Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Site n’Akwụkwọ Mpịakọta Gaa na Codex Otú Bible Si Dịrị n’Ụdị Akwụkwọ

Site n’Akwụkwọ Mpịakọta Gaa na Codex Otú Bible Si Dịrị n’Ụdị Akwụkwọ

Site n’Akwụkwọ Mpịakọta Gaa na Codex Otú Bible Si Dịrị n’Ụdị Akwụkwọ

KEMGBE ụwa, enweela ụzọ dị iche ndị mmadụ siworo na-echekwa ihe ọmụma. N’oge ndị gara aga, ndị na-ede ihe dere ihe n’ahụ́ ihe ndị a kpụrụ akpụ, ná mbadamba nkume ma ọ bụ ná mbadamba osisi, n’akpụkpọ anụ nakwa n’ihe ndị ọzọ. Ka ọ na-erule na narị afọ mbụ, ihe e ji ede ihe n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa bụ akwụkwọ mpịakọta. Ka oge na-aga, a bịara nwee codex, bụ́ nke mesịrị nọchie akwụkwọ mpịakọta ma ghọọ ihe e jizi ede ihe n’ebe nile. O mekwara ka ọ dị nnọọ mfe ikesa Bible. Gịnị bụ codex, oleekwa otú e si malite iji ya eme ihe?

Codex yiri akwụkwọ ndị e nwere taa. Ọ bụ ùkwù mpempe akwụkwọ ndị a pịakọtara apịakọta, chịkọta ha ọnụ, ma jiri eriri gakọta ha. A na-ede ya ihe ihu na azụ, ọ na-enwekwa mkpo akwụkwọ siri ike. Codex ndị mbụ adịghị kpọmkwem ka akwụkwọ e nwere n’oge a, ma dị ka ọ na-adị ma ihe pụta ọhụrụ, e ji nwayọọ nwayọọ na-emeziwanye ya otú ga-adị ndị ji ya eme ihe mma.

Osisi, Wax, na Akpụkpọ Anụ

Ná mmalite, a na-ejikarị osisi sara mbara e tere wax emepụta codex. A hụrụ osisi ndị sara mbara e tere wax, bụ́ ndị e dere ihe na ha, ma jiri ihe jikọta ha ọnụ na Herculaneum, bụ́ obodo e bibikọtara ya na Pompeii mgbe Ugwu Vesuvius gbawara n’afọ 79 O.A. Ka oge na-aga, e ji akwụkwọ ndị a pụrụ ịpịakọta apịakọta dochie anya mbadamba nkume ndị ahụ a na-apụghị ịpịakọta apịakọta. N’asụsụ Latin, ihe a na-akpọ codex, ma ọ bụ akwụkwọ ndị a bụ membranae, ma ọ bụ akpụkpọ anụ. Ihe mekwaranụ e ji akpọ ya aha ahụ bụ n’ihi na e ji akpụkpọ anụ mee ibe akwụkwọ ya.

Ụfọdụ codex ndị ka dị n’oge a bụ ndị nke e ji papaịrọs mee. Codex kasị ochie Ndị Kraịst ji mee ihe, bụ́ nke e chekwara n’ebe ụfọdụ e nwere okpomọkụ n’Ijipt, bụ papaịrọs ka e ji mee ha. *

Akwụkwọ Mpịakọta Ka Ọ̀ Bụ Codex?

O yiri ka ọ bụ akwụkwọ mpịakọta ka Ndị Kraịst jikarịrị mee ihe ruo ná ngwụsị nke narị afọ mbụ nke O.A. Malite na narị afọ mbụ nke O.A. ruo na narị afọ nke atọ nke O.A, ndị na-akwado ka e jiri codex na-eme ihe na ndị nke kwadoro ka a nọgide jiri akwụkwọ mpịakọta na-eme ihe nwere arụmụka kpụ ọkụ n’ọnụ. Ndị na-adịghị njikere ịnakwere ihe ọhụrụ, bụ́ ndị akwụkwọ mpịakọta maarala ahụ́, achọghị ịhapụ ụzọ ochie ha si ede ihe. Ma cheedị ihe isi ike dị n’ịgụ ihe e dere n’akwụkwọ mpịakọta. Akwụkwọ mpịakọta bụ akwụkwọ papaịrọs ndị a nyakọtara anyakọta ka o wee too ogologo ma mechaa fụkọta ya. A na-ede ihe na kọlum na kọlum n’ihu ya. Onye na-agụ ya aghaghị ibu ụzọ fụhee ya iji chọta ebe ọ chọrọ ịgụ. Onye ahụ gụchaa, ya afụkọtakwa ya. (Luk 4:16-20) Onye na-ede akwụkwọ ga-achọ ihe karịrị otu akwụkwọ mpịakọta iji dechaa ihe ọ chọrọ ide, nke a na-emekwa ka ọ na-ara ahụ́ iji ya eme ihe. Ọ bụ ezie na Ndị Kraịst na narị afọ nke abụọ họọrọ iji codex ede ihe ndị ha chọrọ idepụta site n’Akwụkwọ Nsọ, e nwere ndị nọgidere na-eji akwụkwọ mpịakọta na-eme ihe ruo ọtụtụ narị afọ. Ma, ndị ọkà mmụta kweere na ojiji Ndị Kraịst jiri codex mee ihe nyere aka nke ukwuu n’ime ka ọtụtụ ndị malitezie iji ya na-eme ihe.

E nwere nnọọ ọtụtụ ihe codex ji kara akwụkwọ mpịakọta mma—a pụrụ iji ya dee ọtụtụ ihe, ọ dị mfe iji ya eme ihe, ọ dịkwa mfe obubu. N’agbanyeghị na ụfọdụ ndị na narị afọ mbụ ahụ chọpụtara ihe ndị a codex ji kara akwụkwọ mpịakọta mma, o siiri ha ike ịhapụ akwụkwọ mpịakọta. Ma ka ọtụtụ narị afọ na-agafe, e nwere ọtụtụ ihe mere codex ji jiri nwayọọ nwayọọ nọchichaa akwụkwọ mpịakọta.

Iji akwụkwọ mpịakọta ede ihe na-efu ego dị ukwuu karịa iji codex ede ihe. A pụrụ ide ihe n’ihu na n’azụ peeji ọ bụla nke codex, a pụkwara ịchịkọta ọtụtụ akwụkwọ ka ọ ghọọ otu akwụkwọ. Dị ka ụfọdụ ndị kwuru, isi ihe mere Ndị Kraịst na ndị ọkaiwu ji nwee nnọọ mmasị na codex bụ n’ihi na ọ dị mfe ịchọta peeji ọ bụla ị na-achọ. Ọtụtụ akwụkwọ a chịkọtara ọnụ n’otu—ya bụ, akụkụ Bible dị iche iche dịkọtara ọnụ—baara Ndị Kraịst uru nke ukwuu n’ọrụ ịgbasa ozi ọma. E wezụga nke ahụ, codex nwere mkpo, bụ́ nke a na-ejikarị osisi eme, nke mere ka ọ na-anọte aka karịa akwụkwọ mpịakọta.

Codex dịkwaara onye na-achọ ịgụ akwụkwọ n’onwe ya mfe. Ka ọ na-erule na narị afọ nke atọ, e nwere akwụkwọ Oziọma na-aba n’akpa uwe ndị ndị kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst ji eme ihe. Kemgbe ahụ, e bipụtala ọtụtụ ijeri Bible n’ozuzu ya, ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ na codex.

Taa, ọtụtụ ngwá ọrụ ndị e nwere emeela ka ọ dịkwuo mfe ịchọta ihe ọmụma sitere n’aka Chineke bụ́ ndị dị na Bible ngwa ngwa. A pụrụ ịchọta ya na kọmputa, keseeti ndị a na-ege ege, na n’akwụkwọ ndị e biri ebi. N’agbanyeghị nke ọ bụla ị họọrọ iji mee ihe, ihe dị mkpa bụ ịzụlite mmasị n’Okwu Chineke ma na-atụgharị uche na ya kwa ụbọchị.—Abụ Ọma 119:97, 167.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Lee isiokwu bụ́ “Codex nke Ndị Kraịst Oge Mbụ,” nke dị n’Ụlọ Nche Bekee nke August 15, 1962, peeji nke 501-505.

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Codex mere ka ọ dị nnọọ mfe ikesa Bible