Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ọrụ Ebube” Abụọ Weere Ọnọdụ n’Otu Mgbakọ E Nwere na Georgia

“Ọrụ Ebube” Abụọ Weere Ọnọdụ n’Otu Mgbakọ E Nwere na Georgia

“Ọrụ Ebube” Abụọ Weere Ọnọdụ n’Otu Mgbakọ E Nwere na Georgia

NA 2006 na Georgia, e mere otu ihe omume a na-agaghị echefu echefu bụ́ ebe ihe abụọ yiri “ọrụ ebube” mere. Ruo ụbọchị atọ, malite na July 7 ruo 9, e mere Mgbakọ Distrikti “Nnapụta Dị Nso!” nke Ndịàmà Jehova n’ebe isii ná mba ahụ. Nke ahụ bụ nnọọ oriri ime mmụọ nke ihe dị ka puku mmadụ iri na anọ garanụ riri.

Na January 2006, e mere nnọọ mgbalị iji nweta ebe kwesịrị ekwesị ga-aba ọtụtụ puku mmadụ ga-abịa mgbakọ ahụ n’isi obodo Georgia bụ́ Tbilisi, nke bụ́ ebe a ga-anọ eme mgbakọ ahụ. Ndị nọ n’ebe ndị ọzọ a ga-enwe mgbakọ ahụ ga-esi na telefon gere ihe omume ahụ.

N’ime afọ ole na ole gara aga, ndị ọchịchị ji nke nta nke nta na-enye ụmụnna nọ na Georgia ohere ife Jehova otú ha si chọọ. Ma n’agbanyeghị ọtụtụ mmegide Ndịàmà nọ n’ebe ahụ nwetara n’afọ ndị gara aga, ha nọgidere na-enwe obi ike na ha ga-enweta ebe ha ga-anọ enwe mgbakọ n’isi obodo ahụ. E ji ihu ọchị na ile ọbịa nke ọma mara ndị Georgia. Ma ọtụtụ ndị ọchịchị kpọrọ Ndịàmà Jehova asị. Hà ga-ahapụtụgodi àgwà a ha nwere ma kwe ka Ndịàmà nweta ebe ndị ha ga-anọ enwe mgbakọ?

Ụmụnna ndị so na kọmitii na-ahụ maka mgbakọ gara chọọ ma à ga-enweta ámá egwuregwu ma ọ bụ nnukwu ụlọ egwuregwu ndị a ga-anọ nwee mgbakọ. Ndị na-elekọta ebe ndị ahụ kwetara inye ha ebe ndị ahụ ka ha jiri mee mgbakọ, ma mgbe ụmụnna ahụ gwara ha ụbọchị ha ga-achọ iji ebe ndị ahụ eme ihe, ha jụziri inye ha. Ma ọ tụrụ ndị kọmitii ahụ n’anya mgbe ndị na-elekọta otu ebe a na-anọ akụ egwu na Tbilisi kwetara inye Ndịàmà Jehova ebe ahụ. Ụlọ egwu ahụ nọ n’etiti obodo ahụ, ọ bụkwa ebe ahụ ka a na-anọ emekarị ihe omume ndị na-akpọtụ akpọtụ n’obodo ahụ.

Mgbe kọmitii ahụ na-ahazi mgbakọ ahụ a ga-enwe na Tbilisi hụrụ na mgbalị ha enweela isi, ha maliteziri ime ndokwa maka mgbakọ ahụ nakwa maka mgbakọ ndị nke a ga-enwe n’ebe ndị ọzọ ná mba ahụ, nke gụnyere ndị a ga-enwe na Tsknori, Kutaisi, Zugdidi, Kaspi, na Gori. A rụrụ nnukwu ọrụ iji hụ na ndị nọ n’ebe ndị ọzọ a ga-eme mgbakọ ahụ sitere na telefon gere ihe omume ahụ n’otu oge ahụ ndị nke nọ na Tbilisi na-ege ya. A kwadebechaala ihe nile e ji eme mgbakọ ahụ. Mgbe ọ fọrọ nanị otu izu ka mgbakọ ahụ malite, ndị na-elekọta ebe ahụ a na-anọ akụ egwú na Tbilisi kwuru na ha agaghị enyekwa Ndịàmà ebe ahụ. Ha ekwughịkwanụ ihe mere ha ji gbanwee obi.

“Ọrụ Ebube” nke Mbụ

Gịnị ka ụmụnna ahụ ga-eme ugbu a ụbọchị gwụrụla agwụ? Nanị ihe ọzọ ha ga-eme bụ ịga chọwa ma è nwere ebe ha ga-enweta na Marneuli, bụ́ ógbè a na-akọ ugbo nke dị iri kilomita anọ site na Tbilisi. A nọrọla n’ala otu ezinụlọ bụ́ Ndịàmà Jehova dị n’ebe ahụ mee ọtụtụ mgbakọ. Ebe ahụ bụbu nnọọ nnukwu ugbo. Kemgbe afọ iri, ọ bụ nanị ebe ahụ ka ọgbakọ ndị nọ na Tbilisi na-eji eme mgbakọ. Otú ọ dị, ọ bụkwa n’otu Marneuli ahụ ka ndị na-eme ihe ike mekpọrọla Ndịàmà Jehova ọnụ ugboro ugboro.

Otu n’ime ha mere na September 16, 2000. Ndị uwe ojii nọ na Marneuli pachisiri ihe n’ụzọ iji mee ka Ndịàmà ghara iru ebe ha ga-anọ eme mgbakọ. Ka a na-ekwu, lekwa bọs bujuru ndị akpụ obi bụ́ ndị Vasili Mkalavishvili, nke bụ́ onye ụkọchukwu ndị Ọtọdọks a napụrụ ọrụ ụkọchukwu ya, du bịa. Ha kwụsịrị obere ụgbọala na bọs ndị bu ụmụnna na-aga mgbakọ ahụ a na-eme na Marneuli, si n’ụgbọala ndị ahụ kpụpụta ọtụtụ ndị na-abịa mgbakọ ahụ ma tie ha eti eti, ha naara ndị ọzọ ihe ndị ha bu na-abịa mgbakọ ahụ, tinyere Bible ha na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible.

Ihe dị ka iri mmadụ isii ndị ọzọ bukwaara ọgụ gaa n’ebe ahụ a na-eme mgbakọ na Marneuli. Ha merụrụ ihe ruru Ndịàmà iri anọ ahụ́. Ha mara otu nwanna mma n’obi. Ụfọdụ n’ime ha mịpụtasịrị égbè ha ma na-agbalisị mgbọ elu. Otu n’ime ha tụwara onye nwe ebe ahụ a nọ na-eme mgbakọ égbè ka o nye ya ego na ọla. Ha kwaghasịrị ime ụlọ ya nke dị n’ebe ahụ a nọ na-eme mgbakọ ma zuru ngwongwo ya ndị dara ọnụ. Mgbe ha kụwasịchara windo nile dị n’ụlọ ahụ, ha kpọrọ akwụkwọ e ji amụ Bible na bench ndị a rụrụ maka mgbakọ ahụ ọkụ. Akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ha mebiri karịrị akarị. Kama ndị uwe ojii nọ n’ebe ahụ ga-akwụsị ihe a ha na-eme, ha nyeere ha aka na-emeso Ndịàmà ihe ike. *

Ọ bụghị nanị ihe ndị a na-eme ihe ike ga-eme na-echu kọmitii na-ahazi mgbakọ ahụ ụra, ihe ọzọ na-echu ha ụra bụ otú ha ga-esi afabanye puku mmadụ ise n’ebe na-ababu puku mmadụ abụọ na narị ise. Olee ihe a ga-eme banyere nke a ebe ọ bụ na oge adịghịzi? O yiri ka ọ bụ ọrụ ebube mgbe mmadụ abụọ ugbo ha dị n’akụkụ ebe ahụ a na-anọ eme mgbakọ gwara ụmụnna ahụ ka ha nọrọ n’ugbo ha mee mgbakọ.

Imezi ebe ahụ ka ọ dị mma ịnọ mee mgbakọ abụghị obere ọrụ. Mmiri na-ezonụ mere ka ihe sie nnọọ ike—mmiri zoro n’ụbọchị nile dị n’izu bu mgbakọ ahụ ụzọ. A kọrọ poteto n’ugbo ndị ahụ, e kwesịkwara igwupụtasị ha. Ihe mbụ ụmụnna mere bụ iji mmiri ahụ na-ezonụ na-egwu poteto ndị ahụ. Ha wepụziri osisi e ji gbaa ebe ahụ gburugburu ma gwunye osisi ndị e ji rụọ ndo ka anwụ na mmiri ghara inye ndị ga-abịa mgbakọ ahụ nsogbu. Ha rụtakwuru bench, tinyekwuokwa ígwè okwu. Ndị ọrụ afọ ofufe ahụ rụrụ ọrụ ehihie na abalị nke na ụfọdụ arahụghịdị ụra.

Mmadụ nile na-echezi ihe a ga-eme ma ọ bụrụ na mmiri ezowe mgbe mgbakọ ahụ na-aga n’ihu. Gịnị ka a ga-eme apịtị juru ebe nile bụ́ nke nwere ike irikpu ụkwụ ndị bịara mgbakọ ahụ? Ha zụụrụ ahịhịa kpọrọ akpọ maka iji ha wụọ n’ala ebe ahụ dị mmiri mmiri. N’ikpeazụ, anwụ malitere ịcha! Anwụ chara n’abalị atọ ahụ nile e mere mgbakọ.

Mgbe ndị bịara mgbakọ ahụ rutere, ha hụrụ ebe ndị mara nnọọ mma. Otú ebe ahụ si dị nnọọ jụụ mechara ka o yie ka a nọ n’ụwa ọhụrụ. Osisi fig na osisi ndị ọzọ na-amị mkpụrụ na ubi ọka na ubi tomato juru nnọọ gburugburu ebe ahụ a nọ na-eme mgbakọ. Ubi vaịn mara mma dịkwa n’azụ ịkpọ okwu. Ka mgbakọ ahụ na-aga n’ihu, a nọ na-anụ ube oké ọkpa na nke nnekwu ọkụkọ ka a na-achịkọta àkwá ha. A na-anụkwa ube ndị ọzọ a na-anụkarị n’ime obodo, ma ndị bịara mgbakọ ahụ weere ha dị ka ihe na-akpa ọchị. Kama ikwe ka ihe ndị a dọpụ ha uche, ha achọghịdị ịma ma e nwere mkpọtụ ndị na-emenụ n’ihi na obi ha nile nọ n’igere ihe omume ahụ magburu onwe ya sitere na Bible. Ma ihe ndị a a kpọtụrụ uche abụghị nanị ihe ndị a na-agaghị echefu echefu mere ná mgbakọ ahụ.

“Ọrụ Ebube” nke Abụọ

Mgbe a na-emechi ihe omume nke ụbọchị Friday, ọ tụrụ ndị bịara mgbakọ ahụ n’anya mgbe onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, bụ́ Geoffrey Jackson, wepụtara New World Translation of the Holy Scriptures zuru ezu n’asụsụ Georgia. * Anya mmiri gbara ọtụtụ ndị n’ihi na o riri ha ọnụ. Otu ezinụlọ jiri ọṅụ kwuo, sị: “Anyị agaghị akwụsị igosi ekele anyị n’ihi ọrụ ebube a—ọrụ ebube Jehova. Ihe a bụ nnọọ nnukwu ọrụ a rụrụ n’obere oge!”

Otu nwanna nwanyị si Tsalendjikha, bụ́ onye si na telefon gee ihe omume ahụ kwuru, sị: “Apụghị m ịkọlị ụdị ọṅụ m nwere mgbe anyị nwetara Bible a. Unu emeela nnọọ maka mgbakọ ụbọchị atọ a pụrụ iche. Ọ bụ n’ezie mgbakọ a na-agaghị echefu echefu.” Otu ezinụlọ nọ n’otu ọgbakọ dị n’ebe ọdịda anyanwụ Georgia nke dị n’akụkụ Oké Osimiri Ojii kwuru, sị: “Tupu e wepụta Bible a, ihe anyị nwere n’ezinụlọ anyị bụ nanị otu Bible, ma ugbu a anyị anọ nwechara New World Translation. Onye ọ bụla n’ime anyị nweziri ike ịmụ Bible n’onwe ya.”

Ma e nwere nsogbu ndị ọzọ ọtụtụ ndị na-amaghị. Dị ka ihe atụ, n’agbanyeghị na e ji ụgbọ mmiri bute New World Translation ọhụrụ ahụ zuru ezu na Georgia tupu mgbakọ ahụ eruo, ndị na-ahụ maka ibupụ na ibubata ihe na Georgia ekweghị ka e bubata ya. Kọmitii na-ahazi mgbakọ ahụ weere okwu ahụ gakwuru onyeisi na-eleba anya ná mkpesa ndị e nwere n’obodo. Onyeisi ahụ gbalịrị mee ka e bubata Bible ahụ obere oge tupu mgbakọ ahụ amalite. O mesịrị dunye onye na-enyere ya aka ka ọ gaa mgbakọ ahụ e mere na Marneuli iji weta otu n’ime Bible ọhụrụ ahụ maka ọfịs ha.

Otú Ndị Georgia Si Anabata Mmadụ

E nwere ihe ọzọ mere Ndịàmà nọ na Georgia na-agaghị eji chefuo mgbakọ distrikti ahụ e mere na Marneuli. Otu onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova gara mgbakọ ahụ. Ndị nile bịara mgbakọ ahụ nwere nnọọ obi ụtọ nke na ha nile chọrọ iji ụzọ ndị obodo ha si anabata ndị ọbịa nabata ya n’ụzọ na-ekpo ọkụ. Nwanna Jackson ji nnọọ obi ụtọ guzoro ruo ọtụtụ awa ka ọ na-ekele ụmụnna ahụ tupu mgbakọ ahụ amalite, mgbe mgbakọ ahụ na-aga n’ihu, nakwa mgbe mgbakọ ahụ mechiri.

Mgbe a na-emechi otu mgbakọ e nwere na 1903, otu nwanna kwuru, sị: “Abụ m ogbenye ma ego ọ bụla ọ sọkwara mmadụ kwụọ m, enweghị m ike iji ya gbanwere uru nile m ritere ná mgbakọ a.” Ka ihe karịrị otu narị afọ gasịrị, nke a bụ nnọọ otú obi dị Ndịàmà gara mgbakọ ahụ mere ihe akụkọ e nwere n’afọ 2006 na Georgia.

[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 10 Iji gụkwuo banyere otú e si kpagbuo Ndịàmà Jehova na Georgia, lee mbipụta Teta! (Bekee) nke January 22, 2002, peeji nke 18-24.

^ par. 16 E wepụtara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’asụsụ Georgia na 2004.

[Igbe dị na peeji nke 19]

“Onye Nta” Amụbawo

Okwu Aịsaịa 60:22 emezuwo na Georgia: “Onye nta n’etiti ha ga-aghọ [otu puku], onye dịkarịsịrị nta ga-aghọkwa mba nwere ume: Mụ onwe m, Jehova, ga-eme ka ọ bịa ọsọ ọsọ na mgbe ya.” N’ihe na-erughị iri afọ abụọ, ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze nọ na Georgia siri n’ihe na-erughị otu narị ruo ihe dị ka puku iri na isii. Ndị a ji ịnụ ọkụ n’obi na-akpọsa Okwu Chineke, na-eduzi ọmụmụ Bible fọrọ obere ka o ruo puku asatọ n’ebe obibi ndị mmadụ n’izu ọ bụla—nke bụ́ ihe na-egosi na ozi ọma ahụ ka ga-amụbakwu na Georgia.

[Ihe Osise/Map dị na peeji nke 16]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

RUSSIAN FEDERATION

GEORGIA

⇨ Zugdidi

⇨ Kutaisi

Marneuli ⇨ Gori

⇨ Kaspi

⇨ Tsknori

TBILISI

TURKEY

ARMENIA

AZERBAIJAN

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ụwa: E nwetara ya n’aka NASA/Visible Earth imagery

[Foto dị na peeji nke 16]

Ihe a kpụrụ akpụ dị na Tbilisi

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Ndị nọ n’ebe ise ndị ọzọ a nọrọ mee mgbakọ ahụ si na fon gere ihe omume ahụ e mere na Marneuli

[Foto ndị ḍị na peeji nke 18]

Ndị bịara mgbakọ nwere nnọọ obi ụtọ mgbe e wepụtara “New World Translation” zuru ezu n’asụsụ Georgia