Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Unu Ejila Ihe Ọjọọ Akwụghachi Onye Ọ Bụla n’Ọnọdụ Ihe Ọjọọ”

“Unu Ejila Ihe Ọjọọ Akwụghachi Onye Ọ Bụla n’Ọnọdụ Ihe Ọjọọ”

“Unu Ejila Ihe Ọjọọ Akwụghachi Onye Ọ Bụla n’Ọnọdụ Ihe Ọjọọ”

“Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi onye ọ bụla n’ọnọdụ ihe ọjọọ. Na-emenụ ndokwa maka ihe ndị dị mma n’anya mmadụ nile.”—NDỊ ROM 12:17.

1. Olee ụdị àgwà a na-ahụkarị taa?

ỌBỤRỤ na nwatakịrị akwaa nwanne ya aka, ihe mbụ nwanne ya ahụ na-emekarị bụ ịkwagwara ya. Ọ dị mwute ikwu na ọ bụghị nanị ụmụaka na-eme i mee m, m megwara. Ọtụtụ ndị toro eto na-emekwa otu a. Ọ bụrụ na mmadụ emejọọ ha, ha na-achọkarị ụzọ ha ga-esi megwara onye ahụ. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị toro eto adịghị akwagwara aka mgbe mmadụ kwara ha aka, ma ha na-esi ụzọ ọzọ akwagwara. Ha nwere ike ịmalite ịgbasa asịrị ọjọọ banyere onye ahụ ma ọ bụ chọọ ụzọ ndị ọzọ ha ga-esi gbochie onye ahụ inwe ọganihu n’ihe ọ na-eme. N’agbanyeghị ụzọ ha họọrọ isi mee ya, ihe bụ́ isiokwu bụ na ha chọrọ imegwara.

2. (a) Gịnị mere ezi Ndị Kraịst ji ezere ọchịchọ imegwara ihe e mere ha? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle, oleekwa isiakwụkwọ Bible anyị ga-atụle?

2 Ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ na-enwekarị nnọọ ọchịchọ imegwara ihe ọjọọ e mere ha, ezi Ndị Kraịst na-agbalị ịghara imegwara. Kama imegwara, ha na-agbalịsi ike ịgbaso ndụmọdụ ahụ Pọl onyeozi nyere, sị: “Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi onye ọ bụla n’ọnọdụ ihe ọjọọ.” (Ndị Rom 12:17) Gịnị ga-akpali anyị ịkpa àgwà ọma a? Ònye karịsịa ka anyị na-ekwesịghị iji ihe ọjọọ kwụghachi n’ọnọdụ ihe ọjọọ? Olee uru ndị anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị aghara imegwara ihe ọjọọ e mere anyị? Iji nweta azịza ha, ka anyị tụlee okwu ndị gbara okwu ahụ Pọl kwuru gburugburu ma hụ otú Ndị Rom isi 12 si gosi na izere imegwara ihe e mere anyị bụ ihe kwesịrị ekwesị ime, ihe na-egosi na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya, nakwa ihe na-egosi na anyị dị umeala n’obi. Anyị ga-atụle ụzọ ihe atọ a otu otu.

N’ihi Ya Ana M Arịọsi Unu Ike’

3, 4. (a) Malite ná Ndị Rom isi 12, gịnị ka Pọl tụlere, gịnịkwa ka ojiji o ji okwu ahụ bụ́ “n’ihi ya” malite okwu ya na-egosi? (b) Gịnị ka ọmịiko Chineke kwesịrị ime ka Ndị Kraịst nọ na Rom mee?

3 Malite n’isi nke iri na abụọ nke akwụkwọ Ndị Rom, Pọl kọwara ihe anọ yiri ibe ha bụ́ ndị na-emetụta ndụ Onye Kraịst. Ọ kọwara mmekọrịta dị n’etiti anyị na Jehova, nke dị n’etiti anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị, nke dị n’etiti anyị na ndị na-ekweghị ekwe, nakwa nke dị n’etiti anyị na ndị ọchịchị. Pọl gosiri na e nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji zere ime ihe ọjọọ, nke gụnyere ọchịchọ imegwara ihe e mere anyị, mgbe o kwuru, sị: “N’ihi ya, ụmụnna m, esitere m n’ọmịiko nke Chineke na-arịọsi unu ike.” (Ndị Rom 12:1) Rịba okwu ahụ bụ́ “n’ihi ya” ama, nke pụtara “n’ihi ihe a m kwuru.” Ihe Pọl na-ekwu ebe a bụ, ‘N’ihi ihe m ka kọwachaara unu, ana m arịọ unu ka unu mee ihe m na-aga ịgwa unu ugbu a.’ Gịnị ka Pọl kọwaara Ndị Kraịst ahụ bi na Rom?

4 Malite ná Ndị Rom isi mbụ ruo isi iri na otu, Pọl kọwara ohere ahụ magburu onwe ya nke Chineke nyere ma ndị Juu ma ndị Jentaịl, nke bụ́ ịghọ ndị ga-eso Kraịst chịa n’Alaeze Chineke, bụ́ olileanya ụmụ Izrel jụrụ. (Ndị Rom 11:13-36) Ọ bụ nanị n’ihi “ọmịiko nke Chineke” ka ohere ahụ dị oké ọnụ ahịa ji rute ndị ọzọ aka. Gịnị ka Ndị Kraịst kwesịrị ime n’ihi obiọma a na-erughịrị mmadụ nke Chineke gosiri? Obi ha kwesịrị ijupụta n’ekele nke na ọ ga-adị ha ọkụ n’obi ime ihe ọzọ Pọl gara n’ihu ikwu, nke bụ́: “Unu na-enyefe ahụ́ unu dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke Chineke na-anara nke ọma, ozi dị nsọ site n’ikike iche echiche unu.” (Ndị Rom 12:1) Ma, olee otú Ndị Kraịst ahụ pụrụ isi nyefee Chineke onwe ha dị ka “àjà”?

5. (a) Olee otú mmadụ nwere ike isi nyefee Chineke onwe ya dị ka “àjà”? (b) Olee ndụmọdụ Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịdị na-agbaso?

5 Pọl gara n’ihu ikwu, sị: “Kwụsịkwanụ ịbụ ndị a na-eme ka ha yie usoro ihe nke a, kama bụrụnụ ndị e nwoghara site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ, ka unu wee na-anwapụtara onwe unu ihe bụ́ uche Chineke nke ziri ezi na nke a na-anara nke ọma na nke zuru okè.” (Ndị Rom 12:2) Kama ikwe ka mmụọ nke ụwa mee ka ha na-eche echiche ka ụwa, ha kwesịrị ime ka uche ha dị ka nke Kraịst. (1 Ndị Kọrint 2:16; Ndị Filipaị 2:5) Ezi Ndị Kraịst nile, tinyere anyị onwe anyị taa, kwesịrị ịgbaso ndụmọdụ a n’ihe ọ bụla ha na-eme kwa ụbọchị.

6. Dị ka Pọl kwuru ná Ndị Rom 12:1, 2, gịnị na-enyere anyị aka izere imegwara ihe e mere anyị?

6 Olee otú ihe a Pọl kọwara ná Ndị Rom 12:1, 2 si na-enyere anyị aka? Dị nnọọ ka Ndị Kraịst ahụ nọ na Rom e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, anyị nwere nnọọ ekele maka ọmịiko Chineke nọgidere na-egosi anyị nakwa maka ụzọ dị iche iche o si na-egosi anyị ọmịiko ya kwa ụbọchị. N’ihi ya, obi ekele anyị nwere maka ihe ndị a na-akpali anyị iji ume anyị nile, ego anyị na ike anyị na-ejere Chineke ozi. Obi ekele dị otú a na-akpalikwa anyị ịgbalị ike anyị nile ịdị na-enwe uche nke Kraịst, ọ bụghị nke ụwa. Ịdị na-eche echiche dị ka Kraịst na-enyere anyị aka ịmara otú anyị ga-esi na-emeso ndị ọzọ ihe—ma ndị kwere ekwe ibe anyị ma ndị na-ekweghị ekwe. (Ndị Galeshia 5:25) Dị ka ihe atụ: Ọ bụrụ na anyị na-eche echiche dị ka Kraịst, ọ ga-akpali anyị izere ọchịchọ nke imegwara ihe e mere anyị.—1 Pita 2:21-23.

“Ka Ịhụnanya Unu Bụrụ nke Ihu Abụọ Na-adịghị Na Ya”

7. Olee ụdị ịhụnanya e kwuru okwu ya ná Ndị Rom isi 12?

7 Ihe mere anyị ji ezere iji ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ abụghị nanị n’ihi na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ime kama n’ihi na ime ya bụ igosipụta ịhụnanya. Rịba ama ihe ọzọ Pọl onyeozi kwuru banyere ihe mere anyị ji ahụ ndị ọzọ n’anya. N’akwụkwọ Ndị Rom, Pọl ji okwu ahụ bụ́ “ịhụnanya” (a·gaʹpe n’asụsụ Grik) mee ihe ọtụtụ ugboro mgbe ọ na-ekwu okwu banyere otú Chineke na Kraịst si hụ anyị n’anya. (Ndị Rom 5:5, 8; 8:35, 39) Ma ná Ndị Rom isi 12, Pọl ji okwu ahụ bụ́ a·gaʹpe mee ihe n’ụzọ dị iche—mgbe ọ na-ekwu okwu banyere ịhụnanya ụmụ mmadụ na-egosi ibe ha. Mgbe o kwuchara na onyinye nke mmụọ nsọ dịgasị iche iche nakwa na ụfọdụ ndị kwere ekwe nwere onyinye a, Pọl kwuru otu àgwà nke Ndị Kraịst nile kwesịrị inwe. O kwuru, sị: “Ka ịhụnanya unu bụrụ nke ihu abụọ na-adịghị na ya.” (Ndị Rom 12:4-9) Ịhụ ndị ọzọ n’anya bụ otu ụzọ bụ́ isi e si ama ezi Ndị Kraịst. (Mak 12:28-31) Pọl gbara anyị ume ka anyị hụ na ịhụnanya anyị na-egosipụta dị ka Ndị Kraịst bụ nke ihu abụọ na-adịghị na ya.

8. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na ịhụnanya anyị bụ nke ihu abụọ na-adịghị na ya?

8 Pọl gara n’ihu ikwu otú e si egosipụta ịhụnanya nke ihu abụọ na-adịghị na ya site n’ikwu, sị: “Na-akpọnụ ihe ọjọọ asị, na-araparanụ n’ezi ihe.” (Ndị Rom 12:9) ‘Ịkpọ asị’ na ‘ịrapara’ bụ okwu abụọ gbara ọkpụrụkpụ. ‘Ịkpọ asị’ a na-ekwu okwu ya ebe a bụ “ịkpọ ihe asị gabiga ókè.” Ọ bụghị nanị nsogbu ihe ọjọọ na-akpata ka anyị ga-akpọ asị, anyị aghaghị ịkpọ ihe ọjọọ ahụ n’onwe ya asị. (Abụ Ọma 97:10) E si na ngwaa Grik pụtara n’ụzọ nkịtị “iji mgba nyagide ihe” sụgharịta okwu ahụ bụ́ ‘ịrapara.’ Onye Kraịst ọ bụla ịhụnanya ya bụ nke ezigbo ya na-arapagidesi ike ma ọ bụ nyagidesie ike n’àgwà ọma ahụ bụ́ obiọma nke na ịdị obiọma ga-abụzi akụkụ ahụ́ ya.

9. Olee ndụmọdụ Pọl nyere ugboro ugboro?

9 Pọl kwuru nnọọ okwu ugboro ugboro banyere otu ụzọ e si egosipụta ịhụnanya. O kwuru, sị: “Nọgidenụ na-agọzi ndị na-akpagbu unu; na-agọzinụ agọzi, gharakwanụ ịdị na-abụ ọnụ.” “Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi onye ọ bụla n’ọnọdụ ihe ọjọọ.” “Ndị m hụrụ n’anya, unu abọrọla onwe unu ọbọ.” “Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị, kama nọgide jiri ezi ihe na-emeri ihe ọjọọ.” (Ndị Rom 12:14, 17-19, 21) Ihe a Pọl kwuru gosiri nnọọ otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị na-ekweghị ekwe ihe, ọbụna ndị nke na-emegide anyị.

“Nọgidenụ Na-agọzi Ndị Na-akpagbu Unu”

10. Olee ụzọ anyị pụrụ isi na-agọzi ndị na-akpagbu anyị?

10 Olee otú anyị ga-esi mee ihe a Pọl gbara anyị ume ka anyị na-eme, nke bụ́: “Nọgidenụ na-agọzi ndị na-akpagbu unu”? (Ndị Rom 12:14) Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Nọgidenụ na-ahụ ndị iro unu n’anya ma na-ekpe ekpere maka ndị na-akpagbu unu.” (Matiu 5:44; Luk 6:27, 28) N’ihi ya, otu ụzọ anyị si agọzi ndị na-akpagbu anyị bụ site n’ikpe ekpere maka ha, na-arịọ Chineke ka o meghee anya ha ka ha bịa mara eziokwu ahụ ma ọ bụrụ na ha na-akpagbu anyị n’ihi na ha amaghị eziokwu ahụ. (2 Ndị Kọrint 4:4) N’ezie, o nwere ka ọ dị na mmadụ na-arịọ Chineke ka ọ gọzie onye na-akpagbu ya. Ma ọ bụrụ na anyị na-eche echiche dị ka Kraịst, anyị ga-enwe ike ikwe ka ịhụnanya anyị gbasaa ruo n’ebe ndị iro anyị nọ. (Luk 23:34) Gịnị ka igosi ịhụnanya dị otú ahụ nwere ike ịrụpụta?

11. (a) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya Stivin? (b) Dị ka anyị hụrụ n’ihe banyere Pọl, olee mgbanwe ụfọdụ ndị na-akpagbu Ndị Kraịst nwere ike ime ná ndụ ha?

11 Stivin bụ otu onye kpere ekpere maka ndị na-akpagbu ya, ekpere ya rụpụtakwara ihe. Obere oge ka Pentikọst 33 O.A. gasịrị, ndị kpọrọ ọgbakọ Ndị Kraịst asị jidere Stivin, kpụpụ ya n’azụ obodo Jeruselem ma tụgbuo ya na nkume. Tupu ya anwụọ, o kpekuru Jehova ekpere, sị: “Jehova, agụla mmehie a megide ha.” (Ọrụ 7:58–8:1) Otu n’ime ndị Stivin kpere ekpere maka ha n’ụbọchị ahụ bụ Sọl, bụ́ onye hụrụ mgbe a na-atụgbu Stivin ma kwadoo ogbugbu ahụ e gburu ya. Ka e mesịrị, Jizọs ahụ a kpọlitere n’ọnwụ mere ka Sọl hụ ya. Onye ahụ na-akpagbubu Ndị Kraịst ghọrọ onye na-eso ụzọ Kraịst ma mesịa bụrụ Pọl onyeozi, onye dere akwụkwọ ozi ahụ e degaara Ndị Kraịst bi na Rom. (Ọrụ 26:12-18) Eleghị anya, Jehova gbaghaara Pọl mmehie nke ịbụ onye na-akpagbu Ndị Kraịst dị nnọọ ka Stivin kpere n’ekpere. (1 Timoti 1:12-16) Ka a sịkwa ihe mere Pọl jiri gbaa Ndị Kraịst ume, sị: “Nọgidenụ na-agọzi ndị na-akpagbu unu”! Site n’ahụmahụ nke ya onwe ya, ọ maara na ụfọdụ ndị na-akpagbu Ndị Kraịst nwere ike imesị ghọọ ndị na-ejere Chineke ozi. N’oge anyị a, ụfọdụ ndị na-akpagbubu ndị ohu Jehova emesịala ghọọ ndị kwere ekwe n’ihi na ndị ohu Jehova bụ ndị udo.

“Bụrụnụ Ndị Ha Na Mmadụ Nile Na-adị n’Udo”

12. Olee ihe jikọrọ ndụmọdụ ahụ dị ná Ndị Rom 12:9, na nke dị n’amaokwu nke 17?

12 Ndụmọdụ ọzọ Pọl nyere banyere otú anyị ga-esi na-emeso ndị kwere ekwe na ndị na-ekweghị ekwe ihe bụ: “Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi onye ọ bụla n’ọnọdụ ihe ọjọọ.” Nke a bụ nnọọ ihe mmadụ ga-emerịrị ma ọ bụrụ na onye ahụ mere ihe Pọl bu ụzọ kwuo, nke bụ́: “Na-akpọnụ ihe ọjọọ asị.” E kwuwerị, olee otú mmadụ ga-esi kwuo na ya na-akpọ ihe ọjọọ asị ma ọ bụrụ na ọ na-eji ihe ọjọọ akwụghachi ndị mejọrọ ya? Ime nke ahụ agaghị abụ mmadụ inwe ịhụnanya nke “ihu abụọ na-adịghị na ya.” Pọl gaziri n’ihu ikwu, sị: “Na-emenụ ndokwa maka ihe ndị dị mma n’anya mmadụ nile.” (Ndị Rom 12:9, 17) Olee otú anyị si etinye okwu ndị ahụ n’ọrụ?

13. Olee otú anyị na-esi akpa àgwà dị mma “n’anya mmadụ nile”?

13 N’akwụkwọ ozi Pọl bu ụzọ degara Ndị Kraịst bi na Kọrint, o kwuru okwu banyere otú e si na-akpagbu ndịozi. O kwuru, sị: “Anyị aghọwo ihe a na-ekiri ekiri n’ebe a na-eme ihe ngosi n’anya ụwa, nakwa n’anya ndị mmụọ ozi, nakwa n’anya ụmụ mmadụ. . . . Mgbe a na-ekwujọ anyị, anyị na-agọzi agọzi; mgbe a na-akpagbu anyị, anyị na-atachi obi; mgbe a na-ekwutọ anyị, anyị na-arịọsi arịrịọ ike.” (1 Ndị Kọrint 4:9-13) N’otu aka ahụ, ndị bi n’ụwa a na-ekiri ezi Ndị Kraịst taa. Mgbe ndị nọ anyị gburugburu na-ahụ ihe ọma ndị anyị na-eme ọbụna mgbe a na-akpagbu anyị, o nwere ike ime ka ha malite ige ntị n’ozi ọma anyị na-ekwusara ha.—1 Pita 2:12.

14. Olee ókè anyị kwesịrị ịgbalịru iji hụ na anyị na ndị ọzọ dị n’udo?

14 Ma olee ókè anyị kwesịrị ịgbalịru iji hụ na anyị na ndị ọzọ dị n’udo? Anyị kwesịrị ịgbalịru ókè o kwere anyị mee. Pọl gwara Ndị Kraịst ibe ya, sị: “Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, bụrụnụ ndị ha na mmadụ nile na-adị n’udo.” (Ndị Rom 12:18) “Ọ bụrụ na o kwere omume” na “ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka” bụ okwu ndị na-egosi na ọ bụghị mgbe nile ka ọ na-adị mfe mmadụ na ndị ọzọ ịdị n’udo. Dị ka ihe atụ, anyị agaghị ada iwu Chineke n’ihi na anyị chọrọ ka anyị na mmadụ ibe anyị dịrị n’udo. (Matiu 10:34-36; Ndị Hibru 12:14) Ma anyị na-eme ihe ọ bụla anyị nwere ike ime—n’emebighị iwu Chineke—iji hụ na anyị na “mmadụ nile” dị n’udo.

“Unu Abọrọla Onwe Unu Ọbọ”

15. Gịnị ka e kwuru ná Ndị Rom 12:19 nke ga-eme ka anyị hapụ ịbọ ọbọ?

15 Pọl kwuru ihe ọzọ mere anyị ekwesịghị imegwara ihe e mere anyị; ịghara imegwara na-egosi na anyị dị umeala n’obi. O kwuru, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, unu abọrọla onwe unu ọbọ, kama nyenụ ọnụma ahụ ohere; n’ihi na e dere, sị: ‘Ịbọ ọbọ bụ nke m; m ga-akwụghachi, ka Jehova na-asị.’” (Ndị Rom 12:19) Onye Kraịst ọ bụla na-agbalị imegwara ihe ọjọọ e mere ya dị mpako. Ọ na-eweghara ọrụ dịịrị Chineke. (Matiu 7:1) Ọzọkwa, ọ bụrụ na mmadụ emegwara ihe ọjọọ e mere ya, ọ na-egosi na onye ahụ enweghị okwukwe na Jehova ga-emezu nkwa ahụ o kwere bụ́: “M ga-akwụghachi.” N’aka nke ọzọ, ezi Ndị Kraịst kwenyesiri ike na Jehova ‘ga-eme ka e kpeere ndị ọ họọrọ ikpe ziri ezi.’ (Luk 18:7, 8; 2 Ndị Tesalonaịka 1:6-8) Ha na-eji obi umeala ahapụ Chineke ka ọ bọọrọ ha ọbọ ihe ọjọọ ọ bụla e mere ha.—Jeremaịa 30:23, 24; Ndị Rom 1:18.

16, 17. (a) Gịnị ka ‘ikpokwasị mmadụ icheku ọkụ’ n’isi pụtara? (b) Ị̀ hụtụla ebe obiọma e gosiri onye na-ekweghị ekwe mere ka obi onye ahụ dajụọ? Ọ bụrụ na ị hụtụla, kọọ otú o si mee.

16 Ọ bụrụ na anyị emegwara onye mere anyị ihe ọjọọ, o yiri ka ọ ga-eme ka onye ahụ kpọkwuo ekwe nkụ. Ma, ọ bụrụ na anyị ejiri obiọma mesoo ya, o nwere ike ime ka obi ya dajụọ. N’ihi gịnị ka anyị ji kwuo otú a? Rịba ama ihe Pọl gwara Ndị Kraịst nọ na Rom. O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri; ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya ihe ka ọ ṅụọ; n’ihi na site n’ime nke a, ị ga-ekpokwasị icheku ọkụ n’isi ya.” (Ndị Rom 12:20; Ilu 25:21, 22) Gịnị ka nke a pụtara?

17 Ọ bụ n’otú e si agbaze ọla n’oge ochie ka e si nweta okwu ahụ bụ́ ‘ikpokwasị icheku ọkụ n’isi ya.’ A na-ewere ọla e gwupụtara n’ala tinye n’ime ọkụ na-ere ere, ọ bụghị nanị n’okpuru ya ka a na-awụkwasị icheku ọkụ kamakwa a na-awụkwasị ya n’elu ọla ahụ. Icheku ọkụ ahụ a wụkwasịrị n’elu ya na-eme ka ọkụ ahụ karịa akarị nke na ọ ga-enwe ike ịgbaze ọla ahụ ma mee ka ọla nke dị mma nọrọ iche, ihe ndị na-adịghị ọcha dị n’ime ya anọrọkwa iche. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị ejiri obiọma na-emeso onye na-emegide anyị, anyị “ga-agbaze” obi ya ahụ kpọrọ nkụ ma mee ka ọ malite ime ihe dị mma. (2 Ndị Eze 6:14-23) N’ezie, ihe kpaliri ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ taa ịghọ Ndị Kraịst bụ obiọma ndị ohu Jehova ndị ọzọ gosiri ha.

Ihe Mere Na Anyị Adịghị Emegwara

18. Gịnị mere mmadụ ịghara imegwara ihe e mere ya ji bụrụ ihe kwesịrị ekwesị na ihe na-egosipụta na ọ hụrụ ndị ọzọ n’anya ma dịrị umeala n’obi?

18 Site n’ịtụle Ndị Rom isi 12 ná mkpirikpi anyị ahụla ọtụtụ ihe dị mkpa mere anyị na-agaghị eji “ihe ọjọọ akwụghachi onye ọ bụla n’ọnọdụ ihe ọjọọ.” Nke mbụ bụ na ịghara imegwara bụ ihe kwesịrị ekwesị ime. N’ihi ọmịiko Chineke gosiri n’ebe anyị nọ, o kwesịrị ekwesị ma bụrụ ihe ezi uche dị na ya na anyị ga-enye Jehova onwe anyị ma jiri obi anyị nile na-erube isi n’iwu ya—nke gụnyere iwu o nyere anyị ka anyị hụ ndị iro anyị n’anya. Ihe nke abụọ mere anyị na-agaghị eji were ihe ọjọọ kwụghachi n’ọnọdụ ihe ọjọọ bụ na ọ na-egosipụta na anyị nwere ịhụnanya. Site n’ịghara imegwara ma nọgide na-eme udo, anyị na-egosi na anyị hụdịrị ndị na-emekpọ anyị ọnụ n’anya ma nwee olileanya inyere ha aka ịghọ ndị na-efe Jehova. Nke atọ bụ na izere imegwara ihe e mere anyị na-egosi na anyị dị umeala n’obi. Onye na-abọ ọbọ dị mpako, n’ihi na Jehova kwuru, sị: “Ịbọ ọbọ bụ nke m.” Okwu Chineke na-adọkwa anyị aka ná ntị, sị: “Nganga bịa, nlelị abịakwa: ma n’ebe ndị dị umeala n’obi nọ ka amamihe dị.” (Ilu 11:2) Iji amamihe hapụrụ Chineke ọbọ na-egosi na anyị dị umeala n’obi.

19. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

19 Pọl chịkọtaziri ihe a ọ nọ na-ekwu banyere otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ ihe. Ọ gbara Ndị Kraịst ume, sị: “Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị, kama nọgide jiri ezi ihe na-emeri ihe ọjọọ.” (Ndị Rom 12:21) Olee ikike ọjọọ ndị na-agba mgba megide anyị taa? Olee otú anyị nwere ike isi merie ha? A ga-aza ajụjụ ndị a na ndị yiri ha n’isiokwu na-esonụ.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Olee ịdọ aka ná ntị e nyere ugboro ugboro ná Ndị Rom isi 12?

• Gịnị ga-enyere anyị aka ịghara imegwara ihe e mere anyị?

• Olee uru ma anyị ma ndị ọzọ ga-erite ma ọ bụrụ na anyị ezere ‘iji ihe ọjọọ kwụghachi n’ọnọdụ ihe ọjọọ’?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe dị na peeji nke 22]

Ndị Rom isi 12 kọwara mmekọrịta dị n’etiti Onye Kraịst na

• Jehova

• ndị kwere ekwe ibe ya

• ndị na-ekweghị ekwe

[Foto dị na peeji nke 23]

Akwụkwọ ozi Pọl degaara Ndị Kraịst bi na Rom nwere ndụmọdụ Ndị Kraịst taa pụrụ itinye n’ọrụ

[Foto dị na peeji nke 25]

Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta site n’ihe nlereanya nke onye na-eso ụzọ bụ́ Stivin?