Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ime nke Ọma n’Ozi Jehova n’Oge Isi Awọ

Ime nke Ọma n’Ozi Jehova n’Oge Isi Awọ

Ime nke Ọma n’Ozi Jehova n’Oge Isi Awọ

“Ndị a kụworo n’ụlọ Jehova . . . ga-anọ na-amị mkpụrụ n’isi awọ.”—ABỤ ỌMA 92:13, 14.

1, 2. (a) Olee otú esikarị akọwa ịka nká? (b) Olee nkwa Akwụkwọ Nsọ kwere banyere nsogbu mmehie Adam kpataara ụmụ mmadụ?

GỊNỊ na-agbata gị n’uche ma ị nụ na mmadụ akaala nká? Ikekwe ị na-echeta ahụ́ dọlịrị adọlị, ntị na-adịghị anụchazi ihe, na ụkwụ na aka na-amazi jijiji. Ma ọ bụkwanụ ị na-echeta ihe ndị ọzọ ahụ e ji ama “ụbọchị ihe ọjọọ,” bụ́ ndị a kọwara nnọọ n’Ekliziastis 12:1-7. Ya bụrụ otú ahụ, ọ dị mkpa iburu n’uche na ihe ndị a a kọwara n’Ekliziastis isi 12, bụ́ ndị na-eme ahụ́ mgbe mmadụ kara nká, abụghị otú Onye Okike, bụ́ Jehova Chineke, si chọọ ya, kama ọ bụ mmehie Adam kpatara ya.—Ndị Rom 5:12.

2 Ime agadi n’onwe ya abụghị ihe ọjọọ n’ihi na ka mmadụ dị ndụ na-aga, ọ ga na-atụkwasị ihe n’afọ ndụ ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe nile dị ndụ ga-etorịrị eto. Nsogbu ndị mmehie na ezughị okè kpataara ụmụ mmadụ kemgbe puku afọ isii ga-aghọ ihe akụkọ n’oge na-adịghị anya. Ndị nile na-erubere Chineke isi ga-ebizi ndụ obi ụtọ dị ka Chineke zubere ná mbụ, n’enweghị ihe mgbu nke ya na ịka nká so aga, ha agaghịkwa anwụ anwụ. (Jenesis 1:28; Mkpughe 21:4, 5) N’oge ahụ, “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24) Ndị agadi ga-alaghachiru “ụbọchị okorobịa” ha, anụ ahụ́ ha ‘ga-adịkwa ọhụrụ karịa nke nwata.’ (Job 33:25) Ka ọ dịgodị ugbu a, anyị nile na-ata ahụhụ mmehie Adam kpataara anyị. Ma, a na-agọzi ndị ohu Jehova n’ụzọ pụrụ iche ka ha na-eme agadi.

3. Olee ụzọ dị iche iche Ndị Kraịst pụrụ isi nọgide “na-amị mkpụrụ n’isi awọ” ha?

3 Okwu Chineke na-eme ka obi sie anyị ike na “ndị a kụworo n’ụlọ Jehova . . . ga-anọ na-amị mkpụrụ n’isi awọ.” (Abụ Ọma 92:13, 14) Ọbụ abụ ahụ ji ihe atụ kọwaa eziokwu ahụ dị mkpa bụ́ na ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi nwere ike ịnọgide na-enwe ọganihu, na-amị mkpụrụ, ma na-eme nke ọma n’ozi Jehova, ọ sọgodị ya ya bụrụ na ahụ́ esighịzi ha ike. E nwere ọtụtụ ihe atụ na-egosi na nke a bụ eziokwu, ma n’ime Bible ma n’oge anyị a.

“Onye Ọ Na-adịghị Mgbe Ọ Na-akọ Ụkọ n’Ụlọ Nsọ”

4. Olee otú nwanyị na-ebu amụma bụ́ Ana si gosi na ya ji ofufe Chineke kpọrọ ihe, oleekwa otú Chineke si gọzie ya maka nke a?

4 Tụlee ihe banyere Ana, bụ́ nwanyị na-ebu amụma na narị afọ mbụ. Ọ dị afọ iri asatọ na anọ ma ọ ‘dịghị mgbe ọ na-akọ ụkọ n’ụlọ nsọ, na-eji ibu ọnụ na ịrịọsi arịrịọ ike na-eje ozi dị nsọ abalị na ehihie.’ Ebe nna Ana na-abụghị onye Livaị kama o si ‘n’ebo Asha,’ ọ dịghị otú Ana ga-esi biri ebiri n’ụlọ nsọ. Chegodị ihe ọ ga na-ewe ya ịdị na-anọ n’ụlọ nsọ kwa ụbọchị site n’ụtụtụ ruo ná mgbede! Chineke gọziri Ana nke ukwuu n’ihi iji ofufe ya kpọrọ ihe. O nwere ihe ùgwù nke ịnọ ya mgbe Josef na Meri kuuru Jizọs ahụ a mụrụ ọhụrụ bịa n’ụlọ nsọ iche ya n’ihu Jehova dị ka Iwu Mozis si dị. Mgbe Ana hụrụ Jizọs, ọ “malite inye Chineke ekele na ịgwa ndị nile na-echere mgbapụta Jeruselem banyere nwatakịrị ahụ.”—Luk 2:22-24, 36-38; Ọnụ Ọgụgụ 18:6, 7.

5, 6. Olee ụzọ dị iche iche ọtụtụ ndị agadi taa si na-egosi na ha nwere mmụọ yiri nke Ana?

5 Ọtụtụ n’ime ndị agadi nọ n’etiti anyị taa dị ka Ana n’otú ha si abịachi ọmụmụ ihe anya, n’otú ha si ekpesi ekpere ike ka ezi ofufe na-aga n’ihu, nakwa n’otú ha si nwee ọchịchọ siri ike ikwusa ozi ọma. Otu nwanna nwoke gaferela afọ iri asatọ, onye ya na nwunye ya na-abịachi ọmụmụ ihe anya kwuru, sị: “Ịga ọmụmụ ihe amarala anyị ahụ́. Ọ dịghị ebe ọzọ na-agụ anyị agụụ ịnọ. Ọ bụ ebe ndị Chineke nọ ka anyị chọrọ ịnọ. Ọ bụ ebe ahụ ka ọ na-abụ anyị nọrọ ahụ́ eruo anyị ala.” Nke a bụ nnọọ ezigbo ihe nlereanya nye anyị nile!—Ndị Hibru 10:24, 25.

6 “Ọ bụrụ na e nwee ọrụ ọ bụla metụtara ofufe Chineke m ga-arụli, ọ na-amasị m ịrụ ya.” Nke a bụ ụdị mmụọ nwanna nwanyị Jean, bụ́ nwanyị di ya nwụrụ nke gaferela iri afọ asatọ, nwere. Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Ọ bụ eziokwu na e nwere oge ndị m na-anọ ná mwute, ma nke ahụ apụtaghị na ndị nile nọ m gburugburu ga-anọkwa ná mwute.” O ji obi ụtọ kwuo na ọ na-atọ ya ụtọ ịga mba ndị ọzọ n’oge ndị a na-eme ihe ndị metụtara ofufe Chineke iji nweta agbamume. N’otu njem o mere ná nso nso a, ọ gwara ndị ha na ya so gaa njem ahụ, sị, “Achọghịzi m ịga kirie ebe ndị mara mma; achọrọ m ịga ozi ọma!” N’agbanyeghị na ọ maghị asụsụ ebe ahụ, Jean kpaliri ndị mmadụ inwe mmasị ige ozi Bible. Tụkwasị na nke ahụ, o jere ozi ruo ọtụtụ afọ n’otu ọgbakọ chọrọ enyemaka, n’agbanyeghị na ime nke a chọrọ ka ọ mụọ asụsụ ọhụrụ, chọọkwa ka ọ na-eme njem na-ewe awa abụọ iji gaa ọmụmụ ihe ma lọta.

Ime Ka Uche Gị Nọgide Na-aghọ Nkọ

7. Olee ihe Mozis kwuru mgbe o merela agadi nke gosiri na ọ chọrọ ka mmekọrịta ya na Chineke sikwuo ike?

7 Mmadụ na-enwe ahụmahụ ka ọ na-eme agadi. (Job 12:12) Ma, ọ bụghị ime agadi na-eme ka mmadụ nwee ọganihu n’ụzọ ime mmụọ. N’ihi ya, kama iwere ya na okwu Chineke ha mụtara n’oge gara aga ezuola, ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi na-agbalị ‘ịtụkwasị ihe n’amamihe ha’ ka afọ na-aga. (Ilu 9:9) Mozis dị iri afọ asatọ mgbe Jehova kpọrọ ya ka o jewere ya ozi. (Ọpụpụ 7:7) O yiri ka ọ na-esi ike ịhụ onye gbaruru iri afọ asatọ n’oge Mozis n’ihi na Mozis n’onwe ya dere, sị: “Ụbọchị afọ nile anyị dị [iri afọ asaa]; ma ọ bụrụ na ha esite n’ịdị ike anyị ruo [iri afọ asatọ].” (Abụ Ọma 90:10) Ma ọ dịghị mgbe Mozis chere na ya emeela agadi nke na ya agaghị enwekwa ike ịmụta ihe. Ka o jeerela Chineke ozi ruo ọtụtụ iri afọ, nwee ọtụtụ ihe ùgwù n’ozi Jehova, ma rụọ ọrụ ndị dị ike, Mozis rịọrọ Jehova, sị: “Mee ka m mara ụzọ Gị nile, m ga-amarakwa Gị.” (Ọpụpụ 33:13) Ọ na-agụ Mozis agụụ mgbe nile ka mmekọrịta ya na Jehova sikwuo ike.

8. Gịnị ka Daniel mere iji hụ na uche ya ka nọgidere na-aghọ nkọ mgbe ọ gaferela afọ iri itoolu, gịnịkwa ka nke ahụ rụpụtaara ya?

8 A hụrụ Daniel onye amụma ka ọ nọ na-agụ ihe odide ndị ahụ dị nsọ mgbe o yiri ka ọ karịala afọ iri itoolu. Ọ bụ ihe ndị ọ ghọtara mgbe ọ na-amụ “akwụkwọ”—nke gụnyere ma eleghị anya akwụkwọ ndị dị ka Levitikọs, Aịsaịa, Jeremaịa, Hosea, na Emọs—kpaliri ya ikpegara Jehova ekpere site n’ala ala obi ya. (Daniel 9:1, 2) A zara ya ekpere ahụ site n’ịgwa ya banyere ọbịbịa nke Mezaịa ahụ na otú ezi ofufe ga-esi gbasaa n’ọdịnihu.—Daniel 9:20-27.

9, 10. Gịnị ka ụfọdụ ndị merela iji hụ na uche ha nọgidere na-adị nkọ?

9 Dị ka Mozis na Daniel, anyị nwere ike ịgbalị ime ka uche anyị nọgide na-aghọ nkọ site n’ịdị na-amụ banyere Jehova n’oge nile anyị nwere ike imeli otú ahụ. Ọtụtụ ndị na-eme otú ahụ taa. Worth, bụ́ okenye ọgbakọ nke gaferela afọ iri asatọ, na-agbalị ịgụ akwụkwọ nile “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi” na-ebipụta. (Matiu 24:45) O kwuru, sị, “Eziokwu ahụ na-atọ m ụtọ nke ukwuu, ọ na-enyekwa m obi ụtọ ịhụ ka ìhè nke eziokwu ahụ na-enwupụ enwepụ dị ka chi ọbụbọ.” (Ilu 4:18) N’otu aka ahụ, Fred, bụ́ onye jerela ozi oge nile ruo ihe karịrị afọ iri isii, na-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu iji ihe ndị dị na Bible amalite mkparịta ụka mgbe ya na ndị kwere ekwe ibe ya nọ. O kwuru, sị, “Ọ dị mkpa na m ga-eme ka ihe e dere na Bible na-adị n’obi m mgbe ọ bụla. Ọ bụrụ na ị chọrọ ime ka ndị mmadụ ghọta ihe ị na-agụ—gụọ ya nke ọma—ọ bụrụkwa na ị ghọta ihe jikọrọ ihe ị na-agụ na ‘ụkpụrụ nke okwu na-enye ezi ndụ,’ mgbe ahụ ị ga-aghọta na ihe nile e dere n’ime ya kwekọrịtara. Ị pụrụ ịhụ otú eziokwu nile dị na Bible si nwee njikọ.”—2 Timoti 1:13.

10 Ime agadi adịghị egbochi mmadụ ịmụta ihe ọhụrụ na ihe ndị siri ike mmụta. Ọtụtụ ndị gaferela afọ iri isii, iri asaa na ọbụna afọ iri asatọ amụtala ịgụ ihe ma ọ bụ mụta asụsụ ọhụrụ. Ụfọdụ Ndịàmà Jehova emeela nke a iji nwee ike izi ndị si mba ọzọ ozi ọma. (Mak 13:10) Harry na nwunye ya eruwela afọ iri asaa mgbe ha kpebiri ịga ebe a na-asụ asụsụ Portuguese iji nye aka kwusaa ozi ọma n’ebe ahụ. Harry kwuru, sị, “N’eziokwu, ihe ọ bụla mmadụ na-amụ ime ná ndụ mgbe ọ katarala ahụ́ na-esi ike mmụta.” Ma site n’itinye mgbalị na ịnọgidesi ike, ha malitere iji asụsụ Portuguese amụrụ ndị mmadụ Bible. O ruola ọtụtụ afọ Harry jiwere asụsụ ọhụrụ a ọ mụtara na-ekwu okwu ná mgbakọ distrikti.

11. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịtụle ihe ndị agadi kwesịrị ntụkwasị obi na-arụpụta?

11 N’eziokwu, ọ bụghị mmadụ nile nwere ezi ahụ́ ike ma ọ bụ ohere ime ihe a Harry na nwunye ya mere. Ma, gịnị mere anyị ji na-atụle ihe ụfọdụ ndị agadi rụpụtarala? N’ezie, ọ bụghị iji kpalie mmadụ nile ịnwa ime otu ihe ahụ. Kama, ihe e ji kpọtụ ha aha bụ ka a kpalie ndị ọzọ ime ihe a Pọl onyeozi degaara ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst banyere ndị okenye ọgbakọ na-ekwesị ntụkwasị obi, sị: “Ka unu na-ahụkwa ihe na-esi n’omume ha apụta, na-eṅominụ okwukwe ha.” (Ndị Hibru 13:7) Mgbe anyị na-ahụ otú ha si anụ ọkụ n’obi, anyị na-abụ ndị a kpaliri iṅomi okwukwe siri ike nke ndị agadi a, bụ́ nke na-enyere ha aka ịnọgide n’ozi ha na-ejere Chineke. Mgbe Harry, bụ́ onye dị afọ iri asatọ na asaa ugbu a, na-akọwa ihe na-akpali ya ije ozi, o kwuru, sị, “Achọrọ m iji afọ ndụ m fọdụrụnụ mee ihe bara uru ma jeere Jehova ozi otú m nwere ike.” Fred, bụ́ onye e kwuru maka ya ná mbụ nwere afọ ojuju dị ukwuu n’ọrụ ọ na-arụ na Betel. O kwuru, sị, “Ị kwesịrị ịchọpụta otú ka mma ị ga-esi jeere Jehova ozi ma nọgide na-eme nke ahụ.”

Ịnọgide Na-atụ Egwu Chineke n’Agbanyeghị Ọnọdụ Ndị Na-agbanwe Agbanwe

12, 13. Olee otú Bazilaị si gosi na ya na-asọpụrụ Chineke n’agbanyeghị na o meela nnọọ agadi?

12 Ịnabata mgbanwe ndị na-adị ma mmadụ mewe agadi anaghị adị mfe. Ma n’agbanyeghị mgbanwe ndị dị otú ahụ, mmadụ pụrụ igosipụta na ya na-asọpụrụ Chineke. Otu onye setịpụrụ ezi ihe nlereanya n’akụkụ a bụ Bazilaị onye Gilead. Mgbe ọ dị iri afọ asatọ, o lekọtara nnọọ Devid na ndị agha ya n’ụzọ pụrụ iche, site n’inye ha nri na ebe ha ga-ehi mgbe Absalọm na-achụgharị Devid. Mgbe Devid na ndị ha na ya so na-alọghachi Jeruselem, Bazilaị dupụtaruru ha Osimiri Jọdan. Devid gwara Bazilaị ka o soro ya bịa biri n’obí eze ya na Jeruselem. Gịnị ka Bazilaị zara ya? “[Afọ iri asatọ] ka m gbara taa. . . Ohu gị ọ̀ ga-amata ụtọ ihe m na-eri ma ọ bụ nke m na-aṅụ? m̀ ga-ege ntị ọzọ n’olu ndị ikom na-abụ abụ na ndị inyom na-abụ abụ? . . . Lee ohu gị, bụ́ Kimham; ya soro onyenwe m, bụ́ eze, gabiga; gị mekwaara ya ihe dị mma n’anya gị.”—2 Samuel 17:27-29; 19:31-40.

13 N’agbanyeghị na ọ kaala nká, Bazilaị mere ihe nile o nwere ike ime iji hụ na ọ kwadoro eze Jehova ji aka ya họpụta. Ọ bụ ezie na ọ ghọtara na ọ naghịzi anụ ụtọ ihe ọ na-eri dị ka ọ naara anụ, nakwa na ọ naghịzi anụ ihe nke ọma dị ka ọ na-anụbu, nke a emeghị ka obi na-ajọ ya njọ. Kama nke ahụ, Bazilaị gosiri na ọ bụ ezigbo mmadụ site n’ịgwa Devid ka o meere Kimham ihe ndị ahụ ọ chọrọ imere ya. Dịkwa ka Bazilaị, taa, ọtụtụ ndị agadi na-egosi na ha adịghị achọ nanị ọdịmma onwe ha, ha na-egosikwa na ha nwere mmụọ inye ihe. Ha na-eme ihe ọ bụla ha nwere ike ime iji kwadoo ezi ofufe ebe ha maara na “àjà ndị dị otú ahụ na-adị Chineke ezi mma.” Anyị bụ nnọọ ndị a gọziri agọzi inwe ndị na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke n’etiti anyị!—Ndị Hibru 13:16.

14. Olee otú ịmata na Devid emeela agadi oge ọ rọrọ Abụ Ọma 37:23-25 si mee ka okwu ahụ na-emetụkwu n’ahụ́?

14 Ọ bụ ezie na ọnọdụ Devid gbanwere ọtụtụ ugboro n’oge ọ dịrị ndụ, obi siri ya ike na ọ dịghị mgbe Jehova ga-akwụsị ilekọta ndị ohu ya ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere ya ozi. Devid rọrọ abụ ahụ a maara taa dị ka Abụ Ọma nke 37 mgbe ọ karala ezigbo nká. Weregodị anya nke uche hụ Devid ebe ọ na-atụgharị uche ma were ụbọ ya na-agụ abụ a, sị: “Site n’aka Jehova ka e meworo ka nzọụkwụ nile nke mmadụ guzosie ike; ụzọ ya na-atọkwa Ya ụtọ. Mgbe ọ ga-ada, a gaghị atụdasị ya: n’ihi na Jehova na-akwagide aka ya. Nwata ka m bụworo, aghọwokwa m okenye; ma ahụghị m onye ezi omume ka a hapụrụ ya, ahụghịkwa m mkpụrụ ya ka ha na-arịọ nri.” (Abụ Ọma 37:23-25) Jehova mere ka e denye ihe gosiri na Devid emeela agadi n’abụ ọma a e dere n’ike mmụọ nsọ. Nke a mere ka ihe ahụ Devid kwuru na-emetụkwu nnọọ n’ahụ́.

15. Olee otú Jọn onyeozi si setịpụ ezi ihe nlereanya nke ikwesị ntụkwasị obi n’agbanyeghị ihe ndị mere ya na nká?

15 Jọn onyeozi bụ ezi ihe nlereanya ọzọ nke onye kwesịrị ntụkwasị obi nye Chineke n’agbanyeghị ihe ndị megasịrị ná ndụ ya nakwa ime agadi. Ka Jọn jerela Chineke ozi ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ iri afọ asaa, a chụgara ya n’agwaetiti Patmọs “n’ihi ikwu banyere Chineke na ịgbara Jizọs àmà.” (Mkpughe 1:9) N’agbanyeghị nke a, ọrụ ya agwụbeghị. N’ezie, ọ bụ mgbe Jọn merela ezigbo agadi ka o dere akwụkwọ Bible ndị o dere. Mgbe ọ nọ na Patmọs, e gosiri ya ọhụụ ahụ na-awụ ibubo n’ahụ́ nke e dekọrọ n’akwụkwọ Mkpughe, bụ́ nke ọ kpachapụrụ nnọọ anya detuo n’akwụkwọ. (Mkpughe 1:1, 2) Ọtụtụ ndị kweere na ọ bụ mgbe Eze Ukwu Rom bụ́ Nerva na-achị ka a kpọpụtara ya n’ebe ahụ a chụgara ya. Ka e mesịrị, n’ihe dị ka n’afọ 98 O.A., mgbe Jọn dị ihe dị ka afọ iri itoolu ma ọ bụ otu narị afọ, o dere Oziọma Jọn na akwụkwọ ozi atọ ndị ahụ bu aha ya.

Akụkọ A Na-agaghị Echefu Echefu Banyere Ndị Tachiri Obi

16. Olee otú ndị na-enweghịzi ike iso ndị ọzọ kparịta ụka pụrụ isi gosi na ha ka na-asọpụrụ Jehova?

16 Nsogbu ndị ime agadi na-akpata na-adịgasị iche iche. Dị ka ihe atụ, ọ na-esiri nnọọ ụfọdụ ndị agadi ike iso ndị ọzọ ekwurịta okwu. Ma ọ ka na-enye ha obi ụtọ ma ha cheta otú Chineke si hụ ha n’anya na otú o si nwee obi ebere n’ahụ́ ha. Ọ bụ ezie na ọ na-esiziri ha ike ikwu ihe ndị ha chọrọ ikwu, n’ime obi ha, ha na-agwa Jehova, sị: “Lee ka m si hụ iwu Gị n’anya! Ogologo ụbọchị nile ka nke ahụ bụ ihe m na-atụgharị n’uche.” (Abụ Ọma 119:97) Jehova n’onwe ya maara ndị “na-eche echiche aha Ya,” ọ na-enyekwa ya obi ụtọ ịhụ ka ndị dị otú a si dị iche n’ebe imerime ndị ọzọ bi n’ụwa nọ, bụ́ ndị na-adịghị echebara ụzọ Ya echiche. (Malakaị 3:16; Abụ Ọma 10:4) Ọ bụ ihe na-akasi obi ịmara na Jehova na-enwe obi ụtọ mgbe ọ hụrụ ihe anyị na-atụgharị n’uche!—1 Ihe E Mere 28:9; Abụ Ọma 19:14.

17. Olee ihe pụrụ nnọọ iche nke ndị jeerela Jehova ozi ruo ọtụtụ afọ nwere?

17 Otu ihe a na-ekwesịghị ichefu bụ na ndị a nọ na-ejere Jehova ozi kemgbe ọtụtụ iri afọ enweela otu ihe pụrụ iche, bụ́kwanụ nke a na-apụghị isi n’ụzọ ọ bụla ọzọ nweta—ya bụ, ntachi obi ha gosirila nke a na-agaghị echefu echefu. Jizọs kwuru, sị: “Site ná ntachi obi unu, unu ga-enweta mkpụrụ obi unu.” (Luk 21:19) Ntachi obi dị mkpa iji nweta ndụ ebighị ebi. Unu ndị merela “uche Chineke” ma gosi na unu na-ekwesị ntụkwasị obi site n’ụdị ndụ unu na-ebi, ga-enwe ike ịtụ anya inweta “mmezu nke nkwa ahụ.”—Ndị Hibru 10:36.

18. (a) Gịnị ka Jehova na-enwe obi ụtọ ịhụ banyere ndị agadi? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

18 Jehova ji ozi unu ji obi unu nile na-ejere ya kpọrọ ihe n’agbanyeghị ma ihe unu nwere ike ime ugbu a ọ̀ dị nnukwu ma ọ̀ dị obere. Ọ bụ ezie na ‘mmadụ unu bụ n’elu ahụ́ na-ala n’iyi’ ka unu na-emewanye agadi, ‘mmadụ unu bụ n’ime ahụ́’ pụrụ ịdịghachi ọhụrụ site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị. (2 Ndị Kọrịnt 4:16) Obi abụọ adịghị ya na Jehova ji ihe ndị unu rụzuru n’oge gara aga kpọrọ ihe, ma o dokwara anya na ihe ndị unu na-arụzu ugbu a n’ihi aha ya na-atọkwa ya ụtọ. (Ndị Hibru 6:10) N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle ndị ọzọ ikwesị ntụkwasị obi unu na-abara uru.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

• Olee ezi ihe nlereanya Ana setịpụụrụ Ndị Kraịst merela agadi taa?

• Gịnị mere a pụrụ iji kwuo na mmadụ ime agadi adịghị egbochi ya ime ihe ọ chọrọ ime?

• Olee otú ndị agadi pụrụ isi nọgide na-egosi na ha na-asọpụrụ Chineke?

• Olee otú Jehova si ele ozi ndị agadi na-ejere ya anya?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 23]

Daniel merela agadi maara afọ ole ndị Juu ga-anọ ná mba ọzọ site n’ihe ọ gụtara ‘n’akwụkwọ’

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

Ọtụtụ ndị agadi na-esetịpụ ezi ihe nlereanya site n’ịbịachi ọmụmụ ihe anya, ije ozi ọma, na ịdị njikere ịmụta ihe ọhụrụ