Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-eṅomi Jehova n’Otú I Si Eche Banyere Ndị Ọzọ?

Ị̀ Na-eṅomi Jehova n’Otú I Si Eche Banyere Ndị Ọzọ?

Ị̀ Na-eṅomi Jehova n’Otú I Si Eche Banyere Ndị Ọzọ?

“NA-ATỤKWASỊ nchegbu nile unu n’ebe [Chineke] nọ, n’ihi na ọ na-eche banyere unu.” (1 Pita 5:7) Lee ka nke ahụ si bụrụ agbamume na-enye obi ụtọ! Jehova Chineke na-eche nnọọ banyere ndị ya. Ọ dịghị ihe ga-eme anyị n’aka ya.

Anyị kwesịrị ịmụta ịdị na-eche banyere ndị ọzọ otú ahụ ma na-egosipụta ya. Ebe anyị bụ ndị na-ezughị okè, ọ dị ihe ize ndụ ụfọdụ anyị kwesịrị izere mgbe anyị na-egosi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ. Tupu anyị atụlee ụfọdụ n’ime ha, ka anyị hụ ụzọ ụfọdụ Jehova si elekọta ndị ya.

Ọbụ abụ bụ́ Devid ji onye ọzụzụ atụrụ mee ihe atụ mgbe ọ na-akọwa otú Chineke si elekọta anyị, o kwuru, sị: “Jehova bụ onye na-azụ m dị ka atụrụ; ọ dịghị ihe kọrọ m. N’ebe ịta nri nke ahịhịa ndụ ka Ọ na-eme ka m makpuru: n’akụkụ mmiri nke izu ike ka Ọ na-edu m nwayọọ. Ọ na-eweghachi mkpụrụ obi m: . . . Ọzọ, a sị na ejee m ije na ndagwurugwu onyinyo ọnwụ, m gaghị atụ egwu ihe ọjọọ ọ bụla; n’ihi na Gị onwe gị nọnyeere m.”—Abụ Ọma 23:1-4.

Ebe Devid bụ onye ọzụzụ atụrụ, ọ maara ọrụ dị n’ilekọta ìgwè atụrụ. Onye na-azụ atụrụ na-echebe atụrụ ya pụọ n’aka anụ pụrụ iri ha, dị ka ọdụm, nkịta ọhịa, na anụ ọhịa bea. Ọ naghị ekwe ka ìgwè atụrụ ndị ahụ gbasasịa, ọ na-achọ atụrụ furu efu, na-ekuru ụmụ atụrụ ndị ike gwụrụ n’obi ya ma na-elekọta ndị nke na-arịa ọrịa ma ọ bụ ndị merụrụ ahụ́. Ọ na-enye ìgwè atụrụ ya mmiri kwa ụbọchị. Nke a apụtaghị na onye na-azụ atụrụ anaghị ekwe ka atụrụ ndị ahụ megharịa ahụ́. Atụrụ ndị ahụ na-akpagharịrị onwe ha, ma, a na-eche ha nche.

Ọ bụ otú ahụ ka Jehova si elekọta ndị ya. Pita onyeozi kọwara, sị: ‘Unu bụ ndị ike nke Chineke na-echebe.’ N’ebe a, “na-echebe” pụtara n’ụzọ nkịtị “na-eche unu nche.” (1 Pita 1:5) Ebe ọ bụ na Jehova na-eche banyere anyị n’ezie, ọ na-eche anyị nche mgbe nile, na-adị njikere mgbe nile inyere anyị aka mgbe ọ bụla anyị rịọrọ maka enyemaka ya. Otú ọ dị, Jehova kere anyị ka anyị bụrụ ndị nweere onwe anyị, n’ihi ya, ọ naghị elebacha anya n’ihe nile anyị na-eme nakwa ná mkpebi nile anyị na-eme. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Jehova n’akụkụ a?

Ṅomie Chineke n’Otú I Si Eche Banyere Ụmụ Gị

“Ihe nketa nke na-esi n’aka Jehova bịa ka ụmụ bụ.” N’ihi ya, ndị nne na nna kwesịrị ichebe ma na-elekọta ụmụ ha. (Abụ Ọma 127:3) Nke ahụ nwere ike ịgụnye ịgba ụmụ ha ume ikwupụta ihe bụ́ uche ha na ichebaziri ihe ndị ahụ echiche mgbe ha na ụmụ ha na-emekọrịta ihe. Ọ bụrụ na ndị nne na nna anwaa ịchịkwa ụmụ ha n’ihe nile ha na-eme, leghara ọchịchọ ha anya kpamkpam, ọ ga-adị ka onye ọzụzụ atụrụ nke na-anwa ịchịkwa atụrụ ya site n’ịmanye ha eriri n’olu. Ọ dịghị onye ọzụzụ atụrụ ga-esi otú ahụ na-eduzi ìgwè atụrụ ya; Jehova anaghịkwa esi otú ahụ eduzi anyị.

Mariko * kwuru, sị: “Ruo ọtụtụ afọ, anọ m na-agwa ụmụ m, ‘Meenụ nke a,’ ‘Unu emela nke a.’ Echere m na ọ bụ ọrụ dịịrị m dị ka nne. Adịghị m aja ha mma, mụ na ha anaghịkwa ekwurịtacha okwu.” N’agbanyeghị na nwa Mariko nke nwanyị na ndị enyi ya na-akparịta ụka ruo ọtụtụ awa na fon, ya na nne ya anaghị akparịta ụka ruo ogologo oge. Mariko gara n’ihu na-ekwu, sị: “Achọpụtara m ọdịiche dị ná mkparịta ụka mụ na ya na nke ya na ndị enyi ya. Mgbe nwa m nwanyị na-agwa ndị enyi ya okwu, ọ na-ekwu okwu ndị na-egosi ọmịiko, dị ka ‘Ee, ekwere m ekwe’ ma ọ bụ ‘Otú ahụ ka ọ dịkwa m.’ Amalitere m ịdị na-eji okwu ndị dị otú ahụ amata ihe dị n’obi nwa m nwanyị, n’oge na-adịghịkwa anya, mkparịta ụka mụ na ya bịara na-etokwu ogologo ma na-atọkwu ụtọ.” Nke a na-egosi mkpa ezigbo nkwurịta okwu dị, bụ́ nke kwesịrị ịdị n’etiti mmadụ abụọ, ọ bụghị nke nanị otu onye ga na-ekwu.

Ndị nne na nna kwesịrị ịmata ihe dị ụmụ ha n’obi, ụmụ kwesịkwara ịghọta ihe mere nlekọta nke ndị nne na nna ha ji bụụrụ ha ihe nchebe. Bible dụrụ ndị bụ́ ụmụ ọdụ ka ha na-erubere ndị mụrụ ha isi; mgbe ahụzi ya ekwuo ihe mere o ji nye ndụmọdụ ahụ, sị: “Ka o wee gaara gị nke ọma, ka i wee nọọkwa ogologo oge n’elu ụwa.” (Ndị Efesọs 6:1, 3) Ọ na-adịrị ụmụaka ndị ghọtara nnọọ uru dị n’ido onwe ha n’okpuru mfe karị irube isi.

N’Ilekọta Ìgwè Atụrụ Jehova

Nlekọta Jehova ji ịhụnanya na-elekọta anyị na-apụta ìhè n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ebe Jizọs Kraịst bụ Isi nke ọgbakọ ahụ, ọ na-eduzi ndị okenye ka ha na-elekọta ìgwè atụrụ ya. (Jọn 21:15-17) Okwu Grik e ji mee ihe maka onye nlekọta na ngwaa pụtara “ilezi ihe anya” nwere njikọ. Mgbe Pita na-ekwusi okwu ike banyere otú e kwesịrị isi mee nke a, ọ gwara ndị okenye, sị: “Na-azụnụ ìgwè atụrụ Chineke nke unu na-elekọta, ọ bụghị ná mmanye, kama n’ọchịchọ obi; ọ bụghịkwa n’ihi ịhụnanya nke uru aghụghọ, kama n’ịnụ ọkụ n’obi; ọ bụghịkwa ime ndị bụ ihe nketa nke Chineke dị ka ọ bụ unu nwe ha, kama na-aghọnụ ihe nlereanya nye ìgwè atụrụ ahụ.”—1 Pita 5:2, 3.

Ee, ọrụ ndị okenye yiri nke ndị na-azụ atụrụ. Ọ bụ ndị okenye ọgbakọ ka ọ dị n’aka inyere ndị na-arịa ọrịa n’ụzọ ime mmụọ aka, gbazie ha ka ndụ ha wee kwekọọ n’ụkpụrụ ezi omume. Ọ bụ ọrụ ndị okenye ịhazi ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ, ha ga-eme ndokwa maka ọmụmụ ihe ma na-eme ka udo dịrị n’ọgbakọ.—1 Ndị Kọrint 14:33.

Otú ọ dị, okwu ahụ Pita kwuru n’elu na-eme ka anyị mata otu ihe ize ndụ anyị nwere ike ịdaba na ya—ya bụ, ndị okenye ime ka ‘ọ̀ bụ ha nwe’ ọgbakọ. Otu ụzọ onye okenye nwere ike isi mee nke ahụ bụ inye iwu ndị na-adịghị mkpa. N’ihi otú okenye si were ọrụ dịịrị ya ilekọta ìgwè atụrụ ahụ, o nwere ike imebiga ihe ókè. N’otu ọgbakọ dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, ndị okenye nyere iwu otú a ga-esi na-ekele ndị ọzọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze—dị ka ihe atụ, ha kwuru onye kwesịrị ibu ụzọ kelee ibe ya—na-eche na idebe iwu ndị ahụ ga-eme ka udo dịrị n’ọgbakọ. N’agbanyeghị na ebumnobi ha adịghị njọ, ndị okenye ahụ hà na-eṅomi otú Jehova si elekọta ndị ya? Ọ dị nnọọ mma ịhụ na okwu ndị na-esonụ Pọl onyeozi kwuru gosipụtara echiche ya: “Ọ bụghị na anyị bụ ndị nna ukwu n’ebe okwukwe unu dị, kama anyị bụ ndị ọrụ ibe unu maka ọṅụ unu, n’ihi na ọ bụ n’okwukwe unu ka unu na-eguzo.” (2 Ndị Kọrint 1:24) Jehova na-atụkwasị ndị ya obi.

E wezụga ndị okenye ịghara inye iwu ndị na-adabereghị n’Akwụkwọ Nsọ, dị ka ndị na-ahụ n’anya, ha na-egosi na ha na-eche banyere ndị ọzọ n’ezie site n’ịghara ịkọsasị ihe banyere ndị ọzọ. Ha na-eburu ịdọ aka ná ntị sitere n’aka Chineke n’uche, nke bụ́: “Ekpughekwala ìzù nzuzo nke onye ọzọ.”—Ilu 25:9.

Pọl onyeozi ji ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ tụnyere ahụ́ mmadụ, kwuo, sị: “Chineke jikọtara ahụ́ ọnụ . . . ka e wee ghara inwe nkewa n’ahụ́, kama ka akụkụ ya nile wee na-elekọta ibe ha n’otu ụzọ ahụ.” (1 Ndị Kọrint 12:12, 24-26) Okwu Grik e ji mee ihe ebe a maka “na-elekọta ibe ha n’otu ụzọ ahụ” pụtara n’ụzọ nkịtị ‘kwesịrị ịdị na-echegbu onwe unu banyere ibe unu.’ Ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst kwesịrị inwe mmasị dị ukwuu n’ebe ibe ha nọ.—Ndị Filipaị 2:4.

Olee otú ezi Ndị Kraịst nwere ike isi gosi na ha ‘na-echegbu onwe ha banyere ibe ha’? Ha nwere ike igosipụta na ha na-eche banyere ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ site n’ekpere ha nakwa site n’inyere ndị nwere mkpa aka. Nke a na-eme ka a na-ahụta àgwà ọma ndị ọzọ nwere. Tụlee otú e si jiri ezigbo nchebara echiche dị otú ahụ nyere Tadataka aka. Mgbe o mere baptizim mgbe ọ dị afọ 17, ọ bụ nanị ya bụ onye na-efe Jehova n’ezinụlọ ha. Ọ kọrọ, sị: “Otu ezinụlọ mụ na ha nọ n’ọgbakọ na-akpọ m oku mgbe nile iso ha rie ihe na iso ha gaa nnọkọ. Ana m aga n’ụlọ ha ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kwa ụtụtụ mgbe m na-aga akwụkwọ iji soro ha gụọ ihe mmụta dịrị ụbọchị. Ha dụrụ m ọdụ banyere otú m ga-esi merie nsogbu ndị m na-enwe n’ụlọ akwụkwọ, mụ na ha na-ekpekọkwa ekpere ọnụ banyere ha. Esi m n’aka ezinụlọ a mụta inye ihe.” Ugbu a, Tadataka na-etinye ihe ndị ọ mụtara n’ọrụ site n’ije ozi n’otu alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova.

Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị banyere ihe ize ndụ ọzọ dị n’inwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ. O kwuru banyere ụmụ nwanyị ụfọdụ ghọrọla “ndị asịrị na ndị na-etinye ọnụ n’ihe ndị gbasara ndị ọzọ, na-ekwu banyere ihe ndị ha na-ekwesịghị ikwu.” (1 Timoti 5:13) Ọ bụ ezie na o kwesịrị ekwesị ka anyị na-enwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara iru n’ókè nke itinyewe ọnụ n’ihe ndị gbasara nanị ha. Inwe mmasị na-ezighị ezi n’ebe ndị ọzọ nọ nwere ike ịpụta ìhè mgbe anyị ‘na-ekwu banyere ihe ndị anyị na-ekwesịghị ikwu,’ dị ka mgbe anyị na-ekwu okwu ọjọọ banyere ha.

Anyị kwesịrị icheta na Ndị Kraịst nwere ụzọ dị iche iche ha si eme ihe ndị gbasara nanị ha, ihe ndị ha họọrọ ha ga-eri, na ụdị ntụrụndụ ha họọrọ. Onye ọ bụla n’ime anyị nweere onwe ya ịhọrọ ihe ọ ga-eme ma ọ bụrụhaala na o megideghị ụkpụrụ Bible. Pọl dụrụ Ndị Kraịst bụ́ ndị Rom ọdụ, sị: “Ka anyị kwụsị ịdị na-ekpe ibe anyị ikpe, . . . Ka anyị na-achụso ihe ndị na-akpata udo na ihe ndị na-ewuli ibe anyị elu.” (Ndị Rom 14:13, 19) Anyị kwesịrị igosi na anyị ji ezi obi na-eche banyere ibe anyị n’ọgbakọ site n’ịdị njikere inyere ha aka, ọ bụghị site n’itinye ọnụ n’ihe gbasara ndị ọzọ. Ọ bụrụ na anyị ana-eche banyere ibe anyị n’ụzọ dị otú a, ịhụnanya na ịdị n’otu ga na-adị n’ezinụlọ na n’ime ọgbakọ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 A gbanwere aha ụfọdụ.

[Foto dị na peeji nke 19]

Jiri ịja mma na obi ọmịiko chọpụta ihe dị ụmụ gị n’obi