Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Agwọ ahụ gwara Iv okwu ò nwere ụkwụ?

Dị ka e dekọrọ na Jenesis 3:14, Jehova Chineke gwara agwọ ahụ duhiere Iv n’ogige Iden okwu. Chineke kwuru, sị: “N’ihi na i mewo nke a, ihe a na-abụ ọnụ ka ị bụ karịa anụ ụlọ nile, na karịa anụ ọhịa nile ọ bụla; afọ gị ka ị ga-eji jee ije, ọ bụkwa ájá ka ị ga na-eri ụbọchị nile nke ndụ gị.” Bible ekwughị kpọmkwem na anụmanụ ahụ e ji nwaa Iv ọnwụnwa nweburu ụkwụ mesịzie gharakwa inwe. Ọ bụ ezie na okwu ndị e ji mee ihe na Jenesis 3:14 nwere ike ime ka ụfọdụ chee otú ahụ, anyị ekwesịchaghị ikwubi na agwọ nwere ụkwụ tupu ọbụbụ ọnụ a. N’ihi gịnị?

Isi ihe mere anyị ga-eji kwuo otú ahụ bụ na onye bụ́ isi Jehova mara ikpe ahụ bụ Setan—bụ́ mmụọ a na-adịghị ahụ anya nke ji anụmanụ ahụ na-adịghị ihe ọ ma mezuo nzube ọjọọ ya. Bible kọwara Setan dị ka “nna nke ụgha” na “agwọ mbụ ahụ.” O yiri ka okwu abụọ ahụ hà na-ezocha aka n’otú ahụ Setan si jiri anụmanụ, bụ́ agwọ, mee ihe dị ka ọnụ na-ekwuru ya iji duba Iv n’inupụrụ iwu Chineke isi.—Jọn 8:44; Mkpughe 20:2.

Ọ bụ Chineke kere agwọ, o yikwara ka Adam ò nyela agwọ aha ya tupu Setan ejiri ya duhie Iv. Ụta adịrịghị agwọ ahụ na-apụghị iche echiche nke gwara Iv okwu. Ọ gaghị ama na Setan ji ya na-arụ ọrụ, ọ gakwaghị enwe ike ịghọta ikpe Chineke mara ndị ahụ nupụrụ isi.

Oleekwanụ ihe mere Chineke ji kwuo na agwọ ga-ejizi afọ ya na-aga ije? Otú agwọ na-esi eme ma ọ nọrọ n’ọhịa ebe o bi, jiri afọ ya na-akpụgharị n’ala ma na-arapụta ire ya ka à ga-asị na ọ na-achọ ịra ájá, bụ nnọọ ihe atụ dabara adaba nke ọnọdụ Setan nọ na ya kemgbe e wedara ya ala. Ọ bụ ezie na ọ nọbu n’ọkwá dị elu dị ka otu n’ime ndị mmụọ ozi Chineke, e wedara ya ala ma dowe ya n’ọnọdụ dị ala nke Bible kpọrọ Tatarọs.—2 Pita 2:4.

Ọzọkwa, dị nnọọ ka agwọ nkịtị nwere ike imerụ mmadụ ahụ́ n’ikiri ụkwụ, mgbe e wedara Setan ala, ọ ‘ga-echifịa ikiri ụkwụ’ nke “mkpụrụ” Chineke. (Jenesis 3:15) Onye bụ́ isi ná mkpụrụ ahụ mesịrị bụrụ Jizọs Kraịst, bụ́ onye tara ahụhụ ruo nwa oge n’aka ndị na-ejere Setan ozi. Ma Kraịst na ndị òtù ya bụ́ Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị a kpọlitere n’ọnwụ ga-emesị gwepịa isi nke agwọ ahụ kpamkpam. (Ndị Rom 16:20) N’ihi ya, Chineke ilegide agwọ nkịtị anya na-ekwupụta ọbụbụ ọnụ ahụ dabara nnọọ adaba ná nkwatu a ga-akwatu “agwọ mbụ ahụ” a na-adịghị ahụ anya, bụ́ Setan bụ́ Ekwensu, na mbibi a ga-emesị bibie ya.