Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Na-echekwanụ Nche Megide Ụdị Ọchịchọ Anyaukwu Ọ Bụla”

“Na-echekwanụ Nche Megide Ụdị Ọchịchọ Anyaukwu Ọ Bụla”

“Na-echekwanụ Nche Megide Ụdị Ọchịchọ Anyaukwu Ọ Bụla”

“Ọbụna mgbe mmadụ nwere ihe n’ụba, ndụ ya adịghị esi n’ihe ndị o nwere apụta.”—LUK 12:15.

1, 2. (a) Olee ihe ị chọpụtarala ndị mmadụ na-achụso taa? (b) Gịnị mere ọ pụrụ iji dị mfe anyị iso ha kpawa àgwà ndị dị otú a?

EGO, ihe onwunwe, ọkwà dị elu, ọrụ na-enye nnukwu ego, ezinụlọ—ihe ndị a socha n’ihe ndị mmadụ na-ewere na ọ bụ ihe ndị e ji ama onye ihe na-agaziri na onye ihe na-agaghị esiri ike n’ọdịnihu. Ihe àmà na-egosi na ná mba ndị bara ọgaranya na ndị nke dara ogbenye, ndị mmadụ na-achụso nnọọ akụ̀ na ụba, na-adọlịkwa inwe ihe ịga nke ọma. N’aka nke ọzọ, mmasị ha nwere n’ihe ndị metụtara ofufe Chineke—ma ọ bụrụdị na ọ dị nke ha nwere enwe—na-anyụ ka ọkụ.

2 Ọ bụ nnọọ dị ka Bible buru n’amụma. Ọ sịrị: “N’ụbọchị ikpeazụ, oge pụrụ iche nke siri ike obibi gaje ịdị. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, . . . ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya, ndị na-enwe ọdịdị nke nsọpụrụ Chineke ma na-agọnarị ike ya.” (2 Timoti 3:1-5) N’ihi na ezi Ndị Kraịst bi n’etiti ndị na-akpa àgwà ndị dị otú a, a na-arabanyekarị ha ịkpa ụdị àgwà ndị a. Gịnị pụrụ inyere anyị aka iguzogide mgbalị ụwa na-eme ime ‘ka anyị yie ya’?—Ndị Rom 12:2.

3. Olee ndụmọdụ Jizọs nyere nke anyị ga-atụle ugbu a?

3 Dị ka “Onye Nnọchiteanya Ukwu na Onye Mmezu nke okwukwe anyị,” Jizọs Kraịst kụziiri anyị ihe dị ezigbo mkpa banyere anyaukwu. (Ndị Hibru 12:2) N’otu oge, mgbe Jizọs na-akụziri ìgwè mmadụ ihe banyere Chineke, otu nwoke napụrụ ya okwu n’ọnụ ma rịọ ya, sị: “Onye Ozizi, gwa nwanne m nwoke ka mụ na ya kee ihe nketa anyị.” Jizọs nyere nwoke ahụ—na ndị nile na-ege ya ntị—ndụmọdụ gbara ọkpụrụkpụ. Ọ dọrọ nnọọ aka ná ntị megide inwe anyaukwu ma kọọrọ ha akụkọ ga-eme ka ha chee echiche iji mesie ịdọ aka ná ntị ahụ ike. Ọ ga-adị mma ma anyị chebara ihe Jizọs kwuru n’oge ahụ echiche ma hụ otú itinye ihe ndị o kwuru n’ọrụ ná ndụ anyị pụrụ isi baara anyị uru.—Luk 12:13-21.

Arịrịọ Na-ekwesịghị Ekwesị

4. N’ihi gịnị ka nwoke ahụ na-ekwesịghị iji napụ Jizọs okwu n’ọnụ?

4 Tupu nwoke ahụ anapụ Jizọs okwu n’ọnụ, Jizọs nọ na-agwa ndị na-eso ụzọ ya na ndị ọzọ mkpa ọ dị izere omume ihu abụọ, na mkpa ọ dị ịkata obi kwupụta na ha na Nwa nke mmadụ dị n’otu, nakwa mkpa ọ dị inweta enyemaka nke mmụọ nsọ. (Luk 12:1-12) N’ezie, ihe ndị a bụ ihe ndị dị oké mkpa ndị na-eso ụzọ ya na-ekwesịghị iji gwurie egwu. Ọ bụ nnọọ ka Jizọs nọ na-akụzi ihe ndị a na-akpali mmadụ ichebara onwe ya echiche ka nwoke ahụ napụrụ ya okwu n’ọnụ ma rịọ ya ka ọ bịa kpeziere ya na nwanne ya n’okwu banyere ihe onwunwe. Ma, e nwere ihe dị mkpa anyị pụrụ ịmụta site n’ihe a merenụ.

5. Gịnị ka ihe ahụ nwoke ahụ rịọrọ na-agwa anyị banyere nwoke ahụ?

5 Otu akwụkwọ kwuru na “ihe e ji ama ụdị onye mmadụ bụ bụ ebe uche ya na-aga mgbe a na-ekwu ihe banyere Chineke.” Eleghị anya, ka Jizọs nọ na-ekwu ihe ga-enyere mmadụ aka ime ka ya na Chineke dịrị ná mma, nwoke ahụ nọ na-eche ihe ọ ga-eme iji nwetakwuo ego. Bible ekwughị ma nwoke ahụ ò nwere ezi ihe mere o ji na-ewe iwe banyere ihe nketa ya. Ikekwe n’ihi na ọ maara na Jizọs nwere ikike ma bụrụkwa onye maara otú e si edozi okwu, ọ chọrọ iji ohere a rịọta enyemaka ya. (Aịsaịa 11:3, 4; Matiu 22:16) Ihe ọ sọkwara ya ya bụrụ ya mere o ji rịọ ihe ọ rịọrọ, arịrịọ ya gosiri na o nwere ezigbo nsogbu—o jighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. Nke a ọ́ bụghị ezi ihe mere anyị ga-eji nyochaa onwe anyị? Dị ka ihe atụ, mgbe anyị nọ n’ọmụmụ ihe, ọ dị mfe ikwe ka uche anyị na-awagharị, dịrịkwa mfe ikwe ka uche anyị dịrị n’ihe ndị anyị ga-eme ma a gbasaa ọmụmụ ihe. Kama ime otú a, anyị kwesịrị ịṅa ntị n’ihe a na-ekwu ma chee otú anyị pụrụ isi tinye ha n’ọrụ ná ndụ anyị ka anyị wee nwee ike ime ka anyị na Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova Chineke, na Ndị Kraịst ibe anyị, dịkwuo ná mma.—Abụ Ọma 22:22; Mak 4:24.

6. Gịnị mere Jizọs ekweghị eme ihe ahụ nwoke ahụ rịọrọ ya?

6 N’agbanyeghị ihe kpaliri nwoke ahụ ịrịọ arịrịọ a, Jizọs jụrụ ime ihe ọ rịọrọ. Kama ime ihe ọ rịọrọ, Jizọs gwara ya, sị: “Nwoke m, ònye mere m ọkàikpe ma ọ bụ onye na-ekere unu ihe?” (Luk 12:14) Ndị nọ n’ebe ahụ mgbe Jizọs kwuru nke a ghọtara ihe o kwuru nke ọma n’ihi na dị ka Iwu Mozis kwuru, a na-ahọpụta ndị ikpe n’obodo dị iche iche ilebara ụdị okwu ahụ nwoke ahụ welitere anya. (Deuterọnọmi 16:18-20; 21:15-17; Rut 4:1, 2) Ma e nwere ihe ọzọ ka mkpa Jizọs nwere ime—ịgba àmà banyere Alaeze ahụ na ịkụziri ndị mmadụ ihe bụ́ uche Chineke. (Jọn 18:37) Dị ka Jizọs mere, kama ikwe ka ihe nke ụwa na-adọpụ uche anyị, anyị kwesịrị iji oge na ume anyị na-ekwusa ozi ọma ahụ ma ‘na-eme ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.’—Matiu 24:14; 28:19.

Na-eche Nche Megide Inwe Anyaukwu

7. Gịnị ka Jizọs kwuru nke na-enyere anyị aka ịghọta ihe bụ́ nsogbu nwoke ahụ?

7 Ebe ọ bụ na Jizọs nwere ike ịghọta ihe dị mmadụ n’obi, ọ maara na e nwere ihe dị nnọọ njọ n’arịrịọ ahụ nwoke ahụ rịọrọ ka ọ bịa kpeziere ya na nwanne ya. Ya mere, Jizọs akwụsịghị nanị n’ịjụ ime ihe nwoke ahụ rịọrọ kamakwa o kwuru kpọmkwem ihe mere nwoke ahụ ji rịọ ihe ahụ ọ rịọrọ. Jizọs sịrị: “Ghewenụ anya unu oghe, na-echekwanụ nche megide ụdị ọchịchọ anyaukwu ọ bụla, n’ihi na ọbụna mgbe mmadụ nwere ihe n’ụba, ndụ ya adịghị esi n’ihe ndị o nwere apụta.”—Luk 12:15.

8. Gịnị bụ anyaukwu, gịnịkwa ka ọ pụrụ iduga na ya?

8 Anyaukwu abụghị nanị mmadụ ịchọ inwe ego ma ọ bụ ihe ụfọdụ, bụ́ ihe ndị a pụrụ iji mee ihe bara uru. Dị ka otu akwụkwọ ọkọwa okwu si kọwaa ya, anyaukwu bụ “mmadụ inwe oké ọchịchọ ịba ọgaranya ma ọ bụ ịchọ inweta ihe onye ọzọ.” Ọ pụrụ ịgụnye mmadụ inwe ogologo akpịrị inweta ihe ụfọdụ—ikekwe ihe ndị na-abụghị nke ya. Onye dị otú a pụrụ ịchọ inweta ihe ndị a, ọ bụghị n’ihi na ha dị ya mkpa, kama ka e wee sịkwa nnọọ na o nwere ha. Onye anyaukwu adịghị ihe ọzọ ọ na-eche ma ọ bụghị ihe ahụ ọ chọrọ inweta, ọ na-agbalịkwa ihe nile o nwere ike ime iji nweta ya nke na, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ihe ahụ na-aghọrọ ya chi. Cheta na Pọl onyeozi kwuru na onye anyaukwu bụ onye na-ekpere arụsị, nke na-enweghị ihe nketa ọ bụla n’Alaeze Chineke.—Ndị Efesọs 5:5; Ndị Kọlọsi 3:5.

9. Olee ụzọ mmadụ pụrụ isi gosi na ya dị anyaukwu? Nye ihe atụ ụfọdụ.

9 Ọ dị mma ịmara na Jizọs dọrọ aka ná ntị megide “ụdị anyaukwu ọ bụla.” E nwere ụdị anyaukwu dị iche iche. Iwu nke ikpeazụ n’Iwu Iri ahụ kọwara ụfọdụ n’ime ha mgbe o kwuru, sị: “Gị enwela anyaukwu n’ebe ụlọ mmadụ ibe gị dị, gị enwela anyaukwu n’ebe nwunye mmadụ ibe gị nọ, ma ọ bụ n’ebe ohu ya nwoke nọ, ma ọ bụ n’ebe ohu ya nwanyị nọ, ma ọ bụ n’ebe ehi ya dị, ma ọ bụ n’ebe ịnyịnya ibu ya dị, ma ọ bụ n’ebe ihe ọ bụla dị nke mmadụ ibe gị nwere.” (Ọpụpụ 20:17) Akụkọ banyere ndị dabara ná mmehie dị oké njọ n’ihi ụdị dị iche iche nke anyaukwu, juru na Bible. Setan bụ onye mbụ chọrọ inweta ihe dịịrị onye ọzọ, ya bụ, otuto, nsọpụrụ na ikike nke dịịrị nanị Jehova. (Mkpughe 4:11) Ọ gụsiri Iv agụụ ike inwe ikike ikpebiri onwe ya ihe ọ ga na-eme, nduhie e duhiere ya n’ihi nke a mere ndị mmadụ ji na-eme mmehie ma na-anwụ anwụ taa. (Jenesis 3:4-7) Ndị mmụọ ọjọọ bụ ndị mmụọ ozi kwụsịrị inwe afọ ojuju maka “ebe mbụ ha kama gbahapụ ebe obibi ha kwesịrị ekwesị” ma chọọ inweta ihe a na-ekeghị ha inweta. (Jud 6; Jenesis 6:2) Chetakwa Belam, Ekan, Gehezaị, na Judas. Kama ihe ha nwere iju ha afọ, ha kwere ka oké ọchịchọ nke inweta ihe onwunwe mee ka ha ghọọ nkịta tara ọkpụkpụ a nyawara ya n’olu, si otú ahụ kpatara onwe ha mbibi.

10. Olee otú anyị kwesịrị isi ‘ghewe anya anyị oghe’ dị ka Jizọs dụrụ n’ọdụ?

10 N’ezie, o kwesịrị nnọọ ekwesị na Jizọs ji okwu bụ́ “ghewenụ anya unu oghe” malite ịdọ aka ná ntị ahụ o nyere megide inwe anyaukwu. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ dị mfe mmadụ ịhụ na onye ọzọ nwere anyaukwu, ma ọ na-esi ike onye ahụ ekweta na ya nwere anyaukwu. N’agbanyeghị nke ahụ, Pọl onyeozi kwuru na “ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ nile.” (1 Timoti 6:9, 10) Jems onye na-eso ụzọ kọwara na ọ bụrụ na ọchịchọ ọjọọ ‘atụrụ ime, ọ na-amụpụta mmehie.’ (Jems 1:15) Dị ka Jizọs dụrụ anyị ọdụ, anyị kwesịrị ‘ighewe anya anyị oghe,’ ọ bụghị iji mara ma ndị ọzọ hà nwere anyaukwu, kama ọ bụ iji nyochaa obi anyị ma mara ihe dị anyị n’obi iji wee nwee ike ‘iche nche megide ụdị ọchịchọ anyaukwu ọ bụla.’

Inwe Ihe n’Ụba

11, 12. (a) Olee ịdọ aka ná ntị Jizọs nyere megide inwe anyaukwu? (b) N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị Jizọs?

11 E nwekwara ihe ọzọ mere anyị ga-ejirịrị na-eche nche megide inwe anyaukwu. Rịba ama ihe ọzọ Jizọs kwuru: “Ọbụna mgbe mmadụ nwere ihe n’ụba, ndụ ya adịghị esi n’ihe ndị o nwere apụta.” (Luk 12:15) N’ezie okwu a kwesịrị ka anyị chebara ya echiche, karịsịa n’oge a ndị mmadụ na-achụ ihe onwunwe ka à na-anwụ anwụ ma na-ele akụ̀ na ụba na ọkwá dị elu anya dị ka ihe na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ na ihe e ji ama onye ihe na-agaziri. Site n’okwu a Jizọs kwuru, ọ na-egosi na ọ bụghị inwe ihe onwunwe n’ụba na-eme ka mmadụ bie ndụ nwere isi na nke na-eju afọ.

12 Ma ụfọdụ ndị nwere ike ha agaghị ekwere ihe a Jizọs kwuru. Ha nwere ike ịsị na ihe onwunwe na-eme ka ndụ na-atọkwu ụtọ obibi ma nwee isi. N’ihi nke a, ha na-eji oge ha nile achụ ihe ndị ga-eme ka ha nweta ihe onwunwe na ngwá eletrọniks nile ha chọrọ. Ha na-eche na ihe ndị a ga-eme ka ndụ na-atọ ha ụtọ. Ma inwe echiche dị otú ahụ na-eme ka ha ghara ịghọta ihe Jizọs na-ekwu.

13. Olee otú e kwesịrị isi na-ele ndụ na ihe onwunwe anya?

13 Kama ịga kwuwe ma ò ziri ezi ka ọ̀ bụ na o zighị ezi mmadụ inwe ọtụtụ ihe onwunwe, ihe Jizọs na-ekwu bụ na ndụ mmadụ adịghị esi “n’ihe o nwere apụta,” ya bụ, n’ihe ndị o nwerela enwe. Ya mere, anyị nile maara na ọ dịghị mkpa mmadụ inwe ọtụtụ ihe iji bie ndụ ma ọ bụ iji nọgide na-adị ndụ. Nanị ihe dị mkpa bụ obere ihe oriri, uwe a ga-eyi n’ahụ́, na ebe a ga-ehi ụra. Ndị ọgaranya nwere ihe ndị a n’ụba, ma ndị ogbenye na-adọga iji nweta ihe dị ha mkpa. Ma adịghị ama ihe dị iche mgbe ọnwụ bịara—ihe nile na-aghọ ihe efu. (Eklisiastis 9:5, 6) N’ihi ya, ka ndụ wee nwee isi, o kwesịghị ihiwe isi n’ihe mmadụ pụrụ ịkpata ma ọ bụ ihe mmadụ nwere. Ihe a Jizọs kwuru na-edokwu anya ma ọ bụrụ na anyị enyochaa ụdị ndụ Jizọs na-ekwu okwu ya.

14. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’okwu ahụ a sụgharịrị ịbụ “ndụ” na Luk 12:15?

14 Mgbe Jizọs kwuru na ‘ndụ mmadụ adịghị esi n’ihe ndị o nwere apụta,’ okwu Grik (zo·eʹ) o ji mee ihe nke a sụgharịrị ịbụ “ndụ” n’Oziọma Luk, na-ezo aka ná ndụ n’onwe ya ọ bụghị n’ụdị ndụ onye ahụ na-ebi. Ihe Jizọs na-ekwu bụ na ma ànyị bara ọgaranya ma ànyị dara ogbenye, ma ànyị na-ekpori ndụ ma ànyị na-adọga iji kpata ihe anyị ga-eri, ọ dịghị anyị n’aka ikpebi afọ ole anyị ga-adịru ndụ, ọ dịghịdị anyị n’aka ikpebi ma ànyị ga-adị ndụ echi. Jizọs kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ya, sị: “Ònye n’ime unu pụrụ ịgbakwụnye otu kubit ná ndụ ya site n’ichegbu onwe ya?” (Matiu 6:27) Bible mere ka o doo nnọọ anya na ọ bụ nanị Jehova bụ “isi iyi nke ndụ,” ọ bụkwa nanị ya pụrụ inye ndị kwesịrị ntụkwasị obi “ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie,” ma ọ bụ “ndụ ebighị ebi,” ndụ na-enweghị ọgwụgwụ n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa.—Abụ Ọma 36:9; 1 Timoti 6:12, 19.

15. Gịnị mere ọtụtụ ndị ji atụkwasị ihe onwunwe obi?

15 Okwu Jizọs na-egosi otú o si dị mfe ndị mmadụ inwe echiche na-ezighị ezi banyere ndụ. Ma mmadụ ọ̀ bara ọgaranya ma ọ̀ dara ogbenye, anyị nile bụ mmadụ na-ezughị okè, otu ihe ndabara na-adabakwara anyị nile. Nna ochie bụ́ Mozis kwuru, sị: “Ụbọchị afọ nile anyị dị [iri afọ asaa]; ma ọ bụrụ na ha esite n’ịdị ike anyị ruo [iri afọ asatọ], otú ọ dị, nganga ha bụ nanị ịdọgbu onwe ha n’ọrụ na ajọ ihe; n’ihi na ọ gbapụwo ọsọ ọsọ, anyị wee felaa dị ka nnụnụ.” (Abụ Ọma 90:10; Job 14:1, 2; 1 Pita 1:24) N’ihi ya, ndị ha na Chineke na-adịghị ná mma na-enwekarị ụdị echiche Pọl onyeozi kwuru okwu ya nke bụ́ “ka anyị rie ma ṅụọ, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.” (1 Ndị Kọrint 15:32) Ndị ọzọ na-achọ inweta ihe onwunwe iji mee ka ndụ ha gbatịkwuo ebe ha maara na e jighị ndụ n’aka. Ikekwe ha chere na inwe ihe onwunwe nwere ike imetụ ka ha ghara ịnwụ ngwa ngwa. N’ihi ya, ha na-adọlịgbu onwe ha ịkpakọba ego na ihe onwunwe, na-eche echiche na-ezighị ezi bụ́ na ihe ndị dị otú ahụ ga-eme ka ndụ ha gbatịkwuo ma wetara ha obi ụtọ.—Abụ Ọma 49:6, 11, 12.

Ọdịnihu Ka Mma

16. Na gịnị ka ibi ndụ obi ụtọ na-adabereghị?

16 Ọ bụ eziokwu na inwe akụ̀ na ụba—inwe ihe oriri, uwe, ụlọ obibi, na ihe ndị ọzọ e ji enyere ndụ aka n’ụba—pụrụ ime ka mmadụ nwee ike ịtụ ndụ mmanụ ma ọ bụ mee ka onye ahụ nwee ike ịgwọ onwe ya n’ụzọ ka mma mgbe ọrịa bịara ya, si otú ahụ tụkwasịkwuo afọ ole na ole ná ndụ ya. Ma, ụdị ndụ dị otú ahụ ọ̀ bụ nke na-enyekwu obi ụtọ na nke ka mma? E jighị afọ ole mmadụ dịrị ndụ ma ọ bụ ụdị ihe onwunwe o nwere amata onye na-ebi ndụ na-enye obi ụtọ. Pọl onyeozi kọwara nsogbu na-esi ná mmadụ ịtụkwasị ihe ndị dị otú a obi apụta. O degaara Timoti akwụkwọ ozi, sị: “Na-enye ndị bara ọgaranya n’usoro ihe dị ugbu a iwu ka ha ghara inwe anya dị elu, ka ha tụkwasịkwa olileanya ha, ọ bụghị n’akụ̀ na ụba ndị a na-ejighị n’aka, kama na Chineke, onye na-enye anyị ihe nile n’ụba ka anyị wee nwee ọṅụ.”—1 Timoti 6:17.

17, 18. (a) Olee ndị anyị kwesịrị iṅomi mgbe a bịara n’ihe banyere ihe onwunwe? (b) Olee ilu Jizọs nke anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

17 Ọ bụ ihe amamihe na-adịghị na ya mmadụ ịtụkwasị olileanya ya n’akụ̀ na ụba n’ihi na ‘ejighị akụ̀ na ụba n’aka.’ Nna ochie ahụ bụ́ Job bara ọgaranya, ma mgbe ọdachi dakwasịrị ya ná mberede, akụ̀ na ụba ya enyelighịrị ya aka; ha nile funyụrụ anya ná mberede. Ọ bụ mmekọrịta chiri anya nke ya na Chineke nyeere ya aka n’oge ọnwụnwa nile ahụ bịara ya. (Job 1:1, 3, 20-22) Ebreham ekweghị ka akụ̀ na ụba ya gbochie ya ịnakwere ọrụ siri ike nke Jehova nyere ya, a gọzikwara ya site n’ime ka ọ ghọọ “nna nke ìgwè mba.” (Jenesis 12:1, 4; 17:4-6) Anyị kwesịrị iṅomi ihe nlereanya ndị a na ndị ọzọ. Ma ànyị ka na-eto eto ma ànyị emeela agadi, anyị kwesịrị inyocha onwe anyị iji mara ihe dị anyị mkpa n’ezie ná ndụ marakwa ebe olileanya anyị dabeere.—Ndị Efesọs 5:10; Ndị Filipaị 1:10.

18 Ihe ole na ole ndị a Jizọs kwuru banyere inwe anyaukwu nakwa banyere otú e kwesịrị isi na-ele ndụ anya bara uru ma na-akụzi ihe n’ezie. Ma Jizọs nwere ihe ọzọ ọ chọrọ ịgwa anyị, ọ gakwara n’ihu ịtụ ilu na-akpali mmadụ iche echiche, banyere otu ọgaranya na-enweghị uche. Olee otú ilu ahụ si gbasa ndụ anyị na-adị taa, oleekwa ihe anyị pụrụ isi na ya mụta? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.

Gịnị Bụ Azịza Gị?

• Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ọjụjụ Jizọs jụrụ ime ihe otu nwoke so na-ege ya ntị rịọrọ?

• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị iche nche megide inwe anyaukwu, oleekwa otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ?

• Gịnị mere ndụ adịghị esi n’ihe onwunwe apụta?

• Gịnị pụrụ ime ka ndụ dị ụtọ n’ezie ma ka mma?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 23]

Gịnị mere Jizọs emeghị ihe otu nwoke rịọrọ ya?

[Foto dị na peeji nke 23]

Inwe anyaukwu pụrụ ịkpatara mmadụ ọdachi

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

Olee otú Ebreham si gosi na ya na-ele akụ̀ na ụba anya dị ka o kwesịrị?