Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okwukwe nke Otu Nne Nyeere Ya Aka Idi Obi Mgbawa

Okwukwe nke Otu Nne Nyeere Ya Aka Idi Obi Mgbawa

Okwukwe nke Otu Nne Nyeere Ya Aka Idi Obi Mgbawa

“Ọ bụrụ na unu na-agụ akwụkwọ ozi a, ọ pụtara na m nwụrụ mgbe a na-awa m ahụ́ nakwa na mụ na unu agaghịzi anọ.”

NKE a bụ otú otu nne bụ́ Onye Kraịst, onye aha ya bụ Carmen, si malite akwụkwọ ozi o degaara ụmụ ya nwanyị atọ. Otu dị afọ iri abụọ na ise, nke ọzọ dị afọ iri na itoolu, ebe nke atọ dị afọ iri na isii. Ọ dị mwute na Carmen mesịrị nwụọ ka a na-awa ya ahụ́.

Ọ na-agbawa obi onye bụ́ nne ịma na ya na-aga ịkpatara ụmụ ya nwanyị atọ oké iru uju dị otú a. Ma, okwukwe siri ike nne a nwere n’ebe Jehova nọ na ná nkwa ya, nyeere ya aka idi obi mgbawa a. Okwukwe ya mere ka o nwee obi iru ala, bụ́ nke pụtara nnọọ ìhè n’akwụkwọ ozi ya na-agba anya mmiri. Lee ihe ọ gwara ụmụ ya atọ.

“Ihe mbụ m chọrọ ịgwa unu bụ na ahụrụ m unu n’anya nke ukwuu. . . . Unu bụ ụmụ kasị mma nne ọ bụla ga-achọ inwe, ejikwa m nnọọ unu eme ọnụ.

“Ọ gaara amasị m ka mụ na unu nọrọ ruo mgbe ụwa ọhụrụ ahụ Chineke kwere ná nkwa ga-abịa . . . , ma ebe nke ahụ na-agaghịzi enwe isi, arịọla m Jehova ka o nyere unu aka ka unu nwee ike ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi dị ka unu na-eme. Mụ na unu ediela ọtụtụ ule, ọ dịbeghịkwa mgbe Jehova gbahapụrụ anyị. . . . N’ihi ya, nọgidenụ na-anakwere nduzi ọ na-enye site ná nzukọ ya, nọgidekwanụ na-akwado ọgbakọ na ndị okenye. Na-agachinụ ozi ọma anya ruo okè unu nwere ike, na-ahụkwanụ ụmụnna nile n’anya.

“Nkewa a dị n’etiti anyị ugbu a agaghị adịte aka. . . . Ana m arịọ unu ka unu gbaghara m ebe nile m mejọrọ unu, gbagharakwanụ m oge nile m ghọtahiere unu ma ọ bụ oge ndị m na-agwaghị unu na m hụrụ unu n’anya. . . . Ama m na onye ọ bụla n’ime unu nwere mkpa nke ya. Jehova maara nke a karịa ka onye ọ bụla n’ime unu maara, ọ ga-enyekwa unu ihe nile dị unu mkpa ma kwụghachi unu ụgwọ maka ihe nile unu diworo.

“Unu echefula ihe mgbaru ọsọ unu, nke bụ́ ibi n’ime ụwa ọhụrụ ahụ, na-agbalịsikwanụ ike ịbanye n’ime ya. Ka Jehova gọzie unu ma nye unu ume ka unu wee nwee ike ikwesị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ. . . . Ya ewutela unu, ụmụ ọma m. Ahụrụ m unu n’anya!”

Ọdachi pụrụ ịdakwasị mmadụ mgbe ọ na-atụghị anya ya. Eze Solomọn oge ochie dere, sị: “Mgbe na ihe ndapụta na-adabara ha nile.” (Eklisiastis 9:11) Otú ọ dị, ndị nwere okwukwe siri ike n’ebe Chineke nọ nwere ụdị obi ike Pọl onyeozi nwere mgbe ọ sịrị: “Ekwetara m na ọnwụ ma ọ bụ ndụ . . . ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke agaghị enwe ike ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke nke dị n’ime Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.”—Ndị Rom 8:38, 39; Ndị Hibru 6:10.