Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Mgbe Devid gbuchara Golaịat, gịnị mere Eze Sọl ji jụọ ya sị, “Nwa onye ka ị bụ, gị nwa okorobịa?” n’agbanyeghị na Sọl ebula ụzọ kwuo ka a kpọta Devid ka ọ bịa na-ejere ya ozi?—1 Samuel 16:22; 17:58.

Azịza ya pụrụ ịbụ na Sọl chefuru onye Devid bụ n’ihi na ha anọteghị aka mgbe mbụ ha zutere. Ma, o nwere ike ọ gaghị abụcha ya, ebe ọ bụ na ihe e dere na 1 Samuel 16:18-23 gosiri na ọ bụ Eze Sọl kwuru ka a gaa kpọọ Devid, ọ bịakwara hụ ya n’anya nke ukwuu ma mee ya onye na-eburu ya ihe agha. Ọ ghaghị ịbụ na Sọl amarala Devid nke ọma.

Ụfọdụ ndị ọkà mmụta Bible kwuru na a gbakwụnyere 1 Samuel 17:12-31 na 17:55–18:5 agbakwụnye ka oge na-aga n’ihi na ahụghị amaokwu Bible ndị a na Grik Septuagint, nke bụ́ nsụgharị Akwụkwọ Nsọ Hibru e dechara na narị afọ nke abụọ T.O.A. Ma amamihe adịghị n’ịdabere nanị ná nsụgharị Septuagint kwubie na a gbakwụnyere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a agbakwụnye ebe ọ bụ na ha pụtakwara n’ihe odide ndị ọzọ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru ndị e lere anya na ha bụ ezigbo ya.

Ọ ga-abụ na ọ bụghị nanị aha nna Devid ka Sọl chọrọ ịmara n’ihi na o bula ụzọ jụọ Abna onye nna Devid bụ, bịakwa jụọ Devid n’onwe ya otu ihe ahụ. Ebe ọ bụ na Devid ka gbusịrị Golaịat, Sọl maliteziri ile ya anya n’ụdị ọzọ, dị ka onye nwere okwukwe siri ike na onye ụjọ na-adịghị atụ. Ọ bụ ya mere Sọl ji chọzịe ịma onye mụrụ nwa dị otú a. O nwere ike ihe Sọl bu n’uche bụ ka nna Devid, bụ́ Jesi ma ọ bụ ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ ya sonye ná ndị agha ya, n’ihi na o nwere ike ha bụkwa ndị ụjọ na-adịghị atụ na ndị nwere obi ike dị ka Devid.

Ọ bụ ezie na nanị ihe e dere na 1 Samuel 17:58 Devid zara bụ, “nwa ohu gị bụ́ Jesi, bụ́ onye Betlehem,” ihe ọzọ Bible kwuru gosiri na ọ ga-abụ na ha kparịtakwuru ụka. C. F. Keil na F. Delitzsch kwuru banyere nke a, sị: “Site n’ihe e kwuru na [1 Samuel 18:1], nke bụ́ ‘mgbe ọ gwabiri Sọl okwu,’ o doro nnọọ anya na ọ ga-abụ na Sọl jụtụkwuru ya ajụjụ banyere ndị ezinụlọ ya, n’ihi na ihe a e kwuru n’amaokwu a gosiri na ha nwetere mkparịta ụka ahụ aka.”

Site n’ihe a nile, anyị pụrụ ikwubi na mgbe Sọl jụrụ Devid sị, “Nwa onye ka ị bụ, gị nwa okorobịa?” ihe Sọl chọrọ ịmara abụghị onye Devid bụ n’ihi na ọ marabuola onye ọ bụ, kama ọ chọrọ ịmara otú e si zụlite Devid.

[Foto dị na peeji nke 31]

Gịnị mere Sọl ji jụọ Devid onye mụrụ ya?