Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ezikiel—Akụkụ nke Mbụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ezikiel—Akụkụ nke Mbụ

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ezikiel—Akụkụ nke Mbụ

Ọ BỤ n’afọ 613 T.O.A. Jeremaịa onye amụma nọ na Juda n’oge ahụ, o jikwa obi ike na-akpọsa na n’oge na-adịghị anya a ga-ebibi Jeruselem ma mee ka Juda tọgbọrọ n’efu. Eze Nebukadneza nke Babilọn ebula ụzọ dọrọ ọtụtụ ndị Juu n’agha. Ndị so ná ndị ọ kpọọrọ gaa Babịlọn bụ Daniel ka na-eto eto na ndị enyi ya atọ, bụ́ ndị malitere ije ozi n’obí eze ndị Kaldia. Ọtụtụ n’ime ndị Juu ahụ a dọọrọ n’agha bi n’akụkụ osimiri Keba “n’ala ndị Kaldia.” (Ezikiel 1:1-3) Jehova ahapụghị izigara ndị ahụ a dọọrọ n’agha onye ozi. Ọ họpụtara Ezikiel dị afọ iri atọ ka ọ bụrụ onye amụma.

E dechara akwụkwọ Ezikiel n’afọ 591 T.O.A., ihe e dere n’ime ya bụ ihe mere n’ime afọ iri abụọ na abụọ. Ezikiel ji nnọọ nlezianya dee ihe ndị o dere. O dekọrọ akara ụbọchị o buru amụma ya, kwuo kpọmkwem ọbụna ụbọchị, ọnwa na afọ o buru ha. Akụkụ nke mbụ nke amụma Ezikiel lekwasịrị anya n’ọdịda na mbibi nke Jeruselem. E dekọrọ okwu ikpe megide mba ndị gbara ya gburugburu ná nkebi nke abụọ, nkebi nke atọ kwukwara otú a ga-esi maliteghachi ife Jehova. Ihe a tụlere n’isiokwu a bụ isi ihe ndị sitere n’Ezikiel 1:1-24:27, bụ́ nke gụnyere ọhụụ, amụma, na ihe ngosi nke ihe ndị na-aga ịdakwasị Jeruselem.

“ONYE NCHE KA M DOWORO GI”

(Ezikiel 1:1–19:14)

Mgbe e gosichara Ezikiel ọhụụ na-emenye ụjọ banyere ocheeze Jehova, a gwara ya ọrụ ọ ga-arụ. Jehova gwara ya, sị: “Onye nche ka m doworo gị nye ụlọ Izrel: ị ga-anụkwa okwu site n’ọnụ m, dọọ ha aka ná ntị site na m.” (Ezikiel 3:17) A gwara Ezikiel ka o mee ihe ngosi abụọ nke ga-egosi otú a ga-esi nọchibido Jeruselem na nsogbu ndị nke a ga-ewetara obodo ahụ. Jehova sitere n’ọnụ Ezikiel kwuo ihe gaje ime mba Juda, sị: “Lee, Mụ onwe m na-eme ka mma agha bịakwasị unu, M ga-emekwa ka ha laa n’iyi, bụ́ ebe nile unu nke dị elu.” (Ezikiel 6:3) Jehova kwuru banyere ndị bi na Juda, sị: “Ọdachi ga-adakwasị gị.”—Ezikiel 7:7 (NW).

Na 612 T.O.A., Ezikiel nọ n’ọhụụ gaa Jeruselem. Ọ hụrụ ihe ndị na-asọ nnọọ oyi a na-eme n’ụlọ nsọ Chineke. Mgbe Jehova ga-ezipụ ndị agha eluigwe ya na-eme ihe o kpere n’ikpe (bụ́ ndị “ndị ikom isii” na-anọchi anya ha) ịga gosi iwe ya n’ahụ́ ndị si n’ezi ofufe dapụ, ọ bụ nanị ndị ‘a kara akara n’ihu ha’ ka a na-agaghị egbu. (Ezikiel 9:2-6) Ma ihe mbụ a na-aghaghị ime bụ ‘ifesa icheku ọkụ na-ere ere’ nke bụ́ okwu ikpe Chineke, n’obodo ahụ. (Ezikiel 10:2) Ọ bụ ezie na ‘Jehova ga-atụkwasị ụzọ nile nke ndị na-emebi iwu n’isi ha,’ o kwere nkwa ịchịkọtaghachi ndị Izrel a chụsara achụsa.—Ezikiel 11:17-21.

Mmụọ Chineke duuru Ezikiel bịaghachi Kaldia. E nwere ihe ngosi nke na-egosi otú Eze Zedekaịa na ndị Izrel ga-esi gbapụ na Jeruselem. A katọrọ ndị amụma ụgha. A jụrụ ndị na-ekpere arụsị. E jiri Juda tụnyere vaịn na-abaghị uru. Ilu banyere vaịn ugo ahụ na-egosi ihe ọjọọ na-aga ịdakwasị Jeruselem n’ihi ịgbakwuru Ijipt maka enyemaka. Ilu ahụ mechiri site n’ikwe nkwa na ‘Jehova ga-ewere ọnụ ọnụ osisi cedar wara ọhụrụ ma kụọ ya n’elu ugwu dị elu.’ (Ezikiel 17:22) Otú ọ dị, na Juda, agaghị enwe “mkpanaka eze ịchị achị.”—Ezikiel 19:14.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:4-28—Gịnị ka ụgbọ ịnyịnya eluigwe ahụ na-ese onyinyo ya? Ọ na-anọchite anya akụkụ nzukọ Jehova nke nọ n’eluigwe, bụ́ nke ndị mmụọ e kere eke na-ekwesị ntụkwasị obi mejupụtara. Ọ bụ mmụọ nsọ Jehova na-enye nzukọ a ike. Ebube nke onye na-agba ịnyịnya ahụ, bụ́ onye na-anọchite anya Jehova abụghị ihe e ji ọnụ akọ. E ji eke na egwurugwu mara nnọọ mma mee ihe atụ nke ịdị nwayọọ ya.

1:5-11—Olee ndị bụ ihe anọ ndị ahụ dị ndụ? N’ọhụụ nke abụọ Ezikiel hụrụ banyere ụgbọ ịnyịnya ahụ, o kwuru na ihe anọ ndị ahụ dị ndụ bụ ndị cherub. (Ezikiel 10:1-11; 11:22) Ma na nke ugbu a, o kwuru na ihu oké ehi ahụ bụ “ihu cherub ahụ.” (Ezikiel 10:14) Nke a dabara nnọọ adaba n’ihi na oké ehi bụ ihe na-anọchi anya ike na ume, ndị cherub bụkwa ndị mmụọ e kere eke dị ike.

2:6—Gịnị mere e ji kpọọ Ezikiel “nwa nke mmadụ” ugboro ugboro? Jehova kpọrọ Ezikiel nwa nke mmadụ iji chetara onye amụma ahụ na ọ bụ mmadụ, o si otú a na-emesikwu ike ọdịiche dị n’onye ozi bụ́ mmadụ na Chineke bụ́ Onye dunyere ya ozi ahụ. E jikwara otu okwu a kọwaa Jizọs Kraịst ihe dị ka ugboro iri asatọ n’Oziọma anọ ahụ. Nke a na-egosi na Ọkpara Chineke bịara site n’ịbụ onye a mụrụ n’ụwa dị ka mmadụ, ọ bụghị dị ka mmụọ yiiri ahụ́ mmadụ.

2:9–3:3—Gịnị mere akwụkwọ mpịakọta ahụ e dere abụ ákwá dị iche iche na ịsụ ude ji tọọ Ezikiel ụtọ n’ọnụ? Ihe mere akwụkwọ mpịakọta ahụ ji tọọ Ezikiel ụtọ bụ n’ihi otú o si were ozi e dunyere ya. Obi dị ya ụtọ ijere Jehova ozi dị ka onye amụma.

4:1-17—Ezikiel ò mere n’ezie ihe ngosi ahụ kọwara ihe na-aga ịdakwasị Jeruselem? Arịrịọ ahụ Ezikiel rịọrọ ka a gbanweere ya ihe e ji esi nri na otú Jehova si mee ihe ọ rịọrọ ya na-egosi n’ezie na onye amụma ahụ mere ihe ngosi ahụ. Idina n’akụkụ aka ekpe bụ maka narị afọ atọ na iri afọ itoolu nke mmehie alaeze ebo iri—malite mgbe ọ ghọrọ mba na 997 T.O.A. ruo mgbe e bibiri Jeruselem na 607 T.O.A. Idina n’akụkụ aka nri bụ maka iri afọ anọ Juda nọworo na-emehie, malite mgbe a họpụtara Jeremaịa dị ka onye amụma na 647 T.O.A. ruo na 607 T.O.A. Na narị ụbọchị anọ na iri atọ ahụ nile, nanị ihe e nyere Ezikiel bụ obere nri na mmiri, bụ́ nke na-egosi na a ga-enwe ụnwụ nri mgbe a ga-anọchibido Jeruselem n’agha.

5:1-3—Gịnị dị ịrịba ama banyere otú Ezikiel si were ntụtụ isi ole na ole site ná ndị nke ahụ ọ ga-efesara ifufe ma kee ha n’ọnụ ọnụ ala nke uwe mwụda ya? Nke a bụ iji gosi na ka afọ iri asaa ahụ Jeruselem ga-atọgbọrọ n’efu gasịrị, ihe fọdụrụnụ ga-alọghachi Juda ma maliteghachi ife Jehova ofufe.—Ezikiel 11:17-20.

17:1-24—Olee ndị bụ ugo ukwu abụọ ahụ, olee otú e si kụbipụ ọnụ alaka nile wara ọhụrụ nke osisi cedar, onyekwa bụ ‘alaka ahụ dị nro’ nke Jehova kụgharịrị n’ebe ọzọ? Ugo abụọ ahụ na-anọchi anya ndị ọchịchị Babilọn na ndị ọchịchị Ijipt. Ugo nke mbụ ahụ fegara n’ọnụ ọnụ cedar ahụ, ya bụ, n’ọchịchị nke ndị eze si n’eriri Devid. Ugo a kụbipụrụ ọnụ ọnụ alaka nile wara ọhụrụ site n’iji Zedekaịa dochie Eze Juda bụ́ Jehoiakin. N’agbanyeghị na Zedekaịa ṅụrụ iyi na ya ga-edo onwe ya n’okpuru, ọ chọwara enyemaka ugo nke ọzọ, bụ́ onye na-achị ndị Ijipt, ma nke ahụ azọpụtalighị ya. A ga-akpụrụ ya gaa Babilọn, ya anọrọ n’ebe ahụ nwụọ. Jehova kụbipụkwara “alaka ahụ dị nro,” nke bụ́ Eze Mezaịa ahụ. A kụgharịrị ya “n’elu ugwu dị elu nke a tụliri elu,” n’elu Ugwu Zaịọn nke eluigwe, bụ́ ebe ọ ga-aghọ “osisi cedar magburu onwe ya,” bụ́ nke ga-ewetara ụwa ngọzi ndị magburu onwe ha.—Mkpughe 14:1.

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

2:6-8; 3:8, 9, 18-21. Anyị ekwesịghị ikwe ka ndị na-emebi iwu menye anyị ụjọ ma ọ bụ mee ka anyị kwụsị ịkpọsa ozi Chineke, bụ́ nke gụnyere ịdọ ha aka ná ntị. Mgbe anyị zutere ndị na-enweghị mmasị n’ozi anyị, ma ọ bụkwanụ ndị mmegide, anyị kwesịrị isi ike dị ka diamọnd. Ma, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ịbụ ndị obi tara mmiri ma ọ bụ ndị na-adịghị echebara ndị ọzọ echiche. Jizọs nwere ọmịiko n’ahụ́ ndị o kwusaara ozi ọma, ọmịiko kwesịkwara ịkpali anyị ikwusara ndị ọzọ ozi ọma.—Matiu 9:36.

3:15. Mgbe a gwachara Ezikiel ihe ọ ga-eme, ọ gara biri na Tel-abib, ma nọrọ n’ihe ‘iju anya ruo ụbọchị asaa,’ na-atụgharị uche n’ozi a ọ na-aga ịkpọsa. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iwepụta oge iji na-amụchi ihe anya ma na-atụgharị uche n’ihe anyị na-amụ iji ghọta eziokwu Bible ndị pụrụ isi ike nghọta?

4:1–5:4. Ezikiel jiri obi umeala na obi ike mee ihe ngosi nke ihe ndị o buru n’amụma na-aga ime n’ọdịnihu. Anyị kwesịkwara iji obi umeala na obi ike na-arụ ọrụ ọ bụla Chineke nyere anyị.

7:4, 9; 8:18; 9:5, 10. Anyị ekwesịghị imetere ndị Chineke mara ikpe ebere.

7:19. Mgbe Jehova ga-ekpe usoro ihe dị ugbu a ikpe, ego agaghị aba uru ọ bụla.

8:5-18. Mmadụ isi n’ezi ofufe pụọ na-emebi mmekọrịta onye ahụ na Chineke. “Onye si n’ezi ofufe dapụ na-eji ọnụ ya ala mmadụ ibe ya n’iyi.” (Ilu 11:9, NW) Ọ bụ nnọọ ihe amamihe dị na ya anyị ịghara ichetụdị n’echiche ige ndị si n’ezi ofufe dapụ ntị.

9:3-6. Inweta akara ahụ—bụ́ nke na-egosi na anyị bụ ndị ohu Chineke raara onwe anyị nye ya e mekwara baptizim nakwa na anyị na-akpa àgwà dị ka Ndị Kraịst—dị nnọọ mkpa iji gafere “oké mkpagbu” ahụ. (Matiu 24:21) Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị nwoke ahụ ji mpi ink odeakwụkwọ ahụ na-anọchite anya ha, na-ebute ụzọ n’ọrụ ịka akara ahụ, ya bụ, ọrụ ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ na nke ime ndị ọzọ ka bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka akara ahụ dịgide n’ihu anyị, anyị aghaghị iji ịnụ ọkụ n’obi na-enyere ha aka n’ọrụ a.

12:26-28. A gwara Ezikiel ka ọ gwa ọbụna ndị na-akwa ozi ya emo, sị: “Ọ dịghị okwu ọ bụla n’okwu [Jehova] nile a ga-emekwa ka ọ dị anya ọzọ.” Anyị ga-emerịrị ihe ọ bụla anyị nwere ike ime iji nyere ndị ọzọ aka ịtụkwasị Jehova obi tupu ya ebibie usoro ihe dị ugbu a.

14:12-23. Ọ bụ anyị ka ọ dị n’aka ime ihe a ga-eji zọpụta anyị. Ọ dịghị onye ga-arụtara anyị ihe a ga-eji azọpụta anyị.—Ndị Rom 14:12.

18:1-29. Anyị ga-eji isi anyị buru ihe ndị si n’ihe anyị metere pụta.

“MKPÙ IHU, MKPÙ IHU, MKPÙ IHU KA M GA-EKPU YA”

(Ezikiel 20:1–24:27)

Na 611 T.O.A., nke bụ́ afọ nke asaa ụmụ Izrel nọrọla ná mba ọzọ, ndị okenye Izrel bịakwutere Ezikiel ‘iji jụọ Jehova ase.’ Ezikiel kọọrọ ha otú ụmụ Izrel si na-enupụrụ Chineke isi kemgbe, gwakwa ha na ‘Jehova ga-amịpụta mma agha ya’ gbuo ha. (Ezikiel 20:1; 21:3) Jehova gwara onyeisi Izrel bụ́ Zedekaịa, sị: “Wezuga akwa nkuku isi ahụ, bupụ okpu eze ahụ: nke a agaghị abụkwa ihe ọ bụ: mee ihe nke dị ala ka ọ dị elu, mekwaa ihe nke dị elu ka ọ dị ala. Mkpù ihu, mkpù ihu, mkpù ihu ka M ga-ekpu ya: nke a kwa, ọ gaghị adị ruo mgbe ọ ga-abịa, bụ́ onye o ruru aka [Jizọs Kraịst]; M ga-ewerekwa ya nye ya.”—Ezikiel 21:26, 27.

A mara Jeruselem ikpe. A gbara mmehie Ohola (Izrel) na nke Oholiba (Juda) n’anwụ. E bula ụzọ nyefee Ohola “n’aka ndị na-ahụ ya n’anya, n’aka ụmụ Asiria.” (Ezikiel 23:9) Oge eruwekwala mgbe a ga-eme ka Oholiba tọgbọrọ n’efu. Na 609 T.O.A., nnọchibido ahụ ga-ewe ọnwa iri na asatọ a ga-anọchibido Jeruselem malitere. Mgbe obodo ahụ ga-emecha daa, ndị Juu ahụ agaghị enwekwa ọnụ ha ga-eji ruo uju. Ezikiel agaghị agwa ndị Juu ahụ nọ na Babilọn ihe Chineke kwuru ruokwa mgbe “onye gbapụrụ agbapụ” ga-ewetara ya ozi na e bibiela Jeruselem.—Ezikiel 24:26, 27.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

21:3—Gịnị bụ “mma agha” ahụ Jehova mịpụtara n’ọbọ ya? Nebukadneza bụ́ Eze Babilọn na ndị agha ya bụ “mma agha” ahụ Jehova ji kpee Jeruselem na Juda ikpe. Ọ pụkwara ịbụ na akụkụ nzukọ Chineke nke nọ n’eluigwe, bụ́ nke ndị mmụọ e kere eke dị ike mejupụtara, sokwa ya.

24:6-14—Gịnị ka nchara ite ahụ tara na-anọchi anya ya? A kọwara Jeruselem bụ́ nke a nọchibidoro n’agha dị ka nnukwu ite. Nchara ite ahụ tara na-anọchite anya àgwà ọjọọ ndị a na-akpa na Jeruselem, ndị gụnyere adịghị ọcha, omume rụrụ arụ, na mwụfu ọbara. Omume ọjọọ a na-eme na ya rụrụ nnọọ arụ nke na ọbụna isikwasị ite ahụ mgbe ihe na-adịghị n’ime ya n’elu icheku ọkụ na-ere ere iji mee ka ọ dị ezigbo ọkụ, emelighị ka nchara ya pụọ.

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

20:1, 49. Otú ndị okenye Izrel si meghachi omume na-egosi na ha na-enyo ihe Ezikiel kwuru enyo. Ya adịtụkwala mgbe anyị ga-enyo okwu ikpe Chineke enyo.

21:18-22. Ọ bụ ezie na Nebukadneza gara jụọ ndị mmụọ ọjọọ ase, ma ọ bụ Jehova mere ka e jiri onye ọchịchị ahụ na-ekpere arụsị bibie Jeruselem. Nke a na-egosi na ọbụna ndị mmụọ ọjọọ enweghị ike igbochi ndị Jehova ji na-emezu ikpe ya ịrụzu ọrụ o dunyere ha.

22:6-16. Jehova kpọrọ nkwutọ, omume rụrụ arụ, iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, na ịnara aka azụ asị. Anyị kwesịrị ịkwụsi ike ná mkpebi anyị mere na anyị agaghị etinye aka n’àgwà ọjọọ ndị a.

23:5-49. Iso obodo ọzọ na-emekọrịta ihe mere ka Izrel na Juda mụta ife chi ụgha nke ndị obodo ahụ ha na ha na-emekọrịta ihe. Ka anyị zere iso ụwa na-akpachi anya, n’ihi na nke a pụrụ imebi okwukwe anyị.—Jems 4:4.

Ozi Dị Ndụ Ma Na-akpa Ike

Anyị mụtara nnọọ ihe ndị magburu onwe ha n’isi iri abụọ na anọ ndị mbụ nke akwụkwọ Bible bụ́ Ezikiel. Ụkpụrụ ndị dị na ya na-egosi ihe na-eme ka mmadụ ghara inweta ihu ọma Chineke, ụzọ anyị pụrụ isi nweta ebere ya, nakwa ihe mere anyị kwesịrị iji na-adọ ndị na-emebi iwu aka ná ntị. Amụma ahụ e buru banyere mbibi Jeruselem kọwara nnọọ Jehova nke ọma dị ka Chineke onye ‘na-eme ka ndị ya nụrụ ihe tupu ha epuo.’—Aịsaịa 42:9.

Amụma ndị dị ka ndị a e dekọrọ n’Ezikiel 17:22-24 na 21:26, 27 na-ekwu banyere otú e si guzobe Alaeze Mezaịa ahụ n’eluigwe. N’oge na-adịghị anya, ọchịchị ahụ ga-eme ka uche Chineke mee n’ụwa. (Matiu 6:9, 10) Anyị pụrụ iji okwukwe siri ike na-atụ anya ngọzi ndị Alaeze ahụ ga-eweta, ma kwenyesie ike na Chineke ga-emezu ha. N’ezie, “Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.”—Ndị Hibru 4:12.

[Foto dị na peeji nke 12]

Gịnị ka ụgbọ ịnyịnya eluigwe ahụ na-anọchi anya ya?

[Foto dị na peeji nke 14]

Ikerechi òkè anya n’ọrụ nkwusa na-enyere anyị aka ịnọgide na-enwe “akara” ahụ n’ihu anyị