Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịkụziri Ndị Mmadụ Bible Na-eme Ka Ha Nwee Okwukwe

Ịkụziri Ndị Mmadụ Bible Na-eme Ka Ha Nwee Okwukwe

Ịkụziri Ndị Mmadụ Bible Na-eme Ka Ha Nwee Okwukwe

“Ọ BỤỤRỤ anyị nnọọ ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa iji ọnwa ise a gara aga mụọ ihe banyere Onye Okike anyị ma mụta ile ihe anya otú o si ele ya.” Ihe a ka otu nwa akwụkwọ nke kwuchitere ọnụ ụmụ akwụkwọ na-agụsị akwụkwọ na klas nke otu narị na iri abụọ na abụọ nke ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead kwuru n’ụbọchị e mere ememme ngụsị akwụkwọ ha. March 10, 2007 bụ ụbọchị mmadụ iri ise na isii so na klas ahụ, bụ́ ndị na-aga ịmalite ozi ala ọzọ ná mba iri abụọ na isii e zigara ha, na-agaghị echefu echefu.

Mgbe Theodore Jaracz, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi nabatachara puku mmadụ isii na narị abụọ na ise gbakọtara maka ememme ngụsị akwụkwọ ahụ, o kwuru, sị: “Obi siri anyị ike na ihe unu ga-anụ ebe a taa ga-eme ka okwukwe unu sikwuo ike meekwa ka unu na Chineke dịkwuo ná mma.” Ọ kpọziri aha mmadụ anọ ndị ga-eji Bible nye ụmụ akwụkwọ ahụ agbamume na ndụmọdụ kwesịrị ekwesị, bụ́ ndị ga-enyere ha aka ime nke ọma n’ebe e zigara ha ije ozi.

Okwu Agbamume Ndị Ga-enyere Ụmụ Akwụkwọ ahụ Aka Ime Ka Ndị Ọzọ Nwee Okwukwe

Leon Weaver, onye so na Kọmitii Alaka nke United States, kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Nọgide Na-eme Ihe Dị Mma.” O chetaara ụmụ akwụkwọ ahụ na ha nile n’otu n’otu anọruola ihe dị ka afọ iri na atọ n’ozi oge nile, ma jiri oge a kụziere ndị ọzọ eziokwu Bible bụ́ nke nyeere ha aka inwe okwukwe. O kwuru, sị: “Ọrụ ikwusa ozi ọma bụ ọrụ ọma n’ihi na ọ gụnyere ịzọpụta ndụ ndị mmadụ, nke ka nke bụ na ọ na-eme ka e bulie Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova elu.” Nwanna Weaver gbaziri ụmụ akwụkwọ ahụ ume ka ha nọgide “na-agha mkpụrụ maka abamuru nke mmụọ nsọ” ma “ghara ịda mbà n’ime ihe dị mma.”—Ndị Galeshia 6:8, 9.

David Splane, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, chetaara ụmụ akwụkwọ ahụ ihe ndị ga-abara ha uru mgbe ọ na-ekwu okwu n’isiokwu bụ́ “Hụ na Ị Malitere Ozi Gị n’Ụzọ Dị Mma.” Nwanna Splane gbara ndị ahụ ka na-aga ịmalite ozi ala ọzọ amalite ume ka ha malite ozi ha n’ụzọ dị mma site n’ime ihe ndị na-esonụ: “Hụ na ị na-ele ihe anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ekpebila ihe n’echeghị echiche nke ọma. Na-enwe ihu ọchị. Abụla onye na-akatọkarị ihe. Nwee obi umeala, hụkwa na ị na-akwanyere ụmụnna nọ n’ebe e kenyere gị ọrụ ùgwù.” O kwuziri, sị: “Ozugbo unu si n’ụgbọelu rịdata, zọwanụ ije ka ndị ma ihe ha bịara. Ka Jehova gọziekwa ọmarịcha ụkwụ unu ka unu na-ekwusara ndị unu gara n’obodo ha ‘ozi ọma nke ezi ihe.’”—Aịsaịa 52:7.

Isiokwu nke Lawrence Bowen, bụ́ onye na-akụzi na Gilead tụlere bụ, “Ihe Nketa Obi Abụọ Na-adịghị Ya na Ọ Ga-erurịrị Gị Aka.” Nwanna Bowen chetaara ụmụ akwụkwọ ahụ na ihe mere e ji guzobe Ụlọ Akwụkwọ Gilead n’oge a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ bụ okwukwe siri ike ụmụnna anyị nwere na Okwu Jehova ga-emezurịrị. (Ndị Hibru 11:1; Mkpughe 17:8) Kemgbe ahụ, ụlọ akwụkwọ Gilead enyerela ọtụtụ ụmụ akwụkwọ aka ime ka okwukwe ha sie ike. Ọ bụ okwukwe siri ike ụmụ akwụkwọ ndị a nwere na-akpali ha iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa eziokwu ahụ.

Mark Noumair, onye ọzọ na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ Gilead, kwuru okwu n’isiokwu na-akpali akpali bụ́ “O Nwere Onye Unu Na-echetara M.” Ọ rụtụrụ aka n’ihe nlereanya nke Ịlaịsha onye amụma, bụ́ onye gosiri okwukwe na obi ike n’ọrụ ya. Nwanna Noumair lekwasịrị anya ná 1 Ndị Eze 19:21, wee kwuo, sị: “Ịlaịsha dị njikere ime mgbanwe ná ndụ ya, o butere ikwusa nzube Jehova ụzọ ná ndụ ya karịa mkpa nke onwe ya.” Ọ jara ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ mma maka inwe ụdị mmụọ ahụ Ịlaịsha nwere ma gbaa ha ume ka ha nọgide na-eme otú ahụ n’ebe ọhụrụ a ha na-aga.

Okwukwe Na-enyere Mmadụ Aka Inwe Nkwuwa Okwu

Mgbe a ndị na-aga ịghọ ndị ozi ala ọzọ nọ na-amụta ihe ndị ga-eme ka okwukwe ha sikwuo ike, ha nọ na-ekwusara ndị ọzọ ozi ọma ná ngwụsị izu. Ha nwetakwara ahụmahụ ndị mara mma. Ha kọrọ ahụmahụ ndị a ma mee ihe ngosi ha n’otu isiokwu nke Wallace Liverance, bụ́kwa onye na-akụzi na Gilead, kwuru. Isiokwu nke okwu ya bụ́, “Anyị Onwe Anyị Na-egosipụta Okwukwe, Ya Mere Anyị Na-ekwukwa Okwu,” chetaara anyị ihe Pọl onyeozi kwuru ná 2 Ndị Kọrint 4:13.

Okwu ọzọ sochirinụ bụ nke ndị ezinụlọ Betel bụ́ Daniel Barnes na Charles Woody, nọ na ya gbaa ndị ka nọ n’ozi ala ọzọ na ndị nke nọbu n’ozi ala ọzọ, ajụjụ ọnụ. Ụmụnna ndị a kọrọ otú Jehova si elekọta ma na-agọzi ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere ya ozi. (Ilu 10:22; 1 Pita 5:7) Otu onye ozi ala ọzọ kwuru, sị: “Ọzụzụ anyị natara na Gilead mere nnọọ ka mụ na nwunye m ghọta otú Jehova si elekọta anyị. Ọzụzụ ahụ mere nnọọ ka okwukwe anyị sikwuo ike. Okwukwe dị mkpa n’ihi na ndị ohu Chineke nile, tinyere ndị ozi ala ọzọ, ga-enweta ọnwụnwa, ihe isi ike, na ihe ndị ga-enye ha nsogbu n’obi.”

Nọgide Na-akụziri Ndị Mmadụ Bible Bụ́ nke Na-eme Ka Ha Nwee Okwukwe

“Nọgide Na-eme Ka Okwukwe nke Ụmụnna Gị Sie Ike,” bụ isiokwu dabara nnọọ adaba nke Samuel Herd, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, ji mechie ememme ngụsị akwụkwọ ahụ. Olee nzube e ji nye ụmụ akwụkwọ ndị a ọzụzụ? Nwanna Herd kwuru, sị: “Nzube e ji nye unu ọzụzụ bụ iji kụziere unu otú unu ga-esi jiri ire unu na-eto Jehova, otú unu ga-esi kụziere ndị nọ n’ókèala e zigara unu eziokwu Bible, nakwa otú unu ga-esi nyere ụmụnna ndị ọzọ aka ka okwukwe ha sie ike.” Otú ọ dị, o chetaara ụmụ akwụkwọ ahụ na mmadụ nwekwara ike iji ire ya kwuo ihe na-egbu mmụọ. (Ilu 18:21; Jems 3:8-10) Ọ gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume ka ha ṅomie Jizọs n’otú ha si eji ire ha eme ihe. N’otu oge, mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs gechara ya ntị, ha kwuru, sị: “Ọ̀ bụ na obi ekporoghị anyị ọkụ . . . ka ọ nọ na-emepere anyị Akwụkwọ Nsọ nke ọma?” (Luk 24:32) Nwanna Herd gbakwụnyere, sị: “Ọ bụrụ na unu ana-ekwu okwu ndị na-eme ka obi kpoo mmadụ ọkụ, ọ ga-agba ụmụnna ndị nọ n’ebe e zigara unu ume.”

Ihe ọzọ sochirinụ bụ inye ndị ahụ gụsịrị akwụkwọ diplọma ha. Mgbe nke ahụ gasịrị, a gụrụ akwụkwọ ozi ụmụ akwụkwọ ahụ dere iji gosi ekele ha. Akwụkwọ ozi ahụ kwuru, sị: “Anyị weere na iwu ji anyị iji ihe ndị anyị mụtara ebe a jee ozi nke ọma n’ebe ọ bụla e zigara anyị ije ozi. Ugbu a anyị dị njikere ije ozi ruo n’ebe ụwa sọtụrụ, ekpere anyị bụ ka mgbalị nile anyị na-eme bụrụ nke ga-ewetara Onye Nkụzi Ukwu anyị, bụ́ Jehova Chineke, otuto.” Ndị nile bịara maka ememme ahụ kụrụ aka dara nnọọ ụda mgbe a gụsịrị akwụkwọ ozi ekele ahụ. N’ezie, ememme ahụ mere ka okwukwe nke ndị nile bịara ya sikwuo ike.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 17]

“Ọ bụrụ na unu ana-ekwu okwu ndị na-eme ka obi kpoo mmadụ ọkụ, ọ ga-agba ụmụnna ndị nọ n’ebe e zigara unu ume”

[Igbe dị na peeji nke 15]

IHE BANYERE KLAS AHỤ

Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 9

Ọnụ ọgụgụ mba e zigara ha: 26

Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 56

Nkezi afọ ndụ ha: 33.4

Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 16.8

Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 13

[Foto dị na peeji nke 16]

Klas nke Otu Narị na Iri Abụọ na Abụọ Na-agụsị Akwụkwọ na Watchtower Bible School of Gilead

N’aha ndị e depụtara n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.

(1) Howitt, R.; Smith, P.; Martinez, A.; Pozzobon, S.; Kitamura, Y.; Laud, C. (2) Fiedler, I.; Beasley, K.; Matkovich, C.; Bell, D.; Lippincott, W. (3) Sites, W.; Andersen, A.; Toevs, L.; Fusano, G.; Rodríguez, C.; Yoo, J. (4) Sobomehin, M.; Thomas, L.; Gasson, S.; Dauba, V.; Bertaud, A.; Winn, C.; Dobrowolski, M. (5) Yoo, J.; Dauba, J.; Mixer, H.; Newton, M.; Rodríguez, F.; Mixer, N. (6) Laud, M.; Lippincott, K.; Martinez, R.; Haub, A.; Schamp, R.; Pozzobon, L.; Toevs, S. (7) Howitt, S.; Kitamura, U.; Newton, D.; Haub, J.; Sites, J.; Thomas, D. (8) Sobomehin, L.; Matkovich, J.; Fusano, B.; Winn, J.; Schamp, J.; Andersen, D.; Dobrowolski, J. (9) Fiedler, P.; Bell, E.; Beasley, B.; Smith, B.; Bertaud, P.; Gasson, M.