Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ihe Ilu 22:6 kwuru ọ̀ na-egosi na ọ bụrụhaala na a zụọ ụmụ Ndị Kraịst nke ọma, ọ dịghị ihe ọ bụla ga-eme ka ha hapụ Jehova?

Amaokwu ahụ na-agụ, sị: “Zụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị, ọbụna mgbe o mere okenye ọ gaghị esi n’ime ya wezụga onwe ya.” Dị nnọọ ka ọnụ ji na-etoro agawa ebe a rọlara ya mgbe ọ dị nnọọ obere, otú ahụ ka o yikarịrị ka ụmụaka a zụrụ nke ọma hà ga-anọgide na-ejere Jehova ozi mgbe ha toro. Nne ma ọ bụ nna ọ bụla maara na ọzụzụ dị otú a chọrọ oge na mgbalị dị ukwuu. Iji nyere ụmụ ha aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst, ndị nne na nna aghaghị iji nlezianya na-ezi ụmụ ha ihe, na-adụ ha ọdụ, na-agba ha ume, na-adọ ha aka ná ntị, ma na-esetịpụrụ ha ezi ihe nlereanya. Ha ga-anọgide jiri ịhụnanya na-eme nke a ruo ọtụtụ afọ.

Ma nke a ọ̀ pụtara na ọ bụ ndị nne na nna ka a ga-ata ụta ma ọ bụrụ na nwata emesịa kwụsị ijere Jehova ozi? N’ọnọdụ ụfọdụ, o nwere ike ịbụ na ndị nne na nna ụfọdụ emechaghị ihe ha kwesịrị ime iji zụlite ụmụ ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova. (Ndị Efesọs 6:4) Ma, ilu ahụ adịghị ekwu na inye nwata ezi ọzụzụ ga-emerịrị ka ọ nọgide jiri ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Chineke ozi. Ndị nne na nna apụghị ime ka ụmụ ha na-ebi ndụ otú ọ bụla ha chọrọ ka ha si na-ebi. Ụmụaka, dịkwa ka ndị okenye, nweere onwe ha ịhọrọ ihe ha ga-eme, ọ bụkwa ha ga-ahọrọ ụdị ndụ ha ga-ebi. (Deuterọnọmi 30:15, 16, 19) N’agbanyeghị mbọ nile ndị nne na nna na-agba, ụfọdụ ụmụaka na-akwụsị ife Jehova, dị nnọọ ka Solomọn, bụ́ onye dere amaokwu Bible a anyị na-atụle, mesịrị mee. Ọbụna Jehova nwere ụmụ ya ndị kwụsịrị ikwesị ntụkwasị obi nye ya.

N’ihi ya, akụkụ Akwụkwọ Nsọ a adịghị ekwu na nwata ‘agaghị ahapụ’ ọzụzụ e nyere ya ma ọlị, kama ihe ọ na-ekwu bụ na ịzụ nwata nke ọma na-arụpụtakarị ihe dị mma. Nke a bụụrụ nnọọ ndị nne na nna ihe na-agba ume! Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị inwe obi ike na mgbalị ndị ha na-eme ịzụ ụmụ ha n’ụzọ nke Jehova ga-amịpụta ezi mkpụrụ. Ebe ọ bụ na ọrụ ha dị oké mkpa, bụrụkwa na ha nwere ike ịkpali ụmụ ha ime nke ọma, a gbara ndị nne na nna ume ka ha ghara iji ọrụ ha gwurie egwu.—Deuterọnọmi 6:6, 7.

Ọ bụrụgodị na ụmụaka akwụsị ijere Jehova ozi, ndị nne na nna tinyere nnọọ mgbalị dị ukwuu n’ịzụ ha, kwesịrị inwe olileanya na otu ụbọchị nwa ahụ ga-alaghachikwute Jehova. Eziokwu Bible dị ike, ọ na-esikwa ike e chefuo ọzụzụ ndị nne na nna nyere.—Abụ Ọma 19:7.