Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Sọl Ezute Ndị Enyi Ya Ochie Na Ndị Bụ́bu Ndị Iro Ya

Sọl Ezute Ndị Enyi Ya Ochie Na Ndị Bụ́bu Ndị Iro Ya

Sọl Ezute Ndị Enyi Ya Ochie Na Ndị Bụ́bu Ndị Iro Ya

Ọ GHAGHỊ ịbụ na ụjọ tụtụrụ Sọl, bụ́ onye e mesịrị mara dị ka Pọl onyeozi mgbe ọ lọghachiri Jeruselem na nke mbụ ya kemgbe ọ ghọrọ Onye Kraịst. * Ọ hapụrụ obodo ahụ afọ atọ tupu mgbe ahụ dị ka onye na-ekupụ iyi egwu na igbu ọchụ dị ka ume megide ndị na-eso ụzọ Jizọs. E nyere ya ikike ịkpụta Onye Kraịst ọ bụla ọ hụrụ na Damaskọs.—Ọrụ 9:1, 2; Ndị Galeshia 1:18.

Ozugbo Sọl n’onwe ya ghọrọ Onye Kraịst, o kwusara okwukwe o nwere n’ebe Mezaịa ahụ a kpọlitere n’ọnwụ nọ n’atụghị egwu. N’ihi ya, ndị Juu nọ na Damaskọs nwara igbu ya. (Ọrụ 9:19-25) Ndị Juu bụ́bu ndị enyi ya nọ na Jeruselem hà ga-eji nnọọ obi ụtọ nabata ya? Otú ọ dị, ihe ka Sọl mkpa bụ izute ndị na-eso ụzọ Kraịst nọ na Jeruselem. Nke ahụ agaghị adịrị ya mfe.

“Mgbe ọ bịarutere Jeruselem o mere mgbalị isonyere ndị ahụ na-eso ụzọ; ma ha nile na-atụ ya egwu, n’ihi na ha ekwetaghị na ọ bụ onye na-eso ụzọ.” (Ọrụ 9:26) Nke ahụ ekwesịghị iju anyị anya. Ihe ikpeazụ ha maara banyere ya bụ na ọ bụ onye na-akpagbu Ndị Kraịst n’emeghị ebere. Onye Kraịst a ọ na-akpọ onwe ya nwere ike iyiwo ka ọ̀ bụ aghụghọ ọ chọrọ iji gbebata n’ọgbakọ. N’ihi ya, Ndị Kraịst nọ na Jeruselem achọghị ịzọrọ ya ahụ́.

Ma, ọ dị otu onye n’ime ha nke nyeere Sọl aka. Bible kwuru na Banabas duuru onye a bụ́bu onye mkpagbu gakwuru “ndịozi,” ihe àmà na-egosikwa na ndịozi ahụ bụ Pita (Sifas) na Jems, bụ́ nwanne Onyenwe anyị, gwa ha banyere nchegharị Sọl na otú o si kwusaa ozi ọma na Damaskọs. (Ọrụ 9:27; Ndị Galeshia 1:18, 19) Bible agwaghị anyị ihe mere Banabas ji tụkwasị Sọl obi. Ọ̀ ga-abụ na ha abụọ mabu onwe ha, nke mere Banabas ji nwalee Sọl ma kwubizie na obi ya dị ọcha? Ọ̀ ga-abụ na Banabas maara ụfọdụ Ndị Kraịst bi na Damaskọs, ma si n’aka ha mata banyere nchegharị Sọl? N’agbanyeghị ihe kpatara ya, Banabas mere ka ha kwụsị inyo Sọl enyo. Mgbe nke ahụ gasịrị, Sọl na Pita onyeozi nọrọ abalị 15.

Abalị Iri na Ise Ya na Pita Nọrọ

Ọ dịghị Sọl mkpa ịnata mmadụ ọ bụla ikike iji rụọ ọrụ ya n’ihi na ọ bụ Jizọs n’onwe ya nyere ya ọrụ ahụ, dị ka Sọl kọwaara nnọọ ndị Galeshia. (Ndị Galeshia 1:11, 12) Ma o doro anya na Sọl matara mkpa ọ dị ya ịmata banyere ozi Jizọs nke ọma. Ọnụnọ ya na Pita ga-enye nnọọ Sọl ohere zuru ezu ịmata nke ahụ. (Luk 24:12; 1 Ndị Kọrint 15:3-8) Sọl ga-enwe ọtụtụ ihe ịjụ Pita na Jems, ha ga-enwekwa ọtụtụ ajụjụ ịjụ Sọl banyere ọhụụ ya na ọrụ Jizọs nyere ya.

À Zọpụtara Ya n’Aka Ndị Bụ́bu Ndị Enyi Ya?

A kpọrọ Stivin Onye Kraịst mbụ nwụrụ n’ihi okwukwe ya. Ndị ha na Stivin rụrụ ụka bụ “ndị sitere ná ndị ahụ a na-akpọ Ụlọ Nzukọ nke Ndị A Tọhapụrụ Atọhapụ, na nke ndị Saịrini na ndị Aleksandria nakwa ndị sitere Silishia na Eshia.” Ugbu a Sọl na “ndị Juu na-asụ Grik,” ma ọ bụ ndị Juu bi n’ógbè ndị Gris, nọ “na-arụrịta ụka,” ya ana-agbara ha àmà n’atụghị egwu. Gịnị ka ndị ahụ mere? Ha nwara igbu ya.—Ọrụ 6:9; 9:28, 29.

Sọl ga-achọ nnọọ ịkọwara ndị bụ́bu ndị enyi ya ihe mere o ji mee mgbanwe ahụ dị ịrịba ama ná ndụ ya na ịkọwakwuru ha ihe banyere Mezaịa ahụ. Ma, nke a kpasuru nnọọ ndị Juu a na-asụ Grik iwe n’ihi na ha lere Sọl anya dị ka onye na-agba mgba okpuru.

Sọl ọ̀ ghọtara ụdị ihe ize ndụ ọ nọ na ya? Anyị na-agụ na ka ọ na-ekpe ekpere n’ụlọ nsọ ahụ, ọ hụrụ ọhụụ ma hụ Jizọs bụ́ onye gwara ya, sị: “Mee ngwa ma pụọ na Jeruselem ọsọ ọsọ, n’ihi na ha agaghị ekwere àmà ị na-agba banyere m.” Sọl zara, sị: “Onyenwe anyị, ha onwe ha maara nke ọma na m na-adịbu atụ ndị kwere na gị mkpọrọ, na-apịakwa ha ihe n’ụlọ nzukọ dị iche iche; mgbe a nọkwa na-awụfu ọbara Stivin bụ́ onye àmà gị, mụ onwe m guzokwa n’akụkụ na-enye nkwado.”—Ọrụ 22:17-20.

Ụfọdụ na-eche na azịza Sọl pụtara na ọ maara ihe ize ndụ ahụ ọ nọ na ya. Ndị ọzọ chere na ihe ọ na-ekwu bụ: ‘Abụbu m onye mkpagbu dị ka ha, ha makwa. Ha ga-ama nnọọ na echegharịala m n’ezie. Ma eleghị anya, m ga-enwe ike inyere ha aka ịmata eziokwu ahụ.’ N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs maara na ndị Juu ahụ agaghị ege ntị n’àmà ahụ onye ha lere anya dị ka onye si n’ezi ofufe dapụ na-agbara ha. Ọ gwara Sọl, sị: “Gawa, n’ihi na m ga-ezipụ gị gaa ná mba ndị dị anya.”—Ọrụ 22:21, 22.

Mgbe Ndị Kraịst ibe ya matara ihe ize ndụ ahụ ọ nọ na ya, ha mere ngwa ngwa kpọga Sọl n’ọdụ ụgbọ mmiri Sesaria ma tinye ya n’ụgbọ ga-ebuga ya obodo ya, bụ́ Tasọs, bụ́ nke dị narị kilomita ise site n’ebe ahụ. (Ọrụ 9:30) Sọl nọrọ afọ ole na ole ebe ahụ tupu ya alọghachi Jeruselem.

O nwere ike ịbụ na ọpụpụ ahụ Sọl pụrụ na Jeruselem ọsọ ọsọ chebere ọgbakọ Ndị Kraịst. Ọnụnọ onye ahụ bụ́bu onye mkpagbu nọ ebe ahụ nwere ike ịkpata nsogbu. Mgbe Sọl pụsịrị, “ọgbakọ dị na Judia na Galili na Sameria dum banyere n’oge udo, bụrụ nke a na-ewuli elu; ka ọ na-ejekwa ije n’egwu Jehova na ná nkasi obi nke mmụọ nsọ, ọ nọgidere na-amụba.”—Ọrụ 9:31.

Ihe Anyị Na-amụta Banyere Ịkpachara Anya

Dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, taa, a pụrụ inwe ọnọdụ ndị ga-achọ ka anyị kpachara anya. Anyị ekwesịghị inyo ndị anyị na-amabughị enyo gabiga ókè. Ma, mgbe ụfọdụ, ndị ọjọọ anwaala irigbu ndị Jehova maka uru onwe ha ma ọ bụ iji mebie ọgbakọ. N’ihi ya, anyị kwesịrị iji nghọta na-eme ihe iji ghara ịghọrọ ndị nduhie anụ oriri.—Ilu 3:27; 2 Timoti 3:13.

Ihe Sọl kwuru mgbe a sịrị ya kwụsị ikwusa ozi ọma na Jeruselem na-egosi ebe ọzọ Ndị Kraịst kwesịrị ịkpachara anya. Ịgba àmà n’ógbè ụfọdụ ma ọ bụ nye ụfọdụ ndị, gụnyere ndị bụ́bu ndị enyi anyị pụrụ ịdị ize ndụ—ọ pụrụ ịkpatara anyị mmerụ ahụ́, metụta ofufe anyị, ma ọ bụ ọbụna mebie omume ọma anyị. Anyị kwesịrị ịkpachara anya, dị ka ihe atụ site n’izere ịgba àmà n’oge na n’ebe ụfọdụ.—Ilu 22:3; Matiu 10:16.

Obi kwesịrị isi anyị ike na a ga-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke tupu ọgwụgwụ nke ajọ ụwa a eruo. Lee ihe nlereanya magburu onwe ya Sọl setịpụụrụ anyị n’akụkụ a, “na-ekwukwa okwu n’aha Onyenwe anyị n’atụghị egwu” nye ndị enyi ya ochie na ndị bụ́bu ndị iro ya!—Ọrụ 9:28.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 A ka mara Sọl taa dị ka Pọl onyeozi. Ma, a kpọrọ ya aha Juu ya bụ́ Sọl n’ihe ka ọtụtụ n’amaokwu Bible ndị e zoro aka na ha n’isiokwu a.—Ọrụ 13:9.

[Foto dị na peeji nke 16]

Ozugbo Sọl rutere Jeruselem, ọ gbaara ndị Juu na-asụ Grik àmà n’atụghị egwu