Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Chọpụta Ebe Ihe Ọjọọ Sitere!

A Chọpụta Ebe Ihe Ọjọọ Sitere!

A Chọpụta Ebe Ihe Ọjọọ Sitere!

NA NARỊ afọ mbụ, ọtụtụ ndị Juu nọ na-atụ anya ọbịbịa nke Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa. (Jọn 6:14) Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, o wetaara ndị mmadụ nkasi obi ma kụziere ha ọtụtụ ihe. Ọ gwọrọ ndị ọrịa, nye ndị agụụ na-agụ nri, kwụsị ebili mmiri na-akpa ike, ọbụna kpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. (Matiu 8:26; 14:14-21; 15:30, 31; Mak 5:38-43) Ọ gwakwara ndị mmadụ ihe Jehova kwuru ma kwe ha nkwa na ha ga-enweta ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:34) Site n’ihe ndị Jizọs kwuru na ihe ndị o mere, o gosiri nnọọ na ya bụ Mezaịa ahụ, bụ́ onye ga-eme ka ụmụ mmadụ nwere onwe ha pụọ ná mmehie na ihe ọjọọ nile ọ na-akpata.

Ndị ndú okpukpe ndị Juu kwesịdịrị ịbụ ndị mbụ ga-anabata Jizọs, gee ya ntị, ma jiri ọṅụ nakwere nduzi ya. Ma, ha emeghị otú ahụ. Kama nke ahụ, ha kpọrọ ya asị, kpagbuo ya, ma kpaa nkata igbu ya!—Mak 14:1; 15:1-3, 10-15.

Jizọs meziri emezi ịkatọ ndị ikom arụrụala ahụ. (Matiu 23:33-35) Ma, ọ makwa na e nwere onye ọzọ na-akụnye echiche ọjọọ na arụrụala n’obi ndị ikom a. Ọ gwara ha, sị: “Unu sitere ná nna unu bụ́ Ekwensu, unu na-achọkwa ime ọchịchọ nke nna unu. Onye ahụ bụ ogbu mmadụ mgbe ọ malitere, o guzosighịkwa ike n’eziokwu, n’ihi na eziokwu adịghị n’ime ya. Mgbe ọ na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu dị ka ọchịchọ obi ya si dị, n’ihi na ọ bụ onye ụgha, bụrụkwa nna nke ụgha.” (Jọn 8:44) N’agbanyeghị na Jizọs kwetara na ụmụ mmadụ nwere ikike ime omume obi ọjọọ, o kwuru kpọmkwem onye ihe ọjọọ sitere n’aka—Setan bụ́ Ekwensu.

Site n’ikwu na Setan ‘eguzosighị ike n’eziokwu,’ Jizọs mere ka ọ pụta ìhè na mmụọ a e kere eke bụbu ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, ma o mesịrị nupụrụ Chineke isi. Gịnị mere Setan ji nupụrụ Jehova isi? Ọ bụ n’ihi na onwe ya buru ya nnọọ isi ruo n’ókè nke na ọ chọwara ka a na-efe ya ofufe e kwesịrị ife nanị Chineke. *Matiu 4:8, 9.

Nnupụisi Setan pụtara ìhè n’ogige Iden mgbe o duhiere Iv ma mee ka o rie mkpụrụ osisi a sịrị ha erila. Setan mere onwe ya “nna nke ụgha” mgbe ọ ghara ụgha mbụ a ghara n’ụwa a ma kwutọọ aha Jehova. Tụkwasị na nke ahụ, mgbe ọ rafuru Adam na Iv inupụrụ Chineke isi, o mere ka mmehie na-achị ha, bụ́ nke kpataara ha ọnwụ, kpatakwa ọnwụ nke ọgbọ nile e nwere ka oge ha gasịrị. Setan si otú a mee onwe ya, “ogbu mmadụ”—n’ezie, ọ bụ ogbu mmadụ obi kasị fee azụ e nwetụrụla!—Jenesis 3:1-6; Ndị Rom 5:12.

Ike ọjọọ Setan na-akpa rudịrị n’ebe ndị mmụọ ozi bi, bụ́ ebe ọ rafuru ndị mmụọ ozi ndị ọzọ iso ya nupụ isi. (2 Pita 2:4) Dị ka Setan, ndị mmụọ ozi ndị a nwere mmasị na-ekwesịghị ekwesị n’ebe ụmụ mmadụ nọ. Nke ahụ bụ agụụ mmekọahụ rụrụ arụ n’ihi na ekeghị ha inwe mmekọahụ. Omume a ha mere kpatakwara ajọ ọdachi.

Ihe Ọjọọ Ejupụta Ụwa

Bible na-agwa anyị, sị: “Mgbe mmadụ malitere ịba ụba . . . mgbe a mụkwara ụmụ ndị inyom nye ha, na ụmụ ndị ikom nke Chineke hụrụ ụmụ ndị inyom nke mmadụ na ha mara mma; ha wee lụtara onwe ha ndị inyom site ná ndị nile ha họpụtara.” (Jenesis 6:1, 2) Olee ndị bụ “ụmụ ndị ikom nke Chineke”? Ha bụ ndị mmụọ e kere eke, ọ bụghị ụmụ mmadụ. (Job 1:6; 2:1) Olee otú anyị si mara? Otu ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ bụ na ụmụ mmadụ anọwo na-alụrịta onwe ha kemgbe ihe ruru otu puku afọ na narị afọ ise tupu mgbe ahụ nke mere na ọ bụghị ihe ọhụrụ ịga kwuwe okwu banyere ya. Ya mere, site n’ịdọrọ uche gaa ná mmekọahụ nke “ụmụ ndị ikom nke Chineke,” ndị nwoghaara ahụ́ mmadụ ma lụrụ “ụmụ ndị inyom nke mmadụ,” akụkọ ahụ na-arụtụ nnọọ aka n’otu ajọ ihe na-adịghị emebu nke merenụ.

Ihe gosiri na alụmdi na nwunye a ekwesịghị ekwesị bụ ụdị ụmụ a mụtaara ndị mmụọ ozi a. A kpọrọ ha ndị Nefilim, ha bụkwa ọkara mmụọ na ọkara mmadụ ndị tolitere ma ghọọ ndị dike. Ha malitere iji obi ọjọọ na-emeso ndị ọzọ ihe ike. N’ezie, “Nefilim” pụtara “Ndị Nkwada,” ma ọ bụ “ndị na-eme ka ndị ọzọ daa.” A kọwara ndị akpụ obi a obi fere azụ dị ka “ndị dike ahụ ndị nọrịị site na mgbe ebighị ebi gara aga, ndị a maara aha ha.”—Jenesis 6:4.

Ndị Nefilim ahụ na ndị nna ha mere ka ihe ọjọọ ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-ahụtụbeghị mbụ. Jenesis 6:11 kwuru, sị: “E bibiri ụwa n’ihu Chineke, ụwa jupụtakwara n’ihe ike.” Ee, ụmụ mmadụ ṅomiri ime ihe ike na ndụ rụrụ arụ nke ndị a si n’eluigwe bịa binyere ha.

Olee otú ndị Nefilim na ndị nna ha si nwee ike ịkpa ike dị otú a n’ahụ́ ụmụ mmadụ? Ọ bụ site n’ịkpali ụmụ mmadụ imezu ọchịchọ anụ ahụ́ ha. Gịnị si na nke a pụta? “Anụ ahụ nile. . . bibiri ụzọ ya n’elu ụwa.” Jehova mesịrị jiri Iju Mmiri zuru ụwa ọnụ bibie ụwa oge ahụ ma chebe nanị Noa na ezinụlọ ya. (Jenesis 6:5, 12-22) Otú ọ dị, ndị mmụọ ozi ahụ nwoghara onwe ha jiri ihere laghachi n’eluigwe. Ebe ha ghọrọla ndị mmụọ ọjọọ a na-ejighịzi kpọrọ ihe, ha malitere imegide Chineke na ndị mmụọ ozi na-ekwesị ntụkwasị obi n’eluigwe. O yiri ka site mgbe ahụ gaa n’ihu, Chineke gbochiri ndị ajọ mmụọ a inwoghara ahụ́ ụmụ mmadụ ọzọ. (Jud 6) Otú o sina dị, ha ka nọkwa na-akpa ike dị egwu n’ahụ́ ụmụ mmadụ.

A Gbaa Ajọ Onye ahụ n’Anwụ!

E gosiri otú Setan kparuworo ike n’ahụ́ ụmụ mmadụ na 1 Jọn 5:19, bụ́ nke na-asị: “Ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.” Ekwensu na-arabanye ụmụ mmadụ n’ihe ọjọọ n’ụzọ na-enweghị nnọọ atụ. N’ezie, o forola ntutu taa n’oge a ịhụ na ọ lara ihe nile n’iyi. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na a chụpụrụ ya na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe mgbe e guzobesịrị Alaeze Chineke na 1914. Bible buru amụma banyere nchụpụ a mgbe ọ sịrị: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa . . . , n’ihi na Ekwensu arịdakwuruwo unu, na-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.” (Mkpughe 12:7-12) Oleezi otú Setan si akpa ike n’ahụ́ ụmụ mmadụ taa?

Setan na-eme nke a site n’ịkwalite mmụọ nke na-achịkwa otú ndị mmadụ si eche echiche na otú ha si eme ihe. Ndị Efesọs 2:2 kwutere ya mgbe ọ kpọrọ Ekwensu ‘onye na-achị ikike nke ikuku ahụ, bụ́ mmụọ [ma ọ bụ àgwà juru ebe nile] nke na-arụ ọrụ ugbu a n’ime ụmụ nnupụisi.’ Kama ịkpali ndị mmadụ ịtụ egwu Chineke na ime ezi ihe, “ikuku” mmụọ ọjọọ a na-akpali ndị mmadụ inupụrụ Chineke isi. Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya si otú a na-akụnye ihe ọjọọ n’ime ụmụ mmadụ ma na-eme ka ihe ọjọọ a na-aka njọ.

“Chebe Obi Gị”

Otu ihe na-egosi na “ikuku” a na-akpa ụwa aka ọjọọ bụ otú ụmụ mmadụ si achọkarịzi ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-ezighị ezi nke na-emekwa ka omume rụrụ arụ yie ihe na-adọrọ mmasị. (1 Ndị Tesalonaịka 4:3-5) Ihe juru n’ihe nkiri ndị a na-akpali agụụ mmekọahụ bụ ebe a na-edina mmadụ n’ike, ebe a na-emekpọ mmadụ ọnụ iji gboo agụụ mmekọahụ, ebe a dị n’ìgwè na-edina otu onye n’ike, ebe mmadụ na anụmanụ na-enwe mmekọahụ na ebe a na-edina ụmụaka. Ọbụna ndị nke a sị na ha adịchaghị oké njọ na-eri ndị na-ekiri ma ọ bụ na-agụ banyere ha ahụ́ ma na-emerụ ha ahụ́. Ọ na-eme ka ahụ́ ghara izu ha ike ma ọ bụrụ na ha ekirighị ndị gba ọtọ ma ọ bụ ndị na-enwe mmekọahụ. * Ọ bụ ihe ọjọọ nke na-emebi mmekọrịta mmadụ na mmadụ ibe ya na nke ya na Chineke. Ihe ndị a na-akpali agụụ mmekọahụ na-egosi ụdị echiche rụrụ arụ nke ndị mmụọ ọjọọ na-akwalite. Ndị mmụọ ọjọọ a bụ ndị nnupụisi ahụ mejuru agụụ mmekọahụ ha rụrụ arụ tupu oge Iju mmiri nke ụbọchị Noa.

N’ihi ya, e nwere ezi ihe mere nwoke ahụ maara ihe bụ́ Solomọn ji nye ndụmọdụ, sị: “Karịa ihe ndebe gị nile chebe obi gị; n’ihi na site na ya ka mpụta nile nke ndụ dị.” (Ilu 4:23) Otu ụzọ mmadụ pụrụ isi chebe obi ya ka ihe ndị a na-akpali agụụ mmekọahụ ghara imerụ ya bụ ịgbanye TV ya n’ebe ọzọ mgbe a malitere igosi ihe ndị a ma ọ bụkwanụ gbanyụọ kọmputa mgbe ihe ndị a rụrụ arụ pụtara. Ọ dịkwa mkpa na a ga-eme nke a ozugbo n’egbughị oge! Were onwe gị dị ka onye agha na-agbalị izere mgbọ ndị a na-agba ya. Ọ bụ obi ihe atụ gị—ebe mkpali na ọchịchị gị na-esite—ka Setan na-agbalị inweta ma merụọ.

I kwesịkwara ichebe obi gị ka ọ ghara ịhụ ime ihe ike n’anya n’ihi na Ekwensu maara na “onye ọ bụla na-ahụ ihe ike n’anya ka mkpụrụ obi [Jehova] na-akpọ asị.” (Abụ Ọma 11:5) Ihe dị Setan mkpa abụghị ime ka i tinye aka n’ime ihe ike iji mee ka gị na Chineke dịrị n’iro; nanị ihe dị ya mkpa bụ ime ka ime ihe ike na-amasị gị. Ọ bụ ya mere o ji na-ahụ na ime ihe ike na anwansi juru n’ihe nkiri ndị na-ewu ewu. Ndị Nefilim anọghịzi ya, ma a ka nwere nnọọ ndị na-akpa àgwà ka ha! Ụdị ihe ntụrụndụ ndị ị na-ahọrọ, hà na-egosi na ị na-eguzogide aghụghọ Setan?—2 Ndị Kọrint 2:11.

Otú A Pụrụ Isi Guzogide Setan

Ọ pụrụ isi ike iguzogide ọchịchọ ime ihe ọjọọ. Bible kwuru na ndị na-agbalị ime ihe na-atọ Chineke ụtọ “nwere mgba . . . megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ,” tinyekwara ọgụ megide anụ ahụ́ ha na-ezughị okè. Iji merie n’ọgụ ahụ ma bụrụ ndị ha na Chineke ga-adị ná mma, anyị kwesịrị iji ihe nile Chineke na-enye anyị iji nyere anyị aka imeri n’ọgụ ahụ mee ihe.—Ndị Efesọs 6:12; Ndị Rom 7:21-25.

Otu n’ime ihe ndị a Chineke na-enye anyị bụ mmụọ nsọ, bụ́ ikike kasịnụ e nwere n’eluigwe na ụwa. Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst narị afọ mbụ akwụkwọ ozi, sị: “Anyị natara, ọ bụghị mmụọ nke ụwa, kama mmụọ nke sitere na Chineke.” (1 Ndị Kọrịnt 2:12) Ndị mmụọ nsọ Chineke na-eduzi na-amụta ịhụ ihe ndị Chineke hụrụ n’anya n’anya ma kpọọ ihe ndị ọ kpọrọ asị asị. (Emọs 5:15) Olee otú mmadụ pụrụ isi nata mmụọ nsọ? Ụzọ bụ́ isi e si enweta ya bụ site n’ikpe ekpere, ịmụ Bible—e dedịrị Bible n’onwe ya n’ike mmụọ nsọ—nakwa site n’iso ndị hụrụ Chineke n’anya na-akpakọrịta.—Luk 11:13; 2 Timoti 3:16; Ndị Hibru 10:24, 25.

Ọ bụrụ na i jiri ihe ndị a Chineke nyere anyị na-eme ihe, ọ pụtara na i yikwasịwala onwe gị “ekike agha zuru ezu nke sitere na Chineke,” bụ́ nanị ihe ga-echebe gị pụọ ná “nzupụta ọjọọ dị iche iche nke Ekwensu.” (Ndị Efesọs 6:11-18) Ọ dị mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ ka anyị jiri ihe ndị a nile na-eme ihe. N’ihi gịnị?

Ihe Ọjọọ Anọtala!

Ọbụ abụ ahụ sịrị: “Mgbe ndị na-emebi iwu na-ama akwụkwọ dị ka ihe ọkụkụ, mgbe ndị nile nke na-arụ ajọ ihe na-awakwa okooko osisi; ọ bụ ka e wee kpochapụ ha ruo mgbe nile ebighị ebi.” (Abụ Ọma 92:7) Ee, dị ka ọ dị n’ụbọchị Noa, otú ihe ọjọọ si ju ebe nile taa na-egosi na oge ikpe Chineke eruwela, ọ bụghị nanị megide ndị ajọ mmadụ kamakwa megide Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, bụ́ ndị a ga-atụba n’Abis ebe ha na-agaghị enwe ike ịkpa ike ọ bụla ọzọ ruo mgbe a ga-emesị bibie ha kpamkpam. (2 Timoti 3:1-5; Mkpughe 20:1-3, 7-10) Ònye ga-eme nke a? Ọ dịghị onye ọzọ ọ bụ ma ọ bụghị Jizọs Kraịst, bụ́ onye anyị na-agụ banyere ya, sị: “N’ihi nzube a ka e mere ka Ọkpara Chineke pụta ìhè, ya bụ, iji tipịasịa ọrụ Ekwensu.”—1 Jọn 3:8.

Ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike ka e kpochapụ ihe ọjọọ nile? Ọ bụrụ otú ahụ, nkwa ndị e dekọrọ na Bible pụrụ ịkasi gị obi. Ọ dịghị akwụkwọ ọzọ nke na-akọrọ anyị onye ihe ọjọọ sitere n’aka ya, nke bụ́ Setan, ọ dịghịkwa akwụkwọ ọ bụla ọzọ na-akọrọ anyị otú a ga-esi kpochapụ ya na ajọ ọrụ ya nile kpamkpam ma ọ bụghị Bible. Anyị na-agba gị ume ka i nweta ezi ihe ọmụma nke Bible ka i wee nwee ike ịgbanahụ ike ọjọọ nke Setan na-akpa n’ahụ́ ụmụ mmadụ ugbu a ma nwee olileanya nke ịdị ndụ n’ụwa ebe ihe ọjọọ na-agaghị adị.—Abụ Ọma 37:9, 10.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 A maghị ihe bụ ezigbo aha mmụọ ozi ahụ mesịrị ghọọ Setan. Okwu ahụ bụ́ “Setan” na “Ekwensu” pụtara “Onye Nguzogide” na “Onye Nkwutọ.” Àgwà Setan nwere otú o si yie àgwà eze Taịa oge ochie. (Ezikiel 28:12-19) Ha abụọ na-emebu nke ọma tupu mpako ha emee ka ha malite ịkpa àgwà ọjọọ.

^ par. 17 Lee usoro isiokwu bụ́ “Ihe Ndị Na-akpali Agụụ Mmekọahụ—Hà Na-emerụ Ahụ́ Ka Ọ̀ Bụ na Ha Adịghị Emerụ Ahụ́?” ndị dị na Teta! nke August 8, 2003, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

Akụkọ Ifo Ndị Nwetụrụ Eziokwu

N’ebe nile n’ụwa, e nwere akụkọ ifo oge ochie ndị na-akọ banyere ndị yiri chi, ndị dike, na oké idei mmiri mebiri ihe. Dị ka ihe atụ, ihe odide Akkadian bụ́ Epic of Gilgamesh kọrọ banyere oké idei mmiri, ụgbọ mmiri, na ndị lanarịrịnụ. A kọwara Gilgamesh n’onwe ya dị ka onye bụ ọkara mmadụ na ọkara mmụọ nke nwere oké agụụ mmekọahụ rụrụ arụ ma na-eme ihe ike. Ndị Aztec nwere akụkọ ifo na-akọ banyere otu ụwa e nwere n’oge ochie nke ndị dike bi na ya, nakwa banyere otu oké iju mmiri. Akụkọ ifo ndị Norse na-akọkwa banyere otu agbụrụ ndị dike na banyere otu nwoke maara ihe a na-akpọ Bergelmir, bụ́ onye wuru otu nnukwu ụgbọ mmiri iji chebe onwe ya na nwunye ya. Akụkọ a nile nwere ihe jikọrọ ha na akụkọ dị na Bible nke na-akọ na mmadụ nile sitere ná ndị lanarịrị otu oké iju mmiri nke bibiri ajọ ụwa dị n’oge ochie.

[Foto]

Nkume e dere akụkọ ahụ bụ́ Epic of Gilgamesh

[Ebe E Si Nweta Foto]

The University Museum, University of Pennsylvania (neg. # 22065)

[Foto dị na peeji nke 5]

Ndị mmadụ ka na-akpa àgwà taa ka ndị Nefilim

[Foto dị na peeji nke 7]

Ezi ihe ọmụma na-enyere anyị aka ịgbanahụ ike ọjọọ Setan na-akpa n’ahụ́ ụmụ mmadụ