Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Bible Mbụ E Nwere n’Asụsụ Portuguese—Akụkọ Banyere Onye Nọgidesiri Ike n’Ọrụ Ya

Bible Mbụ E Nwere n’Asụsụ Portuguese—Akụkọ Banyere Onye Nọgidesiri Ike n’Ọrụ Ya

Bible Mbụ E Nwere n’Asụsụ Portuguese—Akụkọ Banyere Onye Nọgidesiri Ike n’Ọrụ Ya

“ONYE nọgidesiri ike n’ihe ọ na-eme ga-enwe ihe ịga nke ọma.” Nke a bụ ihe e dere na peeji nke mbụ nke otu akwụkwọ nta na-akọ banyere okpukpe nke João Ferreira de Almeida dere na narị afọ nke iri na asaa. O siri ike ịchọta ụzọ ọzọ ka mma isi kọwaa nwoke wepụtara onwe ya ịsụgharị Bible gaa n’asụsụ Portuguese ma bipụta ya.

A mụrụ Almeida na 1628 na Torre de Tavares, bụ́ obodo dị n’ebe ugwu Portugal. Ebe ọ bụ na nne na nna Almeida nwụrụ mgbe ọ dị obere, nwanne papa ya bụ́ onye mọnk nke bi n’isi obodo Portugal bụ́ Lisbon kpọọrọ ya. A kọrọ na a zụrụ Almeida n’akwụkwọ nke ọma iji kwadebe ya ịghọ onye ụkọchukwu. Ọ pụrụ ịbụ nke a nyeere ya aka inwe ike ịmụta ọtụtụ asụsụ mgbe ọ ka na-eto eto.

Ma o yiri ka Almeida agaraghị eji ọtụtụ asụsụ a ọ maara asụ mee ihe n’ịsụgharị Bible ma a sị na ọ nọgidere na Portugal. Ka ndị Protestant ji Bible e nwere n’asụsụ dị iche iche na-agazu mba ndị dị n’ebe ugwu na n’etiti Europe, na-agbanwe ihe ụfọdụ chọọchị Katọlik na-eme, ndị Katọlik na-ekpe ndị jụrụ okwukwe ha ikpe ka na-akpa ajọ ike na Portugal. Nanị na mmadụ nwere Bible n’asụsụ ya pụrụ ime ka a kpọga ya n’ụlọ ikpe. *

Ikekwe ọ bụ iwu a mere Almeida ji kwaga Netherlands mgbe ọ na-eruchabeghị afọ iri na anọ. Obere oge ka ọ kwagasịrị ebe ahụ, mgbe ọ dị nanị afọ iri na anọ, o sitere Batavia (bụ́ nke a maara ugbu a dị ka Jakarta) Indonesia, gaa Eshia. N’oge ahụ, Batavia bụ ebe isi ụlọ ọrụ ndị Dutch East India dị ná Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Eshia, dị.

Onye Na-eto Eto nke Sụgharịrị Bible

Mgbe ọ fọrọ nke nta ka Almeida ruo Eshia, ọ hụrụ otu ihe nke gbanwere ndụ ya. Ka ha rutere n’agbata Batavia na Malacca (bụ́ nke a na-akpọ Melaka ugbu a) nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ Malaysia, ọ hụrụ otu akwụkwọ nta ndị Protestant e dere n’asụsụ Spanish nke isiokwu ya bụ́ Diferencias de la Cristiandad (Ndịrịta Iche Ndị E Nwere na Krisendọm). E wezuga ịkatọ ozizi ụgha ndị Roman Katọlik, akwụkwọ nta ahụ kwuru otu ihe masịrị nnọọ nwa okoro ahụ bụ́ Almeida: “Iji asụsụ ndị mmadụ na-amaghị na-akụzi ihe na chọọchị abaraghị ndị na-ege ntị na-adịghị aghọta ihe a na-ekwu uru ọ bụla, ọ bụrụgodị na e ji ya na-eto Chineke.”—1 Ndị Kọrint 14:9.

Almeida ghọtara ihe akwụkwọ a na-ekwu: Ihe ga-enye aka ịgba ozizi ụgha nke okpukpe n’anwụ bụ ime ka mmadụ nile ghọta ihe Bible na-ekwu. Mgbe o rutere Malacca, o sonyeere okpukpe Dutch Reformed Church ma malite ozugbo isi na Spanish sụgharịa akụkụ ụfọdụ nke akwụkwọ Oziọma ndị ahụ gaa n’asụsụ Portuguese, ma kesaara ya ndị “chọsiri nnọọ ike ịmata nke bụ́ eziokwu.” *

Ka afọ abụọ gasịrị, Almeida dị nnọọ njikere ịrụ ọrụ ka ukwuu—isi na Latin Vulgate sụgharịa Akwụkwọ Nsọ Grik dum nke Ndị Kraịst. O rughị otu afọ ya asụgharịchaa ya, nke a bụ nnọọ ihe dị egwu onye dị afọ iri na isii ime! O jiri obi ike zigara gọvanọ ndị Netherlands nke nọ na Batavia otu n’ime nsụgharị ya ka e bipụta ya. Ma o yiri ka Reformed Church dị na Batavia zigara Bible ahụ Almeida sụgharịrị n’Amsterdam, ma mgbe onye pastọ merela agadi e nyefere ya n’aka nwụrụ, ihe nile Almeida sụgharịrị efunyụọ anya.

Ọ bụ mgbe a gwara Almeida na 1651 ka o nye okpukpe Reformed Church e nwere na Ceylon (bụ́ nke a na-akpọ Sri Lanka ugbu a) otu n’ime nsụgharị ya ka ọ chọpụtara na nsụgharị mbụ ahụ o dere anọghịkwa n’ebe chọọchị ahụ na-edebe ihe. O kweghị ka nke a kụda ya mmụọ. O mesịrị chọta otu n’ime ihe odide ahụ—ikekwe nke mbụ o dere. N’afọ sochirinụ o degharịchara akwụkwọ Oziọma anọ ahụ na akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi. Òtù ndị isi okpukpe Reformed Chọọchị dị na * Batavia kwụrụ ya ego dị guilder iri atọ. Otu onye ya na Almeida rụkọrọ ọrụ dere na nke a “enweghị ebe o ruru maka nnukwu ọrụ ọ rụrụ.”

N’agbanyeghị na ha aghọtaghị uru mgbalị Almeida na-eme bara, Almeida nọgidere na-arụ ihe ọ na-arụ nke mere na n’afọ 1654, ọ sụgharịchara Agba Ọhụrụ nile ma dị njikere ibipụta ya. E kwulitekwara okwu ọzọ ma a ga-ebipụta ya, ma nanị ihe e meliri bụ iji aka dee akụkụ ya ole na ole ndị a ga-eji na-eme ihe na chọọchị ụfọdụ.

Òtù Na-ekpe Ndị Jụrụ Okwukwe Ikpe Amaa Ya Ikpe Ọnwụ

Ruo afọ iri ọzọ sochirinụ, Almeida nọ na-arụrụ Reformed Church ọrụ dị ka pastọ na onye ozi ala ọzọ. A họpụtara ya ịbụ pastọ na 1656, ebe mbụ o jekwara ozi bụ na Ceylon, bụ́ ebe ọ fọrọ obere ka enyí zọgbuo ya. O mechara jee ozi n’India dị ka onye ozi ala ọzọ mbụ nke ndị Protestant e nwere ná mba ahụ.

Almeida bụ onye si na Katọlik gbafee n’okpukpe Protestant ma na-eje ozi ná mba ọzọ. N’ihi ya, ọtụtụ ndị na-asụ Portuguese n’ebe ndị o letara weere ya dị ka onye si n’okwukwe ha dapụ nakwa dị ka sabo. Otú o si akatọ àgwà ọjọọ ndị ụkọchukwu na-akpa n’ezoghị ọnụ nakwa otú o si agba nkwenkwe na-ezighị ezi nke chọọchị Katọlik n’anwụ mekwara ka ya na ndị ozi ala ọzọ nke ndị Katọlik see okwu ọtụtụ ugboro. Esemokwu a ruru n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu na 1661 mgbe ụlọ ikpe na-ekpe ndị jụrụ okwukwe Katọlik ikpe na Goa, India, mara Almeida ikpe ọnwụ n’ihi na ha weere na ọ na-ezi ozizi nduhie. Ha kpụrụ ihe yiri Almeida ma kpọọ ihe ahụ ọkụ mgbe Almeida na-anọghị ya. Ikekwe n’ihi otú ihe gbasara Almeida si na-adọ ọgụ, gọvanọ Netherlands kpọghachiri ya Batavia obere oge ka a masịrị ya ikpe ọnwụ.

Almeida bụ onye ozi ala ọzọ na-anụ ọkụ n’obi, ma o chefughị mkpa ọ dị ịsụgharị Bible gaa n’asụsụ Portuguese. N’ezie, ihe mere o ji kpebisikwuo ike ime nke a bụ n’ihi na ọ chọpụtara na ma ndị ụkọchukwu ma ndị nkịtị nọ na chọọchị amaghị nke a na-akọ na Bible. N’okwu Almeida ji bido trakitị o dere na 1668, ọ gwara ndị na-agụ akwụkwọ ya, sị: “Ana m atụ anya . . . ịsụgharịrị unu Bible n’ozuzu ya n’asụsụ unu n’oge na-adịghị anya, nke ga-abụ onyinye kasịnụ na nke kasị dị oké ọnụ ahịa onye ọ bụla pụrụ inye unu.”

Nsogbu Almeida na Kọmitii Na-agụgharị Ihe Nwere

Na 1676, Almeida nyere ndị isi nke chọọchị dị na Batavia akụkụ ikpeazụ nke nsụgharị Agba Ọhụrụ ya ka ha gụgharịa. Ha na ya malitere mgbe o nyere ha akwụkwọ a nwewe nsogbu. J. L. Swellengrebel, bụ́ onye dere akụkọ ndụ Almeida, kọrọ na ọ ga-abụ na ndị na-asụ Dutch ha na Almeida rụkọrọ ọrụ aghọtachaghị ihe okwu ụfọdụ pụtara, ya na otú e si ede ha. E nwekwara arụmụka banyere ụdị asụsụ Portuguese a ga-eji asụgharị ya. À ga-eji asụsụ Portuguese ndị mmadụ na-asụ n’ime obodo ka à ga-eji nke ndị gụrụ akwụkwọ ji eme ihe bụ́ nke ga-esiri ndị mmadụ ike nghọta? Ihe ọzọ sokwa kpata esemokwu ọtụtụ ugboro bụ otú o si dịrị Almeida ọkụ n’obi ka e bipụta Bible ahụ ngwa ngwa.

Ọrụ ahụ gburu nnọọ oge n’aka ndị na-agụgharị ya ikekwe n’ihi esemokwu ndị a ma ọ bụkwanụ n’ihi na ndị na-agụgharị ya eweghị ya ka ihe dị mkpa. Ka afọ anọ gasịrị, ndị ahụ na-agụgharị ya na isiakwụkwọ ndị mbụ nke akwụkwọ Luk ka na-alụ. Oge a ha na-egbu wutere Almeida nke ukwuu nke mere o ji ziga otu n’ime ihe ọ sụgharịrị ka e bipụta ya na Netherland n’emeghị ka ndị na-agụgharị ya mara.

N’agbanyeghị mgbalị nile ndị ahụ na-agụgharị ya mere iji hụ na e bipụtaghị ya, na 1681 e wegara nsụgharị Agba Ọhụrụ ya n’ebe a ga-ebi ya na Amsterdam, na 1682 kwa, ndị mbụ e bipụtara rutere Batavia. Chetụdị otú ọ ga-esi wute Almeida mgbe ọ chọpụtara na e nweela ụfọdụ ihe ndị gụgharịrị Bible ahụ na Netherland wepụrụ ma ọ bụ gbanwee. N’ihi na ndị a gụgharịrị ya amachaghị asụsụ Portuguese, Almeida chọpụtara na ha “denyere okwu ụfọdụ na-abụghị otú e si ekwu ha na ndị nke na-emegide onwe ha bụ́ ndị mere ka o sie ike ịghọta ihe Mmụọ Nsọ bụ.”

Obi adịkwughị ndị ọchịchị Netherlands mma, n’ihi ya, ha nyere iwu ka e bibisịa Bible ahụ nile e biri. Ma, Almeida gwara ha ka ha hapụ ụfọdụ n’ime ha ka e jiri aka dezie ihe ndị dị oké njọ a na-edezighị edezi. A ga-eji ha na-eme ihe ruo mgbe a ga-edegharịcha ya.

Ndị ahụ na-agụgharị ya na Batavia bịakọtara ọnụ ọzọ iji gaa n’ihu n’ọrụ ha na-arụ n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ma malitekwa ịrụ ọrụ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ka Almeida na-asụgharị ha. N’ihi ụjọ ji ha na Almeida agaghị enwe ndidi ka a gụgharịchaa akwụkwọ ndị ọ sụgharịrị, òtù ahụ na-agụgharị ihe kpebiri idebe ndị nke ha gụgharịcharala n’ebe a na-echekwa ihe na chọọchị. Ma, Almeida jụwara isi.

Ka ọ na-erule oge a, ahụ́ esichaghịzi Almeida ike n’ihi nnukwu ọrụ ndị ọ rụrụ kemgbe ọtụtụ iri afọ na n’ihi ebe ndị e nwere oké okpomọkụ o jere ozi. Na 1689, n’ihi ọrịa, Almeida kwụsịrị ịrụ ọrụ chọọchị ma lekwasị anya n’ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ọ dị mwute ikwu na ọ nwụrụ na 1691 ka ọ na-asụgharị isiakwụkwọ ikpeazụ nke akwụkwọ Ezikiel.

E bipụtara mbipụta nke abụọ nke nsụgharị Agba Ọhụrụ ya obere oge tupu ya anwụọ n’afọ 1693. O yikwara ka ọrụ ya ọ hụsiri anya ọzọ n’aka ndị na-amaghị nke a na-akọ na-agụgharị ya. G. L. Santos Ferreira kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ A Biblia em Portugal (Bible E Nwere na Portugal), sị: “Ndị gụgharịrị Bible ahụ . . . gbanwere nnọọ ọtụtụ ihe n’ọmarịcha ọrụ ahụ Almeida rụrụ, ha ghagbusịrị ma mebisịa ihe ndị gụgharịrị ya mbụ mebifọrọ.”

E Bipụta Bible Portuguese

Mgbe Almeida nwụchara, e nweghịzi onye na-agba mbọ na Batavia ịhụ na a gụgharịrị Bible Portuguese ma bipụta ya. Ọ bụ otu òtù nọ na London a na-akpọ Society for Promoting Christian Knowledge wetara ego e ji bipụta mbipụta nke atọ nke nsụgharị Agba Ọhụrụ nke Bible Almeida ahụ na 1711, ọ bụkwanụ ndị ozi ala ọzọ bụ́ ndị Denmark ndị na-arụ ọrụ na Tranquebar, nke dị n’ebe ndịda India, rịọrọ ka e mee otú ahụ.

Òtù ahụ kpebiri imepe ebe a na-ebi akwụkwọ na Tranquebar. Ma, mgbe e bu ihe ndị e ji ebi akwụkwọ na Bible Portuguese ahụ n’ụgbọ mmiri na-aga India, ndị French na-ezu ohi n’oké osimiri jidere ha, ha mesịkwara hapụ ngwongwo ndị ahụ n’ọdụ ụgbọ mmiri Rio de Janeiro dị na Brazil. Santos Ferreira dere, sị: “N’ihi ihe a na-apụghị ịkọwa otú o si mee, nke ọtụtụ weere dị ka ọrụ ebube, igbe ndị e ji tinye ihe ndị ahụ e ji ebi akwụkwọ gara sụlaa n’ala ala ụgbọ ahụ n’enweghị ihe mere ha, e mechakwara jiri otu ụgbọ ahụ buruo ha Tranquebar.” Ndị ozi ala ọzọ ahụ bụ́ ndị Denmark ji nnọọ nlezianya gụgharịa akụkụ Bible ndị fọdụrụnụ Almeida sụgharịrị ma bipụta ha. E bipụtara mpịakọta ikpeazụ nke Bible Portuguese na 1751, nke bụ́ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu narị afọ na afọ iri Almeida malitesịrị ịsụgharị Bible.

Onyinye Na-adịte Aka Ọ Hapụrụ

Malite mgbe Almeida dị obere, ọ ghọtara mkpa ọ dị inwe Bible na Portuguese ka ndị nkịtị wee nwee ike ịghọta eziokwu ahụ n’asụsụ ha. Ọ gbasiri nnọọ mbọ ike ịhụ na nke a nwere isi n’oge ndụ ya n’agbanyeghị mmegide sitere n’aka Chọọchị Katọlik, nakwa n’agbanyeghị na ndị ọgbọ ya egosighị mmasị n’ihe ọ na-eme tinyere nsogbu o nwere n’aka ndị na-agụgharịrị ya ha, na ọrịa ya na-akwanye njọ. Ma ntachi obi ya rụpụtara ezi ihe.

Ọtụtụ obodo ndị a na-asụ asụsụ Portuguese bụ́ ndị Almeida kwusaara ozi ọma adịghịzi, ma Bible ya ka dị. Na narị afọ nke iri na itoolu, òtù a na-akpọ British and Foreign Bible Society na American Bible Society kesara ọtụtụ puku Bible ahụ Almeida sụgharịrị na Portugal nakwa n’obodo ndị dị n’ụsọ oké osimiri ndị dị na Brazil. N’ihi ya, Bible ndị e si na Bible ya sụgharịta so na ndị kasị ewu ewu na ndị a kasị ekesa n’ebe ndị a na-asụ Portuguese n’ụwa.

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọtụtụ ndị nwere Bible kwesịrị ikele ndị mbụ sụgharịrị Bible dị ka Almeida. Ma onye e kwesịrị ikele karịsịa bụ Jehova, bụ́ Chineke nke na-agwa ndị mmadụ uche ya, onye ọ bụ “uche ya ka a zọpụta ụdị mmadụ nile na ka ha bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Timoti 2:3, 4) Ọ bụ ya n’ezie chebere Okwu ya ma mee ka anyị nweta ya maka abamuru anyị. Ya adịla mgbe anyị ga-akwụsị iji ya akpọrọ ihe, ka anyị jiri ịdị uchu na-amụ “akụ̀ a kasị dịrị oké ọnụ ahịa” nke si n’aka Nna anyị nke eluigwe.

[Ntụaka ala peeji]

^ par. 4 N’etiti narị afọ nke iri na isii, ndị Chọọchị Katọlik machibidoro nnọọ mmadụ ịgụ Bible e dere n’asụsụ ya iwu site n’iwepụta ihe odide a kpọrọ Index of Forbidden Books bụ́ ebe e depụtara akwụkwọ ndị a machibidoro mmadụ iwu ịgụ. Dị ka The New Encyclopædia Britannica si kwuo, nke a ‘mere nnọọ ka ndị Katọlik kwụsị ịsụgharị Bible ọzọ ruo narị afọ abụọ.’

^ par. 8 Na Bible ndị mbụ Almeida sụgharịrị, a kpọrọ ya Padre (Fada) Almeida, bụ́ nke mere ka ụfọdụ chee na o nwere mgbe ọ bụ onye ụkọchukwu ndị Katọlik. Ma ndị Netherlands gụgharịrị Bible Almeida jiri utu aha ahụ mee ihe n’amaghị ama, na-eche na ọ bụ utu aha e ji ama pastọ ma ọ bụ onye ụkọchukwu.

^ par. 10 Ọ bụ òtù a na-atụ ihe na-eme n’okpukpe Reformed Church.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 21]

AHA CHINEKE

Otu ihe kwesịrị ịrịba ama nke na-egosi na Almeida bụ onye nsụgharị na-agbasochi eziokwu anya bụ otú o si jiri aha Chineke sụgharịa Tetragrammaton Hibru.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Cortesia da Biblioteca da Igreja de Santa Catarina (Igreja dos Paulistas)

[Map dị na peeji nke 18]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

OKÉ OSIMIRI ATLANTIC

PORTUGAL

Lisbon

Torre de Tavares

[Foto dị na peeji nke 18]

Otú Batavia dị na narị afọ nke iri na asaa

[Ebe E Si Nweta Foto]

E si na Oud en Nieuw Oost-Indiën, Franciscus Valentijn, 1724 nweta ya

[Foto dị na peeji nke 18, 19]

Peeji bu isiokwu nke nsụgharị Agba Ọhụrụ mbụ n’asụsụ Portuguese, nke e bipụtara n’afọ 1681

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’aka Biblioteca Nacional, Portugal