Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ijere Jehova Ozi—Ihe Ùgwù Na-enweghi Atụ

Ijere Jehova Ozi—Ihe Ùgwù Na-enweghi Atụ

Akụkọ Ndụ

Ijere Jehova Ozi—Ihe Ùgwù Na-enweghi Atụ

Dị Ka Zerah Stigers Si Kọọ

Di m, bụ́ onye mụ na ya jekọrọ nnọọ ozi oge nile, nwụrụ na 1938. Ọ hapụụrụ nanị m nwa ọhụrụ anyị na nwa anyị nwoke dị afọ iri. N’eziokwu, ọ ka na-agụsi m agụụ ike ije ozi dị ka onye ozi oge nile ma oleekwanụ otú m ga-esi eme ya? Ka m kọtụrụ gị akụkọ ndụ m tupu mụ akọọrọ gị otú m si nwee ike ije ozi dị ka onye ozi oge nile.

OBERE oge ka a mụsịrị m na July 27, 1907, n’Alabama, U.S.A., ndị mụrụ m kpọọrọ mụ na ụmụnne m atọ ndị ọzọ gaa Georgia. Obere oge ka anyị kwafesịrị n’ebe ahụ, anyị kwagara Tennessee, ma mechaa kwaga n’ebe dị nso na Tampa, Florida. N’ebe ahụ ka m nọrọ kirie “Foto Ihe Nkiri nke Okike” na 1916. N’oge ahụ, a ka malitere ime fim ọhụrụ, nke ahụ mekwara ka “Foto Ihe Nkiri” ahụ tọọ onye ọ bụla ụtọ!

Ndị mụrụ m na-agụchi Ụlọ Nche na akwụkwọ ndị ọzọ e ji amụ Bible anya. Ọ bụ ezie na ịgụ akwụkwọ ndị ahụ na-amasị papa m, n’oge ahụ, ya na Ndị Mmụta Bible, nke bụ́ aha a na-akpọ Ndịàmà Jehova mgbe ahụ, adịghị akpachi anya. Ma mama m na-akpọrọ anyị aga ọmụmụ ihe. N’oge na-adịghị anya ka anyị kwagasịrị Niles, Michigan, anyị na-eji ụgbọ okporo ígwè eme njem karịrị kilomita iri na ise mgbe nile iji ruo ebe anyị na-enwe ọmụmụ ihe na South Bend, Indiana.

Ka e mesịrị na July 22, 1924, e mere m baptizim iji gosi na ararawo m onwe m nye Jehova. Obere oge ka e mechara m baptizim, mama m haziri ihe omume ya iji ghọọ kọpọtụa, bụ́ ihe a na-akpọ ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova mgbe ahụ. Ezi ihe nlereanya ya na nke ndị kọpọtụa ndị ọzọ mere ka m nwee mmasị n’ọrụ ọsụ ụzọ.

Ịchọta Di

Ka m na-aga mgbakọ ukwu e mere n’Indianapolis, Indiana, na 1925, ahụrụ m James Stigers, onye Chicago. Ozugbo m hụrụ James, enwere m mmasị n’ebe ọ nọ n’ihi ịnụ ọkụ n’obi o ji na-ejere Jehova ozi. Site na Chicago ruo ebe m bi dị ihe dị ka otu narị kilomita na iri isii, n’ihi ya, ọ dịghịrị anyị mfe ịdị na-agakarị na nke ibe anyị. N’oge ahụ, nanị ihe e nwere ná nnukwu obodo ahụ bụ otu ọgbakọ, anyị na-enwekwa ọmụmụ ihe n’otu ọnụ ụlọ anyị na-akwụ ụgwọ ya nke dị n’ụlọ elu. James na-edekarịrị m akwụkwọ ozi iji na-agba m ume ka m nọgide n’ozi Jehova. Mụ na ya gbara akwụkwọ na December 1926, ka ihe dị ka otu afọ gasịrị, amụrụ m ọkpara anyị bụ́ Eddie.

Obere oge ka m mụsịrị Eddie, mụ na di m malitere ịrụkọ ọrụ ọsụ ụzọ. Anyị jere ozi na steeti asatọ—Michigan, Louisiana, Mississippi, South Dakota, Iowa, Nebraska, California, na Illinois—afọ nile anyị ji jee ozi n’ebe ndị a bụ afọ ndị kasị nye anyị obi ụtọ ná ndụ. Ọ bụ mgbe di m dara ọrịa ka ezinụlọ anyị na-enwechaghịzi obi ụtọ dị ka anyị naara enwe.

Anyị laghachiri Chicago na 1936 ka anyị na nne di m, onye bụ́kwa Onyeàmà biri, n’ihi na ọrịa di m erichaala anyị ego nile dị anyị n’aka. Obere oge tupu di m anwụọ, mgbe m dị ime nwa anyị nke abụọ, arụrụ m ọrụ n’ebe a na-ere nri bụ́ ebe a na-akwụ m otu dọla kwa ụbọchị. Ezigbo nne di m hụrụ nnọọ na ọ dịghị mgbe ihe oriri kọrọ anyị, o kweghịkwa ka anyị kwụghachi ya ego ọ bụla. O lekọtara anyị nnọọ nke ọma.

Ruo afọ abụọ, di m rịara ọrịa zara ya ụbụrụ nke mesịrị gbuo ya. Nke ahụ mere na July 1938. N’oge ahụ ọ na-arịa ọrịa, ọ dịghị anyali ụgbọala ma ọ bụ soro gaa ozi ụlọ n’ụlọ, ma ọ dịghị mgbe ọ hapụrụ iji ohere ọ bụla ọ hụrụ kwusaara ndị ọzọ ozi ọma. Iji nye aka ịkpata ego anyị ga-eji na-egbo mkpa ezinụlọ anyị, akwụsịrị m ije ozi oge nile. Arụrụ m ọrụ n’ebe dịgasị iche iche, ọ dịghịkwa nke m rụtere aka n’ime ha.

A mụrụ nwa anyị nwoke bụ́ Bobby na July 30, 1938, nanị abalị asatọ ka papa ya nwụchara. Otú ọ dị, nne di m ekweghị ka m gaa n’ụlọ ọgwụ ụmụ ogbenye. Kama nke ahụ, o mere ndokwa ka m gaa n’ụlọ ọgwụ ka nke ahụ mma, ka dọkịta ya nwekwaa ike ilekọta m nke ọma. Ọ kwụkwara ụgwọ nile ndị ụlọ ọgwụ ahụ sịrị ka a kwụọ, nke a masịrị m nnọọ n’ihi na ọ na-egosi na o nwere ịhụnanya e ji mara Ndị Kraịst.

Ịmaliteghachi Ozi Oge Nile

Anyị na nne di m bigidere ruo mgbe Bobby dị ihe dị ka afọ abụọ na ụma, n’oge ahụ Eddie dị afọ iri na abụọ. Ọ bụ ezie na ọnọdụ ọhụrụ a m nọ na ya adịghịrị m mfe ma ọ ka na-agụsi m agụụ ike ijere Jehova ozi oge nile. Ná mgbakọ e mere na Detroit, Michigan, na 1940, ahụrụ m di na nwunye bụ́ ndị ọsụ ụzọ, bụ́ ndị gbara m ume ịbịa sụọ ụzọ na South Carolina. N’ihi ya, ejiri m otu narị dọla na iri dọla ise zụrụ ụgbọala a na-akpọ Pontiac nke e mepụtara na 1935 ma jikere ịkwaga South Carolina. Na 1941, nke bụ́ afọ United States sonyere n’Agha Ụwa nke Abụọ, mụ na ụmụ m nwoke abụọ kwagara n’ebe ndịda United States, anọkwara m n’ebe ahụ maliteghachi ozi oge nile.

Oge anyị kwagara South Carolina, anyị buru ụzọ gaa Camden, mechaa gaa Little River, mgbe ahụzi gaa Conway. Na Conway, azụụrụ m otu obere ụlọ ụgbọala na-adọkpụ. Otu onye nwere ebe a na-ere mmanụ ụgbọala kwere ka m na-adọwa ụlọ ahụ ụgbọala na-adọkpụ n’akụkụ ebe ọ na-ere mmanụ ụgbọala. Nwoke ahụ kwere ka m si n’ụlọ ya dọrọ ọkụ eletrik na gas e ji esi nri, kwekwa ka m na-aga mposi na nke ya. Mmanụ ụgbọala bịara dị ụkọ n’oge a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, enwelighi m ike ịzụta nke m ga-eji anya ụgbọala m. N’ihi ya azụụrụ m ígwè ochie. Na 1943, bụ́ mgbe o yiri ka enweghịkwa m ike ịnọgide na-asụ ụzọ n’ihi na ego anyị agwụla, a kpọrọ m ka m bịa bụrụ onye ọsụ ụzọ pụrụ iche bụ́ nke a na-enye m obere ego kwa ọnwa iji na-enyere onwe m aka. Kemgbe ọtụtụ afọ, Jehova anọwo na-enyere m nnọọ aka!

N’oge ahụ, e nweghị Ndịàmà ọzọ bi na Conway, ọ na-esikwara mụ na ụmụ m ike nanị anyị ịdị na-aga ozi ọma. N’ihi ya edere m akwụkwọ ma rịọ ka e zitere m onye ọsụ ụzọ pụrụ iche mụ na ya ga na-ejekọ ozi. Na 1944, e zitere Edith Walker, onye bụ́ nnọọ ezigbo mmadụ. Anyị jekọrọ ozi n’ọtụtụ ebe ruo afọ iri na isii. Ma ọ dị mwute na Edith laghachiri Ohio n’ihi ọrịa.

Ngọzi Ndị M Na-agaghị Echefu Echefu

A bịa n’ọtụtụ ihe ndị na-enye obi ụtọ m na-agaghị echefu echefu mere n’afọ ndị ahụ, enweghị m ike ichefu Albertha dị afọ iri na atọ, bụ́ onye bi na Conway nke na-elekọta nne nne ya nwere nkwarụ na ụmụnne ya ndị obere abụọ. O nwere nnọọ mmasị n’eziokwu Bible ndị m na-akụziri ya nke na ọ chọrọ ịkọrọ ha ndị ọzọ. Ọ bịakwara nwee nnọọ mmasị n’ozi ọsụ ụzọ ma malite ịsụ ụzọ ozugbo ọ gụchara akwụkwọ kọleji na 1950. Ọ ka nọkwa na-asụ ụzọ kemgbe ihe karịrị iri afọ ise na asaa!

Na 1951, e zigara mụ na Edith ije ozi nwa obere oge na Rock Hill, South Carolina, bụ́ ebe e nwere Ndịàmà ole na ole. Anyị sizi ya gaa Elberton, Georgia, bụ́ ebe anyị jere ozi ruo afọ atọ. Anyị mesịrị laghachi South Carolina, bụ́ ebe m nọrọ site na 1954 ruo 1962. Na Walhalla, ezutere m otu agadi nwanyị na-adịghị anụcha ihe nke ọma nke aha ya bụ́ Nettie, bụ́ onye nanị ya bi n’ime otu obodo dịbara nnọọ n’ime. Ka anyị wee nwee ike ịnọgide na-amụ Bible, ọ na-abụ ọ gụpụta otu paragraf dị n’akwụkwọ anyị na-amụ, mụ atụọrọ ya aka n’ajụjụ paragraf ahụ bụ́ nke dị n’ala ala peeji, mgbe ahụzi ọ na-atụrụ m azịza ya aka na paragraf ahụ.

Ọ bụrụ na e nwere ihe ọ na-aghọtaghị, ọ na-edere m ajụjụ ya n’akwụkwọ, m na-edekwara ya azịza ya n’okpuru ya. Ka oge na-aga, Nettie bịara nwee nnọọ mmasị n’eziokwu Bible nke na ọ malitere ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma. Ọ bụ nanị ya na-aga n’ọnụ ụlọ ndị mmadụ, ma m na-anọkarị nso adịghị ama ama ya achọọ enyemaka.

Ụgbọala m merela ochie mebiri mgbe m nọ na Walhalla. E nwere mgbe m hụrụ ụgbọala m ga-azụ otu narị dọla, ma ejighị m ego m ga-eji zụọ ya. Ebitere m otu Onyeàmà na-azụ ahịa otu narị dọla. Obere oge ka nke ahụ gasịrị, nwanne m nwanyị detaara m akwụkwọ ozi m na-atụghị anya ya, na-akọrọ m na ụmụnne m chọpụtara na e nwere ụfọdụ ego papa m hapụrụ n’ụlọ akụ̀ tupu ya anwụọ. Ha kwurịtara ihe ha ga-eji ya mee, ma kwekọrịta na ha ga-ezitere m ya. Ego ahụ bụ otu narị dọla!

Mụ na Ụmụ M Iso Na-asụ Ụzọ

Mgbe Eddie na Bobby ka dị obere, mụ na ha na-eso mgbe nile aga ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. N’oge ahụ ndị mmadụ amachaghị ihe bụ́ ịṅụ ọgwụ ọjọọ, omume ọjọọ ndị juru ebe nile taa adịchaghịkwa mgbe ahụ. Ibi ndụ n’ụzọ dị mfe na ilekwasị anya n’ozi ọma ahụ nyeere m aka izere ọtụtụ nsogbu ndị nne na nna na-enwe taa ka ha na-azụ ụmụ ha ijere Jehova ozi.

Eddie nọrọ na Camden gụchaa klas nke abụọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, mgbe ọ gụchara, ọ bịaziri chọọ iso m na-asụ ụzọ. Mụ na ya jiri obi ụtọ rụkọọ ọrụ ọsụ ụzọ ruo afọ ụfọdụ. Ọ bịaziri nwee mmasị ịrụ ọrụ n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York, bụ́ ebe o jere ozi site na 1947 ruo 1957. Na 1958 ọ lụrụ Albertha, onye ahụ m mụụrụ Bible, ha abụọ malitekwara ịrụkọ ọrụ ọsụ ụzọ. Ọ bụ nnọọ ihe na-enye obi ụtọ na n’afọ 2004, anyị atọ gakọrọ Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ!

Echetara m ihe mere otu ụbọchị ọtụtụ afọ gara aga mgbe Bobby ka dị obere. A nụrụ m ka ọ na-arịọ Jehova n’ekpere ka o nyere m aka inweta mmanụ ụgbọala ga-ezuru m iji gaa leta ndị m na-amụrụ Bible. Kemgbe Bobby dị obere ruo ugbu a, o nwere nnọọ mmasị n’ịga ozi ọma, ọ bụkwa onye ọsụ ụzọ kemgbe ọtụtụ afọ. Ma ọ dị mwute na ọdachi dakwasịkwara ezinụlọ Bobby. Na 1970, nwunye ya ya na ya lụrụ ruo nanị otu afọ na ọnwa iri na ụmụ ejima ọ dị ime ha nwụrụ mgbe ọ na-amụ ha. Mụ na Bobby biketere nso kemgbe ahụ, anyị abụọ na-emekọkwa nnọọ ihe.

M Ka Na-asụ Ụzọ!

Na 1962, e zigara m n’ọgbakọ m nọ na ya ugbu a na Lumberton, North Carolina, m ka nọ n’ọgbakọ a ka iri afọ anọ na ise gaferela. Anyagidere m ụgbọala m ruo mgbe m gafere iri afọ asatọ. Ugbu a, ọ bụ otu n’ime ezinụlọ Ndịàmà ndị mụ na ha bi nso na-akwọga m ọmụmụ ihe na ozi ọma.

Enwere m mkpara na oche nkwagharị, ma ọ dịghị nke ọ bụla m na-eji eme ihe n’ihi na enwere m ike ịga ije na-ejighị ha. Ana m ekele Jehova na o mere ka m nwee nnọọ ezigbo ahụ́ ike, nanị anya na-enyetụ m nsogbu ugbu a. Ọ dịtụbeghị mgbe m hapụrụ ọmụmụ ihe ma ọ̀ bụghị mgbe ezigbo ọrịa jituru m, m ka nọkwa na-eje ozi dị ka onye ọsụ ụzọ ahụ́ na-esichaghị ike.

Ebe ọ bụ na ejirila m ọṅụ jee ozi dị ka onye ọsụ ụzọ ruo ihe karịrị iri afọ asaa, apụrụ m ikwu n’ezie na Jehova enyerela m aka ná ndụ m nile. * Ama m na abụghị m onye ụbụrụ na-aghọ nnọọ nkọ ma ọ bụ onye dị nnọọ garagara, ma Jehova maara ihe m ga-emeli na ihe m na-agaghị emeli. Ana m ekele ya nnọọ na ọ maara na m na-anwa ike m nakwa na o ji m na-arụ ọrụ.

Eweere m na mmadụ ijere Jehova ozi ruo ókè ike kwere ya dị mkpa n’ihi na ihe nile anyị nwere si n’aka ya. Ruokwa ókè ọ bụla m nwere ike, ọ dịghị ụdị ozi ọzọ m ga-achọ ije ma ọ bụghị ịsụ ụzọ. Nke a bụ nnọọ ihe ùgwù magburu onwe ya! Ekpere m bụ́ ka Jehova jiri m na-arụ ọrụ ruo mgbe ebighị ebi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 30 Nwanna nwanyị Stigers jesịrị ozi elu ala ya n’April 20, 2007, mgbe ọ fọrọ nanị ọnwa atọ ka o ruo otu narị afọ. Ọtụtụ afọ o ji ikwesị ntụkwasị obi jeere Jehova ozi na-agba anyị nnọọ ume, obi dịkwa anyị ụtọ na ọ na-anata ụgwọ ọrụ ya nke bụ́ ịga eluigwe.

[Foto dị na peeji nke 13]

Mụ na di m jiri ụgbọala a rụọ ọrụ ọsụ ụzọ

[Foto dị na peeji nke 14]

Mụ na ụmụ m n’afọ 1941

[Foto dị na peeji nke 15]

Mụ na Eddie na Bobby n’oge na-adịbeghị anya