Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Nọgide Jiri Ezi Ihe Na-emeri Ihe Ọjọọ”

“Nọgide Jiri Ezi Ihe Na-emeri Ihe Ọjọọ”

“Nọgide Jiri Ezi Ihe Na-emeri Ihe Ọjọọ”

“Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị, kama nọgide jiri ezi ihe na-emeri ihe ọjọọ.”—NDỊ ROM 12:21.

1. N’ihi gịnị ka obi ga-eji sie anyị ike na anyị pụrụ imeri ihe ọjọọ?

Ò KWERE omume ịkwụrụ chịm mgbe ndị mmadụ ji obi ịta mmiri na-emegide ezi ofufe? Ọ̀ kwere omume imeri ikike ndị na-agbalị ịdọghachi anyị azụ n’ime ụwa a nke na-adịghị asọpụrụ Chineke? Azịza nke ajụjụ abụọ ahụ bụ ee! Gịnị mere anyị ji sị ee? Ọ bụ n’ihi ihe Pọl onyeozi kwuru n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst bi na Rom. O dere, sị: “Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị, kama nọgide jiri ezi ihe na-emeri ihe ọjọọ.” (Ndị Rom 12:21) Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi ma kpebisie ike na anyị agaghị ekwe ka ụwa merie anyị, ihe ọjọọ ya agaghị emeri anyị. Ọzọkwa, okwu ahụ bụ́ “nọgide . . . na-emeri ihe ọjọọ” na-egosi na anyị nwere ike imeri ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-agba mgba megide ya. Ọ bụ nanị ndị kwụsịrị ịnọ ná nche ma kwụsị ịlụso ụwa ọjọọ a na Setan bụ́ Ekwensu, bụ́ onye ọjọọ na-achị ya ọgụ, ka a ga-emeri.—1 Jọn 5:19.

2. Gịnị mere anyị ga-eji tụlee ihe ụfọdụ mere ná ndụ Nehemaịa?

2 Ihe dị ka narị afọ ise tupu oge Pọl biri ndụ n’ụwa, otu ohu Chineke bi na Jeruselem gosiri na ihe ahụ Pọl kwuru banyere ịgba mgba megide ihe ọjọọ bụ eziokwu. Ọ bụghị nanị na nwoke ahụ na-atụ egwu Chineke bụ́ Nehemaịa guzogidere mmegide nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, kamakwa o ji ezi ihe merie ihe ọjọọ. Olee ụdị ihe ịma aka ndị bịaara ya? Gịnịkwa nyeere ya aka imeri ha? Olee otú anyị pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya ya? Iji zaa ajụjụ ndị a, ka anyị tụlee ihe ụfọdụ mere ná ndụ Nehemaịa. *

3. Olee ụdị ebe Nehemaịa bi, oleekwa nnukwu ọrụ ọ rụrụ?

3 Nehemaịa jere ozi n’obí Eze Ataksaksis nke Peshia. Ọ bụ eziokwu na Nehemaịa bi n’etiti ndị na-ekweghị ekwe, ọ dịghị mgbe o kwere “yie usoro ihe” nke oge ya. (Ndị Rom 12:2) Mgbe e nwere mkpa na Juda, ọ hapụrụ obí eze ebe o nwere ntụsara ahụ́, mee njem tara akpụ gaa Jeruselem ma nara nnukwu ọrụ nke ịrụgharị mgbidi obodo ahụ. (Ndị Rom 12:1) N’agbanyeghị na ọ bụ ya bụ gọvanọ obodo Jeruselem, Nehemaịa sooro ndị Izrel ibe ya rụọ ọrụ kwa ụbọchị “site na chi ọbụbọ ruo mgbe kpakpando pụtara.” N’ihi nke a, ha rụchara ọrụ ahụ nanị n’ime ọnwa abụọ! (Nehemaịa 4:21; 6:15) Nke ahụ bụ ihe dị nnọọ ịtụnanya, n’ihi na n’oge ọrụ a na-aga n’ihu, ndị mmegide si ụzọ dị iche iche nwaa ịkụda ndị Izrel aka n’ọrụ ha. Olee ndị bụ ndị ahụ megidere Nehemaịa, gịnịkwa bụ ebumnobi ha?

4. Gịnị bụ ebumnobi ndị iro Nehemaịa?

4 Ndị bu mmegide ahụ n’isi bụ Sanbalat, Tobaịa, na Geshem, bụ́ ụmụ nwoke a ma ama bi nso obodo Juda. Ebe ọ bụ na ha bụ ndị iro nke ndị Chineke, ‘ọ dị ha njọ nke ukwuu na Nehemaịa bịara ịchọrọ ụmụ Izrel ọdịmma.’ (Nehemaịa 2:10, 19) Ndị iro Nehemaịa fooro ntutu taa na ha ga-akwụsịrịrị ọrụ ihe owuwu ahụ Nehemaịa na-ewu, ọbụna ha kpawara nkata ọjọọ iji kwụsị ọrụ ahụ. Nehemaịa ọ̀ ‘ga-ekwe ka ihe ọjọọ merie ya’?

“Iwe Ya Dị Ọkụ, E Wee Kpasuo Ya Iwe”

5, 6. (a) Gịnị ka ndị iro Nehemaịa mere mgbe ha hụrụ na a rụwala mgbidi ahụ? (b) Gịnị mere Nehemaịa ekweghị ka ụjọ jide ya n’ihi ndị mmegide ahụ?

5 Nehemaịa ji obi ike gbaa ndị ya ume, sị: “Bịanụ ka anyị wuo mgbidi Jeruselem.” Ha zara ya, sị: “Ka anyị bilie rụọ mgbidi.” Nehemaịa kwuru, sị: “Ha wee mee ka aka ha dị ike ime ezi ihe a,” ma ndị mmegide wee “chịa anyị ọchị, leda anyị anya, sị, Gịnị bụ ihe a nke unu onwe unu na-eme? Ọ̀ bụ eze ka unu na-enupụ isi megide?” Nehemaịa ekweghị ka mkparị ha na ebubo ụgha ha menye ya ụjọ. Ọ gwara ndị ahụ na-emegide ya, sị: “Chineke nke eluigwe, Ya onwe ya ga-eme ka ihe gaara anyị nke ọma; anyị onwe anyị, bụ́ ndị ohu Ya, ga-ebilikwa rụọ mgbidi.” (Nehemaịa 2:17-20) Nehemaịa kpebiri ịnọgide ‘na-eme ezi ihe ahụ.’

6 Otu n’ime ndị mmegide ahụ, bụ́ Sanbalat, ‘wee wee iwe dị ọkụ, e wee kpasuo ya iwe,’ ya amalitezie ịkparị ndị ahụ na-arụ ọrụ karịa ka ọ na-emebu. Ọ bịara jiri ha na-eme akaje, na-asị: “Gịnị ka ndị Juu ndị a na-ata ahụ́ na-eme? Hà ga-esi n’ọbọ ájá mee ka nkume dị adị ọzọ?” Tobaịa sokwa naachị ha ọchị, sị: “Ọ bụrụ na nkịta ọhịa arịgoo n’elu ya, ọ ga-etipukwa mgbidi nkume ha.” (Nehemaịa 4:1-3) Gịnị ka Nehemaịa mere?

7. Olee ihe ndị Nehemaịa mere mgbe ndị mmegide na-ekwugide ha?

7 Nehemaịa gbachiri ha nnọọ nkịtị. O rubere isi n’iwu Chineke, ọ gbalịghịkwa imegwara ihe ha na-eme ya. (Levitikọs 19:18) Kama nke ahụ, ọ hapụụrụ Jehova okwu ahụ ma kpee ekpere, sị: “Nụrụ, Chineke anyị; n’ihi na anyị bụ ndị e ledaworo anya: Gị mekwaa ka ịta ụta ha laghachi n’isi ha.” (Nehemaịa 4:4) Nehemaịa tụkwasịrị obi n’okwu na-emesi obi ike Jehova kwuru, sị: “Mụ nwe ọbọ na nkwụghachi.” (Deuterọnọmi 32:35) Nehemaịa na ndị ya “wee rụọ mgbidi ahụ.” Ha ekweghị ka ihe ọ bụla dọpụ uche ha n’ọrụ ha na-arụ. N’eziokwu, ha ‘rụkọtara mgbidi nile ruo nkera ịdị elu ya: n’ihi na ndị Juu nwere obi ịrụ ọrụ.’ (Nehemaịa 4:6) Ndị iro nke ezi ofufe akwụsịlighị ọrụ ahụ! Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Nehemaịa?

8. (a) Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Nehemaịa mgbe ndị mmegide boro anyị ebubo ụgha? (b) Kọọ otu ahụmahụ i nwere n’onwe gị ma ọ bụ nke ị nụtụrụla banyere amamihe dị ná mmadụ ịghara imegwara ihe e mere ya.

8 Taa, ndị mmegide nwere ike ịkparị anyị ma ọ bụ bo anyị ebubo n’ụlọ akwụkwọ, n’ebe anyị na-arụ ọrụ, ma ọ bụkwanụ n’ime ezinụlọ anyị. Ọtụtụ mgbe, ụzọ kasị mma isi merie ebubo ụgha ndị ahụ bụ itinye ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru n’ọrụ, bụ́ nke na-asị: ‘E nwere mgbe ịgba nkịtị.’ (Ekliziastis 3:1, 7) N’ihi ya, dị ka Nehemaịa, anyị na-ezere iji okwu ọjọọ azaghachi ndị na-emegide anyị. (Ndị Rom 12:17) Anyị na-ekpegara Chineke ekpere, na-atụkwasị obi n’onye ahụ kwere anyị nkwa, sị: “M ga-akwụghachi.” (Ndị Rom 12:19; 1 Pita 2:19, 20) N’ụzọ dị otú ahụ, anyị adịghị ekwe ka ndị na-emegide anyị dọpụ uche anyị n’ọrụ Chineke nyere anyị ịrụ taa, nke bụ́ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke na inyere ndị mmadụ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Mgbe ọ bụla anyị gara kwusaa ozi ọma ma jụ ịkwụsị ọrụ nkwusa anyị mgbe a na-emegide anyị, anyị na-egosipụta na anyị kpebisiri ike ime ihe dị mma dị ka Nehemaịa.

‘Anyị Ga-egbu Ha’

9. Olee ụdị mmegide ndị iro Nehemaịa palitere, oleekwa ihe Nehemaịa mere?

9 Mgbe ndị na-emegide ezi ofufe n’oge Nehemaịa nụrụ na a “na-arụzu mgbidi Jeruselem nile,” ha buliri mma agha ha “ibuso Jeruselem agha.” Ndị Juu ahụ chere na olileanya adịkwaghị. Ndị iro ha gụnyere ndị Sameria nọ n’ebe ugwu, ndị Amọn nọ n’ebe ọwụwa anyanwụ, ndị Arab nọ n’ebe ndịda, na ndị Ashdọd nọ n’ebe ọdịda anyanwụ. Ndị iro gbara Jeruselem gburugburu; o yiri ka ndị ahụ na-ewu mgbidi ahụ hà tọrọ atọ! Gịnị ka ha ga-eme? Nehemaịa kwuru, sị: “Anyị wee kpeere Chineke anyị.” Ndị iro ahụ yiri ha egwu site n’ikwu, sị: ‘Anyị ga-egbu ha, ma mee ka ije ozi ha kwụsị.’ Ihe Nehemaịa meziri bụ ịgwa ndị ọrụ ahụ ka ha jiri “mma agha ha, na ube ha na ụta ha” chebe obodo ahụ. N’ezie, elewe ya anya otú mmadụ nkịtị si ele ihe anya, ndị Juu ahụ ọnụ ọgụgụ ha dị nta agaghị achịta ájá ma ha na ndị iro ha a lụwa ọgụ, ma Nehemaịa gbara ha ume, sị: “Unu atụla egwu . . . Chetanụ Onyenwe anyị, nke dị ukwuu dịkwa egwu.”—Nehemaịa 4:7-9, 11, 13, 14.

10. (a) Gịnị mere ndị iro Nehemaịa ji kwụsị mmegide ha ná mberede? (b) Oleekwa ihe ndị ọzọ Nehemaịa mere?

10 Egwu dagharịrị ná mberede. Ndị iro ahụ kwụsịrị imegide ndị Juu. N’ihi gịnị? Nehemaịa kwuru, sị: “Chineke mebikwara ndụmọdụ ha dụrịtara onwe ha.” Ma Nehemaịa maara na ndị iro ha ka nwere ike ịbịa ọzọ. N’ihi ya, o ji amamihe gbanwee otú ndị ọrụ ahụ si arụ ọrụ ha. Malite mgbe ahụ gaa n’ihu, “nwoke ọ bụla na-ewere otu aka ya rụọ ọrụ n’ije ozi ahụ, ma otu aka ya na-eji ihe agha ya.” Nehemaịa kenyekwara otu nwoke ọrụ ‘ịfụ opi ike’ iji gwa ndị ọrụ ahụ mgbe ndị iro bịawara. Nke ka nke bụ na Nehemaịa mere ka obi sie ndị ya ike site n’ịgwa ha, sị: “Chineke anyị ga-eburu anyị agha.” (Nehemaịa 4:15-20) Ebe ọ bụ na a gbaala ndị ọrụ ahụ ume ma kwadebe ha maka agha, ha nọgidere n’ọrụ ha. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ a?

11. Gịnị na-enyere ezi Ndị Kraịst nọ ná mba ebe a machibidoro ọrụ ikwusa ozi ọma iwu aka idi ihe ọjọọ a na-eme ha, oleekwa otú ha si eji ezi ihe emeri ihe ọjọọ?

11 Mgbe ụfọdụ, a na-emegide ezi Ndị Kraịst n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. N’ezie, ná mba ụfọdụ, ndị na-emegide ezi ofufe na-eji obi ịta mmiri na-emegide ndị ohu Chineke. Ọ bụrụ na elewe ya anya otú mmadụ si ele ihe anya, ọ ga-eyi ka ọ dịghịzi olileanya dịịrị ụmụnna anyị ndị nọ ná mba ndị ahụ. Ka o sina dị, obi siri Ndịàmà nọ ná mba ndị ahụ ike na ‘Chineke ga-eburu ha agha.’ N’eziokwu, ndị a kpagburu n’ihi okwukwe ha achọpụtala ugboro ugboro na Jehova na-aza ekpere ha ma ‘na-emebi ndụmọdụ’ nke ndị iro ha. Ọbụnadị ná mba ebe a machibidoro ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ iwu, Ndị Kraịst na-achọtakwa ụzọ isi nọgide na-ekwusa ozi ọma. Dị nnọọ ka ndị ahụ na-ewu mgbidi Jeruselem si gbanwegharịa ụzọ ha si rụọ ọrụ, otú ahụkwa ka Ndịàmà Jehova taa si eji amamihe agbanwe ụzọ ha si eje ozi ọma mgbe a machibidoro ọrụ ha iwu. Ha adịghị eji ngwa agha nkịtị alụso ndị iro ha agha. (2 Ndị Kọrint 10:4) Ọbụnadị iyi ha egwu na a ga-ata ha ahụhụ adịghị eme ka ha kwụsị ọrụ nkwusa ha. (1 Pita 4:16) Kama nke ahụ, ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị a nwere obi ike ‘na-anọgide na-eji ezi ihe na-emeri ihe ọjọọ.’

“Bịa, Ka Anyị Zukọta n’Otu”

12, 13. (a) Olee nkata aghụghọ ọzọ ndị iro Nehemaịa kpara? (b) Gịnị mere Nehemaịa ji jụ ịga zute ndị ahụ na-emegide ya?

12 Mgbe ndị iro Nehemaịa hụrụ na mgba ha na-agba enweghị isi, ha chọpụtara ụzọ aghụghọ ọzọ ha ga-esi megide ndị Juu. N’eziokwu, ọ dị ụzọ ihe atọ ha gbalịrị ime. Gịnị ka ha bụ?

13 Nke mbụ, ndị iro ahụ gbalịrị ịghọgbu Nehemaịa. Ha sịrị ya: “Bịa, ka anyị zukọta n’otu n’obodo nta n’ime ndagwurugwu nke Ono.” Ono dị n’agbata Jeruselem na Sameria. Ihe ndị iro ahụ chọrọ bụ ka Nehemaịa bịa zute ha n’agbata obodo ha na obodo nke ya ka ha nọrọ ebe ahụ dozie esemokwu ha. Nehemaịa nwere ike ichewe, sị: ‘Aro a ha tụrụ amaka. Ọ ka mma ịkparịta nsogbu dịịrị anyị karịa ịlụ agha.’ Ma Nehemaịa jụrụ ịga. O kwuru ihe mere o ji jụ, sị: “Ndị ahụ na-eche echiche imejọ m emejọ.” Ọ chọpụtara aghụghọ ha, o kweghịkwa ka ha ghọgbuo ya. Ugboro anọ ka ọ gwara ndị iro ya, sị: “Apụghịkwa m ịrịda: n’ihi gịnị ka ozi a ga-akwụsị, mgbe m na-ahapụ ya, wee rịdakwuru unu?” Mgbalị nile ndị iro ahụ mere ka Nehemaịa hapụ ọrụ ya kụrụ afọ n’ala. O kweghị ka ihe ọ bụla dọpụ uche ya n’ọrụ ọ na-arụ.—Nehemaịa 6:1-4.

14. Gịnị ka Nehemaịa gwara ndị na-ebo ya ebubo ụgha?

14 Nke abụọ, ndị iro Nehemaịa malitere ịgbasa asịrị ụgha, na-ekwu na Nehemaịa “na-eche echiche inupụ isi” megide Eze Ataksaksis. Ha gwakwara Nehemaịa, sị: “Ka anyị dụrịta onwe anyị ọdụ.” Nehemaịa jụkwara na ya agaghị aga, n’ihi na ọ chọpụtara ihe ndị iro ya bu n’obi ime. Nehemaịa kwuru, sị: “Ha nile na-eme ka anyị tụọ egwu, sị, Aka ha ga-akụdapụ n’ije ozi a, agaghị ejekwa ya.” Ma banyere ebubo ahụ e boro ya, Nehemaịa mere ka ndị ahụ boro ya ebubo mara na ihe ahụ ha kwuru bụ ụgha, site n’ịgwa ha, sị: “Ọ dịghị ka okwu ndị a si dị nke gị onwe na-ekwu, kama gị onwe gị na-echepụta ha n’obi gị.” Nehemaịa kpegakwaara Jehova ekpere maka enyemaka, sị: “Gị mee ka aka m abụọ dị ike.” Obi siri ya ike na ọ bụrụ na Jehova enyere ya aka, na ya ga-enwe ike imebi nkata aghụghọ nile ndị iro ya na-akpa ma nọgide n’ọrụ ọ na-arụ.—Nehemaịa 6:5-9.

15. Olee ihe otu onye amụma ụgha gwara Nehemaịa mee, gịnịkwa mere Nehemaịa ekwetaghị ime ihe o kwuru?

15 Nke atọ, ndị iro Nehemaịa bịara jiri onye Izrel bụ́ onye sabo nke aha ya bụ Shemaịa nwaa ime ka Nehemaịa daa iwu Chineke. Shemaịa gwara Nehemaịa, sị: “Ka anyị zukọta n’ụlọ Chineke, n’etiti ụlọ ukwuu Chineke, ka anyị mechikwaa ụzọ nile nke ụlọ ukwuu Chineke: n’ihi na ha na-abịa igbu gị.” Shemaịa kwuru na a na-achọ igbu Nehemaịa ma na ọ bụrụ na Nehemaịa ezoo n’ụlọ nsọ, na ọ dịghị ihe ga-eme ya. Ma Nehemaịa abụghị onye nchụàjà. Izo n’ime ụlọ nsọ ga-abụrụ ya mmehie. Ọ̀ ga-ada iwu Chineke iji zọta ndụ ya? Nehemaịa gwara ya, sị: “Ònye dịkwa, nke dị ka mụ onwe m, nke ga-aba n’ụlọ ukwuu Chineke, wee dị ndụ? M gaghị aba n’ime.” Gịnị mere Nehemaịa amaghị n’ọnyà ahụ e siiri ya? Ọ bụ n’ihi na ọ maara na “ọ bụghị Chineke zitere” Shemaịa n’agbanyeghị na ọ bụ onye Izrel ibe ya. E kwuwerị, onye bụ ezigbo onye amụma Chineke agaghị anwa anwa gwa ya ka ọ daa Iwu Chineke. Nehemaịa ekwekwaghị ka ndị iro ya merie ya na nke a. Obere oge ka e mesịrị, o kwuru, sị: “E wee rụzuo mgbidi ahụ n’ụbọchị nke [iri abụọ na ise] nke ọnwa Elul, [n’ụbọchị iri ise na abụọ].”—Nehemaịa 6:10-15; Ọnụ Ọgụgụ 1:51; 18:7.

16. (a) Olee otú anyị kwesịrị isi mesoo ndị enyi ụgha, ndị ebubo ụgha, na ndị ụmụnna ụgha? (b) Olee otú i si egosi na ị naghị ada iwu Chineke n’ezinụlọ gị, n’ụlọ akwụkwọ gị na n’ebe ị na-arụ ọrụ?

16 Dị ka Nehemaịa, ndị enyi ụgha, ndị na-ebo anyị ebubo ụgha na ụmụnna ụgha nwekwara ike imegide anyị. Ụfọdụ ndị nwere ike ịgwa anyị ka anyị mee ihe megidere okwukwe anyị. Ha nwere ike ịgwa anyị na ọ bụrụ na anyị ewetulata aka n’ozi Jehova, na anyị ga-enwe ohere ịchụso ihe nke ụwa ma ka na-ejekwara Jehova ozi. Ma n’ihi na anyị na-ebute Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ anyị, anyị agaghị ekwe ime ihe megidere okwukwe anyị. (Matiu 6:33; Luk 9:57-62) Ndị mmegide na-ebokwa anyị ebubo ụgha. Ná mba ụfọdụ, a na-ebo anyị ebubo na anyị na-agba ọchịchị mgba okpuru, dị nnọọ ka e boro Nehemaịa ebubo na ọ na-enupụrụ eze isi. Ụlọ ikpe dị iche iche ekpebiela na aka anyị dị ọcha n’ụfọdụ n’ime ebubo ndị a. Ma ihe ọ sọrọ ya bụrụ ihe e kpebiri n’ikpe ndị metụtara ụmụnna anyị n’otu n’otu, ekpere anyị bụ ka Jehova mee dị ka uche ya si dị n’okwu ndị a. (Ndị Filipaị 1:7) Mmegide nwekwara ike isi n’aka ndị na-eme ka hà na-ejere Jehova ozi. Dị nnọọ ka onye Juu ibe ya ahụ gbalịrị ime ka Nehemaịa daa Iwu Chineke iji chebe ndụ ya, otú ahụkwa ka ndị bụbu Ndịàmà Jehova nwere ike isi otu ụzọ ma ọ bụ ọzọ chọọ ime anyị ka anyị daa iwu Chineke. Ma, anyị na-ajụ ndị si n’ezi ofufe dapụ n’ihi na anyị maara na ihe ga-azọpụta anyị abụghị inupụ isi n’iwu Chineke, kama ọ bụ irube isi na ya! (1 Jọn 4:1) N’ezie, site n’enyemaka Jehova anyị ga-enwe ike imeri ụdị ihe ọjọọ ọ bụla.

Ịnọgide Na-ekwusa Ozi Ọma n’Agbanyeghị Mmegide

17, 18. (a) Gịnị ka Setan na ndị na-ejere ya ozi na-agbalị ime? (b) Gịnị ka i kpebisiri ike ime, n’ihi gịnịkwa ka i ji kpebie ime otú ahụ?

17 Okwu Chineke kwuru banyere ụmụnna Kraịst e tere mmanụ, sị: “Ha merikwara [Setan] n’ihi . . . okwu nke àmà ha na-agba.” (Mkpughe 12:11) Nke a na-egosi na e nwere ihe jikọrọ imeri Setan—onye ihe ọjọọ si n’aka—na ikwusa ozi Alaeze ahụ. Ka a sịkwa ihe mere Setan ji ewetara, ma ndị e tere mmanụ ma “oké ìgwè mmadụ” ahụ, mmegide n’esepụghị aka!—Mkpughe 7:9; 12:17.

18 Dị ka anyị hụrụ, mmegide nwere ike ịbịa n’ụdị mkparị, iyi egwu, ma ọ bụ n’ụzọ aghụghọ ndị ọzọ. Ụzọ ọ sọrọ ya ya si bịa, ihe Setan bu n’obi na-eweta nsogbu ndị a nile bụ otu—ịhụ na anyị kwụsịrị ọrụ nkwusa ahụ. Ma mgbalị ya nile ga-akụ nnọọ afọ n’ala n’ihi na ndị Chineke taa ekpebiela ‘ịnọgide jiri ezi ihe na-emeri ihe ọjọọ’ dị nnọọ ka Nehemaịa oge ochie mere. Ha ga-eme nke a site n’ịnọgide na-ekwusa ozi ọma ahụ ruo mgbe Jehova ga-asị ha kwụsị.—Mak 13:10; Ndị Rom 8:31; Ndị Filipaị 1:27, 28.

[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 2 Iji ghọtakwuo ihe ndị ahụ merenụ, gụọ Nehemaịa 1:1-4; 2:1-6, 9-20; 4:1-23; 6:1-15.

Ì Chetara?

• Olee ụdị mmegide ndị ohu Chineke oge ochie nwetara bụ́kwa nke Ndị Kraịst taa na-enweta?

• Gịnị bụ ebumnobi bụ́ isi nke ndị iro Nehemaịa, oleekwa ihe bụ́ ebumnobi ndị iro Chineke taa?

• Olee otú Ndị Kraịst taa si nọgide jiri ezi ihe na-emeri ihe ọjọọ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe/Foto dị na peeji nke 29]

Ihe Mmụta Ndị Dị n’Akwụkwọ Nehemaịa

A na-agwa ndị ohu Chineke

• okwu mkparị

• okwu iyi egwu

• okwu nduhie

Ndị na-achọ iduhie ndị ohu Jehova bụ

• ndị enyi ụgha

• ndị na-ebo ebubo ụgha

• ndị ụmụnna ụgha

Ndị ohu Chineke na-emeri ihe ọjọọ site

• n’ịnọgide na-arụ ọrụ Chineke nyere ha

[Foto dị na peeji nke 27]

Nehemaịa na ndị ọrụ ibe ya rụgharịrị mgbidi Jeruselem n’agbanyeghị mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ

[Foto dị na peeji nke 31]

Ezi Ndị Kraịst na-ekwusa ozi ọma ahụ n’atụghị egwu