnị Mere I Ji Gbachi Nkịtị?”

Ọ BỤ Popu Benedict nke Iri na Isii, bụ́ onye gara n’ebe bụ́bu ogige ịta ahụhụ dị n’Auschwitz, Poland, na May 28, 2006, kwuru okwu ndị ahụ. Mgbe ọ nọ n’ebe ndị Nazi nọ gbuo ọtụtụ narị puku ndị Juu na ndị ọzọ, o kwukwara, sị: “E nwere nnọọ ọtụtụ ajụjụ ebe a na-eme ka anyị jụọ! Ndị mmadụ na-ajụkarị, sị: Ebee ka Chineke nọ n’oge ahụ? Gịnị mere o ji gbachi nkịtị? Olee ihe ọ ga-eji kwere ka e gbuo ìgwè mmadụ n’akwụsịghị akwụsị, kwere ka ihe ọjọọ merie ezi ihe? . . . Anyị aghaghị ịnọgide jiri obi umeala na-akpọku Chineke n’akwụsịghị akwụsị, na-asị ya: Bilie! Echefula ụmụ mmadụ i kere eke!”

Okwu ahụ popu ahụ kwuru kpaliri ndị mmadụ ikwu nnọọ ihe dị iche iche. Ụfọdụ chere na ọ dị ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ o leghaara anya, dị ka ihe atụ, o kwughị banyere ọnụ e mekpọrọ ndị Juu n’oge ahụ a kpara arụ n’Auschwitz. Ndị ọzọ lere okwu ya anya dị ka mgbalị ọ na-eme iji kpuchie arịrịọ Popu John Paul nke Abụọ rịọrọ maka mgbaghara nke mmehie ndị chọọchị mere. Otu onye nta akụkọ bụ́ onye Katọlik bụ́ Filippo Gentiloni kwuru, sị: “Ma, ọ dị nnọọ mma na mgbe a jụrụ ọtụtụ ndị na-agbasa akụkọ ebe Chineke nọ mgbe ihe ahụ na-eme—bụ́ ajụjụ na-enweghị azịza—ha na-asị ka a zaa ha ajụjụ ka mfe bụ́: Olee ebe Popu Pius nke Iri na Abụọ nọ mgbe ọ na-eme?” Ihe ndị ahụ na-agbasa akụkọ na-ekwu banyere ya bụ nkịtị Popu Pius nke Iri na Abụọ gbara n’oge Oké Mgbukpọ ahụ.

Oké Mgbukpọ ahụ na mgbukpọ nke agbụrụ nile e nwerela kemgbe mmadụ malitere ịdị ndụ na-egosi na “mmadụ nwere ike n’ahụ́ mmadụ ibe ya imejọ ya.” (Eklisiastis 8:9) Ọzọkwa, ọ dịbeghị mgbe Onye kere mmadụ gbachiri nkịtị mgbe imerime ihe ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ́ nọ na-eme. Site na Bible, o kpughewo ihe ndị mere o ji kwere ka mmebi iwu dịgide. Chineke emesiwokwa anyị obi ike na ya echefubeghị ụmụ mmadụ. N’ezie, oge Chineke hapụrụ ụmụ mmadụ ka ha na-achị onwe ha ga-agwụ n’isi nso. (Jeremaịa 10:23) Ị̀ ga-achọ ịmatakwu ihe Chineke zubere maka anyị? Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka ịghọta ihe ndị Bible zara maka ajụjụ ndị ahụ siiri Popu Benedict nke Iri na Isii ike ọzịza.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]

Ebe Ndebe Ihe Ochie Oświęcim