Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Asụsụ Kewara Anyị Ma Ịhụnanya Jikọtara Anyị”

“Asụsụ Kewara Anyị Ma Ịhụnanya Jikọtara Anyị”

“Asụsụ Kewara Anyị Ma Ịhụnanya Jikọtara Anyị”

Nnapụta. Ntọhapụ. Nzọpụta. O ruola ọtụtụ narị afọ ndị mmadụ chọwara inwere onwe ha pụọ ná nsogbu ndị ha nwere. Olee otú anyị pụrụ isi die nsogbu ndị anyị na-enwe ná ndụ? È nwere mgbe ụmụ mmadụ ga-enwere onwe ha pụọ ná nsogbu ndị ha na-enwe? Ọ bụrụ na e nwere, olee otú ha ga-esi enwere onwe ha?

IHE ndị a bụ isi ihe ndị a tụlere ná mgbakọ distrikti were ụbọchị atọ nke Ndịàmà Jehova haziri, bụ́ nke malitere na May 2006. Isiokwu mgbakọ ahụ bụ “Nnapụta Dị Nso!”

Ọtụtụ puku mmadụ si mba dị iche iche gara ebe itolu n’ime ebe ndị e nwere mgbakọ a. E nwere mgbakọ ndị a n’ọnwa July na August na Prague, bụ́ isi obodo Czech Republic; na Bratislava, bụ́ isi obodo Slovakia; na Chorzow na Poznan bụ́ obodo ndị dịcha na Poland; * nakwa ná nnukwu obodo ise e nwere na Germany—Dortmund, Frankfurt, Hamburg, Leipzig, na Munich. Ọnụ ọgụgụ ndị nile gara n’ebe ndị a karịrị narị puku atọ na puku iri na atọ.

Olee otú obi dị ndị bịara mgbakọ ahụ mgbe mgbakọ ahụ na-aga n’ihu nakwa mgbe ọ gasịrị? Gịnị ka ndị ụlọ ọrụ mgbasa ozi kọrọ banyere mgbakọ ahụ?

Ime Nkwadebe

Ọ gụsiri Ndịàmà nọ n’ebe ndị a nọ nwee mgbakọ ahụ na ndị ga-esi esi abịa agụụ ike ka mgbakọ ahụ ruo eruo n’ihi na ha maara na mgbakọ ahụ ga-atọgbu onwe ya. Ịchọta ụlọ ga-ezu ndị ga-abịa mgbakọ ahụ abụghị obere ọrụ. Dị ka ihe atụ, ná mgbakọ e nwere na Chorzow, Ndịàmà nọ na Poland kwere nkwa inye ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku mmadụ iri na atọ si Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe ụlọ n’ụlọ ha. Ndị bịara mgbakọ ahụ si Armenia, Belarus, Estonia, Georgia, Kazakhstan, Kyrgyzstan, Latvia, Lithuania, Moldova, Russia, Tajikistan, Turkmenistan, Ukraine, United States, na Uzbekistan.

Ọtụtụ ndị bịara mgbakọ ahụ malitere ịkwadebe maka mgbakọ ahụ ọtụtụ ọnwa tupu oge eruo. Tatiana, bụ́ onye ozi oge nile nọ na Kamchatka, nke bụ́ obodo Russia dịdebere mmiri ma dịrị n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Japan, malitere idokọta ego maka njem ahụ otu afọ tupu oge eruo. Njem o mere ruru ihe dị ka puku kilomita isii na narị ise. Iji ruo ebe ọ na-aga, ọ nọrọ awa ise n’ụgbọelu, mesịa gbaa ụgbọ okporo ígwè ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụbọchị atọ, ma n’ikpeazụ nọọ awa iri atọ na bọs bururu ya Chorzow.

Ọtụtụ puku mmadụ wepụtara onwe ha ịrụ ọrụ n’ámá egwuregwu ndị a ga-anọ na ha nwee mgbakọ ndị ahụ ka ha wee dị mma ịnọ ha fee Jehova ofufe. (Deuterọnọmi 23:14) Dị ka ihe atụ, ụmụnna nọ na Leipzig debere nnọọ ámá egwuregwu a chọrọ ịnọ nwee mgbakọ ahụ ọcha, ma kwe nkwa ime otu ihe ahụ mgbe mgbakọ ahụ gasịrị. N’ihi nke a, ndị na-elekọta ámá egwuregwu ahụ kagburu ebe ha dere na ụmụnna ga-akwụ ezigbo ego nke a ga-eji hụ maka idebe ebe ahụ ọcha mgbe mgbakọ gasịrị.

Ịkpọ Ndị Ga-abịa Mgbakọ ahụ Oku

Ọgbakọ dị iche iche n’ụwa nile kpọsara nnọọ banyere mgbakọ ahụ bụ́ “Nnapụta Dị Nso!” Ndị gara maka mgbakọ a pụrụ iche so jiri ịnụ ọkụ n’obi kpọọ ndị mmadụ oku ịbịa. N’ụbọchị ga-abọta ụbọchị mgbakọ ahụ ga-amalite, ha nọgidere na-akpọsa banyere mgbakọ ahụ ruo abalị. Ịnụ ọkụ n’obi ha ọ̀ rụpụtara ihe?

Bogdan, Onyeàmà bụ́ onye Poland, zutere otu agadi nwoke chọrọ ịga mgbakọ ahụ, ma nwoke ahụ kwuru na obere ego ezumike nká a na-akwụ ya agaghị ezu iji gaa Chorzow nke dị otu narị kilomita na iri abụọ. O mechara daba na a ga-enwe ohere na bọs ọgbakọ ha chọtara iji gaa mgbakọ ahụ. Bogdan kọrọ, sị: “Anyị gwara nwoke ahụ na anyị ga-ebu ya aga n’efu ma ọ bụrụ na ọ pụta n’ebe anyị ga-ezukọ ma o jiri ọkara gafee elekere ise nke ụtụtụ.” Nwoke ahụ kwetara, o sokwa gaa mgbakọ ahụ. O degaara ụmụnna ahụ akwụkwọ ka e mesịrị, sị: “Ka m gasịrị mgbakọ a, ekpebisiwo m ike ịdị na-akpa àgwà ka mma.”

Na Prague, otu nwoke nke nọ n’otu họtel ndị si Britain bịa mgbakọ ahụ bi gwara ndị ahụ bịara mgbakọ n’otu uhuruchi na ya onwe ya gakwara mgbakọ nke e nwere n’ụbọchị ahụ. Gịnị kpaliri ya ime otú ahụ? Nwoke ahụ kwuru na mgbe mmadụ iri dịgasị iche ya na ha zutere n’okporo ámá nke obodo ahụ kpọchara ya oku ịbịa, ọ dịghị ihe ọzọ ya ga-eme ma ọ bụghị ịga. Ihe ọ mụtara masịrị ya nnọọ, ọ chọkwara ịmụtakwu.—1 Timoti 2:3, 4.

Okwu Ndị Na-ewusi Okwukwe Ike

Okwu ndị e kwuru ná mgbakọ ahụ lebara anya n’ihe ndị anyị pụrụ ime banyere nsogbu ndị dịgasị iche anyị na-enwe. Ndụmọdụ a kapịrị ọnụ bụ́ ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ kọwara otú a pụrụ isi dozie nsogbu ndị a ma ọ bụ nagide ha.

Ndị agadi, ndị ọrịa, ndị ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ, ma ọ bụ ndị nwere nsogbu ndị ọzọ dị iche iche, nwetara agbamume sitere na Bible nke ga-enyere ha aka inwe olileanya. (Abụ Ọma 72:12-14) Ndị di na nwunye nwetara ndụmọdụ ndị sitere na Bible banyere ihe ha ga-eme ka alụmdi na nwunye ha na-enye ha obi ụtọ nakwa otú ha pụrụ isi zụlite ụmụ ha nke ọma. (Eklisiastis 4:12; Ndị Efesọs 5:22, 25; Ndị Kọlọsi 3:21) Ndị Kraịst na-eto eto, bụ́ ndị a na-eji Okwu Chineke na-akụziri ihe n’ụlọ ha na n’ọgbakọ, ma n’otu oge ahụ ụmụ akwụkwọ ibe ha a na-arabanye ha ime omume ọjọọ, nwetakwara ndụmọdụ banyere ihe ha pụrụ ime ma ọ bụrụ na ndị ọgbọ ha aranyewe ha ime ihe ha ma na o kwesịghị ekwesị. Ha natakwara ndụmọdụ banyere otú ha pụrụ isi “gbanahụ ọchịchọ nke oge ntorobịa.”—2 Timoti 2:22.

Ha Bụ n’Ezie Òtù Ụmụnna Zuru Ụwa Ọnụ

A na-esi n’Akwụkwọ Nsọ enye Ndịàmà Jehova ntụziaka ndị ga-abara ha uru mgbe ọ bụla ha gara nnọkọ ha dị iche iche. (2 Timoti 3:16) Ma ihe mere ka mgbakọ ndị a pụọ iche bụ na ndị si mba dị iche iche bịara ha. E mere ihe omume nile e mere ná mgbakọ ndị a pụrụ iche n’ọtụtụ asụsụ. Kwa ụbọchị, otu onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-ekwu otu isiokwu, akụkọ ndị e sikwa ná mba ndị ọzọ nweta mere ka mgbakọ ahụ pụkwuo iche. A sụgharịrị okwu na ahụmahụ ndị a n’asụsụ dị iche iche ka ndị nile bịara mgbakọ ahụ wee ghọta ihe a na-ekwu.

Obi dị ndị nile bịara mgbakọ ahụ ọkụ ịhụ ụmụnna ha ndị si mba ndị ọzọ bịa. Otu n’ime ndị bịara mgbakọ ahụ kwuru, sị: “Asụsụ dị iche iche anyị na-asụ enyeghị nsogbu ọ bụla. Kama ịkpata nsogbu, o mere ka mgbakọ ahụ tọkwuo ụtọ. Ndị mmadụ si n’ebe dị iche iche bịa mgbakọ ahụ, ma otu okwukwe ha nwere mere ka ha dịrị n’otu.” Ndị gara mgbakọ nke e nwere na Munich si otú a kwuo ya: “Asụsụ kewara anyị ma ịhụnanya jikọtara anyị.” N’agbanyeghị ebe ha si na asụsụ ha, ndị bịara mgbakọ ahụ chọpụtara na ndị ha na ha nọ bụ ezigbo ndị enyi ha—ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwanyị.—Zekaraịa 8:23.

Okwu Ndị E Ji Gosi Ekele

Ụdị mmiri zoro na Poland n’oge e nwere mgbakọ ahụ nwalere ntachi obi na ụdị àgwà nke ndị bịara mgbakọ ahụ nwere. Ọ bụghị nanị na ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na mmiri zoro n’oge nile e mere mgbakọ ahụ kamakwa ezigbo oyi nọ na-atụ. Otu nwanna nwoke si United States kwuru, sị: “Kemgbe m gawara mgbakọ, ahụtụbeghị m ụdị mmiri ozuzo na oké oyi dị otú a, nke a mekwara ka m ghara ịghọtacha ihe e kwuru ná mgbakọ ahụ. Ma ịhụ ndị si mba ọzọ, ụdị ọṅụ nke a nyere anyị, na otú ụmụnna ndị ebe ahụ si lekọta anyị mere ka anyị chefuo nsogbu ndị anyị nwere. Mgbakọ a abụghị ihe a ga-echefu echefu!”

Ihe ndị na-asụ asụsụ Polish gara mgbakọ ahụ na-agaghị echefu echefu bụ mgbe e wepụtara Insight on the Scriptures n’asụsụ Polish nke bụ́ ụzọ magburu onwe ya isi kwụọ ha ụgwọ maka ntachi obi ha ji die oyi na oké mmiri ozuzo ahụ. Mmadụ nile gara mgbakọ ahụ bụ́ “Nnapụta Dị Nso!” nwekwara ọṅụ dị ukwuu mgbe e wepụtara akwụkwọ ọhụrụ bụ́ Live With Jehovah’s Day in Mind.

E nwere ihe ndị ọzọ mere ndị gara mgbakọ ahụ na-agaghị eji chefuo ya. Kristina, bụ́ nwanna nwanyị si Czech nke wepụtara onwe ya isonyere ụmụnna ndị si esi bịa na bọs ha kwuru, sị: “Mgbe oge ruru ka ndị ọ bụla lawa, otu nwanna nwanyị kpọọrọ m gaa n’otu akụkụ, makụọ m ma kwuo, sị: ‘Unu lekọtara anyị nnọọ nke ọma! I wetaara anyị nnọọ nri n’oche ebe anyị nọ ọbụna nye anyị mmiri anyị ṅụrụ. I meela nke ukwuu maka ezi ịhụnanya i nwere n’ebe anyị nọ.’” Ihe ọ na-ekwu okwu ya bụ otú e si nye ndị si esi bịa mgbakọ ahụ nri ehihie. Otu nwanna nwoke kwuru, sị: “Ihe a bụ ụdị ọrụ anyị na-arụtụbeghị. Ọrụ a gụnyere ikesa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ efere nri puku isii na narị ise kwa ụbọchị. Ọ bụ nnọọ ihe na-emetụ n’ahụ́ ịhụ ka ọtụtụ mmadụ, tinyere ụmụaka, wepụtara onwe ha inye aka.”

Otu nwanna nwanyị si Ukraine gaa Chorzow maka mgbakọ ahụ kwuru, sị: “Ịhụnanya, obiọma, na mmesapụ aka nke ndị kwere ekwe ibe anyị gosipụtara metụrụ anyị n’ahụ́ nke ukwuu. Anyị amaghị otú anyị ga-esi debe ọnụ kelewe ha.” Annika, bụ́ nwatakịrị dị afọ asatọ nke si Finland, degaara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Poland akwụkwọ, sị: “Mgbakọ ahụ magburu nnọọ onwe ya karịa otú m chere ọ ga-adị. Ọ bụ ihe ùgwù magburu onwe ya ịnọ ná nzukọ Jehova ebe mmadụ nwere ndị enyi n’ụwa nile!”—Abụ Ọma 133:1.

Ihe Ndị Na-abụghị Ndịàmà Kwuru

Tupu mgbakọ ahụ ebido, e mere ndokwa ka ndị bịara mgbakọ ahụ gaa legharịa anya. N’ime obodo dị na Bavaria, ndị ọbịa ahụ kwụsịrị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị dị n’obodo ahụ bụ́ ebe Ndịàmà nọ n’ebe ahụ nabatara ha. Ịhụnanya dị n’etiti ụmụnna ndị a metụrụ otu onye na-abụghị Onyeàmà nke na-edugharị ndị bịara nleta ahụ n’ahụ́. Otu onye n’ime ndị bịara mgbakọ ahụ kwuru, sị: “Mgbe anyị na-alaghachi na họtel anyị, onye ahụ dugharịrị anyị kwuru na anyị dị nnọọ iche ná ndị ọzọ ha na-adị na-edugharị ma ha bịa nleta. Anyị jiri ejiji nke ọma, ma rubere ndị na-edugharị anyị isi. Ọ dịghị onye na-akpọ ibe ya iyi, ọ dịghịkwa ọgba aghara ọ bụla dịnụ. Ọ tụrụ ya n’anya otú ndị na-amabughị ibe ha ga-esi ghọọ ezigbo ndị enyi ozugbo.”

Otu nwanna nwoke nke rụrụ ọrụ ná Ngalaba Na-ahụ Maka Mgbasa Ozi ná mgbakọ nke e nwere na Prague kwuru, sị: “N’ụtụtụ Sunday, onyeisi ndị uwe ojii a kpọtara ka ha chewe anyị nche bịara ná ngalaba anyị. O kwuru na onye ọ bụla na ibe ya dị n’udo nke na ndị uwe ojii enweghị ọrụ ọ bụla ha ga-arụ. O kwukwara na ụfọdụ ndị bi gburugburu ebe a nọ mee mgbakọ ahụ ajụọla ajụjụ banyere ihe a nọ ebe ahụ na-eme. Ha na-amakarị ọsụ ma a gwa ha na ọ bụ Ndịàmà Jehova na-enwe mgbakọ ha, ma onye uwe ojii ahụ na-agwa ha, sị: ‘Ọ bụrụ na mmadụ nile ga na-akpatụ àgwà ka Ndịàmà Jehova, agaghịdị enwe ndị uwe ojii.’”

A Napụtalarị Ọtụtụ Ndị!

Ọ bụ Okwu Chineke bụ́ Bible na-ejikọta agbụrụ dị iche iche ọnụ, ọ na-eme ka Ndị Kraịst dịrị n’otu na n’udo. (Ndị Rom 14:19; Ndị Efesọs 4:22-24; Ndị Filipaị 4:7) Mgbakọ a pụrụ iche bụ́ “Nnapụta Dị Nso!” gosiri na nke a bụ eziokwu. A napụtalarị Ndịàmà Jehova n’ọtụtụ nsogbu ndị na-akpa ụwa a aka ọjọọ. Ịkpọasị, ime ihe ike, ịkpa okè agbụrụ—à ga-ekwu ole ghara ole—adịghịzi n’etiti ha, ha na-atụkwa anya mgbe nsogbu ndị a na-agaghịzi adị n’ebe nile n’ụwa.

Ndị gara mgbakọ a ji anya ha hụ ịdị n’otu nke dị n’etiti Ndịàmà Jehova si ná mba na agbụrụ dị iche iche. Nke a pụtara nnọọ ìhè ná ngwụsị nke mgbakọ ahụ. Mmadụ nile nọ na-akụ aka, na-amakụrịta ndị enyi ha nwetara ọhụrụ, ma na-eserịta foto ikpeazụ tupu ha alawa. (1 Ndị Kọrint 1:10; 1 Pita 2:17) Ndị bịara mgbakọ ahụ ji obi ụtọ laghachi n’ụlọ ha n’ihi na ha maara na nnapụta site ná nsogbu ndị juru ebe nile dị nso. Nke a mekwara ka ha kpebisie ike ijidesi ‘okwu Chineke na-enye ndụ’ aka ike.—Ndị Filipaị 2:15, 16.

[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 4 Ndị nọ n’obodo isii ndị ọzọ a nọkwa nwee mgbakọ ahụ na Poland na ndị nọ n’otu nke e nwere na Slovakia si na telifon gere akụkụ ihe omume ahụ nke ndị si esi bịa kwuru.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 10]

Otu Ihe Omume nke E Mere n’Asụsụ Iri Abụọ na Isii

Ná mgbakọ itolu nile ahụ e nwere, a sụgharịrị ihe omume ndị ahụ n’asụsụ ndị bi n’ógbè ebe ahụ na-asụ. E jikwa asụsụ iri na asatọ ọzọ mee ihe ná mgbakọ ndị e mere na Germany. Na Dortmund, e jikwa asụsụ Arabic, Farsi, Portuguese, Spanish, na Russian mee ihe; na Frankfurt e ji asụsụ Bekee, French, na Serbian/Croatian mee ihe; na Hamburg e ji asụsụ Danish, Dutch, Swedish, na Tamil; na Leipzig e ji asụsụ Chinese, Polish, na Turkish; na Munich kwa, e ji Grik, Italian, na ụdị asụsụ ogbi nke Germany mee ihe. E ji asụsụ Czech, Bekee, na Russian mee ihe omume nile e mere na Prague. Na Bratislava, e ji asụsụ Bekee, Hungarian, Slovak na ụdị asụsụ ogbi nke Slovakia mee ihe. Na Chorzow, asụsụ ndị e ji mee ihe bụ Polish, Russian, Ukrainian, na ụdị asụsụ ogbi nke Poland. Na Poznan, asụsụ ndị e ji mee ihe bụ Polish na Finnish.

Ha nile dị asụsụ iri abụọ na isii. N’ezie, asụsụ kewara ndị gara mgbakọ ndị ahụ, ma ịhụnanya jikọtara ha.

[Foto dị na peeji nke 9]

Obi tọgburu ndị gara mgbakọ na Frankfurt atọgbu mgbe e wepụtara “Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ” n’asụsụ ha