Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘E Mere Anyị Ka Anyị Bụrụ Oké Ọrụ’

‘E Mere Anyị Ka Anyị Bụrụ Oké Ọrụ’

‘E Mere Anyị Ka Anyị Bụrụ Oké Ọrụ’

“E jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ.”—ABỤ ỌMA 139:14.

1. Olee ihe mere ọtụtụ ndị na-eche echiche ji kwere na ọ bụ Chineke kere ihe ndị dị ịtụnanya dị n’ụwa?

IHE ndị dị ịtụnanya jupụtara n’ụwa anyị a. Olee otú ha si malite? Ụfọdụ chere na anyị nwere ike ịmata otú ha si malite n’ekwughị banyere Onye Okike nwere ọgụgụ isi. Ndị ọzọ chere na anyị ịsị na e nweghị Onye Okike n’ebughị ụzọ chee echiche ga-eme ka o siere anyị ike ịghọta ihe ndị dị n’ụwa. Ha kweere na ihe ndị dị n’ụwa dị mgbagwoju anya, dị ọtụtụ, ị pụkwara ịsị na ha dịkwa ebube nke ukwuu nke na mmadụ enweghị ike ịsị na ha pụtaara onwe ha. Ọtụtụ ndị, gụnyere ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị, kweere na e nwere ọtụtụ ihe ndị na-egosi na e nwere Onye Okike maara ihe, nke dị ike, na nke dị obiọma, kere eluigwe na ụwa. *

2. Olee ihe kpaliri Devid ito Jehova?

2 Eze Devid nke Izrel oge ochie kweere na e kwesịrị ito Onye Okike maka ihe ndị dị ịtụnanya O kere. Ọ bụ ezie na sayensị enwebeghị ọganihu otú o nwerela taa n’oge Devid, Devid maara na ihe ndị dị ebube Chineke kere gbara ya gburugburu. Mgbe Devid chere nanị banyere otú e si kee ahụ́ ya, ibobo nwụrụ ya nnọọ n’ahụ́ n’ihi ụdị ike Chineke nwere ike ihe. O dere, sị: “M ga-ekele Gị; n’ihi na e jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ: oké ọrụ ka ọrụ Gị nile dị; mkpụrụ obi m makwaara ya nke ọma.”—Abụ Ọma 139:14.

3, 4. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka onye nke ọ bụla n’ime anyị chemie echiche echemie banyere ọrụ Jehova?

3 Ihe mere Devid ji kwenyesie ike na e kwesịrị ito Chineke bụ na o chemiri echiche echemi. Taa, ụlọ akwụkwọ na usoro mgbasa ozi na-akụzi ọtụtụ ihe ndị na-ebibi okwukwe banyere otú ndụ mmadụ si malite. Ka anyị wee nwee ụdị okwukwe ahụ Devid nwere, anyị aghaghị ichemi echiche echemi. Anyị agatụghị ekwe ka ndị ọzọ cheere anyị echiche, karịsịa mgbe a bịara n’okwu gbara ọkpụrụkpụ dị ka ma è nwere Onye Okike na ihe bụ́ ọrụ Ya.

4 E wezụga nke ahụ, iche echiche banyere ọrụ Jehova na-eme ka anyị hụkwuo ya n’anya ma mee ka obi sie anyị ike ná nkwa ndị o kwere maka ọdịnihu. Nke ahụ nwekwara ike ịkpali anyị ịmatakwu Jehova nke ọma na ife ya ofufe. N’ihi ya, ka anyị tụlee otú sayensị nke oge a siworo gosi na Devid kwuru eziokwu mgbe o kwuru na ‘e mere anyị ka anyị bụrụ oké ọrụ.’

Ụzọ Dị Ịtụnanya Ahụ́ Anyị Si Eto

5, 6. (a) Olee otú anyị nile si malite ịdị ndụ? (b) Olee ọrụ akụrụ anyị na-arụ?

5 “Gị onwe gị enwetawo akụrụ m abụọ: Ị na-akpa m n’afọ nne m dị ka e si akpa ákwà.” (Abụ Ọma 139:13) Anyị nile malitere ndụ anyị n’ime afọ nne anyị dị ka mkpụrụ ndụ nke na-aharughị ka kpọm dị n’ọgwụgwụ ahịrịokwu a. Ihe dị n’ime mkpụrụ ndụ a a na-apụghị iji anya nkịtị ahụ dị egwu—n’ezie ọ dị ka ụlọ ọrụ ebe a na-emepụta mmiri ọgwụ! O toro ngwa ngwa. Mgbe ọ na-erule ọnwa abụọ a tụsịịrị ime gị, akụkụ ahụ́ gị ndị bụ́ isi adịla adị. Otu n’ime ha bụ akụrụ gị. Mgbe a mụrụ gị, akụrụ gị adịla njikere ịza ọbara nile dị gị n’ahụ́—na-azapụsị ihe ndị na-egbu egbu na mmiri ndị dị na ya ma na-ahapụ ihe ndị dị mma. Ya bụrụ na akụrụ gị abụọ ana-arụ ọrụ nke ọma, ha na-azapụsị mmiri n’ọbara gị kwa minit 45—ọbara dịkwanụ n’ahụ́ onye toro eto na-adị ihe dị ka lita ise!

6 Akụrụ gị na-achịkwakwa ọ̀tụ̀tụ̀ nke ihe ndị dị ka nnu na ihe ndị ọzọ yiri ya dị n’ahụ́ gị na otú ọbara si erugharị gị n’ahụ́. Akụrụ gị na-arụ ọrụ ndị ọzọ dị mkpa, dị ka ịgbanwe vitamin D ka ọ dịrị n’ụdị ahụ́ gị nwere ike iji rụọ ọrụ ime ka i nwee ọkpụkpụ siri ike ma na-emepụta mmiri ahụ́ a na-akpọ erythropoietin, bụ́ nke na-eme ka ọkpụkpụ gị na-emepụta ọbara uhie. Ka a sịkwa ihe mere e jirila kpọọ akụrụ “ọkpọka dọkịta ndị na-emepụtara ahụ́ ọgwụ”! *

7, 8. (a) Kọwaa otú nwa nọ n’afọ na-esi amalite ndụ. (b) Olee ihe mere e nwere ike iji sị na ‘a dụrụ nwa ka na-eto eto n’akpa nwa dị ka ákwà n’ebe nile dị ala nke ụwa’?

7 “Ọkpụkpụ m ezopụghị n’anya Gị, mgbe e mere m na nzuzo, mgbe a dụrụ m nke ọma, dị ka onye ọkà ọdụdụ ákwà si adụ, n’ebe nile dị ala nke ụwa.” (Abụ Ọma 139:15) Mkpụrụ ndụ mbụ ahụ kewara abụọ, mkpụrụ ndụ abụọ ahụ nọgidekwara na-ekewa. N’oge na-adịghị anya, mkpụrụ ndụ ndị ahụ bịara dịwa iche n’ibe ha, ma ọ bụ rụwa ọrụ dịgasị iche, na-aghọ mkpụrụ ndụ akwara, mkpụrụ ndụ uru ahụ́, mkpụrụ ndụ anụ ahụ́, na ụdị mkpụrụ ndụ ndị ọzọ. Mkpụrụ ndụ ndị na-arụ otu ọrụ jikọtara onwe ha ọnụ ma mesịa ghọọ akụkụ ahụ́ dị iche iche. Dị ka ihe atụ, n’izu nke atọ ka a tụsịịrị ime gị, ị malitere inwe ọkpụkpụ. Mgbe ị dị nanị izu asaa, bụ́kwa mgbe ị dị nanị ihe dị ka sentimita abụọ na ọkara n’ogologo, narị ọkpụkpụ abụọ na isii nile ga-adị gị n’ahụ́ mgbe i tochara apụtachaala, ọ bụ ezie na ha esibeghị ike.

8 Ihe a nile dị ịtụnanya nọ na-eme n’ime akpa nwa nne gị, bụ́ ebe zoro ezo nye anya mmadụ dị ka è liri ya n’ime ime ala. N’ezie, ọ dị ọtụtụ ihe ụmụ mmadụ na-amatabeghị banyere otú anyị si ghọọ mmadụ. Dị ka ihe atụ, olee ihe gwara mkpụrụ ndụ dị iche iche dị gị n’ahụ́ ka ha ghọwa ụdị mkpụrụ ndụ dịgasị iche n’ibe ha? Ndị ọkà mmụta sayensị nwere ike imesị mata azịza ya, ma dị ka Devid kwuziri, Onye Okike anyị—bụ́ Jehova—maara ya nke ọma kemgbe.

9, 10. Olee otú o si bụrụ na “e dere” otú akụkụ ahụ́ dị iche iche nke nwa e bu n’afọ si apụta “n’akwụkwọ” Chineke?

9 “Anya Gị abụọ hụrụ ahụ́ m mgbe ọ ka-ezughị okè, ọ bụkwa n’akwụkwọ Gị ka e dere ihe nile dị m n’ahụ́, nke a kpụrụ kwa ụbọchị, mgbe ọ dịghị otu ihe dị n’ime ha.” (Abụ Ọma 139:16) Mkpụrụ ndụ mbụ gị ahụ nwere ụkpụrụ nke otú ahụ́ gị nile ga-adị. Ọ bụ ụkpụrụ a duziri uto gị n’ọnwa itoolu ị nọrọ n’afọ tupu a mụọ gị ma nọgide na-eduzi uto gị ruo ihe karịrị afọ iri abụọ i ji ghọọ onye toro eto. N’oge a, ahụ́ gị gabigara oge uto dị iche iche, ihe duzikwara ha nile bụ ihe ndị dị n’ime mkpụrụ ndụ mbụ ahụ.

10 Devid amaghị ihe banyere mkpụrụ ndụ na ihe ndị dị n’ime ha na-achịkwa ha, ebe ọ bụ na o nwedịghị onyokomita e ji ahụ ha. Ma ọ ghọtara nnọọ na otú ahụ́ nke ya si too gosiri na ọ dị ụkpụrụ a tụrụla atụ ọ na-agbaso. O nwere ike ịbụ na Devid maara ihe ụfọdụ banyere otú nwa si eto n’akpa nwa, n’ihi ya, o kwuru na ọ ghaghị ịbụ na oge uto ya nile dabara n’ụkpụrụ a tụrụla atụ na n’oge a kapịrịla ọnụ. O ji abụ kọwaa na “e dere” ụkpụrụ a “n’akwụkwọ” Chineke.

11. Olee ihe mere anyị ji dịrị otú anyị dị n’ile anya?

11 Taa, a matala na ihe ndị i ketara n’aka nne gị na nna gị na ndị nne na nna gị ochie—dị ka ogo gị, ihu gị, ụcha anya na ntutu isi gị, na ọtụtụ puku ihe ndị ọzọ—dị ná mkpụrụ ndụ ihe nketa gị. Mkpụrụ ndụ gị nke ọ bụla nwere ọtụtụ iri puku mkpụrụ ndụ ihe nketa, nke ọ bụla n’ime mkpụrụ ndụ ihe nketa ndị a bụ́ ndị bú ihe i ketara n’aka nne na nna gị so n’otu ogologo ihe dị ka chen a na-akpọ DNA (deoxyribonucleic acid). E “dere” ntụziaka nile banyere otú ị ga-adị n’ime DNA gị. Mgbe ọ bụla mkpụrụ ndụ gị kewara—iji mepụta mkpụrụ ndụ ndị ọhụrụ ma ọ bụ iji dochie ndị mere ochie—DNA gị na-etinye ntụziaka ndị a n’ime mkpụrụ ndụ ndị ọhụrụ ahụ, si otú ahụ mee ka ị nọgide na-adị ndụ ma dịkwa otú ị dị n’ile anya. Lee ka nke ahụ si egosi nnọọ ike na amamihe nke Onye Okike anyị nke bi n’eluigwe!

Uche Anyị nke Pụrụ Iche

12. Olee ihe kasị mee ka ụmụ mmadụ dị iche n’ụmụ anụmanụ?

12 “Lee ka echiche Gị nile si dị oké ọnụ ahịa n’anya m, Chineke! Lee ka ọnụ ọgụgụ nile ha si dị ukwuu hie nne! Ọ bụrụ na agụọ m ha ọnụ, ha bara ụba karịa ájá.” (Abụ Ọma 139:17, 18a) E mekwara ụmụ anụmanụ ka ha bụrụ oké ọrụ, ụfọdụ n’ime ha nwekwara ikike ụfọdụ karịrị nke ụmụ mmadụ. Ma Chineke nyere ụmụ mmadụ ọgụgụ isi karịrị nke ụmụ anụmanụ ndị ahụ. Otu akwụkwọ sayensị kwuru, sị: “N’agbanyeghị otú anyị na ihe ndị ọzọ dị ndụ n’ụwa si yie, anyị dị iche n’ihe ọ bụla ọzọ dị ndụ n’ihi ikike anyị nwere ịsụ asụsụ na iche echiche. Ihe ọzọkwa mere anyị ji dị iche bụ otú anyị si enwe ọchịchọ ịmata banyere onwe anyị: Olee otú ahụ́ anyị si bịa dịrị otú ọ dị? Olee otú e si kee anyị?” Ọ bụkwa ajụjụ ndị a ka Devid chebaara echiche.

13. (a) Olee otú Devid si nwee ike ịtụgharị uche banyere echiche Chineke? (b) Olee otú anyị pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya Devid?

13 Ụzọ kasị mkpa anyị si dị iche n’ụmụ anụmanụ bụ na anyị nwere ike iche echiche banyere Chineke. * Onyinye a pụrụ iche anyị nwere so n’ihe ndị mere e ji sị na e kere anyị “n’onyinyo Chineke.” (Jenesis 1:27) Devid ji onyinye a mee ihe nke ọma. O chebaara ihe ndị na-egosi na Chineke dị adị echiche nakwa ezi àgwà ihe ndị e kere eke gbara ya gburugburu n’ụwa na-egosipụta. Devid nwekwara akụkụ ndị mbụ nke Akwụkwọ Nsọ, bụ́ ebe Chineke nọ kọwaa onwe ya na ọrụ ya. Akwụkwọ ndị a e dere n’ike mmụọ nsọ nyeere Devid aka ịghọta echiche Chineke, àgwà ya, na nzube ya. Devid ịtụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ, n’ihe ndị e kere eke, nakwa n’otú Chineke si emeso ya ihe mere ka o too Onye Okike ya.

Ihe Okwukwe Gụnyere

14. Olee ihe mere o ji ghara ịdị anyị mkpa ịmata ihe nile banyere Chineke iji nwee okwukwe na ya?

14 Ka Devid na-atụgharịkwu uche n’ihe ndị e kere eke na n’Akwụkwọ Nsọ, otú ahụ ka ọ na-aghọtakwu na ọ gaghị ekwe ya omume ịghọtacha ihe ọmụma na ikike Chineke. (Abụ Ọma 139:6) Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị. Ọ dịghị mgbe anyị ga-enwe ike ịghọtacha ihe nile Chineke kere eke. (Eklisiastis 3:11; 8:17) Ma ihe ọmụma Chineke meworo ka ọ ‘pụta ìhè’ n’Akwụkwọ Nsọ na n’ihe ndị o kere eke ga-ezu ime ka ndị na-achọ eziokwu ga-adị ndụ n’oge ọ bụla nwee okwukwe nke dabeere n’ihe àmà.—Ndị Rom 1:19, 20; Ndị Hibru 11:1, 3.

15. Nye ihe atụ iji gosi ihe jikọrọ okwukwe na mmekọrịta anyị na Chineke.

15 Inwe okwukwe abụghị nanị ikwere na e nwere Onye nwere ọgụgụ isi kere eluigwe na ụwa. Ọ gụnyere ịtụkwasị Jehova Chineke obi dị ka onye dị adị—onye chọrọ ka anyị mata ya nakwa ka anyị na ya nọgide na-adị ná mma. (Jems 4:8) Anyị nwere ike iji ya tụnyere okwukwe na ntụkwasị obi mmadụ na-enwe ná nna ya nke hụrụ ya n’anya. Ọ bụrụ na onye na-atụkwasịghị nna gị obi ajụọ gị ma nna gị ọ̀ ga-enyere gị aka n’ezie mgbe ị nọ ná nsogbu, o nwere ike ị gaghị emeli ka o kweta na nna gị kwesịrị ntụkwasị obi. Ma ya bụrụ na ọ dịla ọtụtụ ihe merelanụ ndị mere ka ị mata àgwà ọma ndị nna gị nwere, obi ga-esi gị ike na ọ gaghị ahapụ gị mgbe enyemaka ya dị gị mkpa. N’otu aka ahụ, ịmata Jehova site n’ịmụ Akwụkwọ Nsọ, ịtụgharị uche n’ihe ndị o kere eke, na site n’ịhụ otú o si nyere anyị aka mgbe anyị kpegaara ya ekpere na-eme ka anyị tụkwasị ya obi. Ọ na-eme ka anyị chọọ ịnọgide na-amụtakwu ihe banyere ya na ito ya ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ịhụnanya na nsọpụrụ achọghị ọdịmma onwe onye anyị nwere n’ebe ọ nọ. Nke ahụ bụ nzube kasị elu onye ọ bụla nwere ike ịgbalị iru.—Ndị Efesọs 5:1, 2.

Na-achọ Nduzi nke Onye Okike Anyị!

16. Olee ihe anyị pụrụ ịmụta site ná mmekọrịta chiri anya Devid na Jehova nwere?

16 “Gwupụta ala obi m, Chineke, wee mara obi m: na-anwa m, wee mara iche uche m nile: hụkwa ma ọ̀ dị ụzọ ọ bụla na-eweta ihe mgbu dị n’ime m, durukwa m n’ụzọ ebighị ebi.” (Abụ Ọma 139:23, 24) Devid maara na Jehova eburula ụzọ mara ya nke ọma—Onye Okike ya maara nnọọ ihe nile o chere n’echiche, ihe nile o kwuru, ma ọ bụ mee. (Abụ Ọma 139:1-12; Ndị Hibru 4:13) Chineke ịmaru Devid ala otú ahụ mere ka ahụ́ ruo Devid ala, dị nnọọ ka ahụ́ na-esi eru obere nwa ala mgbe nne ya na nna ya ku ya. Devid ji mmekọrịta chiri anya ya na Jehova nwere kpọrọ ihe ma gbalịa ichebe mmekọrịta ahụ site n’ichemi echiche echemi n’ihe ndị O kere eke na ikpegara Ya ekpere. N’ezie, ọtụtụ n’ime abụ ọma Devid—nke gụnyere Abụ Ọma nke 139—bụ nnọọ ekpere ndị a bụrụ dị ka abụ. Ntụgharị uche na ekpere pụkwara inyere anyị aka ịbịaru Jehova nso.

17. (a) Olee ihe mere Devid ji chọọ ka Jehova nyochaa obi ya? (b) Olee otú otú anyị si jiri ikike anyị nwere ime nhọrọ mee ihe si emetụta ndụ anyị?

17 Ebe ọ bụ na e kere anyị n’onyinyo Chineke, anyị nwere ikike ime nhọrọ. Anyị nwere ike ịhọrọ ime ezi ihe ma ọ bụ ihe ọjọọ. Nnwere onwe dị otú ahụ na-eme ka anyị bụrụ ndị ga-aza ajụjụ banyere àgwà anyị. Devid achọghị ka a gụkọta ya na ndị na-emebi iwu. (Abụ Ọma 139:19-22) Ọ chọrọ izere ime ihe ọjọọ ndị ga-akpatara ya obi mgbawa. N’ihi ya, mgbe Devid chere echiche banyere ihe ọmụma na-enweghị nsọtụ nke Jehova nwere, o ji ịdị umeala n’obi rịọ Chineke ka o nyochaa obi ya ma duo ya n’ụzọ nke ga-eduga ya ná ndụ. Ụkpụrụ ezi omume Chineke bụ maka mmadụ nile; n’ihi ya, anyị onwe anyị kwa kwesịrị ịhọrọ ime ezi ihe. Jehova na-agba anyị nile ume irubere Ya isi. Ime otú ahụ ga-eme ka ihe anyị na-adị ya mma, meekwa ka ọ gọzie anyị. (Jọn 12:50; 1 Timoti 4:8) Iso Jehova eje ije kwa ụbọchị na-enyere anyị aka inwe udo nke obi, ọbụna mgbe anyị nọ n’oké nsogbu.—Ndị Filipaị 4:6, 7.

Gbasoo Onye Okike Anyị Dị Ebube!

18. Olee ihe Devid kwubiri mgbe o chesịrị echiche banyere ihe ndị e kere eke?

18 Mgbe Devid bụ nwa okorobịa, ọ na-anọkarị n’ọhịa n’abalị na-azụ atụrụ. Mgbe atụrụ ndị ahụ hulatara na-ata nri, Devid na-eleli anya elu. N’abalị ahụ ọchịchịrị gbachiri ebe nile, Devid na-eche echiche banyere otú eluigwe na ala si buo ibu na ihe mere Chineke ji kee ihe a nile. Devid dere, sị: “Eluigwe na-akọ nsọpụrụ Chineke; ọ bụkwa ọrụ aka Ya ka mbara eluigwe na-egosi. Otu ụbọchị na-agwawara ụbọchị ibe ya okwu ọnụ n’ụba, otu abalị na-ekwupụtakwara abalị ibe ya ihe ọmụma.” (Abụ Ọma 19:1, 2) Devid ghọtara na ọ dị ya mkpa ịchọ ma gbasoo Onye ahụ mere ihe nile ka ha dị ebube. Ọ dịkwa anyị mkpa ime otú ahụ.

19. Olee ihe ndị ụmụaka na ndị okenye ga-amụta site n’ịmata na ‘e mere anyị ka anyị bụrụ oké ọrụ’?

19 Devid biri ndụ kwekọrọ na ndụmọdụ ahụ nwa ya bụ́ Solomọn mesịrị nye ndị na-eto eto, nke bụ́: “Chetakwa Onye keworo gị n’ụbọchị nile ị dị n’okorobịa . . . Tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile.” (Eklisiastis 12:1, 13) Mgbe Devid ka bụ nwa okorobịa, ọ ghọtalarị na ‘e mere ya ka ya bụrụ oké ọrụ.’ Ibi ndụ kwekọrọ ná nghọta a o nwere baara ya nnọọ uru ná ndụ ya nile. Ọ bụrụ na anyị nile, ma nwata ma okenye, ana-eto ma na-efe Onye Okike Ukwu anyị, anyị ga-enwe obi ụtọ ná ndụ anyị ugbu a nakwa n’ọdịnihu. Bible kwere ndị nọ Jehova nso ma na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụzọ ezi omume ya nkwa, sị: “Ha ga-anọ na-amị mkpụrụ n’isi awọ; osisi nke mmiri dị ha n’ahụ́ hie nne, nke nwezukwara akwụkwọ ndụ, ka ha ga-abụ. Igosi na Jehova ziri ezi.” (Abụ Ọma 92:14, 15) Anyị ga-enwekwa olileanya nke ịnụ ụtọ ihe ndị dị ebube Onye Okike anyị kere ruo mgbe ebighị ebi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 1 Lee Teta! (Bekee) nke June 22, 2004, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 6 Leekwa isiokwu bụ́ “Akụrụ Gị—Nzà Dị Gị Mkpa ná Ndụ,” nke dị na Teta! (Bekee) nke August 8, 1997.

^ par. 13 Okwu Devid ndị dị n’Abụ Ọma 139:18b yiri ka hà pụtara na ọ bụrụ na ọ malite n’ụtụtụ ruo mgbe o hiri ụra n’abalị gụkọwa echiche Jehova, mgbe o tetara n’ụtụtụ, ọ ka ga-enwe ndị ọ na-agụbeghị.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Olee otú otú nwa e bu n’afọ na-esi eto si egosi na ‘e mere anyị ka anyị bụrụ oké ọrụ’?

• Olee ihe mere anyị kwesịrị iji na-atụgharị uche n’echiche Jehova?

• Olee ihe jikọrọ okwukwe na mmekọrịta anyị na Jehova?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Uto nke nwatakịrị nọ n’afọ na-agbaso ụkpụrụ a tụrụla atụ

DNA

[Ebe E Si Nweta Foto]

Nwa e bu n’afọ: Lennart Nilsson

[Foto dị na peeji nke 24]

Dị ka ụmụaka ndị tụkwasịrị nna ha hụrụ ha n’anya obi, anyị tụkwasịrị Jehova obi

[Foto dị na peeji nke 25]

Ịtụgharị uche n’ihe ndị Jehova kere kpaliri Devid ito Ya