Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọrụ Tara Akpụ Ernst Glück Rụrụ

Ọrụ Tara Akpụ Ernst Glück Rụrụ

Ọrụ Tara Akpụ Ernst Glück Rụrụ

IHE karịrị narị afọ atọ gara aga, Ernst Glück malitere ọrụ nanị mmadụ ole na ole rụtụrụla. O kpebiri ịsụgharị Bible gaa n’asụsụ ọ na-amaghị asụ.

A mụrụ Glück n’ihe dị ka afọ 1654 n’obere obodo bụ́ Wettin, nke dị nso na Halle, Germany. Nna ya bụ pastọ ndị chọọchị Lutheran, nke ahụ mekwara ka Ernst nwee mmasị n’ịmụ banyere Chineke. Mgbe ọ dị afọ 21, ọ mụchara ihe ọmụmụ nkà mmụta okpukpe ya na Germany ma kwaga n’ebe a na-akpọ Latvia ugbu a. N’oge ahụ, ọtụtụ ndị bi n’ebe ahụ agụghị akwụkwọ, akwụkwọ ndị e nwekwara n’asụsụ ha dị ole na ole. Glück dere, sị: “Mgbe m rutere n’ala a mgbe m ka bụ nwa okorobịa, nsogbu mbụ m chọpụtara e nwere ebe a bụ na chọọchị Latvian dị ebe ahụ enweghị Bible . . . Nke a mere ka m nọrọ n’ihu Chineke kpebie na m ga-amụ asụsụ a ma mụta ya nke ọma.” O kpebisiri ike ibipụtara ndị Latvia Bible n’asụsụ ha.

Ịkwado Maka Ọrụ Nsụgharị Ahụ

A na-akpọ ógbè ebe Glück bi n’oge ahụ Livonia, ọ bụkwa Sweden na-achị ya. Onye na-anọchi anya eze Sweden n’ebe ahụ bụ Johannes Fischer. O nwere mmasị ịkwalite ọnọdụ agụmakwụkwọ na nke mkpata ego ná mba ahụ. Glück gwara Fischer banyere ịsụgharị Bible gaa na Latvian. Fischer nwere ebe a na-ebi akwụkwọ n’isi obodo ahụ, bụ́ Riga. Site n’ibi Bible Latvian ahụ, ọ ga-enwe ike ịkwado mbọ ọ na-agba ịkwalite ọnọdụ agụmakwụkwọ, ma n’otu oge ahụ, nwetakwa ego buru ibu. Fischer gwara Eze Charles nke Iri na Otu nke Sweden ka o nye ya ikike maka nsụgharị ahụ. Eze ahụ nyere ya ikike maka ọrụ ahụ, ma kwe nkwa iweta ego a ga-eji rụọ ya. Akwụkwọ ikike eze bịanyere aka na ya n’August 31, 1681, mere ka a malite ịsụgharị Bible ahụ.

Ka ọ dịgodị, Glück nọ na-akwadebe onwe ya. Ebe ọ bụ onye Germany, ọ pụrụ iji nsụgharị Martin Luther mere ihe nlereanya iji sụgharịa Bible Latvian. Ma Glück chọrọ ibipụta nsụgharị kasị mma o nwere ike ibipụta, o kwubikwara na nke a ga-achọ ya n’aka isite n’asụsụ Hibru na Grik mbụ e ji dee Bible sụgharịa nke ya. Glück amachaghị asụsụ ndị mbụ ahụ e ji dee Bible nke ọma, n’ihi ya, ọ gara Hamburg, Germany, iji mụọ asụsụ Hibru na Grik. Mgbe ọ nọ ebe ahụ, o yiri ka ụkọchukwu bụ́ onye Livonia nke aha ya bụ Jānis Reiters ò nyeere ya aka ịmụta asụsụ Latvian nakwa asụsụ Grik e ji dee Bible.

Ọtụtụ Afọ O Ji Rụọ Ọrụ, Ọtụtụ Afọ O Ji Chere

Mgbe Glück mụsịrị asụsụ ndị ahụ n’afọ 1680, ọ lọghachiri Latvia ma malite ịrụ ọrụ dị ka pastọ. N’oge na-adịghị anya, ọ malitere ọrụ nsụgharị ya. N’afọ 1683, e mere Glück pastọ nke parish Alūksne nke buru ibu, bụ́ ebe ọ nọ mee nsụgharị ya.

N’oge ahụ, asụsụ Latvian enweghị okwu ndị a ga-eji sụgharịa ọtụtụ okwu na ndị a ga-eji kọwaa ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị na Bible. N’ihi ya, Glück tinyere okwu German ụfọdụ ná nsụgharị ya. Ma o mere ihe nile o nwere ike ime ịsụgharị Okwu Chineke gaa n’asụsụ Latvian, ndị ọkachamara kwetakwara na nsụgharị ya bụ ịgba. Glück wepụtadịrị okwu ndị ọhụrụ n’asụsụ ahụ, a na-ejizikwa nnọọ ọtụtụ okwu ndị ahụ o wepụtara eme ihe n’asụsụ Latvian. Ha gụnyere okwu Latvian maka “ihe atụ,” “oriri,” “dike,” “iledo ihe,” na “ịgba akaebe.”

Johannes Fischer nọgidere na-eme ka eze Sweden mara otú ọrụ nsụgharị ahụ si na-aga, akwụkwọ ozi ha derịtakwara gosiri na Glück sụgharịchara Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ka ọ na-erule afọ 1683. Ọ sụgharịchara Bible dum ka ọ na-erule afọ 1689, nke bụ́ na o ji nanị afọ asatọ rụchaa ọrụ a tara akpụ. * O were ogologo oge tupu e bipụta Bible ahụ, ma n’agbanyeghị nke ahụ, n’afọ 1694, o ruru ihe mgbaru ọsọ ya—gọọmenti kwadoro ka e kesaara ọhaneze Bible Latvian.

Ụfọdụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme ekwuola na ha echeghị na ọ bụ nanị Glück sụgharịrị Bible ahụ. Obi abụọ adịghị ya na o ji nsụgharị Luther mee ihe ma tinye akụkụ Bible ụfọdụ dịbu adị n’asụsụ Latvian ná nsụgharị ya. Ma, akụkụ Bible ndị ahụ dị ole na ole. È nwere ndị ọzọ so ya sụgharịa ya? Glück nwere onye enyemaka mgbe ọ na-asụgharị Bible ya, e nwekwara ndị ọzọ nyeere ya aka ịgụgharị ihe o dere na ịhụ na e deziri ya edezi. Otú ọ dị, o yighị ka aka ha nyeere ya ọ̀ gụnyere iso ya mee nsụgharị. N’ihi ya, o yiri ka ọ̀ bụ nanị Glück sụgharịrị Bible ahụ.

Bible ahụ Glück sụgharịrị nyere nnọọ aka n’uto nke asụsụ Latvian, ma ọ dị ihe ka nke ahụ mkpa ọ rụpụtara. Ndị Latvia mesịrị nwee ike ịgụ Okwu Chineke n’asụsụ ha ma nụrụ ozizi ndị na-enye ndụ dị na ya. Ha echefubeghị ihe Ernst Glück meere ha. Ndị Alūksne elekọtawo osisi oak abụọ a na-akpọ Glika ozoli, ma ọ bụ oak Glück, ruo ihe karịrị narị afọ atọ. Glück dọrọ osisi ndị ahụ iji na-echeta Bible Latvian ahụ. E nwere obere ebe ngosi ihe mgbe ochie n’Alūksne bụ́ ebe e nwere nsụgharị Bible dị iche iche, otu n’ime ha bụkwa mbipụta ndị mbụ nke Bible ahụ Glück sụgharịrị. E senyere Bible ahụ ma denye afọ 1689, bụ́ mgbe Glück sụgharịchara ya, n’akara e ji mara obodo Alūksne.

Ọrụ O Mesịrị Rụọ

N’oge na-adịghị anya ka Glück lọghachisịrị Latvia, ọ malitere ịmụ asụsụ Russian. N’afọ 1699, o dere na ya na-achọ iru ihe mgbaru ọsọ ọzọ ya nwere—ya bụ ịsụgharị Bible gaa n’asụsụ ahụ. N’akwụkwọ ozi o dere n’afọ 1702, o dere na ya amalitela idegharị Bible Latvian ahụ. Ma otú ọnọdụ si na-agbanwe n’obodo ahụ mere ka ọ na-esikwuru ya ike. Ka obodo Latvia nọsịrị n’udo ruo ọtụtụ afọ, ọ ghọrọ ọgbọ agha. N’afọ 1702, ndị agha Russia meriri ndị Sweden ma weghara Alūksne. A gbaara Glück na ezinụlọ ya ụgbọ nwa mkpi gaa Russia. * N’oge ọgba aghara ahụ, ihe ndị Glück dekọrọ iji degharịa Bible Latvian na iji sụgharịa Bible gaa n’asụsụ Russian funahụrụ ya. Ọ nwụrụ na Moscow n’afọ 1705.

Ihe ndekọ ndị ahụ a chọburu iji mee ihe maka nsụgharị Latvian na nke Russian ahụ bụ́ ndị a na-ahụkwaghị bụ oké mfu. Ma ruo taa, onye ọ bụla gụrụ Bible Latvian na-erite uru na Bible mbụ ahụ Glück sụgharịrị.

Ernst Glück bụ otu n’ime ọtụtụ ndị rụrụ ọrụ tara akpụ bụ́ ịsụgharị Bible gaa n’asụsụ dị n’ógbè dị iche iche. N’ihi mgbalị ndị dị otú a e mere, ọ fọdụrụ obere ka ọ bụrụ ìgwè nile na-asụ asụsụ dị iche iche dị n’ụwa nwere ike ịgụ Okwu Chineke n’asụsụ ha, ma si otú ahụ na-aṅụ mmiri dị oké ọnụ ahịa nke eziokwu. Ee, site ná nsụgharị Bible nke dị n’ihe karịrị puku asụsụ abụọ, Jehova anọgidela na-eme ka ndị mmadụ mara ya n’ebe nile.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Ọ bụ ndị ọkà mmụta 47 rụsiri ọrụ ike ruo afọ asaa iji sụgharịa Bible Authorized Version ma ọ bụ King James Version gaa n’asụsụ Bekee n’afọ 1611.

^ par. 14 Onye Glück ji mere ada mesịrị lụọ Eze Peter Onye Ukwu nke Russia. N’afọ 1725, bụ́ afọ Peter nwụrụ, ọ ghọrọ Catherine nke Mbụ, eze ukwu nwanyị nke Russia.

[Foto dị na peeji nke 13]

Bible Glück sụgharịrị

[Foto dị na peeji nke 14]

Ndịàmà Jehova na-akụzi Bible n’obodo ahụ Glück nọ sụgharịa ya