Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Agadi—Ndị E Ji Gọzie Ndị Na-eto Eto

Ndị Agadi—Ndị E Ji Gọzie Ndị Na-eto Eto

Ndị Agadi—Ndị E Ji Gọzie Ndị Na-eto Eto

“Ọbụna ruo agadi na isi awọ ahapụla m, Chineke; ruo mgbe m ga-egosi ọgbọ ọzọ ogwe aka Gị, gosikwa onye ọ bụla nke ga-abịa ịdị ike Gị.”—ABỤ ỌMA 71:18.

1, 2. Gịnị ka ndị ohu Chineke merela agadi kwesịrị iburu n’uche, gịnịkwa ka anyị ga-atụle ugbu a?

OTU okenye ọgbakọ nọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa gara ileta otu nwanna nwoke merela agadi so ná ndị e tere mmanụ. Mgbe o rutere, ọ jụrụ ya, sị, “Kedụ ka i mere?” Nwanna ahụ zara sị, “Enwere m ike ịgba ọsọ nweekwa ike ịwụli elu.” Ka ọ na-ekwu nke a, ọ nọ n’otu oge ahụ na-eme ihe ndị a ọ sị na ya nwere ike ime. Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Ma enweghị m ike ife efe.” Okenye ahụ ghọtara ihe nwanna ahụ bu n’uche. Ihe o bu n’uche bụ na ọ na-atọ ya ụtọ ime ihe ọ bụla o nwere ike ime, ma ọ dịghị eme ihe ọ bụla ọ na-agaghị emeli. Okenye ahụ gara leta nwanna nwoke a akarịala afọ iri asatọ ugbu a, obi ka na-adịkwa ya ụtọ mgbe ọ bụla o chetara otú nwanna nwoke ahụ si eme mmadụ ihe ọchị nakwa otú o si kwesị ntụkwasị obi.

2 Mgbe onye merela agadi na-akpa àgwà na-egosi na ọ na-asọpụrụ Chineke, ọ pụrụ ịkụziri ndị ọzọ ihe ha na-apụghị ichefu echefu. N’eziokwu, ime agadi abụghị ya na-eme ka mmadụ nwee amamihe ma na-akpa àgwà ka onye na-eso ụzọ Kraịst. (Eklisiastis 4:13) Bible na-ekwu, sị: “Okpueze nke mara mma ka isi awọ bụ, n’ụzọ ezi omume ka a ga-ahụ ya.” (Ilu 16:31) Ọ bụrụ na i meela agadi, ị̀ maara na ndị ọzọ pụrụ irite uru dị ukwuu site n’okwu ọnụ gị na otú i si akpa àgwà? Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ dị na Bible bụ́ ndị na-egosi otú ndị na-eto eto si erite uru dị ukwuu n’aka ndị merela agadi.

Okwukwe nke Na-abara Ndị Ọzọ Uru

3. Olee otú okwukwe Noa si baara ndị nile dị ndụ taa uru?

3 Ọbụna ruo taa, a ka na-ahụ uru okwukwe Noa na otú o si nọgide n’ofufe Chineke bara. Noa achọwala iru narị afọ isii mgbe ọ rụrụ ụgbọ ahụ, chịkọta ụmụ anụmanụ, ma kwusaara ndị agbata obi ya ozi ọma. (Jenesis 7:6; 2 Pita 2:5) Noa na ezinụlọ ya lanahụrụ oké Iju Mmiri ahụ, ya aghọọkwa nna nke ndị nile dị ndụ n’ụwa taa n’ihi na ọ tụrụ egwu Chineke. N’ezie, Noa dịrị ndụ mgbe ụmụ mmadụ na-adịte ndụ aka. Ma Noa nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi ọbụna mgbe o mekwuru agadi, nke ahụ wetakwara ngọzi ndị ọzọ buru nnọọ ibu. N’ụzọ dị aṅaa?

4. Olee otú ikwesị ntụkwasị obi Noa si na-abara ndị ohu Chineke uru taa?

4 Ọ fọrọ obere ka Noa ruo narị afọ asatọ mgbe Nimrọd malitere ịrụ Ụlọ Elu Bebel nke gosiri na ọ na-enupụ isi n’iwu ahụ Jehova nyere bụ́ ka e “jupụta ụwa.” (Jenesis 9:1; 11:1-9) Ma Noa esoghị Nimrọd nupụrụ Chineke isi. Ya mere, o yikwara ka a gbanweghị asụsụ ya mgbe a ghagburu asụsụ ndị nnupụisi ahụ. Okwukwe na ikwesị ntụkwasị obi Noa, bụ́ nke o gosipụtara ná ndụ ya nile, ọ bụghị nanị mgbe o mere agadi, bụ nnọọ ihe ndị ohu Chineke nile—ma ndị agadi ma ndị ka na-eto eto—kwesịrị iṅomi.—Ndị Hibru 11:7.

Otú Àgwà Ha Si Abara Ndị Ezinụlọ Ha Uru

5, 6. (a) Mgbe Ebreham dị afọ iri asaa na ise, gịnị ka Jehova gwara ya ka o mee? (b) Olee ihe Ebreham mere mgbe Chineke gwara ya ihe ọ ga-eme?

5 A pụrụ ịhụ otú ndụ ndị agadi si eme ka okwukwe ndị ezinụlọ ha sie ike site n’ihe nlereanya nke ndị nna ochie biri ndụ mgbe Noa nwụsịrị. Ebreham dị ihe dị ka iri afọ asaa na ise mgbe Chineke gwara ya, sị: “Si n’ala gị, sikwa n’ụmụnna gị, sikwa n’ụlọ nna gị, jee nke gị ruo ala ahụ nke M ga-eme ka ị hụ ya anya: M ga-emekwa gị ka ị ghọọ mba ukwu, M ga-agọzikwa gị.”—Jenesis 12:1, 2.

6 Chegodị ihe ọ dị ka ya ịsị gị hapụ ụlọ gị, ndị enyi gị, obodo ebe a mụrụ gị, na ndị ikwu gị ma gaa mba ọzọ ị na-amaghị. Ọ bụ nke a kpọmkwem ka a gwara Ebreham mee. O “wee jee, dị ka Jehova gwara ya okwu,” o bikwara afọ ndụ ya ndị fọrọnụ n’ụlọikwuu dị ka onye ọbịa nke na-akwagharị site n’otu obodo dị na Kenan gaa n’ọzọ. (Jenesis 12:4; Ndị Hibru 11:8, 9) Ọ bụ ezie na Jehova kwuru na Ebreham ga-abụ “mba ukwu,” ogologo oge gafere ka ọ nwụsịrị tupu ụmụ ya abaa ụba n’ọnụ ọgụgụ. Sera, bụ́ nwunye ya, mụụrụ ya nanị otu nwa nwoke bụ́ Aịzik mgbe Ebreham jegharịrịla ruo afọ iri abụọ na ise n’Ala Nkwa ahụ. (Jenesis 21:2, 5) N’agbanyeghị nke ahụ, Ebreham adaghị mbà n’obi ma laghachi n’obodo Ọọ. Ebreham bụ nnọọ ezi ihe nlereanya nke onye nwere okwukwe na ntachi obi!

7. Olee otú ntachi obi Ebreham si nwee mmetụta n’ahụ́ nwa ya nwoke bụ́ Aịzik, gịnịkwa ka nke a rụpụtaara ụmụ mmadụ?

7 Ntachi obi Ebreham nwere mmetụta dị ukwuu n’ahụ́ nwa ya nwoke bụ́ Aịzik, bụ́ onye ji afọ ndụ ya nile nke dị otu narị afọ na iri afọ asatọ bie dị ka ọbịa n’ala Kenan. Ihe mere Aịzik ji tachie obi bụ n’ihi na o nwere okwukwe ná nkwa Chineke, bụ́ okwukwe nke nne na nna ya merela agadi nyeere ya aka inwe, nakwa nke ihe o mesịrị nụ n’ọnụ Jehova n’onwe ya wusiri ike. (Jenesis 26:2-5) Ikwesị ntụkwasị obi Aịzik so nnọọ mee ka nkwa ahụ Jehova kwere na a ga-esi ná “mkpụrụ” sitere n’ezinụlọ Ebreham gọzie ụmụ mmadụ nile mezuo. Ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị, Jizọs Kraịst, bụ́ akụkụ bụ́ isi nke “mkpụrụ” ahụ, mere ka onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe n’ebe ọ nọ na Chineke dịghachi ná mma, meekwa ka o nwee ohere nke inweta ndụ ebighị ebi.—Ndị Galeshia 3:16; Jọn 3:16.

8. Olee otú Jekọb si gosi na ya nwere okwukwe siri ike, oleekwa uru okwukwe ya bara?

8 Aịzik n’onwe ya nyeere nwa ya nwoke bụ́ Jekọb aka inwe okwukwe siri ike, bụ́kwa nke o nwegidere ruo mgbe o mere agadi. Jekọb dị iri afọ itoolu na asaa mgbe ya na mmụọ ozi gbara mgba ogologo abalị nile ka mmụọ ozi ahụ wee gọzie ya. (Jenesis 32:24-28) Tupu Jekọb anwụọ mgbe ọ gbara otu narị afọ na iri afọ anọ na asaa, n’agbanyeghị na ume adịghịzi ya, o jisiri nnọọ ike kpọkọọ ụmụ ya iri na abụọ ma gọzie ha nile otu otu. (Jenesis 47:28) Amụma ndị o buru n’oge ahụ, bụ́ ndị e dekọrọ na Jenesis 49:1-28, mezuru, ụfọdụ n’ime ha ka na-emezukwa.

9. Olee otú ndị agadi ji ozi Jehova kpọrọ ihe pụrụ isi baara ndị ezinụlọ ha uru?

9 O doro anya na ndị ohu Chineke merela agadi ma ka nọgide jiri ikwesị ntụkwasị obi na-ejere ya ozi nwere ike ịkpali ndị ezinụlọ ha ime nke ọma. Ntụziaka ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ ha na-enye, tinyere ndụmọdụ bara uru ndị agadi a na-enye n’ihi ahụmahụ ndị ha nwere nakwa ntachi obi ha, pụrụ inyere onye na-eto eto aka inwe okwukwe siri ike. (Ilu 22:6) Ndị agadi ekwesịtụghị iche na ọ dịghịzi uru ha baara ndị ezinụlọ ha.

Uru Ha Na-abara Ndị Kwere Ekwe Ibe Ha

10. Gịnị ka Josef ‘nyere n’iwu banyere ọkpụkpụ ya,’ gịnịkwa ka nke ahụ mere ka ndị Izrel nwee?

10 Ndị agadi nwekwara ike ịbara ndị kwere ekwe ibe ha uru. Mgbe nwa Jekọb bụ́ Josef mere agadi, o mere otu ihe gosiri na o nwere okwukwe, bụ́ nke mere nnọọ ka okwukwe nke ọtụtụ nde ndị fere Chineke ofufe mgbe ọ nwụsịrị sie ike. Ọ dị otu narị afọ na afọ iri mgbe ‘o nyere iwu banyere ọkpụkpụ ya,’ ka ụmụ Izrel chịrị ọkpụkpụ ya mgbe ha ga-esi n’Ijipt laa. (Ndị Hibru 11:22; Jenesis 50:25) Iwu ahụ o nyere so n’ihe ndị mere ka ndị Izrel nwee olileanya n’ime afọ ndị ahụ nile ha bụ ohu n’Ijipt ka Josef nwụsịrị, meekwa ka obi sie ha ike na otu ụbọchị a ga-anapụta ha.

11. Olee uru o yiri ka Mozis merela agadi ọ̀ baara Jọshụa?

11 Otu n’ime ndị ihe ahụ Josef kwuru wusiri okwukwe ha ike bụ Mozis. Mgbe Mozis dị iri afọ asatọ, o nwere ihe ùgwù nke ịchịrị ọkpụkpụ Josef si n’ala Ijipt pụọ. (Ọpụpụ 13:19) O yiri ka ọ bụ n’oge ahụ ka ya na Jọshụa, bụ́ onye ọ tọrọ nnọọ nke ọma, matara. Jọshụa ghọrọ onye na-ejere Mozis ozi ruo afọ iri anọ sochirinụ. (Ọnụ Ọgụgụ 11:28) O so Mozis rịgoro Ugwu Saịnaị, ọ nọkwa ya mgbe Mozis ji mbadamba nkume abụọ nke ihe àmà ahụ rịdata. (Ọpụpụ 24:12-18; 32:15-17) Ọ ghaghị ịbụ na Mozis meworo agadi nyere Jọshụa ndụmọdụ baara ya uru ma nyere ya aka inwe amamihe.

12. Olee uru Jọshụa baara mba Izrel n’oge nile ọ dịrị ndụ?

12 N’oge nile ọ dị ndụ, Jọshụa n’onwe ya kwa gbara ndị Izrel ume ịnọgide na-efe Jehova. Ndị Ikpe 2:7 na-agwa anyị, sị: “Ndị Izrel wee fee Jehova ofufe ụbọchị nile nke Jọshụa, na ụbọchị nile nke ndị okenye ndị e mere ka ụbọchị ha dị anya ka Jọshụa nwụsịrị, ndị hụrụ omume ukwuu nile nke Jehova, nke O meere Izrel.” Ma mgbe Jọshụa na ndị okenye ahụ nwụsịrị, ndị Izrel malitere ibi ndụ ka ndị na-amaghị nke ha ga-eme eme ruo narị afọ atọ, ha fetụ Jehova ha efetụ arụsị, ha megidere nke a ruo mgbe Samuel ghọrọ onye amụma.

Samuel ‘Emezuo Ezi Omume’

13. Gịnị ka Samuel mere iji ‘mezuo ezi omume’?

13 Bible ekwughị afọ ole Samuel dị mgbe ọ nwụrụ, ma ihe ndị e dekọrọ n’akwụkwọ Samuel nke Mbụ bụ ihe ndị mere n’ime otu narị afọ na afọ abụọ, Samuel jikwa anya ya hụ ọtụtụ n’ime ha. Ná Ndị Hibru 11:32, 33, anyị gụtara na ndị ikpe na ndị amụma, bụ́ ndị kwụwara aka ha ọtọ, ‘mezuru ezi omume.’ N’ezie, Samuel mere ka ụfọdụ ndị ha na ya dịkọrọ ndụ zere ma ọ bụ kwụsị ime ihe ọjọọ. (1 Samuel 7:2-4) Olee otú o si mee nke a? Ọ bụ site n’ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova ná ndụ ya nile. (1 Samuel 12:2-5) Ụjọ atụghị ya ịbara ọbụna eze mba mgbe o mere ihe ọjọọ. (1 Samuel 15:16-29) Tụkwasị na nke ahụ, Samuel, n’agbanyeghị na ‘ọ ghọwo agadi,’ bụ ezi ihe nlereanya n’ihe banyere ikpe ekpere maka ndị ọzọ. O kwuru na ọ ‘bụụrụ ya ihe arụ ime mmehie megide Jehova n’ịghara ikpe ekpere’ maka ndị Izrel ibe ya.—1 Samuel 12:2, 23.

14, 15. Olee otú ndị agadi taa pụrụ isi ṅomie Samuel n’ihe banyere ekpere?

14 Ihe a nile na-egosi ụzọ dị mkpa ndị agadi pụrụ isi nyere ndị ohu Jehova ibe ha aka ịdị na-eme ezi ihe. N’agbanyeghị na ọrịa na nká nwere ike ime ka ha gharazie imeru ihe ókè ha naara eme, ndị agadi ka nwere ike ikpe ekpere maka ndị ọzọ. Ndị agadi, ùnu maara otú ekpere unu si abara ndị nọ n’ọgbakọ uru? N’ihi okwukwe unu nwere n’ọbara Kraịst wụsịrị, unu na Jehova dị nnọọ ná mma, n’ihi ntachi obi unu kwa, okwukwe unu abụrụla ịgba n’ihi ịbụ nke “e lere ule.” (Jems 1:3; 1 Pita 1:7) Ya adịla mgbe unu ga-echefu na: “Arịrịọ nke onye ezi omume na-arịọsi ike, mgbe ọ nọ n’ọrụ, nwere ike dị ukwuu.”—Jems 5:16.

15 Ekpere unu na-ekpe iji kwado ozi Alaeze Jehova dị anyị mkpa. Ụfọdụ ụmụnna anyị nọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi na ha ekweghị etinye aka n’ihe Ndị Kraịst na-ekwesịghị ime. Ọdachi ndị na-emere onwe ha, agha na ọgba aghara obodo, akpaala ndị ọzọ aka ọjọọ. E nwekwara ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ anyị, bụ́ ndị na-ezute ọnwụnwa na mmegide dị iche iche. (Matiu 10:35, 36) Ndị na-edu ndú n’ọrụ nkwusa ahụ na n’ọgbakọ chọkwara ka unu na-echeta ha n’ekpere mgbe nile. (Ndị Efesọs 6:18, 19; Ndị Kọlọsi 4:2, 3) Ọ ga-amagbu nnọọ onwe ya ma unu cheta ndị kwere ekwe ibe unu n’ekpere unu dị ka Epafras mere!—Ndị Kọlọsi 4:12.

Ịkụziri Ọgbọ Ndị A Ga-enwe n’Ọdịnihu Ihe

16, 17. Gịnị ka e buru n’amụma n’Abụ Ọma 71:18, oleekwa otú nke a si na-emezu?

16 “Atụrụ ọzọ” ahụ, bụ́ ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa, enwetawo nnọọ ọzụzụ dị mkpa site n’iso “ìgwè atụrụ nta” ahụ bụ́ ndị a kpọrọ ịga eluigwe na-akpakọrịta. (Luk 12:32; Jọn 10:16) E buru nke a n’amụma n’Abụ Ọma 71:18, bụ́ nke na-agụ, sị: “Ọbụna ruo agadi na isi awọ ahapụla m, Chineke; ruo mgbe m ga-egosi ọgbọ ọzọ ogwe aka Gị, gosikwa onye ọ bụla nke ga-abịa ịdị ike Gị.” Kemgbe ụwa, ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ dị nnọọ njikere ịzụ ndị enyi ha bụ́ atụrụ ọzọ ahụ ka ha nwee ike ịrụ ọrụ a na-amụbawanye amụbawanye, tupu ha ahapụ atụrụ ọzọ ahụ gakwuru Jizọs Kraịst n’eluigwe.

17 A pụrụ ikwu na ihe e dere n’Abụ Ọma 71:18 nke na-ekwu banyere ịkụziri “onye ọ bụla nke ga-abịa” ihe, metụtakwara atụrụ ọzọ ahụ, bụ́ ndị na-enweta ntụziaka site n’aka ndị Chineke e tere mmanụ. Jehova enyewo ndị agadi ihe ùgwù nke ịkọrọ ndị na-abata n’ọgbakọ ugbu a banyere ya. (Joel 1:2, 3) Atụrụ ọzọ ahụ nwere ekele maka ihe ndị ha mụtara n’aka ndị e tere mmanụ, nke a na-akpalikwa ha ịkụziri ndị ọzọ chọrọ ife Jehova ofufe ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ.—Mkpughe 7:9, 10.

18, 19. (a) Olee ihe ọmụma ndị bara uru a pụrụ inweta n’aka ndị ohu Jehova meworo agadi? (b) Gịnị ka Ndị Kraịst meworo agadi ga-eburu n’obi?

18 Ndị ohu Jehova meworo agadi, ma ndị nke e tere mmanụ, ma ndị nke so n’atụrụ ọzọ ahụ, na-eme ka a mata ihe ndị dị mkpa mere n’oge ndị gara aga. Ole na ole n’ime ha ka nọ ndụ taa nọ ya mgbe mbụ e gosiri “Foto Ihe Nkiri nke Okike.” Ụfọdụ n’ime ha maara nnọọ ụmụnna ndị ahụ na-edu ndú bụ́ ndị a tụrụ mkpọrọ n’afọ1918. Ndị ọzọ so kwuo okwu n’ụlọ ọrụ redio Watchtower bụ́ WBBR. Ọtụtụ pụrụ ịkọ banyere mgbe a gara okwu ikpe dị iche iche n’ụlọ ikpe ndị kasị elu iji mee ka Ndịàmà Jehova nwere onwe ha ikpe okpukpe ha. E nwekwara ndị ọzọ na-akwụsịghị ife Jehova ọbụna mgbe ha nọ n’okpuru ndị ọchịchị aka ike. Ee, ndị agadi pụrụ ịkọ otú e siworo jiri nke nta nke nta mee ka eziokwu ahụ dowanye anya. Bible na-agba anyị ume ka anyị mụta ihe site n’ahụmahụ ndị a bara uru.—Deuterọnọmi 32:7.

19 A gbara Ndị Kraịst merela agadi ume ka ha bụrụ ezi ihe nlereanya nye ndị na-eto eto. (Taịtọs 2:2-4) Ikekwe ị dịghị ahụ otú ntachi obi gị, ekpere gị, na ndụmọdụ gị si enyere ndị ọzọ aka ugbu a. Eleghị anya Noa, Ebreham, Josef, Mozis, na ndị ọzọ amaghị uru ikwesị ntụkwasị obi ha ga-abara ọgbọ ndị na-abịanụ. Ma, okwukwe na ikwesị ntụkwasị obi ha bara uru nke ukwuu; otú ahụkwa ka nke gị bara.

20. Ngọzi ndị dị aṅaa na-echere ndị nọgidere na-enwe olileanya ruo ọgwụgwụ?

20 Ma ị̀ dị ndụ gabiga “oké mkpagbu ahụ” ma à ga-akpọlite gị n’ọnwụ, ọ ga-abụ ihe na-enye obi ụtọ ịdị “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie”! (Matiu 24:21; 1 Timoti 6:19) Cheedị otú ọ ga-adị n’Ọchịchị Otu Puku Afọ nke Kraịst mgbe Jehova ga-emezi ihe nile ime agadi meghasịworo. Kama ahụ́ anyị ịnọgide na-adọlị, anyị ga-eteta ụra na-ahụ ka ahụ́ anyị ji nke nta nke nta na-akawanye mma—anyị ga na-enwekwu ume, anya anyị a na-ahụ ihe nke ọma, ntị anyị ana-anụ ihe nke ọma, anyị amaakwa mma. (Job 33:25; Aịsaịa 35:5, 6) Ndị nwere ihe ùgwù nke ibi n’ụwa ọhụrụ Chineke ga na-adị ka ndị na-eto eto mgbe nile ma e jiri afọ ndụ ha tụnyere ndụ ebighị ebi nke na-eche ha n’ihu. (Aịsaịa 65:22) N’ihi ya, ka anyị nọgide na-enwe olileanya ruo ọgwụgwụ ma nọgide jiri obi dum na-ejere Jehova ozi. Ka obi sie anyị ike na Jehova ga-emezu ihe nile o kwere ná nkwa nakwa na ihe ọ ga-emere anyị ga-akarị ihe ọ bụla ọ pụrụ ịbụ na anyị na-atụ anya ya.—Abụ Ọma 37:4; 145:16.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee uru ikwesị ntụkwasị obi Noa mere agadi baara ụmụ mmadụ?

• Olee otú okwukwe ndị nna ochie nwere si baara ọgbọ ndị sochiri ha uru?

• Mgbe ha merela agadi, olee otú Josef, Mozis, Jọshụa, na Samuel si gbaa ndị ha na ha na-efekọ Jehova ume?

• Ihe nlereanya dị aṅaa ka ndị agadi pụrụ isetịpụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 26]

Ntachi obi Ebreham nwere mmetụta dị ukwuu n’ahụ́ Aịzik

[Foto dị na peeji nke 28]

Ndụmọdụ bụ́ ịgba Mozis nyere Jọshụa gbara ya ume

[Foto dị na peeji nke 29]

Ekpere ị na-ekpe maka ndị ọzọ pụrụ ịbara ha uru dị ukwuu

[Foto dị na peeji nke 30]

Ndị na-eto eto na-erite uru site n’ige ndị agadi na-ekwesị ntụkwasị obi ntị