Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ọ̀ Na-ahụ Ihe Ị Na-eme?

Chineke Ọ̀ Na-ahụ Ihe Ị Na-eme?

Chineke Ọ̀ Na-ahụ Ihe Ị Na-eme?

JEHOVA, bụ́ Onye kere ihe nile, ò nwere ikike ịhụ ihe ndị na-emenụ? N’ezie o nwere! Bible kwuru nnọọ n’ụzọ doro anya, sị: “Onye na-akpụ anya, ọ̀ gaghị ahụwa ụzọ?” (Abụ Ọma 94:9) Anya Jehova dị nnọọ nkọ karịa anya ụmụ mmadụ. Ọ bụghị nanị na ọ na-ahụ ọdịdị elu ahụ́ anyị kama ọ “na-anwa obi,” ọ pụkwara ‘ịtụzi obi nile.’ (Ilu 17:3; 21:2) Ee, o nwere ikike ịma ihe anyị na-eche, ihe na-akpali anyị ime ihe, nakwa ọchịchọ ndị dị anyị n’obi.

Jehova maara ihe isi ike ndị anyị nwere ike izute ná ndụ, ọ na-emekwara anyị ihe ndị anyị na-arịọ ya. Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Anya abụọ nke Jehova dị n’ahụ́ ndị ezi omume, ntị Ya abụọ ghekwara oghe ná mkpu ha na-etiku Ya. Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa, Ọ na-azọpụtakwa ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha.” (Abụ Ọma 34:15, 18) Ọ bụ nnọọ ihe na-emesi obi ike ịmara na Jehova maara ọnọdụ anyị ma na-aza arịrịọ anyị sitere n’obi!

Jehova Chineke na-ahụkwa ihe ndị e mere ọbụna ná nzuzo. Ee, “ihe nile gba ọtọ ma bụrụ ndị e kpughepụrụ ekpughepụ n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.” (Ndị Hibru 4:13) N’ihi ya Jehova na-ahụ ihe nile anyị na-eme, ma hà dị mma ma hà dị njọ. (Ilu 15:3) Dị ka ihe atụ, Jenesis 6:8, 9 kwuru na “Noa hụtara amara n’ihu Chineke” nakwa na ya “na Chineke yịkọrọ na-ejegharị.” N’ezie, ihe mere Noa ji nweta ihu ọma Jehova na ngọzi ya bụ n’ihi na o rubeere Chineke isi ma mee ihe ndị Ọ gwara ya mee. (Jenesis 6:22) Ma, ndị biri ndụ n’oge Noa na-eme ihe ike, àgwà ha rụkwara arụ. Chineke hụrụ ihe ndị ahụ na-eme n’oge ahụ. O “wee hụ na ihe ọjọọ nke mmadụ hiri nne n’ụwa, Ọ hụkwa na nchepụta nile ọ bụla nke echiche ya bụ nanị ihe ọjọọ ogologo ụbọchị nile.” Jehova mechara bibie ndị ọjọọ ahụ nile ma chebe Noa na ezinụlọ ya.—Jenesis 6:5; 7:23.

Jehova ọ̀ ga-ele gị anya dị ka onye ruru eru inweta ngọzi ya? N’ezie, anya Jehova “na-ejegharị n’ụwa nile, igosi Onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru òkè n’ebe Ọ nọ.” (2 Ihe E Mere 16:9) N’oge na-adịghị anya, ọ ga-ebibikwa ndị nile na-emebi iwu n’ụwa ma napụta ndị nile dị umeala n’obi.—Abụ Ọma 37:10, 11.