Ibi Úgwù Ọ̀ Bụ Ihe E Ji Ama Onye Bụ́ Nwoke n’Ezie?
Ibi Úgwù Ọ̀ Bụ Ihe E Ji Ama Onye Bụ́ Nwoke n’Ezie?
N’ỌTỤTỤ ebe n’ụwa, a na-ebi ụmụ nwoke a mụrụ ọhụrụ úgwù iji chebe ha pụọ n’ọrịa ụfọdụ. N’ebe ndị ọzọ, a dịghị ebi ụmụ nwoke úgwù ma ọlị. Nye ụfọdụ, dị ka ndị Juu na ndị Alakụba, ibi úgwù abụghị nanị ihe a na-eme iji zere ọrịa; ha na-eme ya n’ihi na ọ bụ ihe okpukpe ha chọrọ.
Otú ọ dị, ná mba ụfọdụ, a na-ebi nwatakịrị nwoke úgwù mgbe o toruru ogo mmadụ. A na-emekarị nke a site n’ịkpọga nwa ahụ n’ụlọ akwụkwọ a na-akụzi ihe banyere ọdịnala, bụ́ ebe a na-anọ bie ya úgwù ma kpọpụ ya iche ruo izu ụfọdụ, ọ na-anọgide n’ebe ahụ ruo mgbe ọnyá ya lara. N’oge a a kpọpụrụ ya iche, nwatakịrị nwoke ahụ na-anọ n’ebe ahụ eme ihe ụfọdụ omenala chọrọ, a na-akụzikwara ya ụzọ e si aghọ dimkpa. Ọ̀ dị mkpa na a ga-ebirịrị nwatakịrị nwoke ụdị úgwù a iji gosi na o toruola nwoke? Ka anyị lee ihe Bible kwuru banyere otú Chineke si ele okwu a anya.—Ilu 3:5, 6.
Otú Chineke Si Ele Ibi Úgwù Anya
Ụfọdụ ndị n’oge ochie, dị ka ndị Ijipt, na-ebi úgwù. Otú ọ dị, e nweghị ụdị omenala a n’obodo ebe a mụrụ Ebreham. N’ezie, e bighịdị ya úgwù ruo mgbe o mere agadi. Ma Ebreham mere ihe gosiri na ọ bụ dike n’agbanyeghị na e bighị ya úgwù. Ọ kpọ nanị mmadụ ole na ole chụsoo ndị agha nke ndị eze anọ kpụụrụ nwa nwanne ya bụ́ Lọt ma merie ha. (Jenesis 14:8-16) Ka ihe dị ka afọ iri na anọ gasịrị, Chineke gwara Ebreham ka o bie úgwù, ọ gwakwara ya bie nwoke ọ bụla nọ n’ụlọ ya úgwù. Gịnị mere Chineke ji gwa ya ka o mee otú a?
Nke a abụghị iji gosi na Ebreham esila na nwata ghọọ nwoke tozuru okè. N’ihi na ọ dị iri afọ itolu na itolu mgbe ahụ. (Jenesis 17:1, 26, 27) Chineke kwuru ihe mere o ji nye ya iwu ahụ, sị: “A ga-ebi unu úgwù n’anụ ahụ nke apị́ unu; ọ ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọgbụgba ndụ dị n’etiti Mụ na unu.” (Jenesis 17:11) Ọgbụgba ndụ ahụ Chineke na Ebreham gbara gụnyere nkwa Chineke bụ́ na a ga-emecha si n’Ebreham gọzie “agbụrụ nile nke ụwa.” (Jenesis 12:2, 3) N’ihi ya, n’anya Chineke, o nweghị ihe ọ bụla jikọrọ ibi úgwù na mmadụ itozu nwoke. Ihe mere e ji bie úgwù n’oge ahụ bụ iji gosi na onye ahụ e biri úgwù bụ onye Izrel nke si n’agbụrụ Ebreham, bụ́ ndị nwere ihe úgwù nke ịbụ ndị ‘e nyefere okwu dị nsọ nke Chineke n’aka.’—Ndị Rom 3:1, 2.
Ka oge na-aga, mba Izrel gosiri na ha erughịkwa eru ka a tụkwasị ha obi mgbe ha jụrụ ezi Mkpụrụ Ebreham bụ́ Jizọs Kraịst. N’ihi ya, Chineke jụrụ ha, ibi úgwù ha enweghịkwa ihe ọ bụla ọzọ ọ pụtara n’anya Chineke. Ma, ụfọdụ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ siri ọnwụ na-ekwu na Chineke ka chọrọ ka a na-ebi mmadụ úgwù. (Ọrụ 11:2, 3; 15:5) N’ihi ya, Pọl onyeozi zigara Taịtọs ka ọ gaa ‘dozie ihe ndị gahiere agahie’ n’ọgbakọ dị iche iche. Mgbe Pọl degaara Taịtọs akwụkwọ, ọ gwara ya banyere otu n’ime ihe ndị a gahiere agahie, sị: “E nwere ọtụtụ ndị isi ike, ndị na-ekwu okwu na-abaghị uru, na ndị na-eduhie uche, karịsịa ndị ahụ na-arapara n’obibi úgwù. Ọ dị mkpa imechi ndị a ọnụ, ebe mmadụ ndị a nọgidere na-ekpu ezinụlọ dum ihu site n’izi ihe ndị ha na-ekwesịghị izi n’ihi uru aghụghọ.”—Taịtọs 1:5, 10, 11.
1 Pita 4:15) Ọbụna Pọl sitere n’ike mmụọ nsọ dee banyere ibi úgwù nke e kwuru okwu ya n’iwu Mozis, sị: “Ọ̀ dị onye a kpọrọ mgbe e biworo ya úgwù? Ya aghọla onye a na-ebighị úgwù. Ọ̀ dị onye a kpọrọ mgbe a na-ebibeghị ya úgwù? Ya abụla onye e biri úgwù. Ibi úgwù apụtaghị ihe ọ bụla, ebighị úgwù apụtaghịkwa ihe ọ bụla, kama ime ihe Chineke nyere n’iwu nwere ihe ọ pụtara. N’ọnọdụ ọ bụla a kpọrọ onye ọ bụla, ya nọgide na ya.”—1 Ndị Kọrịnt 7:18-20.
Ndụmọdụ Pọl ka bara uru taa. N’ezie, ọ ga-abụ ime ihe megidere Akwụkwọ Nsọ ezi Onye Kraịst ịgwa mmadụ na o kwesịrị ibi nwa ya úgwù. Kama ịbụ “onye na-enyonye anya n’ihe ndị gbasara ndị ọzọ,” Onye Kraịst kwesịrị ịhapụ ndị mụrụ nwa ahụ ka ha jiri aka ha kpebie ihe ha ga-eme. (Oleekwanụ Banyere “Ụlọ Akwụkwọ Ebe A Na-akụzi Ihe Banyere Ibi Úgwù”?
Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na nne na nna bụ́ Ndịàmà Jehova ekpebie ibi nwa ha nwoke úgwù? Hà na-eme ihe Bible kwuru ma ọ bụrụ na ha etinye ụmụ ha ndị nwoke n’ụlọ akwụkwọ ebe a na-akụzi banyere ọdịnala ma na-ebi úgwù dị ka a kọwara n’elu? Ihe a na-eme n’ụlọ akwụkwọ ndị a abụghị nanị ibi úgwù. Onye ahụ na ụmụaka ndị ọzọ nakwa ndị nkụzi, bụ́ ndị na-adịghị efe Jehova, na-akpachi nnọọ anya ruo ọtụtụ izu. Ọtụtụ ihe a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ ndị a dị nnọọ iche n’àgwà ọma Bible kwuru ka anyị na-akpa. Bible dọrọ aka ná ntị, sị: “Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà bara uru.”—1 Ndị Kọrịnt 15:33.
Ọtụtụ mgbe, ịga ụlọ akwụkwọ a na-akpatara mmadụ mmerụ ahụ́ ndị dị oké njọ. Na 2003, otu akwụkwọ na-ekwu banyere ahụ́ ike, bụ́ nke a na-akpọ South African Medical Journal, dọrọ aka ná ntị, sị: “N’usoro mgbasa ozi ndị a na-anụ aha ha n’ụwa, a nụwo banyere nsogbu ndị dị egwu ibi úgwù kpatara n’afọ a, a nụwokwa banyere ndị nwụrụ n’ihi ya na ndị e bejasịrị akụkụ ahụ́ ha ji bụrụ nwoke. . . . N’igbu ya ná nkenke, ọtụtụ n’ime ụlọ akwụkwọ ndị a a sị na ha na-akụzi ibi úgwù taa bụcha nke adịgboroja, ha na-alakwa ndụ n’iyi.”
E wezụga na a pụrụ imerụ nwa ahụ ahụ́, nke kadị njọ bụ na ụlọ akwụkwọ a pụrụ imebi mmekọrịta nwatakịrị ahụ na Jehova. Ihe ndị a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ ndị a na ihe ndị a na-eme n’ebe ahụ nwere ihe ndị jikọrọ ha na mgbaasị na ife ndị nna ochie nwụrụ anwụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nsogbu adapụta ka a na-ebi nwatakịrị úgwù, kama ikweta na ihe kpatara ya bụ n’ihi na ndị dọkịta akpachapụghị anya nakwa n’ihi na ngwá ọrụ ndị ha ji eme ihe na ebe ndị ha nọ na-eme ya adịghị ọcha, ọtụtụ ndị na-ekwu na a tara nwa ahụ amụsu ma ọ bụ na ọ bụ ndị nna ochie ya nwụrụ anwụ gburu ya. Bible nyere iwu banyere iso okpukpe ụgha emekọrịta ihe, sị: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ. N’ihi na olee mkpakọrịta ezi omume na mmebi iwu nwere? Ma ọ bụ, olee òkè ìhè na ọchịchịrị nwere?. . . ‘Ya mere sinụ n’etiti ha pụọ, kewapụkwanụ onwe unu,’ ka Jehova na-asị, ‘kwụsịkwanụ ibitụ ihe na-adịghị ọcha aka’; ‘m ga-anabatakwa unu.’” (2 Ndị Kọrịnt 6:14-17) N’ihi ndụmọdụ a Bible nyere, ọ ga-abụ nnọọ ihe amamihe na-adịghị na ya ma ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst tinye ụmụ ha n’ụlọ akwụkwọ na-akụzi banyere ibi úgwù.
Gịnị Na-egosi na Onye Kraịst Bụ Nwoke n’Ezie?
Ma Onye Kraịst bụ́ nwoke ò biri úgwù ma ọ bụ na o bighị, ọ bụghị ya ka e ji ama na o toruola nwoke. Ihe kasị echu Ndị Kraịst ụra bụ́ ime ihe ndị na-amasị Chineke, ọ bụghị “ime ngosipụta dị mma n’anụ ahụ́.”—Ndị Galetia 6:12.
Otú ọ dị, Onye Kraịst ọ bụla chọrọ ime ihe na-amasị Chineke, ‘ga-ebirirị obi ya úgwù.’ (Deuterọnọmi 10:16; 30:6; Matiu 5:8) A dịghị eji agụba ebi ụdị úgwù a, kama a na-ebi ya site n’ịjụ ọchịchọ ọjọọ na nganga nke gụnyere nkwenkwe bụ́ na ibi mmadụ úgwù na-anụ ahụ́ na-eme ka onye ahụ kara ndị ọzọ. Ma Onye Kraịst ò biri úgwù ma ọ bụ na o bighị, ọ ga-egosi na ya etozuwo nwoke site n’idi ọnwụnwa na site n’iguzosi “ike n’okwukwe.”—1 Ndị Kọrịnt 16:13; Jems 1:12.