Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Anyị Kpebisiri Ike Ijezu Ozi Anyị

Anyị Kpebisiri Ike Ijezu Ozi Anyị

Akụkọ Ndụ

Anyị Kpebisiri Ike Ijezu Ozi Anyị

Dị ka Lena Davison si kọọ

Ka anyị nọ n’ụgbọelu anyị ji na-aga ebe ọhụrụ e kenyere anyị ọrụ, ọkwọ ụgbọelu anyị kwuwere okwu ka onye na-anwụ anwụ, sị: “Anya mụ oo! Anaghị m ahụkwa ụzọ.” Obere oge o kwuchara nke a, aka ya chịpụrụ n’ihe o ji na-eduzi obere ụgbọelu anyị nọ na ya ma tụbọọ n’oche ya. Di m, bụ́ onye na-amatụghị otú e si akwọ ụgbọelu, gbalịrị ike ya nile ime ka o nwetaghachi onwe ya. Tupu mụ akọọ otú anyị si gbanahụ ọnwụ a, ka m kọgodi ihe mere anyị ji banye n’ụgbọelu ahụ na-aga Papua New Guinea, nke bụ́ otu n’ime obodo ndị kasị dị n’ime ime n’ụwa.

A MỤRỤ m n’Australia na 1929, ma ọ bụ na Sydney, bụ́ isi obodo New South Wales, ka m nọ too. Papa m bụ́ Bill Muscat bụ onye ọchịchị Kọmunist. Ọ bụkwa ihe iju anya na o kweere na Chineke. Na 1938, o kwetadịrị ịbịanye aka n’akwụkwọ e ji na-arịọ gọọmenti ka ha kwe ka Joseph F. Rutherford, onye si n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova, bịa kwusaa ozi ọma n’Ụlọ Ezumezu dị na Sydney.

N’oge ahụ, papa m gwara anyị, sị: “Ọ ga-enwerịrị ihe dị mkpa ọ ga-ekwu.” Ka afọ asatọ gasịrị, anyị ghọtara isi ihe dị n’ozi ọma ahụ ọ bịara kwusaa. Papa m kpọrọ Norman Bellotti, onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova, ka ọ bịa n’ụlọ anyị ka anyị na ya kwurịta ihe ndị sitere na Bible. Ezinụlọ anyị nabatara eziokwu Bible ngwa ngwa, ọ dịghịkwa anya anyị amalite ikerechi òkè anya n’ozi ọma.

N’etiti afọ 1940, akwụsịrị m ịga akwụkwọ iji nyere mama m bụ́ onye nọ n’ute ọrịa aka. Amalitekwara m ịkwa àkwà iji na-enyere onwe m aka. N’abalị Saturday, mụ na nwanne m nwanyị bụ́ Rose na-esonyere ndị ọsụ ụzọ gaa gbaa àmà n’okporo ámá ndị dị gburugburu Ụlọ Ezumezu Sydney. Na 1952, nwanne m nwoke nke okenye bụ́ John, gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ Gilead dị na United States, e zigakwa ya Pakistan ije ozi ebe ahụ. Achọrọ m ịgbaso ihe nlereanya ya n’ihi na enwekwara m mmasị n’ozi oge nile. N’ihi ya, n’afọ 1953, aghọrọ m onye ọsụ ụzọ oge nile.

Ịlụ Di na Ije Ozi Ala Ọzọ

Obere oge ka m ghọsịrị onye ọsụ ụzọ, amatara m John Davison, bụ́ onye na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’Australia. Ịdị umeala n’obi ya, àgwà ọma ya, na otú o si e ji obi ike arụ ọrụ masịrị m nnọọ. N’oge a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, a tụrụ ya mkpọrọ ugboro atọ n’ihi na o kweghị aga agha. Mụ na ya kpebiri na ikwusa ozi ọma ga-abụ ihe anyị ga-anọgide na-arụ ná ndụ anyị.

Mụ na John gbara akwụkwọ na June 1955. Anyị zụụrụ bọs anyị chọrọ ịrụgharị ka ọ bụrụ ụlọ a ga na-ebugharị ebugharị. Ihe mere anyị ji zụrụ ya bụ ka anyị jiri ya na-aga ekwusa ozi ọma n’ebe ndị dị n’ime ime n’Australia. N’afọ sochirinụ, a rịọrọ ma è nwere Ndịàmà ga-ekwe aga New Guinea, bụ́ nke dị n’ebe ugwu nke otu nnukwu agwaetiti dị n’ebe ugwu Australia. * E kwusarubeghị ozi ọma n’obodo a. Ozugbo ahụ, anyị kwetara ịga.

N’oge ahụ, nanị ihe ga-eme ka e kwe ka mmadụ bata na New Guinea bụ ma onye ahụ ò nwetara ọrụ ọ ga na-arụ n’obodo ahụ, n’ihi ya, di m bụ́ John malitere ịchọ ọrụ. N’oge na-adịghị anya, o nwetara ọrụ n’otu ụlọ ọrụ na-awa osisi na New Britain, nke bụ́ otu agwaetiti dị nnọọ obere nke so na New Guinea. Ka ọtụtụ izu gasịrị, anyị gawara ebe ọhụrụ a di m nwetara ọrụ, ma ruo Rabaul, New Britain na July 1956. Anyị nọrọ abalị isii n’ebe ahụ ka anyị na-eche ụgbọ mmiri ga-ebuga anyị Waterfall Bay.

Ozi Anyị Jere na Waterfall Bay

Ka anyị tasịrị nnọọ ahụhụ n’ụgbọ mmiri ruo ọtụtụ ụbọchị, anyị rutere Waterfall Bay, nke bụ́ nnukwu isi mmiri dị ihe dị ka narị kilomita abụọ na iri anọ site n’ebe ndịda Rabaul. N’ebe a, e nwere otu nnukwu njin e ji awa osisi nke a rụrụ n’otu oké ọhịa. N’uhuruchi ụbọchị ahụ, ka ndị nile na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ahụ nọdụrụ gburugburu tebụl e ji eri nri, manịja ụlọ ọrụ ahụ kwuru, sị, “Ehee, maazị Davison na oriakụ ya, otu iwu e tiri n’ụlọ ọrụ a bụ na ndị nile e were ọrụ ebe a ga-ekwu okpukpe ha na-ekpe.”

O doro anyị anya na ọ dịghị iwu ọ bụla dị otú ahụ e tiri, ma anyị ghọtara na ihe mere ha ji na-enyo anyị enyo bụ n’ihi na anyị jụrụ ise siga. Ka o sina dị, di m zara ya, sị, “Anyị bụ Ndịàmà Jehova.” Ebe nile dara jụụ mgbe o kwuru nke a. Ndị ọrụ ahụ so lụọ Agha Ụwa nke Abụọ, ha kpọkwara Ndịàmà asị n’ihi na ha esoghị lụọ agha ahụ. Site mgbe ahụ ha nụrụ na anyị bụ Ndịàmà gaa n’ihu, ha bidoro chọwa ohere ọ bụla ha ga-eji mee ka ihe na-esiri anyị ike.

Ihe mbụ manịja ahụ mere bụ ịjụ ibunye anyị friji na stovu, n’agbanyeghị na o kwesịrị ibunye anyị ha. Nke a mere ka ihe oriri anyị ndị nwere ike imebi emebi mebisịa, meekwa ka anyị jiri otu stovu mebiri emebi anyị butere n’oké ọhịa ahụ na-esi nri. Ihe ọzọ o mere bụ ịgwa ndị nwe ala ka ha kwụsị iresị anyị akwụkwọ nri na mkpụrụ osisi, nke a mere ka anyị na-erizi akwụkwọ nri na mkpụrụ osisi ọ bụla anyị nwere ike inwetali. Ebe ọ bụla anyị gara, a na-ewere anyị dị ka ndị nledo ma na-ele ma è nwere onye anyị ga-akụziri Bible. Ka oge na-aga, ịba jituru m.

N’agbanyeghị ihe a nile, anyị kpebisiri ike ijezu ozi anyị. N’ihi ya, anyị rịọrọ ụmụ okoro abụọ bụ́ ndị obodo ahụ na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ a na-awa osisi, bụ́kwa ndị maara asụ Bekee, ka ha kụziere anyị Melanesian Pidgin, nke bụ́ asụsụ ndị obodo ahụ. Anyị na-amụrụ ha Bible ka ha na-akụziri anyị Melanesian Pidgin. Ná ngwụsị izu, anyị na-akpagharị nnọọ ọtụtụ ebe, na-eme ka à ga-asị na anyị na-aga ikiri ebe ndị mara mma n’obodo ahụ. Ka anyị na-aga, anyị na-eji akọ agbara onye ọ bụla anyị hụrụ n’obodo ahụ àmà; ndị anyị na-amụrụ Bible na-akọwara ha ihe ndị anyị na-ekwu. Anyị na-agafe osimiri ndị na-asọsi nnọọ ike, hụkwa ọtụtụ agụ iyi ndị na-anya anwụ n’akụkụ mmiri ndị ahụ. E wezụga otu oge ọ fọrọ nke nta ka agụ iyi ndị ahụ taa anyị, ọ dịghị mgbe ọ bụla ọzọ ha nyere anyị nsogbu.

Imepụta Ngwá Ọrụ Ndị E Ji Akụzi Ihe

Ka ozi anyị na-amụba, anyị kpebiri idepụta ozi ndị dị mfe site na Bible ma kesaara ya ndị nwere mmasị. Ọ bụ ndị anyị na-amụrụ Bible n’ebe ahụ a na-awa osisi nyeere anyị aka ịsụgharị ndị mbụ n’ime ihe ndị a anyị dere. Anyị jiri ọtụtụ abalị dee ọtụtụ narị traktị ma kesaara ha ndị obodo ahụ na ndị ji ụgbọ mmiri na-agafe.

Na 1957, John Cutforth, bụ́ onye ozi na-ejegharị ejegharị nwere ahụmahụ, bịara leta anyị nleta na-agba ume. * Ọ tụụrụ anyị aro na iji ihe osise ezi ihe bụ ụzọ dị irè a pụrụ isi kụziere ndị na-enweghị ike ịgụ ihe eziokwu Bible. Ya na di m sere ọtụtụ ihe ndị dị mfe nghọta iji kọwaa ozizi Bible ndị bụ́ isi. Ka e mesịrị, anyị jiri ọtụtụ awa segharịa ihe osise ndị a n’ime akwụkwọ e ji ede ihe. Anyị nyere ndị anyị na-amụrụ Bible otu otu, bụ́ nke onye nke ọ bụla n’ime ha na-ejikwa ezi ndị ọzọ ozi ọma. E mechara jiri ụzọ izi ihe a na-ezi ihe n’obodo ahụ nile.

Ka anyị nọsịrị afọ abụọ na ọkara na Waterfall Bay, anyị nọzuru afọ ole anyị kwuru na anyị ga-arụ ọrụ n’obodo ahụ, anyị nwetaziri akwụkwọ ikike iji nọwazie n’obodo ahụ. Ya mere, mgbe a kpọrọ anyị ịmalite ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche, anyị nabatara ya.

Ịlaghachi Rabaul

Ka anyị nọ n’ụgbọ mmiri na-aga Rabaul, bụ́ obodo nọ n’ebe ugwu, ụgbọ anyị kwụsịrị ịnọ otu abalị n’otu ebe a na-emepụta mmanụ akị bekee na ọgbọ koko nke dị na Wide Bay. Ndị nwe ebe ahụ bụ otu di na nwunye merela agadi. Ha gwara di m ka o lekọtawa ebe ahụ n’ihi na ha chọrọ ịlaghachi Australia. Ọrụ a na-adọ nnọọ akpịrị, ma mgbe anyị kwurịtachara ya n’abalị ahụ, anyị kwekọrịtara na ihe mere anyị ji bịa New Guinea abụghị ịchụ ego. Anyị kpebisiri ike ijezu ozi anyị dị ka ndị ọsụ ụzọ. N’ihi ya mgbe chi bọrọ, anyị gwara di na nwunye ahụ mkpebi anyị ma banyeghachi n’ụgbọ mmiri bugara anyị Rabaul.

Mgbe anyị rutere Rabaul, anyị sonyeere obere ìgwè Ndịàmà ndị ọzọ bịakwara abịa n’obodo ahụ. Ozi Alaeze ahụ masịrị nnọọ ndị obodo ahụ, anyị malitekwara ịmụrụ ọtụtụ ndị Bible. Ka ọ dịgodị, anyị na-enwe ọmụmụ ihe Ndị Kraịst n’otu ụlọ ezumezu anyị na-akwụ ụgwọ ya, ihe rukwara otu narị mmadụ na iri ise na-adị na-abịa. Ọtụtụ n’ime ndị a nabatara eziokwu ahụ ma nye aka gbasaa ozi ọma nke Alaeze Chineke n’akụkụ ndị ọzọ nke obodo ahụ.—Matiu 24:14.

Anyị gakwara Vunabal, nke bụ́ obodo dị ihe dị ka iri kilomita ise site na Rabaul, bụ́ ebe ndị mmadụ gosiri nnọọ mmasị n’eziokwu Bible. N’oge na-adịghị anya, otu onye Katọlik a ma ama n’obodo ahụ matara ihe na-aganụ. Ya na ndị enyi ya bụ́kwa ndị Katọlik kwụsịrị ọmụmụ ihe ahụ anyị na-enwe kwa izu ma chụpụ anyị n’obodo ahụ. Mgbe anyị chọpụtara na a ga-enwekwa nsogbu n’izu ọzọ, anyị gwara ndị uwe ojii ka ha soro anyị.

N’ụbọchị ahụ, ndị Katọlik jupụtara nnọọ n’ụzọ anyị sị agafe na-akparị anyị. Ọtụtụ n’ime ha na-achọ ịtụ anyị nkume. Ka ihe a nọ na-eme, otu onye ụkọchukwu ebula ụzọ kpọkọta ọtụtụ narị ndị obodo ahụ. Ndị uwe ojii ahụ gwara anyị na anyị nwere ikike inwe ọmụmụ ihe anyị, n’ihi ya ha siri n’etiti igwe mmadụ ahụ gbuwaara anyị ụzọ ka anyị gafere. Ma ozugbo anyị malitere ọmụmụ ihe, onye ụkọchukwu ahụ kpaliri ìgwè mmadụ ahụ ime oké ụ̀zụ̀. Ndị uwe ojii ahụ enwelighị ike ịkwụsị nke a; n’ihi ya, onyeisi ndị uwe ojii ahụ gwara anyị ka anyị kwụsị ọmụmụ ihe ahụ ma mee ngwa duga anyị n’ebe ụgbọala anyị nọ.

Ìgwè mmadụ ahụ iwe ji gbara anyị gburugburu, na-akpọ anyị iyi, na-agbụ anyị asọ ma na-esiri anyị aka ọkpọ, onye ụkọchukwu ahụ guzooro gbakụọ aka ya na-achị ọchị. Mgbe anyị gbapụrụ ebe ahụ, onyeisi ndị uwe ojii ahụ kwuru na ọ bụ ọnọdụ kasị njọ ya hụtụrụla. Ọ bụ ezie na ọtụtụ n’ime ndị nọ na Vunabal kwụsịrị iso anyị n’ihi na ha na-atụ ìgwè ahụ na-eme ihe ike ụjọ, otu onye m na-amụrụ Bible ji obi ike nabata eziokwu banyere Alaeze ahụ. Kemgbe ahụ, ọtụtụ narị ndị ọzọ nọ na New Britain anọgidesiwo ike n’eziokwu ahụ.

Ije Ozi na New Guinea

Na November 1960, e zigara anyị Madang nke bụ́ nnukwu obodo nọ n’ebe ugwu New Guinea, agwaetiti bụ́ isi n’obodo ahụ. N’ebe ahụ, ọtụtụ ndị kpọrọ mụ na di m ka anyị bịa rụwara ha ọrụ anyị ga na-arụ ụbọchị nile. Otu ụlọ ọrụ gwara m ka m na-elekọta ụlọ ahịa ha na-anọ ere uwe. Nke ọzọ chọrọ ka m na-adụziri ha ákwà ha. Ọbụna ụfọdụ ụmụ nwanyị bịara abịa n’obodo ahụ chọrọ imepere m ebe m ga-anọ na-akwa ákwà. Ma ebe ọ bụ na anyị maara ihe mere anyị ji bịa n’obodo ahụ, anyị jiri nwayọọ jụ ihe ndị a nile nakwa ihe ndị ọzọ ha kwuru na ha ga-emere anyị.—2 Timoti 2:4.

Ọtụtụ ndị gere anyị ntị na Madang, n’oge na-adịghịkwa anya a bịara nwee ọgbakọ na-eme nke ọma n’obodo ahụ. Anyị na-adị eji ụkwụ na ọgba tum tum aga ozi ọma, na-anọ ọtụtụ ụbọchị n’ebe ndị dị nnọọ n’ime ime n’obodo ahụ. Anyị na-eji achara anyị gbutere n’ime ọhịa mete ihe ndina n’ime ụlọ ájá ndị mmadụ na-ebikwaghị na ha bụ́ ndị anyị hụrụ n’akụkụ ụzọ. Nanị ihe ndị anyị na-eji aga bụ nri ndị dị ná mkpọ, biskiiti na ákwà e ji egbochi anwụnta.

N’otu n’ime njem ndị ahụ anyị mere, anyị gara leta ìgwè ndị nwere mmasị na Talidig, nke bụ́ obodo dị ihe dị ka kilomita iri ise site n’ebe ugwu Madang. Ka ìgwè ahụ na-enwe ọganihu n’eziokwu Bible, onyeisi ụlọ akwụkwọ nke otu ụlọ akwụkwọ praịmarị dị n’obodo ahụ kwụsịrị ha ịdị na-anọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ na-amụ Bible. Ka e mechara, ọ kpaliri ndị uwe ojii imebisị ụlọ ha ma chụba ha n’ime ọhịa. Ma otu onye agbata obi ha bụ́ chiifu kwere ka ìgwè ahụ biri n’ala ya. Ka oge na-aga, chiifu a nwere obi ọma nakweere eziokwu Bible, a rụọkwa Ụlọ Nzukọ Alaeze ọgbara ọhụrụ n’ebe ahụ.

Ọrụ Nsụgharị na Ọrụ Njegharị

Nanị afọ abụọ ka anyị rutesịrị New Britain na 1956, a kpọrọ mụ na di m ịbịa sụgharịa ọtụtụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’asụsụ Melanesian Pidgin. Anyị rụgidere nke a ruo ọtụtụ afọ. Na 1970, a kpọrọ anyị ịbịa biri n’alaka ụlọ ọrụ dị na Port Moresby, nke bụ́ isi obodo Papua New Guinea, ịrụ ọrụ nsụgharị. Anyị kụzikwaara ndị mmadụ asụsụ n’ebe ahụ.

Na 1975 anyị laghachiri New Britain ma jee ozi dị ka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị. N’ime afọ iri na atọ sochirinụ, anyị jiri ụgbọelu, ụgbọ mmiri, ụgbọala na ụkwụ gazuo ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ akụkụ nile nke obodo ahụ. Anyị nwetara ọtụtụ ahụmahụ ndị na-emenye ụjọ n’ụzọ, tinyere ihe ahụ m kọrọ ná mmalite isiokwu a. N’oge ahụ, ka anyị rutewere Kandrian nke bụ́ ebe ụgbọelu na-ada na New Britain, ọkwọ ụgbọelu anyị tụbọrọ n’ihi afọ okuko mesiri ya nnọọ ike. Ụgbọelu ahụ malitere ifegharị nnọọ gburugburu n’ihi na e tinyere ya n’ebe ọ ga-eji aka ya na-efegharị. Ka anyị nọ na-agba gburugburu n’elu na-enweghị onye enyemaka ọ bụla, John mere ihe nile o nwere ike ime iji mee ka ọkwọ ụgbọelu ahụ nweta onwe ya. Ka e mechara, o nwetara onwe ya ma malite ịhụtụ ụzọ bụ́ nke nyeere ya aka ifeda ụgbọelu ahụ n’ike. Ozugbo ụgbọelu anyị ruru ala, ya atụbọọ ọzọ.

E Nwee Ọrụ Ọzọ A Ga-arụ

Na 1988 e zigara anyị Port Moresby ịga lekọta ọrụ nsụgharị nọ na-amụba n’ike n’ike n’alaka ụlọ ọrụ ahụ. Anyị dị ihe dị ka mmadụ iri ise bi ma na-arụ ọrụ dị ka otu ezinụlọ n’alaka ụlọ ọrụ ahụ, anyị nọkwara n’ebe ahụ zụọ ndị nsụgharị ọhụrụ. E nyere onye ọ bụla n’ime anyị otu obere ọnụ ụlọ. Mụ na di m kpebiri ịdị na-eghewe ọnụ ụzọ anyị oghe ka ndị ezinụlọ Betel na ndị bịara nleta nwee ike kwụsị ka anyị na ha matakwuo. Anyị na ndị ezinụlọ Betel bịara dịrị nnọọ n’ezigbo mma, onye ọ bụla hụkwara ibe ya n’anya ma dị njikere inyerịtara ibe ya aka.

Na 1993, ọrịa nkụchi obi gburu di m. Ọ dị m ka otu akụkụ ahụ́ m ọ̀ nwụrụ. Anyị bụ di na nwunye ruo iri afọ atọ na asatọ, jirikwa afọ ndị a nile jekọọ ozi ọnụ. Ọ bụ ezie na di m anwụọla, m ka kpebisiri ike na site n’ike Jehova, m ka ga-anọgide na-eje ozi m. (2 Ndị Kọrịnt 4:7) Ọnụ ụzọ m ka na-eghe oghe, ndị na-eto eto ka na-abịakwa eleta m. Ụdị mkpakọrịta a na-ewuli elu enyeworo m aka ịnọgide na-enwe olileanya.

Na 2003, e zighachiri m n’alaka ụlọ ọrụ dị na Sydney, Australia n’ihi na ahụ́ esichaghịzi m ike. Ugbu a, adị m iri afọ asaa na asaa, m ka na-ejekwa ozi ná Ngalaba Nsụgharị site n’ụtụtụ ọrụ na-amalite ruo mgbe ọ na-agbasa n’uhuruchi, m na-agachikwa ozi ọma anya. Ana m enwe obi ụtọ mgbe nile ka m na-ahụ ndị enyi m, ndị m nyeere aka ịbata n’ọgbakọ nakwa ndị ndị ahụ m nyere aka nyeere aka.

Ọnụ ụzọ ụlọ m na Betel ka ghekwara oghe, m na-enwekarịkwa ndị na-abịa eleta m. N’eziokwu, mgbe ọ bụla ọnụ ụzọ ụlọ m mechiri, ndị mmadụ na-akụkarị aka iji mara ihe merenụ. Ruo ogologo oge nile m ga-adị ndụ, m kpebisiri ike ịnọgide na-ejezu ozi m, kpebisiekwa ike ife Chineke m, bụ́ Jehova.—2 Timoti 4:5.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 E kewara ebe ọwụwa anyanwụ nke agwaetiti ahụ ụzọ abụọ n’oge ahụ—Papua, bụ́ nke dị n’ebe ndịda, na New Guinea, bụ́ nke dị n’ebe ugwu. Taa, a na-akpọ ebe ọdịda anyanwụ nke agwaetiti a Papua, o so n’Indonesia, ma a na-akpọ ebe ọwụwa anyanwụ ya, Papua New Guinea.

^ par. 19 Iji gụọ banyere akụkọ ndụ John Cutforth, lee Ụlọ Nche (Bekee) nke June 1, 1958, peeji nke 333 ruo 336.

[Map ndị dị na peeji 18]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

NEW GUINEA

AUSTRALIA

Sydney

INDONESIA

PAPUA NEW GUINEA

Talidig

Madang

PORT MORESBY

NEW BRITAIN

Rabaul

Vunabal

Wide Bay

Waterfall Bay

[Ebe E Si Nweta Foto]

Map na ụwa: Site n’aka NASA/Visible Earth imagery

[Foto dị na peeji nke 17]

Mụ na di m bụ́ John ná mgbakọ e nwere na Lae, New Guinea na 1973

[Foto dị na peeji nke 20]

N’alaka ụlọ ọrụ dị na Papua New Guinea, 2002