Ndị Ụkpụrụ Ndị Oge Ha Na-adịghị Agafe Agafe Na-eduzi
Ndị Ụkpụrụ Ndị Oge Ha Na-adịghị Agafe Agafe Na-eduzi
OBODO nile nwere ihe ndị ha weere dị ka ezi ihe na ihe ndị ha weere dị ka ihe ọjọọ. Í kwetaghị na e ji àgwà ndị dị ka ịkwụwa aka ọtọ, obiọma, ọmịiko, na achọghị ọdịmma onwe onye kpọrọ nnọọ ihe gburugburu ụwa, nakwa na ha na-amasị ihe ka ọtụtụ n’ime anyị?
Olee Onye Nyere Ụkpụrụ Ndị Ahụ?
Na narị afọ mbụ O.A., otu nwoke gụrụ akwụkwọ nke ọma a kpọrọ Sọl biri n’etiti ndị Ndị Rom 2:14, 15.
atọ nwechara ụkpụrụ nke ha—ndị Juu, ndị Gris, na ndị Rom. Sọl chọpụtara na e wezụga ọtụtụ omenala obodo ndị ahụ na-agbaso, na e nwere ihe ụmụ mmadụ bu pụta ụwa na-achịkwa omume ha. Ọ bụ akọnuche anyị. Mgbe Sọl ghọsịrị Onye Kraịst ma zawazie Pọl onyeozi, o dere, sị: “Mgbe ọ bụla ndị mba ọzọ, bụ́ ndị na-enweghị iwu, sitere n’ọmụmụ [“amamihe e bu pụta ụwa,” The New Testament in Modern Speech] na-eme ihe ndị dị n’iwu, ndị a, ọ bụ ezie na ha enweghị iwu, bụ iwu nye onwe ha. Ha onwe ha bụ kpọmkwem ndị na-egosipụta isi ihe dị n’iwu ahụ ịbụ nke e dere n’obi ha, ebe akọ na uche ha so ha na-agba àmà.”—Ma, “amamihe e bu pụta ụwa” ò zuuru anyị mgbe anyị na-achọ ikpebi ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ? O nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na akụkọ ihe mere eme kọrọ ọtụtụ ihe ọjọọ ndị mmadụ na òtù dị iche iche mere. Nke a emewo ka ọtụtụ ndị kwenyesie ike na ọ dị anyị mkpa inweta nduzi nke onye ka anyị elu iji nweta ụkpụrụ kasị mma ga na-eduzi ndụ anyị. Ọtụtụ ndị ga-ekweta na ọ bụ Onye kere mmadụ nọ n’ọnọdụ kasị mma inye anyị ụkpụrụ ndị dị otú ahụ oge ha na-adịghị agafe agafe. Dr. Carl Jung kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ The Undiscovered Self, sị: “Onye na-adabereghị na Chineke enweghị ike imeri ọnwụnwa anụ ahụ́ na nke omume jupụtara n’ụwa n’ike nke aka ya.”
Nkwubi okwu ahụ kwekọrọ n’ihe otu onye amụma oge ochie dere: “Ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Onye Okike anyị na-ekwu, sị: ‘M na-ezi gị ime ihe na-aba uru, M na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso.’—Aịsaịa 48:17.
Ebe Anyị Pụrụ Isi Nweta Ụkpụrụ Ndị Anyị Pụrụ Ịtụkwasị Obi
Okwu ndị ahụ e hotara n’elu sitere n’akwụkwọ na-akụzi omume ọma, bụ́kwa akwụkwọ a kasị kesaa n’ụwa nile—nke bụ́ Akwụkwọ Nsọ. Ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa, ọbụna ndị na-abụghị Ndị Kraịst na ndị na-anọghị n’okpukpe ọ bụla, agụwo Akwụkwọ Nsọ iji nweta amamihe na nghọta. Onye Germany na-ede egwú bụ́ Johann Wolfgang von Goethe dere, sị: “Enwere m nnọọ mmasị na [Bible] ma na-akwanyere ya ùgwù, n’ihi na ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ya ka m si mụta omume ọma nile m nwere.” E kwuru na ọ dị mgbe onye ndú ndị okpukpe Hindu bụ́ Mohandas Gandhi kwuru, sị: “Gbalịsie ike ịmụ okwu ndị dị n’Ozizi Elu Ugwu ahụ [nke so n’ozizi Jizọs Kraịst ndị dị na Bible] nke ọma . . . N’ihi na Ozizi Elu Ugwu ahụ dịịrị anyị nile.”
Pọl onyeozi, bụ́ onye e hotara okwu ya na mbụ kọwara ọrụ dị mkpa Akwụkwọ Nsọ na-arụ n’inye anyị ụkpụrụ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru maka izi ihe.” (2 Timoti 3:16) Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu?
Gịnịkwanụ ma ị chọpụta n’onwe gị? Jiri nlezianya tụlee ụkpụrụ ndị e depụtara na peeji na-esonụ. Rịba uru ndị ị ga-erite na ha ama. Chee echiche otú ozizi ndị a pụrụ isi mee ka ndụ gị na mmekọrịta gị na ndị ọzọ ka mma.
Ị̀ Ga-erite Uru na Ha?
Ụkpụrụ ndị ahụ e depụtara bụ ihe atụ ole na ole nke ndụmọdụ ndị bara uru dị n’Akwụkwọ Nsọ. E wezụga ndụmọdụ ndị a, e nwere ọtụtụ ịdọ aka ná ntị e nyere anyị n’Okwu Chineke megide iche echiche ọjọọ, ikwu okwu ọjọọ, na ime omume ndị nwere ike ịla ndụ anyị n’iyi.—Ilu 6:16-19.
Ee, ozizi Bible nwere otu ihe kọrọ nnọọ ụmụ mmadụ ụkọ—nke bụ́ ndụmọdụ ga-enyere ha aka ịgbaso ụkpụrụ kasị mma e nwere. Ndị nabatara ozizi ndị a ma na-etinye ha n’ọrụ na-enwe mgbanwe dị ịrịba ama ná ndụ ha. Ụzọ ha si eche echiche na-aka mma. Ndị Efesọs 4:23, 24) Ha na-ebukwu ezi ihe n’obi. Ịmụ ụkpụrụ Chineke ndị dị na Bible enyeworo ọtụtụ ndị aka ihichapụ ịkpa ókè agbụrụ na ịkpọasị n’obi ha. (Ndị Hibru 4:12) Akwụkwọ Nsọ na ụkpụrụ ndị dị na ya akpaliwo ndị mmadụ ịkwụsị ụdị ime ihe ike na omume ọjọọ nile ma kpaziwe àgwà.
(Ee, ụkpụrụ Bible enyeworo ọtụtụ nde mmadụ aka ịgbanwe àgwà na omume ndị gbanyesiri mkpọrọgwụ ike n’ime ha, bụ́ ndị laworo ndụ ndị ọzọ n’iyi. (1 Ndị Kọrint 6:9-11) Ozizi Bible anọwo na-agbanwe ndị dị otú ahụ—ọ bụghị nanị àgwà ha, kama obi ha, olileanya ha na ezinụlọ ha. N’agbanyeghị otú ụwa si na-ajọwanye njọ, ndụ ndị mmadụ anọgidewo na-aka mma gburugburu ụwa. Nke a agaghịkwa akwụsị akwụsị. “Ahịhịa akpọnwụwo, okooko ọhịa ajanwụwo: ma okwu Chineke anyị ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Aịsaịa 40:8.
Ma, “okwu Chineke anyị” ọ̀ ga-abara gị onwe gị uru? Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ igosi gị otú ị ga-esi agbaso ụkpụrụ Bible iji rite uru na ha. Ịgbaso ụkpụrụ ndị dị otú ahụ ga-eme ka ihe anyị dị Chineke mma ugbu a ma duga anyị ná ndụ ebighị ebi nke ụkpụrụ Chineke ndị oge ha na-adịghị agafe agafe na-achịkwa.
[Igbe dị na peeji nke 6, 7]
ỤKPỤRỤ NDỊ OGE HA NA-ADỊGHỊ AGAFE AGAFE
Otú anyị ga-esi na-emeso ndị ọzọ ihe. “Ya mere, ihe nile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ; n’eziokwu, nke a bụ ihe Iwu ahụ na akwụkwọ ndị amụma pụtara.”—Matiu 7:12.
Hụ onye agbata obi gị n’anya. “Ị ghaghị ịhụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Matiu 22:39) “Ịhụnanya adịghị arụ ihe ọjọọ n’ebe onye agbata obi mmadụ nọ; ya mere ịhụnanya bụ idebezu iwu ahụ.”—Ndị Rom 13:10.
Na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù. “N’ịhụnanya ụmụnna, na-enwenụ mmetụta dị nro maka ibe unu. N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.”—Ndị Rom 12:10.
Na-achọ udo. “Nọgidekwanụ na-adị n’udo n’etiti ibe unu.” (Mak 9:50) “Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, bụrụnụ ndị ha na mmadụ nile na-adị n’udo.” (Ndị Rom 12:18) “Ka anyị na-achụso ihe ndị na-akpata udo.”—Ndị Rom 14:19.
Na-agbaghara ndị mejọrọ gị. “Gbagharakwa anyị ụgwọ ndị anyị ji, dị ka anyị gbagharawokwaara ndị ji anyị ụgwọ.” (Matiu 6:12) “Bụrụnụ ndị na-emere ibe unu ebere, na-enwe obi ọmịiko, na-agbaghara ibe unu kpam kpam.”—Ndị Efesọs 4:32.
Bụrụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi. “Kwesị ntụkwasị obi nye nwunye nke gị ka ọ bụrụkwa nanị ya ga-enweta ịhụnanya gị. . . . Obi tọọ gị ụtọ n’ebe nwunye gị nọ, gị na nwata nwanyị ị lụrụ ṅụrịakwa ọṅụ . . . Ka ịma mma ya na-eme gị obi ụtọ; ka o jirikwa ịhụnanya ya makụọ gị. . . . N’ihi gịnị ka ị ga-eji nye nwanyị ọzọ ịhụnanya gị? N’ihi gịnị ka nwanyị ọzọ ga-eji maa gị mma karịa nwunye gị?” (Ilu 5:15-20, Today’s English Version) “Onye kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe kasị nta na-ekwesịkwa ntụkwasị obi n’oké ihe, onye bụkwa onye ajọ omume n’ihe kasị nta na-abụkwa onye ajọ omume n’oké ihe.” (Luk 16:10) “Ihe a na-achọ n’aka ndị nlekọta ụlọ bụ ka a hụ mmadụ dị ka onye na-ekwesị ntụkwasị obi.”—1 Ndị Kọrint 4:2.
Kwụwa aka gị ọtọ. “M̀ ga-adị ọcha n’obi mgbe m nwere ihe ọ̀tụ̀tụ̀ mmebi iwu, mgbe m nwekwara akpa nkume ọ̀tụ̀tụ̀ aghụghọ?” (Maịka 6:11) “Anyị tụkwasịrị obi na anyị nwere akọ na uche ziri ezi, ebe anyị na-achọ ịdị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe nile.”—Ndị Hibru 13:18.
Na-ekwu eziokwu ma na-eme ihe ziri ezi. “Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, hụnụ ezi ihe n’anya, meenụ ikpe ziri ezi ka o guzosie ike n’ọnụ ụzọ ámá.” (Emọs 5:15) “Kwuonụ, onye ọ bụla ọ gwa ibe ya, eziokwu; kpeenụ ikpe eziokwu na ikpe udo n’ọnụ ụzọ ámá nile unu.” (Zekaraịa 8:16) “Ebe unu wepụworo okwu ụgha, ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu.”—Ndị Efesọs 4:25.
Na-arụsi ọrụ ike, jiri ọrụ gị kpọrọ ihe. “Ị̀ hụwo mmadụ nke na-eme ngwa n’ije ozi ya? n’ihu ndị eze ka ọ ga-eguzo onwe ya.” (Ilu 22:29) “Unu adịla umengwụ n’ihe unu na-eme.” (Ndị Rom 12:11) “Ihe ọ bụla unu na-eme, jirinụ mkpụrụ obi dum na-arụ ya dị ka ọ bụ nye Jehova, ọ bụghịkwa nye ndị mmadụ.”—Ndị Kọlọsi 3:23.
Dị nwayọọ, na-eme ebere, dị obiọma. “Yikwasịnụ onwe unu mmetụta ndị dị nro bụ́ ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi.”—Ndị Kọlọsi 3:12.
Jiri ezi ihe na-emeri ihe ọjọọ. “Nọgidenụ na-ahụ ndị iro unu n’anya ma na-ekpe ekpere maka ndị na-akpagbu unu.” (Matiu 5:44) “Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị, kama nọgide jiri ezi ihe na-emeri ihe ọjọọ.”—Ndị Rom 12:21.
Nye Chineke ihe kasị mma i nwere. “‘Ị ghaghị iji obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.’ Nke a bụ ihe e nyere n’iwu nke kasịnụ, bụrụkwa nke mbụ.”—Matiu 22:37, 38.
[Foto]
Ịgbaso ụkpụrụ Bible pụrụ inyere anyị aka inwe alụmdi na nwunye na-aga nke ọma, ezinụlọ nwere obi ụtọ, na ezigbo ndị enyi