Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otu Afọ ‘n’Ezi Ala Ahụ’

Otu Afọ ‘n’Ezi Ala Ahụ’

Otu Afọ ‘n’Ezi Ala Ahụ’

N’AFỌ 1908, a chọtara otu ihe dị ịrịba ama ná mkpọmkpọ ebe nke obodo a kpọrọ aha na Bible bụ́ Giza, bụ́ nke dịdebere ala dị n’ụsọ osimiri nke dị n’akụkụ ọdịda anyanwụ nke Jeruselem: ihe ahụ a chọtara bụ otu mbadamba nkume e dere ihe n’elu ya, nke e chere na e dere ya na narị afọ nke iri T.O.A. A hụrụ n’elu ya ihe e dere n’asụsụ Hibru nke e chere na ọ bụ ụzọ ka mfe isi depụta oge ihe ubi nile e nwere n’afọ na ihe ndị a na-eme na nke ọ bụla n’ime ha. A bịara kpọwa mbadamba nkume a Kalenda Giza.

E nwere aha e dere n’elu mbadamba nkume ahụ, nke bụ́: Abaịja. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta ihe ochie weere ya dị ka ihe omume e nyere nwa akwụkwọ ka o mee n’ụlọ bụ́ nke e dere n’ụdị abụ, ọ bụ ezie na ọ bụghị ndị ọkà mmụta ihe ochie nile kweere nke ahụ. * Ị̀ ga-achọ ịhụ otú nwatakịrị dịrị ndụ n’oge ahụ si lee Ala Nkwa ahụ anya? Ime otú ahụ nwere ike inyere gị aka icheta ihe ụfọdụ mere n’oge Bible.

Ọnwa Abụọ nke Nchịkọta Ihe

Ihe mbụ onye dere kalenda oge ochie a dere banyere ya bụ oge nchịkọta ihe. Ọ bụ ezie na e bu ụzọ depụta oge a na kalenda a, i nwere ike ịghọta ihe mere ndị Izrel ji were oge nchịkọta ihe a dị ka ngwụsị nke oge a kasị arụ ọrụ ubi n’afọ. Ọnwa Etanim (nke e mesịrị kpọwa Tishri) kwekọrọ n’ọnwa September/October na kalenda nke oge anyị. Mgbe e wesịrị ihe ka ọtụtụ n’ihe ubi n’oge a, ọ na-abụ nnọọ oge oké ememe nke obere nwa bụ́ Abaịja na-eso na ya. Were anya nke uche gị hụ otú obi ga-esi na-atọ ya ụtọ ka ọ nọ na-enyere nna ya aka ịrụ ụlọ ntu ha ga-ebi na ya ruo otu izu ka ha ji ọṅụ na-ekele Jehova maka ihe ubi ndị ha nwetara!—Deuterọnọmi 16:13-15.

N’ihe dị ka n’oge a n’afọ, ọ na-afọ obere ka ezinụlọ Abaịja malite ịghọ mkpụrụ osisi oliv site n’ịkụ ihe n’alaka ya, nke bụ́ ọrụ obere nwa bụ́ Abaịja na-agaghị arụli ma ọ ga-atọ ya ụtọ ikiri ndị na-arụ ya. (Deuterọnọmi 24:20) Ha ga-atụtụkọtazi mkpụrụ oliv ndị ahụ ma buga ha n’ebe dị nso a ga-anọ gwepịa ha iji wepụta mmanụ ya. Ma ọ bụkwanụ ezinụlọ ya esi n’ụzọ ọzọ ka mfe nweta mmanụ ya—nke bụ́ ịwụnye mkpụrụ oliv ndị a sụrụ asụ n’ime mmiri ma kuru mmanụ ya ndị sere n’elu. N’agbanyeghị otú e si nweta mmanụ a dị mkpa, ọ bụghị nanị oriri ka a na-eri ya. A na-ejikwa ya eme mmanụ e ji amụ ọkụ na nke a na-ete n’ebe mmadụ chihịara ahụ́ na n’ọnyá, dị ka nke obere nwa bụ́ Abaịja nwere ike inweta ka ọ na-egwu egwu.

Ọnwa Abụọ nke Ịgha Mkpụrụ

Mgbe mmiri ndị mbụ malitere izo, o nwere ike ịbụ na Abaịja na-enwe obi ụtọ ịpụta ná mmiri ka ọ jụọ ya ahụ́ oyi. Eleghị anya nna ya agwawo ya uru mmiri ozuzo na-abara mbara ala. (Deuterọnọmi 11:14) Ala anwụ merela ka o sie ike ruo ọtụtụ ọnwa ga-abịa dị nro, dịkwa mma ịkọ ya ihe. Onye ọrụ ugbo oge ochie na-eji nkà eduzi ọgụ osisi, ikekwe nke nwere ígwè n’ọnụ ya, ka anụmanụ na-adọkpụ ya. Ihe mere o ji na-eme nke a bụ iji hụ na ọ kọrọ ihe ahụ n’ahịrị ndị na-agbagọghị agbagọ. Ndị Izrel ji nnọọ ala kpọrọ ihe, ọ bụ ya mere ndị ọrụ ugbo ha ji akọ ugbo ọbụna n’ala ndị dị obere, nke gụnyere ala ndị kpọdara akpọda. Ma ha nwere ike iji ọgụ ndị a na-eji n’aka kọọ ebe ndị dị otú ahụ.

Ozugbo a kọrọ ala ahụ dị nro, e nweziri ike ịkụ ya ọka wit na bali. Ọ dabara nnọọ adaba na ihe ọzọ e debanyere na Kalenda Giza na-ekwu banyere ọnwa abụọ e ji akụ ihe ndị dị otú ahụ. Onye ahụ na-agha mkpụrụ nwere ike iji uwe ya kporo mkpụrụ akụ́kụ́ ahụ ma jiri aka na-ekporo ya ma na-efesasị ya.

Ọnwa Abụọ nke Ịgha Mkpụrụ Ikpeazụ

Ọ dịghị mgbe “ezi ala ahụ” na-adịghị eme nri. (Deuterọnọmi 3:25) Na December, mmiri na-ezo nke ukwuu, ahịhịa ndụ na-etojukwa ebe nile. Ọ bụ oge e ji agha mkpụrụ ikpeazụ, bụ́ ihe ndị yiri ọkwụrụ na ụdị akwụkwọ nri dị iche iche. (Emọs 7:1, 2) Ná mbadamba nkume ahụ, Abaịja kpọrọ ya “ihe ọkụkụ nke oge opupu ihe ubi” ma ọ bụkwanụ a sụgharịa ya ịbụ, “ọrụ ndị a na-arụ n’ikpeazụ,” bụ́ oge a na-enwe nri ndị dị ụtọ, ndị a na-eji ọtụtụ akwụkwọ nri na-adị n’oge a esi.

Ka oge oyi na-eru nso, osisi almọnd, bụ́ nke e ji ama mgbe oge opupu ihe ubi ruwerela, na-awa okooko ndị na-acha ọcha na ndị na-acha pinki pinki. Nke a nwere ike ịmalite mgbe e nwere obere okpomọkụ, malite na January.—Jeremaịa 1:11, 12.

Otu Ọnwa nke Ifo Flax

Ihe ọzọ Abaịja dere banyere ya bụ flax. Nke ahụ nwere ike ichetara gị otu ihe pụrụ iche mere ọtụtụ narị afọ tupu oge Abaịja n’ebe akụkụ ọwụwa anyanwụ ugwu Judia. N’otu obodo dị na Jeriko, Rehab zoro ndị nledo abụọ “n’ókpòrò flax, nke e doro n’usoro” bụ́ nke ọ ghasara n’uko ụlọ ya ka ọ kpọọ. (Joshua 2:6) Flax baara ndị Izrel uru nke ukwuu. Iji nweta eriri ndị dị na ya, a ga-ahapụ ya ka o buru ụzọ ree. Igirigi ga-eme ka o jiri nwayọọ nwayọọ ree ma ọ bụkwanụ e tinye flax ahụ n’ime mmiri ka o nwee ike ree ngwa ngwa. Mgbe e wepụtasịrị eriri flax, a na-eji ya emepụta ákwà linin, bụ́ nke a na-ejizi emepụta ákwà ụgbọ mmiri, ákwà ụlọikwuu, na uwe. A na-ejikwa flax eme eri oriọna.

Ụfọdụ ndị ekwenyeghị na a na-akụ flax na Giza, bụ́ ebe na-enwekebeghị mmiri. Ndị ọzọ kwuru na a na-akụ flax nanị n’ọgwụgwụ afọ. Ọ bụ ya mere ụfọdụ ji chee na ihe Kalenda Giza kpọrọ “flax” bụ “ahịhịa” a na-enye anụmanụ.

Otu Ọnwa nke Ịghọ Ọka Bali

Kwa afọ, mgbe ọnwa igbu flax gafechara, Abaịja na-ahụ oko ọka bali, bụ́ mkpụrụ akụ́kụ́ ọzọ o dere na kalenda ya. Ọnwa nke kwekọrọ na ya na Hibru bụ Ebib, nke pụtara “Oko Ọka,” eleghị anya n’ihi na n’oge a, ọka achaala ma o sibeghị ike. Jehova nyere iwu, sị: “Debe ọnwa Ebib, mekwaara Jehova, . . . ememe ngabiga.” (Deuterọnọmi 16:1) Ebib (nke e mesịrị kpọwa Naịsan) kwekọrọ n’ọnwa March na April n’oge a. O nwere ike ịbụ na a na-ejikwa mgbe ọka bali na-acha amata mmalite nke ọnwa a. Ruokwa taa, ndị Juu Karaịt ka na-eji ọchịcha nke ọka bali a amata mmalite nke afọ ọhụrụ ha. Ma a na-efekwa mkpụrụ mbụ nke ọka bali n’ihu Jehova n’abalị 16 nke ọnwa Ebib.—Levitikọs 23:10, 11.

Ọka bali baara ọtụtụ ndị Izrel uru ná ndụ. Ebe ọ dị ọnụ ala karịa ọka wit, ndị mmadụ, karịsịa ndị ogbenye, na-ejikarị ya eme achịcha.—Ezikiel 4:12.

Otu Ọnwa nke Owuwe Ihe Ubi na Ịtụ Ihe n’Ihe Ọ̀tụ̀tụ̀

Ọ bụrụ na i chee echiche banyere oge Abaịja, ị ga-ahụ na ma eleghị anya, n’otu isi ụtụtụ, o nwere ike ịhụ ka ihu igwe na-agbachapụ—mmiri agakwaghị ezo ruo oge ụfọdụ. Ihe gazi na-enyere ihe ndị a kụrụ n’ezi ala ahụ aka ito bụ igirigi. (Jenesis 27:28; Zekaraịa 8:12) Ndị ọrụ ugbo nọ n’Izrel maara na ọtụtụ ihe ubi ndị e wetara n’ọnwa ndị anyanwụ na-achasi ike na ha n’afọ chọrọ ka e debe ha n’ebe ikuku ga na-ekusatụ ha ruo oge Pentikọst. Ikuku na-atụ oyi ma dị mmiri mmiri nke na-esi n’ebe ugwu na-abịa nwere ike inyere mkpụrụ akụ́kụ́ aka, ma ụdị ikuku ahụ na-enye osisi ndị na-amị mkpụrụ nsogbu ozugbo ha mara ifuru. Ikuku na-ekpo ọkụ nke na-esi n’ebe ndịda na-abịa na-enyere ifuru osisi aka ịgbawa ma mịa mkpụrụ.—Ilu 25:23; Abụ nke Abụ 4:16.

Jehova, bụ́ Onye na-achịkwa mmiri ozuzo na ikuku, mere ka nke ọ bụla na-enyere ihe ndị a kụrụ akụ aka. N’oge Abaịja, Izrel bụ n’ezie “ala nke ọka wit na ọka bali, na osisi vaịn, na osisi fig, na pomegranate; ala nke osisi oliv na-enye mmanụ, na nke mmanụ aṅụ.” (Deuterọnọmi 8:8) Ọ pụrụ ịbụ na nna oche Abaịja gwara ya banyere oge ihe bara nnọọ ụba mgbe Eze Solomọn maara ihe na-achị—bụ́ ihe doro anya gosiri na Jehova nọ na-agọzi ha.—1 Ndị Eze 4:20.

Ka kalenda ahụ kwusịrị banyere iwe ihe ubi, e nwekwara okwu e dere na ya nke ụfọdụ weere na ọ pụtara “ịtụ ihe n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀.” Nke ahụ nwere ike ịpụta ịtụ ihe ubi ndị ahụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ iji nye ndị nwe ubi na ndị ọrụ òkè nke ha ma ọ bụ ọbụna iji wepụta nke a ga-eji tụọ ụtụ isi. Otú ọ dị, ndị ọkà mmụta ndị ọzọ ghọtara okwu Hibru ahụ ịbụ “ime ememe” ma kwuo na o kwekọrọ n’Ememe nke Izu Asaa nke Ụbọchị Asaa, bụ́ nke dabara n’ọnwa Sivan (May/June).—Ọpụpụ 34:22.

Ọnwa Abụọ nke Ịkwachapụ Akwụkwọ Osisi

Ihe ọzọ Abaịja dere banyere ya bụ ọnwa abụọ e ji akwacha osisi vaịn ndị ahụ. Ọ̀ pụrụ ịbụ na o nyere aka kwachapụ akwụkwọ juru n’osisi vaịn ka anwụ wee nwee ike ịchasa mkpụrụ ya? (Aịsaịa 18:5) Ihe ọzọ a na-eme bụ ịghọ mkpụrụ vaịn ndị ahụ, bụ́ mgbe ndị na-eto eto nọ n’oge ahụ ji enwe ọṅụ. Mkpụrụ vaịn ndị mbụ charanụ na-atọ nnọọ ụtọ! Eleghị anya Abaịja nụrụ banyere ndị nledo 12 Mozis zigara n’Ala Nkwa ahụ. Ha gara n’oge mkpụrụ vaịn ndị mbụ na-acha iji mara otú ala ahụ si maa mma. Na njem ahụ ha mere, otu alaka nke mkpụrụ vaịn ahụ buru ibu nke na ọ bụ mmadụ abụọ butere ya!—Ọnụ Ọgụgụ 13:20, 23.

Otu Ọnwa nke Mkpụrụ Osisi Oge Okpomọkụ

Ihe ikpeazụ e dere na kalenda Abaịja kwuru banyere mkpụrụ osisi oge okpomọkụ. N’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa n’oge ochie, oge okpomọkụ na-abụ oge a na-enweta ọtụtụ mkpụrụ osisi n’afọ. Mgbe oge Abaịja gasịrị, Jehova ji okwu bụ́ “otu nkata nke mkpụrụ osisi nke mgbe nghọkọta mkpụrụ [ma ọ bụ, “nke oge okpomọkụ”]” kọwaa ‘ọgwụgwụ bịaruworo ndị ya, bụ́ Izrel,’ jiri okwu Hibru ndị bụ́ “mkpụrụ osisi nke oge okpomọkụ” tụnyere “ọgwụgwụ.” (Emọs 8:2) Nke a kwesịrị ichetara ndị Izrel ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi na oge ọgwụgwụ ha eruola nakwa na oge eruola ka Jehova kpee ha ikpe. O doro anya na fig so ná mkpụrụ osisi oge okpomọkụ ndị Abaịja kwuru banyere ha. E nwere ike iji mkpụrụ fig oge okpomọkụ mee mbadamba fig maka oriri ma ọ bụ gwakọta ya iji gwọọ etuto.—2 Ndị Eze 20:7.

Otú Kalenda Giza Si Gbasa Gị

O yiri nnọọ ka obere nwa bụ́ Abaịja ò bi n’ebe a na-arụ ọrụ ugbo n’ime obodo. Ọtụtụ ndị Izrel na-arụ ọrụ ugbo n’oge ahụ. Ọ bụrụgodị na i bighị n’ebe a na-arụ ọrụ ugbo, ihe ndị dị ná mbadamba nkume Giza pụrụ ime ka i jiri anya nke uche gị hụ ihe ndị ị na-agụ na Bible ma mee ka ị ghọtakwuo ha nke ọma.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ndị ọkà mmụta nile ekwekọrịtachaghị na ọnwa ndị dị na Kalenda Giza kwekọrọ n’otú e si agụ ọnwa na Bible. Ọzọkwa, e nwere ike ịkụ ihe ubi ụfọdụ n’oge dịgasị iche n’akụkụ dị iche iche nke Ala Nkwa ahụ.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 11]

Otú O Nwere Ike Ịbụ Na E Si Dee Kalenda Giza Ahụ:

“Ọnwa ndị e ji aghọ ihe ubi na oge e ji aghọ mkpụrụ osisi oliv;

ọnwa ndị e ji akụ ihe n’ubi;

ọnwa ndị ahịhịa ndụ ji epulite;

ọnwa e ji efo flax;

ọnwa e ji aghọ ọka bali;

ọnwa e ji aghọ ọka bali ma tụọ ya n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀;

ọnwa ndị e ji akwachasị osisi ndị dị n’ubi;

ọnwa e ji enwe mkpụrụ osisi ndị na-amị n’oge okpomọkụ.”

[ebe e dere aha:] Abaịja *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 41 Ọ dabeere n’akwụkwọ bụ́ Textbook of Syrian Semitic Inscriptions, Mpiakọta nke 1, nke John C. L. Gibson dere, 1971.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ebe Ndebe Ihe Ochie dị n’Istanbul

[Chaatị/Foto dị na peeji nke 9]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

NAỊSAN (EBIB)

March—April

IYYAR (ZIV)

April—May

SIVAN

May—June

TAMUZ

June—July

AB

JULY—AUGUST

ELUL

August—September

TISHRI (ETANIM)

September—October

HESHVAN (BUL)

October—November

KISLEV

November—December

TIBET

December—January

SHEBAT

January—February

ADA

February—march

VEADAR

March

[Ebe E Si Nweta Foto]

Onye ọrụ ugbo: Garo Nalbandian

[Foto dị na peeji nke 8]

Ihe e gwupụtara na Giza

[Ebe E Si Nweta Foto]

© 2003 BiblePlaces.com

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Osisi almọnd

[Foto dị na peeji nke 10]

Ókpòrò flax

[Ebe E Si Nweta Foto]

Dr. David Darom

[Foto dị na peeji nke 10]

Bali

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ngalaba Na-ahụ Maka Ọrụ Ubi na United States