Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ga-akwụsị Ịkpọasị n’Etiti Agbụrụ Dị Iche Iche?

Gịnị Ga-akwụsị Ịkpọasị n’Etiti Agbụrụ Dị Iche Iche?

Gịnị Ga-akwụsị Ịkpọasị n’Etiti Agbụrụ Dị Iche Iche?

NA Spen, otu referii kwụsịrị egwuregwu bọl nọ na-aga n’ihu. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọtụtụ n’ime ndị na-ekiri egwuregwu bọl ahụ nọ na-akparị otu onye Cameroon so na-agba bọl nke mere o ji chọọ isi n’àmà egwuregwu ahụ pụọ. Na Russia, a na-alụsokarị ndị Africa, ndị Eshia, na ndị Latin America ọgụ; na 2004, ugboro ole a lụsoro ndị agbụrụ ọzọ ọgụ n’ebe ahụ ji pasent iri ise na ise karịa nke mere n’afọ 2003, ruo na e nwere ugboro narị atọ na iri itolu na anọ a lụsoro ndị agbụrụ ọzọ ọgụ n’ebe ahụ na 2005. Na Britain, otu n’ime ụzọ atọ nke ndị Eshia na ndị isi ojii a gbara ajụjụ ọnụ chere na ihe mere e ji chụọ ha n’ọrụ ha bụ n’ihi na ha si n’agbụrụ ọzọ. Ihe atụ ndị a na-egosi ihe na-eme n’ụwa nile.

E nwere ụzọ dị iche iche dị njọ ndị mmadụ si egosi na ha kpọrọ agbụrụ ndị ọzọ asị. Ụfọdụ na-eme nke a site n’ịkparị ndị si n’agbụrụ ọzọ ma ọ bụ ịgwa ha okwu na-agbawa obi, ebe gọọmenti ụfọdụ na-ekpebi igbuchapụ agbụrụ ụfọdụ nọ ná mba ha bụ́ ndị ihe banyere ha na-adịghị amasị. * Gịnị mere ụfọdụ ndị ji akpọ ndị agbụrụ ọzọ asị? Olee otú anyị pụrụ isi zere ịkpọ ndị agbụrụ ọzọ asị? Amamihe ọ̀ dị n’ịtụwa anya na a ga-enwe mgbe ụmụ mmadụ nile ga-ebikọ ọnụ n’udo? Bible na-aza ajụjụ ndị a n’ụzọ na-akpali mmasị.

Mmegbu na Ịkpọasị

Bible kwuru, sị: “Nchepụta nke obi mmadụ dị njọ site na nwata.” (Jenesis 8:21) N’ihi nke a, ọ na-atọ ụfọdụ ndị ụtọ imegbu ndị ọzọ. Bible kwukwara, sị: “Lee, anya mmiri nke ndị a na-emegbu, ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere; ma n’akụkụ ndị na-emegbu ha ka ike dị, ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere.”—Eklisiastis 4:1.

Bible gosikwara na ọ dịla anya ndị mmadụ kpọwara ndị si n’agbụrụ ọzọ asị. Dị ka ihe atụ, na narị afọ nke iri na asatọ tupu Oge Anyị, otu Fero nke Ijipt gwara Jekọb bụ́ onye Hibru na nnukwu ezinụlọ ya ka ha bịa biri n’Ijipt. Ma ka ọtụtụ afọ gasịrị, Fero ọzọ tụrụ egwu na ndị Hibru a na-amụba n’ike n’ike ga-akarị ha ike. N’ihi ya, anyị na-agụ, sị: “O wee sị ndị ya, Lee, ndị ụmụ Izrel dị ọtụtụ nweekwa ume karị anyị: ngwa, ka anyị gosi onwe anyị ná ndị maara ihe n’ebe ha nọ; ka ha wee ghara ịba ụba, . . . Ha wee doo ndị isi nke ndị na-efe ofufe n’isi ha iwere ibu ha weda ha n’ala.” (Ọpụpụ 1:9-11) Ndị Ijipt nyedịrị iwu ka e gbuo nwatakịrị nwoke Hibru ọ bụla a mụrụ ọhụrụ.—Ọpụpụ 1:15, 16.

Gịnị Mere Ụfọdụ Ndị Ji Akpọ Ndị Agbụrụ Ọzọ Asị?

Okpukpe ndị e nwere n’ụwa enyerebeghị ndị mmadụ aka ịkwụsị ịkpọ ndị agbụrụ ọzọ asị. Ọ bụ ezie na e nweela ụfọdụ ndị katara nnọọ obi lụọ ọgụ megide imegbu ndị ọzọ, ihe a na-ahụkarị bụ na ndị okpukpe na-adụnyere ndị a na-emegbu ndị ọzọ úkwù. Nke a bụ ihe mere na United States, bụ́ ebe iwu kwadoburu ka e jiri ndị isi ojii na-agba ohu ma nye ndị mmadụ ohere igbu ha. Iwu nke machibidoro ndị ọcha na ndị isi ojii ịlụ onwe ha dịgidere ruo na 1967. Otu ihe ahụ mekwara na South Africa mgbe e nwere ịkpa ókè agbụrụ, bụ́ mgbe otu ntakịrị ìgwè mere iwu dị iche iche iji hụ na ọchịchị nọgidere ha n’aka. Otu n’ime iwu ndị a bụ nke megidere ịlụ onye agbụrụ ọzọ. Na nke ọ bụla n’ime ihe atụ ndị a, ụfọdụ ndị so kwadoo ka a na-akpọ ndị agbụrụ ọzọ asị bụcha ndị bu okpukpe n’isi.

Otú ọ dị, Bible na-agwa anyị ihe ọzọ bụ́ isi mere ndị mmadụ ji akpọ ndị agbụrụ ọzọ asị. Ọ kọwara ihe mere agbụrụ ụfọdụ ji emegbu ibe ha. Ọ na-ekwu, sị: “Onye na-adịghị ahụ n’anya amabeghị Chineke, n’ihi na Chineke bụ ịhụnanya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ekwuo, sị: ‘Ahụrụ m Chineke n’anya,’ ma na-akpọkwa nwanna ya asị, ọ bụ onye ụgha. N’ihi na onye na-adịghị ahụ nwanna ya n’anya, bụ́ onye ọ hụworo, apụghị ịdị na-ahụ Chineke n’anya, bụ́ onye ọ na-ahụbeghị.” (1 Jọn 4:8, 20) Ihe a e kwuru n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ a gosiri isi ihe mere ndị mmadụ ji akpọ ndị agbụrụ ọzọ asị. Ndị mmadụ na-eme ya—ma hà na-aga chọọchị ma ọ bụ na ha anaghị aga—n’ihi na ha amaghị Chineke, ha ahụghịkwa ya n’anya.

Ịmara Chineke Bụ Isi Ihe Na-eme Ka Agbụrụ Dị Iche Iche Dịrị n’Udo

Olee otú ịmara Chineke na ịhụ ya n’anya si eme ka agbụrụ dị iche iche dịrị n’udo? Olee ihe Okwu Chineke kwuru bụ́ nke na-egbochi ndị mmadụ imerụ ndị si n’agbụrụ ọzọ ahụ́? Bible na-egosi na Jehova bụ Nna nke mmadụ nile. Ọ na-ekwu, sị: “Nye anyị e nwere n’ezie otu Chineke bụ́ Nna, onye ihe nile si n’aka ya dịrị.” (1 Ndị Kọrint 8:6) Okwu Chineke gakwara n’ihu ikwu, sị: “O sitekwara n’otu mmadụ mee mba ọ bụla nke ụmụ mmadụ.” (Ọrụ 17:26) N’ihi ya, a pụrụ ikwu na mmadụ nile bụ ụmụnne.

Agbụrụ nile nọ n’ụwa kwesịrị inwe obi ụtọ na Chineke nyere ha ndụ, ma mmadụ nile na-enwe ihe ọ na-abụ ha cheta, banyere otú ha si malite, obi a na-ajọ ha njọ. Pọl, bụ́ onye so dee Bible, kwuru, sị: “Mmehie sitere n’otu mmadụ bata n’ụwa.” N’ihi ya, “mmadụ nile emehiewo, gharakwa iru ebube Chineke.” (Ndị Rom 3:23; 5:12) Jehova bụ Chineke nke na-enwe mmasị ka ihe dịrị n’ụdị dịgasị iche iche—ọ dịghị ihe ọ bụla o kere eke ndị bụ nnọọ kpọmkwem otu ụdị. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịghị agbụrụ ọ bụla o nyere ihe ga-eme ka ha chewe na ha karịrị ndị ọzọ. Echiche ọtụtụ ndị nwere bụ́ na agbụrụ nke ha ka agbụrụ ndị ọzọ mma megidere ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu. O doro nnọọ anya na ihe anyị na-amụta n’aka Chineke na-enyere anyị aka ịhụ na anyị na ndị agbụrụ ọzọ dị n’udo.

Chineke Na-eche Banyere Mba Nile

Ụfọdụ ndị na-eche na Chineke na-akwado agbụrụ ịkpọ agbụrụ ibe ya asị n’ihi otú o si họrọ ụmụ Izrel ma kụziere ha ịnọpụ iche n’ebe mba ndị ọzọ nọ. (Ọpụpụ 34:12) E nwere mgbe Chineke họọrọ mba Izrel ịghọ ndị nke ya n’ihi okwukwe na-enweghị atụ nke nna nna ha bụ́ Ebreham gosipụtara. Chineke duziri mba Izrel oge ochie n’onwe ya, jiri aka ya họpụta ndị eze ha ma nye ha iwu duziri ha. N’oge ụmụ Izrel nabatara nduzi Chineke, ndị mmadụ hụrụ ihe dị iche ná mba Chineke na-achị na mba ndị mmadụ na-achị. N’oge ahụ, Jehova kụzikwaara ụmụ Izrel mkpa ịchụ àjà dị iji mee ka mmadụ na Chineke dịghachi ná mma. Ya mere, mmekọ Jehova so Izrel mekọọ ihe baara mba nile uru. Nke a kwekọrọ n’ihe ọ gwara Ebreham: “Ọ bụkwa ná mkpụrụ gị ka mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha; n’ihi na i gewo ntị n’olu m.”—Jenesis 22:18.

E wezụga nke a, ndị Juu nwekwara ihe ùgwù nke ịnụ olu Chineke nakwa nke ịbụ mba a mụrụ Mezaịa ahụ n’ime ya. Ma ihe mere e ji mee nke a bụ maka abamuru nke mba nile. Akwụkwọ Nsọ Hibru, bụ́ nke e nyere ndị Juu, kwuru ihe na-agba ume mgbe o kwuru banyere oge agbụrụ nile ga-enweta ngọzi dị ukwuu: “Ọtụtụ mba ga-ejekwa, sị, Bịanụ, ka anyị rịgoruo ugwu Jehova, ruokwa ụlọ Chineke nke Jekọb; Ọ ga-ezikwa anyị ụzọ Ya ụfọdụ, . . . mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ. Ma ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.”—Maịka 4:2-4.

N’agbanyeghị na ọ bụ ndị Juu ka Jizọs Kraịst kwusaara ozi ọma n’onwe ya, o kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.” (Matiu 24:14) Mba nile kwesịrị ịnụ ozi ọma ahụ. Jehova si otú a setịpụ ihe nlereanya na-enweghị atụ nke otú e kwesịrị isi na-emeso agbụrụ nile ihe n’eleghị onye ọ bụla anya n’ihu. “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anara nke ọma.”—Ọrụ 10:34, 35.

Iwu Chineke nyere mba Izrel gosikwara na o nwere mmasị n’ebe mba nile nọ. Rịba ama otú Iwu ahụ si gosi na ihe a chọrọ ka ụmụ Izrel mee abụghị nanị ịghara ịkpọ ndị na-abụghị ndị Izrel asị mgbe ọ sịrị: “Dị ka onye a mụrụ n’ala site n’ahụ́ unu ka ọbịa ga-adịrị unu, bụ́ onye nọ dị ka ọbịa n’etiti unu, ị ga-ahụkwa ya n’anya dị ka onwe gị; n’ihi na ndị ọbịa ka unu burịị n’ala Ijipt.” (Levitikọs 19:34) Ọtụtụ n’ime iwu ndị Chineke nyere kụziiri ụmụ Izrel inwe obiọma n’ebe ndị na-abụghị ndị Izrel nọ. Nke a mere na mgbe Boaz, onye bụ́ nna ochie Jizọs, hụrụ otu nwanyị na-abụghị onye Izrel nke bụ́ ogbenye ka ọ na-achịkọta ihe ndị e wefọrọ n’ubi ya, o mere ihe ọ mụtara n’aka Chineke site n’ịhụ na ndị na-ewere ya ihe ubi hapụụrụ nwanyị ahụ ọtụtụ ọka ka ọ chịkọrọ.—Rut 2:1, 10, 16.

Jizọs Kụziiri Ndị Mmadụ Inwe Obiọma

Jizọs gosipụtara na ya maara Chineke karịa onye ọ bụla. O gosiri ụmụazụ ya otú e si egosi obiọma n’ebe ndị si n’agbụrụ ọzọ nọ. N’otu oge, ọ malitere ịkpanyere otu nwanyị Sameria ụka. Ọtụtụ ndị Juu kpọrọ ndị Sameria asị, n’ihi ya, ihe a Jizọs mere tụrụ nwanyị ahụ n’anya. Ka mkparịta ụka ha na-aga n’ihu, Jizọs ji obiọma nyere nwanyị ahụ aka ịghọta otú ọ pụrụ isi nweta ndụ ebighị ebi.—Jọn 4:7-14.

Jizọs kụzikwaara anyị otú anyị ga-esi na-emeso ndị si n’agbụrụ ọzọ ihe mgbe o nyere ihe atụ banyere onye Sameria bụ́ ezigbo onye agbata obi. Nwoke a hụrụ onye Juu ndị ohi kụrụ ọ dị ndụ ọnwụ ka mma. Ọ gaara echewe, sị: ‘Olee ihe m ga-eji nyere onye Juu aka? Ndị Juu kpọrọ ndị obodo m asị.’ Ma Jizọs kọrọ na onye Sameria ahụ adịghị ewere ndị na-esighị n’agbụrụ ya dị ka ndị iro. N’agbanyeghị na ndị ọzọ gafeere nwoke ahụ e merụrụ ahụ́, onye Sameria ahụ “nwere ọmịiko” ma nyere ya nnọọ aka. Jizọs mechiri ihe atụ a site n’ikwu na onye ọ bụla chọrọ ka ya na Chineke dịrị ná mma kwesịrị ịdị na-eme otu ihe a.—Luk 10:30-37.

Pọl onyeozi kụziiri ndị chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ ka ha gbanwee àgwà ha ma ṅomie otú Chineke si emeso ndị ọzọ ihe. Pọl dere, sị: “Yipụnụ ụdị mmadụ ochie ahụ na omume ya, ma yikwasịnụ onwe unu ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ, bụ́ nke a na-esite n’ezi ihe ọmụma na-eme ka ọ dị ọhụrụ dị ka onyinyo nke Onye ahụ kere ya si dị, bụ́ ebe a na-enweghị onye Grik ma ọ bụ onye Juu, ibi úgwù ma ọ bụ ebighị úgwù, onye mba ọzọ, onye Sitia . . . Ma, e wezụga ihe ndị a nile, yikwasịnụ onwe unu ịhụnanya, n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.”—Ndị Kọlọsi 3:9-14.

Ịmara Chineke Ọ̀ Na-eme Ka Ndị Mmadụ Gbanwee Àgwà Ha?

Ịmara Jehova Chineke ọ̀ na-agbanwe otú ndị mmadụ si emeso ndị agbụrụ ọzọ ihe? Tụlee ahụmahụ nke otu onye Eshia kwagara Canada, onye obi na-adịghị mma mgbe e mesoro ya ihe n’ụzọ na-adịghị mma n’ihi na o si n’agbụrụ ọzọ. O zutere Ndịàmà Jehova, ha amalitekwa ịmụrụ ya Bible. Mgbe e mesịrị, o degaara ha akwụkwọ ekele bụ́ ebe o kwuru, sị: ‘Unu bụ ndị ọcha nwere obiọma. Mgbe m chọpụtara na unu dị nnọọ iche ná ndị ọcha ndị ọzọ, echewere m ihe kpatara ya. Echegidere m ihe a wee kwubie na unu bụrịrị Ndịàmà Chineke. A ga-enwerịrị ihe unu gụtara na Bible mere unu ji dị iche. Ná nzukọ unu, n’agbanyeghị na e nwere ìgwè ndị ọcha, ndị isi ojii na ndị nwegasịrị ụdị ụcha akpụkpọ ahụ́ dị iche iche, unu nwere otu obi—e nweghị onye buuru ibe ya ihe n’obi—n’ihi na onye ọ bụla weere ibe ya dị ka nwanne. Ugbu a, amatala m onye mere ka unu nwee obiọma otú a. Ọ bụ Chineke unu.’

Okwu Chineke buru amụma na a ga-enwe mgbe “ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa.” (Aịsaịa 11:9) Ọbụna ugbu a, ná mmezu nke amụma Bible, oké ìgwè mmadụ ruru ọtụtụ nde bụ́ ndị si “ná mba na ebo na ndị na asụsụ nile” dị n’otu ma na-efe ezi Chineke ahụ. (Mkpughe 7:9) Ha na-atụ anya ịhụ mgbe ịhụnanya zuru ụwa ọnụ ga-anọchi ịkpọasị. Ụdị ịhụnanya a nke ga-adị n’etiti mmadụ nile n’ụwa ga-abụ mmezu nke ihe Jehova gwara Ebreham mgbe ọ sịrị: “A ga-agọzi ezinụlọ nile nke ụwa.”—Ọrụ 3:25.

[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 3 Ihe a na-ekwu okwu ya n’isiokwu a metụtakwara ịkpọ ndị mmadụ asị n’ihi okpukpe ma ọ bụ asụsụ ha.

[Foto dị na peeji nke 4, 5]

Iwu Chineke kụziiri ụmụ Izrel ka ha hụ ndị na-abụghị ndị Izrel n’anya

[Foto dị na peeji nke 5]

Gịnị ka anyị pụrụ isi n’ilu nke onye Sameria bụ́ ezigbo onye agbata obi mụta?

[Foto ndị dị na peeji nke 6]

Ọ dịghị ihe ọ bụla Chineke nyere otu agbụrụ nke ga-eme ka ha chee na ha karịrị ndị ọzọ