Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Abụ Ákwá

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Abụ Ákwá

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Abụ Ákwá

JEREMAỊA onye amụma hụrụ ka e mezuru okwu ikpe ndị ahụ ọ nọ na-akpọsa kemgbe iri afọ anọ. Olee otú obi dị onye amụma ahụ mgbe ọ hụrụ ka a na-ebibi obodo ya ọ hụrụ n’anya? Okwu mmalite nke akwụkwọ Abụ Ákwá ná nsụgharị Grik Septuagint kwuru, sị: “Jeremaịa wee nọdụ ọdụ na-ebe ákwá, wee bụọrọ Jeruselem abụ ákwá.” E dere akwụkwọ Abụ ákwà na 607 T.O.A., bụ́ mgbe onye amụma ahụ ka na-echeta nnọọ otú e si nọchibido Jeruselem n’agha ruo ọnwa iri na asatọ na otú e si gbaa obodo ahụ ọkụ. Akwụkwọ Abụ Ákwá kọrọ otú ihe ahụ merenụ si wute nnọọ Jeremaịa. (Jeremaịa 52:3-5, 12-14) Ọ dịghị obodo ọ bụla ọzọ a kọrọ banyere ya n’akụkọ ihe mere eme nke e ji ụdị okwu ndị a na-emetụ n’ahụ́ kwaara ákwá.

Ihe mejupụtara akwụkwọ Abụ Ákwá bụ uri ise e dere ede. Anọ ndị mbụ bụ uri ákwá; nke ise bụ arịrịọ, ma ọ bụ ekpere. Na New World Translation, e dere abụ anọ ndị mbụ n’usoro, nke ọ bụla ji mkpụrụ akwụkwọ dị iche malite n’usoro e si ede mkpụrụ akwụkwọ iri abụọ na abụọ e ji ede ihe n’asụsụ Hibru. Ọ bụ ezie na abụ nke ise nwere amaokwu iri abụọ na abụọ bụ́ nke mere ka o kwekọọ ná mkpụrụ akwụkwọ iri abụọ na abụọ e ji ede ihe n’asụsụ Hibru, a hazighị ha n’usoro e si ede mkpụrụ akwụkwọ ndị ahụ.—Abụ Ákwá 5:1.

“ANYA M ABỤỌ ADALAWO N’ISI SITE N’ANYA MMIRI”

(Abụ Ákwá 1:1–2:22)

Jeremaịa onye amụma si otú a malite abụ ákwá ya banyere Jeruselem: “Lee, ka obodo ahụ nke ndị ya dị ọtụtụ si nọdụ ala nanị ya! Lee, ka o siworo ghọọ ihe dị ka nwanyị di ya nwụrụ! Obodo nke hiri nne n’etiti mba nile, nke bụ isi n’etiti ala nile a na-achị achị, lee ka o siworo ghọọ ụsụụ ndị na-efe ofufe.” Onye amụma ahụ kwuru ihe mere ọdachi a ji dakwasị Jeruselem, ọ sịrị: “Jehova emekpawo ya ahụ́ n’ihi ịba ụba nke njehie ya nile.”—Abụ Ákwá 1:1, 5.

A kọwara Jeruselem dị ka nwanyị di ya na ụmụ ya nwụrụ nke jụrụ, sị: “Ọ̀ dị ihe mgbu dị ka ihe mgbu m?” O kpegaara Chineke ekpere banyere ndị iro ya, sị: “Ka ihe ọjọọ nile ha bịa n’ihu Gị; Gị mekwaa ha, dị ka I meworo m n’ihi njehie m nile: N’ihi na ize ume m dị ọtụtụ, ahụ́ adịghịkwa obi m ike.”—Abụ Ákwá 1:12, 22.

Jeremaịa ji nnọọ mwute dị ukwuu kwuo, sị: “[Jehova] ebipụwo mpi nile ọ bụla nke Izrel n’iwe dị ọkụ; Ọ seghachiwo aka nri Ya azụ site n’ihu onye iro: Ọ rechapuwokwa Jekọb dị ka ọkụ na-enwu enwu, nke na-eripịa gburugburu.” Iji gosi na obi adịghị ya nnọọ mma, onye amụma ahụ kwara ákwá arịrị, sị: “Anya m abụọ adalawo n’isi site n’anya mmiri, ngịrị afọ m anụwo m ọkụ, a wụsiwo imeju m n’ala dị ka mmiri.” O juru ndị na-agafe agafe anya nke na ha nọ na-ekwu, sị: “Ọ̀ bụ nke a bụ obodo ahụ nke a na-akpọ Ebe mazuru mma, ihe obi ụtọ nke ụwa nile?”—Abụ Ákwá 2:3, 11, 15.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:15—Olee otú Jehova siworo ‘zọchaa ebe nzọcha mkpụrụ vaịn nye ada Juda na-amaghị nwoke’? Ndị Babilọn kwafuru nnọọ ọtụtụ ọbara mgbe ha bibiri obodo ahụ a kọwara dị ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, nke na e jiri ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ha kwafuru tụnyere ịzọchasị mkpụrụ vaịn n’ebe nzọcha mkpụrụ vaịn. Ebe ọ bụ Jehova buru nke a n’amụma ma kwe ka o mezuo, a pụrụ ikwu na ‘ọ zọchawo ebe nzọcha mkpụrụ vaịn.’

2:1—Olee otú e si ‘si n’eluigwe tụda ịma mma nke Izrel n’ala’? Ebe ọ bụ na ‘eluigwe dị elu karịa ụwa,’ mgbe ụfọdụ, a na-akọwa otú e si weda ihe ndị dị elu ala dị ka isi ‘n’eluigwe tụda ha n’ala.’ A tụdara “ịma mma nke Izrel,” ya bụ, ebube na ike o nwere mgbe ya na Chineke ka dị ná mma, n’ala, mgbe e bibiri Jeruselem ma mee ka Juda tọgbọrọ n’efu.—Aịsaịa 55:9.

2:1, 6—Gịnị bụ “ihe mgbakwasị ụkwụ” Jehova na “ụlọ ntu” ya? Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Ka anyị baa n’ebe obibi Ya nile; ka anyị kpọọ isiala n’ebe ihe mgbakwasị ụkwụ Ya dị.” (Abụ Ọma 32:7) N’ihi ya, “ihe mgbakwasị ụkwụ” ahụ Abụ Ákwá 2:1 na-ekwu okwu ya bụ ụlọ ebe a na-anọ efe Jehova ofufe ma ọ bụ ụlọ nsọ ya. Ndị Babilọn ‘surere ụlọ Jehova n’ọkụ’ dị ka ọ̀ bụ ụlọ ntu nkịtị a rụrụ n’ubi.—Jeremaịa 52:12, 13.

2:17—Olee ihe bụ́ kpọmkwem “okwu ọnụ” nke Jehova mezuru n’ahụ́ Jeruselem? Ọ ga-abụ na ihe a na-ekwu okwu ya n’ebe a bụ ihe ahụ e kwuru na Levitikọs 26:17, bụ́ nke na-asị: “M ga-eche ihu m megide unu, a ga-etigbukwa unu n’ihu ndị iro unu: ndị na-akpọ unu asị ga-azọda unu; unu ga-agbalagakwa mgbe ọ na-adịghị onye na-achụ unu.”

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

1:1-9. Jeruselem kwasiri nnọọ ákwá ike n’abalị, anya mmiri ya dịkwa na ntì ya abụọ. Ọnụ ụzọ ama ya nile tọgbọrọ n’efu, ndị nchụàjà ya na-ezekwa ume. Iru uju emekpawo ụmụ agbọghọ ya na-amaghị nwoke ahụ́, Jeruselem n’onwe ya nọkwa na-eru nnọọ uju. Gịnị kpatara ihe a nile? Ọ bụ n’ihi na Jeruselem emehiewo nke ukwuu. Ịrụ arụ ya dị n’ọnụ ọnụ ala nile nke uwe mwụda ya. Njehie enweghị ike iweta ọṅụ, kama iweta ọṅụ, ihe ọ na-akpata bụ anya mmiri, ize ume, iru uju, na ihe ilu.

1:18. Jehova na-eme ihe ziri ezi mgbe nile n’ịta ndị mebiri iwu ya ahụhụ.

2:20. A dọrọ ụmụ Izrel aka ná ntị na ọ bụrụ na ha ajụ ịṅa ntị n’okwu Jehova, ha ga-enweta nkọcha, bụ́ nke gụnyere iri ‘anụ ahụ́ ụmụ ha ndị nwoke na ụmụ ha ndị nwanyị.’ (Deuterọnọmi 28:15, 45, 53) Legodị otú o si bụrụ nnọọ ihe nzuzu inupụrụ Chineke isi!

“EZOBELA NTỊ GỊ N’IKU UME M”

(Abụ Ákwá 3:1–5:22)

N’abụ Ákwá isi nke 3, a kọwara mba Izrel dị ka à ga-asị na ọ bụ “nwoke.” N’agbanyeghị na nwoke a nọ n’ahụhụ, ọ bụrụ abụ, sị: “Jehova dị mma n’ebe ndị na-ele anya Ya nọ.” N’ekpere o kpegaara ezi Chineke ahụ, ọ rịọrọ ya sị: “Olu m ka Ị nụrụ; ezobela ntị Gị n’iku ume m, na ntiku m.” Ka ọ na-arịọ Jehova ka o leba anya n’otú ndị iro si akọcha aha ya, o kwuru, si: “Ị ga-enyeghachi ha mmeso ha, Jehova, dị ka ọrụ aka ha si dị.”—Abụ Ákwá 3:1, 25, 56, 64.

Jeremaịa kwupụtara nnọọ otú obi dị ya n’ihi mmekpa ahụ́ nnọchibido ahụ weere ọnwa iri na asatọ a nọchibidoro Jeruselem wetaara ndị Izrel. Ọ kwara ákwá, sị: “Ajọ omume nke ada ndị m wee dị ukwuu karịa mmehie Sọdọm, nke a kwaturu dị ka n’otu ntabi anya, ma ọ dịghị aka ọ bụla dakwasịrị ya.” Jeremaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Ndị mma agha gbuworo adịwo mma karịa ndị agụụ gụgbuworo; n’ihi na ndị a na-erupụ dị ka mmiri, bụrụ ndị a dụpụworo adụpu, ghara inwe ihe omume nke ubi.”—Abụ Ákwá 4:6, 9.

E dere abụ nke ise ka o yie ka ọ̀ bụ ndị bi na Jeruselem na-ekwu okwu. Ha sịrị: “Jehova, cheta ihe ruworo anyị ahụ́: legide anya, hụ ịta ụta anyị.” Ka ha nọ na-akọ nsogbu ha, ha rịọrọ, sị: “Jehova, ọ bụ ruo mgbe ebighị ebi ka Ị na-anọdụ dị ka eze; ocheeze Gị na-adịru ọgbọ nile. Mee ka anyị laghachikwute Gị, Jehova, anyị ga-alatakwa; mee ka ụbọchị nile anyị dị ọhụrụ dị ka na mgbe ochie.”—Abụ Ákwá 5:1, 19, 21.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

3:16—Gịnị ka okwu ahụ bụ́: “O weere ụmụ nkume kụjie ezé m nile” na-egosi? Otu akwụkwọ kwuru, sị: “Mgbe ndị dọọrọ ndị Juu n’agha kpụ ha n’ala, a manyere ndị Juu ime bred ha n’ime ala e gwuru egwu bụ́ nke mere ka bred ndị ahụ bụrụ ájá ájá.” Ịta ụdị bred a nwere ike ịgbakepụ mmadụ ezé.

4:3, 10—Gịnị mere Jeremaịa ji jiri “ada ndị [ya]” tụnyere “enyi nnụnụ n’ọzara”? Job 39:16 kwuru na enyi nnụnụ ‘na-eme ụmụ ya ihe ike, dị ka à ga-asị na ha abụghị ihe o nwere.’ Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na enyi nnụnụ abụọ àkwá ya, ọ na-ahapụ akwụ ya ma soro nnekwu ndị ọzọ pụwa, ebe nke oké na-anọ na-elekọta ụmụ ọhụrụ ahụ. Olee ihe ha na-eme ma ọ bụrụ na anụ ka ha ike abịakwute ha na ụmụ ha? Ma nke oké ma nke nne na-ahapụ ụmụ ha na-akwụ fepụ. N’oge ahụ ndị Babilọn nọchibidoro Jeruselem n’agha, ụnwụ nri bịara sie nnọọ ike na Jeruselem nke na ndị nne, bụ́ ndị a tụrụ anya na ha kwesịrị nnọọ inwe ọmịiko n’ahụ́ ụmụ ha, bịaziri na-emeso ụmụ ha ihe n’obi ọjọọ, dị ka nne enyi nnụnụ n’ọzara. Nke a dị nnọọ iche n’otú nkịta ọhịa si elekọta ụmụ ya.

5:7—Jehova ọ̀ na-eji ihe ndị nna ochie metara ata ụmụ ha ahụhụ? Mba, Jehova adịghị ata ndị mmadụ ahụhụ n’ihi mmehie ndị nna ochie ha mere. Bible kwuru, sị: “Onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.” (Ndị Rom 14:12) Ma, ihe ndị si ná mmehie pụta nwere ike ịnọgide nke na ọbụna ọgbọ ndị na-abịa n’ihu na-ata ahụhụ ha. Dị ka ihe atụ, mgbe mba Izrel oge ochie malitere ife arụsị, o mere ka o siere ọbụna ọgbọ ndị kwesịrị ntụkwasị obi e mechara nwee ike ịgbaso ụzọ nke ezi omume.—Ọpụpụ 20:5.

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

3:8, 43, 44. N’oge ahụ Jeruselem na-ata ahụhụ, Jehova jụrụ ịṅa ntị ná mkpu ndị bi n’obodo ahụ na-etiku ya maka enyemaka. Gịnị kpatara ya? Ọ bụ n’ihi na ndị ahụ anọwo na-enupụ isi, ha achọghịkwa igosi nchegharị ọ bụla. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova zaa ekpere anyị, anyị aghaghị ịdị na-erubere ya isi.—Ilu 28:9.

3:20. Jehova, bụ́ “Onye Kachasị Ihe nile Elu n’elu ụwa nile,” dị nnọọ elu nke na ọ ghaghị ime onwe ya ka ọ dị ala iji wee nwee ike ‘ilekwasị eluigwe na ụwa anya.’ (Abụ Ọma 83:18; 113:6) Ma, Jeremaịa maara nnọọ nke ọma otú Onye Kasị Elu si dị njikere iwetu onwe ya ala n’ebe ndị ya nọ, ya bụ, iwetulata onwe ya ruo ogo ha iji wee nwee ike ịgba ha ume. Anyị kwesịrị nnọọ inwe obi ụtọ na ọ bụghị nanị na ezi Chineke ahụ dị nnọọ ike ma mara ihe, kamakwa ọ dị obi umeala!

3:21-26, 28-33. Olee otú anyị pụrụ isi die ọbụna ihe isi ike ndị tara akpụ? Jeremaịa gwara anyị ụzọ anyị pụrụ isi mee nke a. Anyị ekwesịghị ichefu na Jehova nwere nnọọ obi ọma n’enweghị atụ nakwa na ebere ya dị ọtụtụ. Anyị kwesịkwara icheta na nanị na anyị dị ndụ ezuola ime ka anyị nọgide na-enwe olileanya, o kwesịkwara ime ka anyị na-enwe ndidi ma na-edere duu, ghara ịdị na-eme mkpesa ka anyị na-echere Jehova ka ọ napụta anyị. Anyị kwesịkwara “itinye ọnụ [anyị] ná ájá,” ya bụ, ịdị na-atachi obi n’ọnwụnwa, na-eburu n’uche na ihe ọ bụla Chineke kwere ka o mee, o nwere ezi ihe mere o ji mee otú ahụ.

3:27. Ihe isi ike na akaje pụrụ ịbụ ụdị ule ndị na-abịara onye na-eto eto. Ma o kwesịrị nnọọ ekwesị ka ‘nwoke na-ebu yok na mgbe ọ dị na nwata.’ N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụrụ na mmadụ amụta ibu yok ahụhụ n’oge ọ na-eto eto, ọ ga-akwadebe ya imeri ihe isi ike ndị ọ ga-ezute n’afọ ndị na-abịa n’ihu.

3:39-42. Anyị ekwesịghị “ịtamu ntamu” mgbe anyị na-ata ahụhụ n’ihi ihe ndị na-ezighị ezi anyị mere. Kama ịtamu ntamu mgbe anyị na-ata ahụhụ n’ihi ihe ọjọọ anyị mere, “ka anyị gwupụta ala ụzọ nile anyị, nyochapụta ha, laghachikwuru Jehova.” Anyị ichegharị ma mezie ụzọ ndụ anyị na-egosi na anyị maara ihe.

Tụkwasị Jehova Obi

Akwụkwọ Abụ Ákwá kwuru otú ọ dị Jehova mgbe ndị Babilọn suchara Jeruselem ọkụ ma mee ka Juda tọgbọrọ n’efu. Ihe ndị Jeremaịa dekọrọ n’akwụkwọ Abụ Ákwá iji gosi na o kwetara na mba ahụ mere mmehie mere ka o doo anya na n’anya Jehova, ọ bụ mmehie mba ahụ mere ha ji na-ata ahụhụ. N’abụ ndị a e dekọrọ site n’ike mmụọ nsọ, e nwere okwu ndị na-egosi na onye dere ha nwere olileanya na Jehova ga-emezu nkwa ya, gosikwa ọchịchọ onye ahụ dere ya nwere ime ezi ihe. Ọ bụ ezie na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị dịrị ndụ n’oge Jeremaịa enweghị olileanya na ọchịchọ dị otú a, Jeremaịa na ndị fọdụrụnụ chegharịrị echegharị nwere olileanya n’ebe Jehova nọ ma dị njikere ime ihe dị mma.

Ụzọ Jehova si lee ihe mere Jeruselem anya bụ́ nke e dekọrọ n’akwụkwọ Abụ Ákwá na-akụziri anyị ihe abụọ dị oké mkpa. Nke mbụ, mbibi e bibiri Jeruselem na otú Juda si tọgbọrọ n’efu na-egosi na anyị kwesịrị ịdị na-erubere Jehova isi, ọ bụkwa ihe ịdọ aka ná ntị na anyị ekwesịghị ịhapụ ime uche Chineke. (1 Ndị Kọrịnt 10:11) Anyị na-amụtakwa ihe site n’otú Jeremaịa si kpaa àgwà. (Ndị Rom 15:4) Ọbụna mgbe o yiri ka olileanya adịghịkwa, onye amụma ahụ na-eru nnọọ uju legaara Jehova anya maka nnapụta. Ọ dị nnọọ oké mkpa na anyị ga-atụkwasị Jehova na Okwu ya obi anyị nile ma nwee obi ike na ọ ga-anapụta anyị.—Ndị Hibru 4:12.

[Foto dị na peeji nke 9]

Jeremaịa onye amụma hụrụ ka e mezuru okwu ikpe ndị ahụ ọ kpọsara

[Foto dị na peeji nke 10]

A nwalere okwukwe Ndịàmà a si Korea n’ihi nnọpụiche ha