Ụwa nke Na-enweghị Otu Ụkpụrụ Na-achịkwa Ya
Ụwa nke Na-enweghị Otu Ụkpụrụ Na-achịkwa Ya
OTU akụkọ oge ochie a ma ama kwuru na Diogenes, bụ́ ọkà ihe ọmụma biri n’Atens na narị afọ nke anọ T.O.A., ji mpanaka na-agagharị n’etiti ehihie iji chọta otu onye bụ́ ezi mmadụ ma ọ dịghị onye ọ hụrụ.
Anyị amaghị ma akụkọ ahụ ò mere eme ka ọ̀ bụ na o meghị. Ma, a sị na Diogenes dị ndụ taa, ọ gaghị eju anyị anya ma ọ bụrụ na ọ chọgharịkwuo iji lee ma ọ̀ ga-ahụ ndị bụ́ ezi mmadụ. O yiri ka ọtụtụ ndị hà chere na e kwesịghị inwe otu ụkpụrụ na-achịkwa àgwà ndị mmadụ. Mgbe mgbe, ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-agwa anyị banyere àgwà rụrụ arụ ndị mmadụ kpara—na nzuzo, na gọọmenti, n’ebe ọrụ, n’egwuregwu, n’ógbè azụmahịa, na n’ebe ndị ọzọ. Ndị mmadụ anaghịzi akwanyere ọtụtụ ụkpụrụ ndị ọgbọ ndị gara aga ji kpọrọ ihe ùgwù. A na-enyozi ọtụtụ n’ime ụkpụrụ ndị a nabatara na mbụ enyo, mgbe mgbe, a na-agbahapụkwa ha. Ndị mmadụ na-anabata ụkpụrụ ndị ọzọ n’ọnụ efu ma ghara ịgbaso ha.
Otu onye ọkà n’ihe metụtara mmekọrịta okpukpe dị iche iche na ibe ha bụ́ Alan Wolfe kwuru, sị: “Oge agaala mgbe mmadụ nile na-agbaso otu ụkpụrụ.” A sịkwara na o kwuru, sị: “Ọ dịbeghị mgbe ọzọ n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ mgbe ndị mmadụ jụrụ ịdabere n’omenala na n’òtù dị iche iche iduzi omume ha dị ka ọ dị ugbu a.” Mgbe akwụkwọ akụkọ bụ́ Los Angeles Times na-ekwu banyere otu narị afọ gara aga, o kwuru ihe Jonathan Glover kwuru, nke bụ́ na ihe bụ́ isi kpatara oké ime ihe ike dị n’ụwa ugbu a bụ na ọtụtụ mmadụ anakwaghị erubere okpukpe na iwu ndị zuru ụwa ọnụ na-achịkwa omume isi.
Otú ọ dị, n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị amaghị ụkpụrụ nke ha ga-agbaso, ụfọdụ ndị anọgidewo na-achọ ụkpụrụ ndị ga na-eduzi omume ha. Afọ ole na ole gara aga, Federico Mayor, bụ́ onye bụ́bu onyeisi òtù UNESCO, kwuru na “ọ dịghị ihe na-echu ụmụ mmadụ ụra n’ụwa taa karịa ịchọta ụkpụrụ ga na-eduzi ndụ ha.” Ma ụwa ịghara inwe ụkpụrụ ziri ezi na-eduzi ya apụtaghị na e nweghị ụkpụrụ ndị ziri ezi mmadụ pụrụ ịgbaso, bụ́kwa ndị anyị kwesịrị ịgbaso.
Ma, mmadụ nile hà nwere ike ikwekọrịta ịgbaso otu ụkpụrụ? Ee e. Ya bụrụkwa na e nweghị ụkpụrụ mmadụ nile kwekọrịtara ịgbaso mgbe a bịara n’ikpebi ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ, olee otú mmadụ pụrụ isi mara ma ụkpụrụ ò ziri ezi? Echiche dị otú ahụ nke onye ọ bụla mere otú masịrị ya juru ebe nile taa. Ma, ị pụrụ ịhụ na echiche a emebeghị nnọọ ka àgwà ụmụ mmadụ ka mma.
Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ onye Britain nke aha ya bụ Paul Johnson kwenyesiri ike na echiche a nke onye ọ bụla mere otú masịrị ya esowo mee ka “ndị mmadụ . . . gharakwa ịdị na-ajụ nnọọ onwe ha ajụjụ banyere ihe ndị ha na-eme na iwere ya dị ka ọrụ dịịrị ha ịgbaso ụkpụrụ ndị ziri nnọọ ezi” bụ́ ihe ọtụtụ ndị na-eme tupu a banye na narị afọ nke 20.
Ebe ọ dị otú ahụ, mmadụ ò nwere ike ịchọta “ụkpụrụ ndị ziri nnọọ ezi” ma ọ bụ gbasoo “iwu ndị zuru ụwa ọnụ na-achịkwa omume”? Ọ̀ dị ebe anyị pụrụ isi nweta ụkpụrụ ndị oge ha na-adịghị agafe agafe, bụ́ ndị pụrụ ime ka ndụ anyị kwụsikwuo ike ma mee ka anyị nwee olileanya maka ọdịnihu? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.