Ì Chetara?
Ì Chetara?
Ọ̀ tọrọ gị ụtọ ịgụ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Ọ dị mma, lee ma ị̀ pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:
• Olee ihe anọ “ọgbakọ” pụtara n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst?
Ihe bụ́ isi ọ pụtara bụ ìgwè ndị na-eso ụzọ Kraịst e tere mmanụ (ọ na-agụnye Kraịst n’amaokwu ụfọdụ). N’ebe ndị ọzọ, “ọgbakọ Chineke” na-apụta Ndị Kraịst dị ndụ n’otu oge. Ihe nke atọ ọ pụtara bụ Ndị Kraịst nile nọ n’otu ógbè. Ọ pụkwara ịpụta Ndị Kraịst nọ n’otu ọgbakọ.—4/15, peeji nke 21-23.
• Olee mgbe a kwụsịrị ịhọrọ Ndị Kraịst ga-aga eluigwe?
Bible enyeghị azịza a kapịrị ọnụ maka ajụjụ a. A malitere ịhọrọ ha n’afọ 33 O.A., a nọgidekwara na-ahọrọ ha ruo oge anyị a. Mgbe afọ 1935 gasịrị, nzube bụ́ isi e ji na-ekwusa ozi ọma bụzi iji chịkọta ndị ga-emejupụta oké ìgwè mmadụ ahụ. Ebe ọ bụ na mmụọ nsọ gbaara ụfọdụ Ndị Kraịst e mere baptizim n’afọ ndị sochiri 1935 àmà na ha ga-aga eluigwe, anyị enweghị ike ikwu kpọmkwem afọ a kwụsịrị ịhọrọ ha. Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị e tere mmanụ enweghị mmụọ nsọ Chineke karịa ka ndị ibe ha so n’atụrụ ọzọ ahụ nwere, ha anaghịkwa atụ anya ka a na-emeso ha ihe n’ụzọ pụrụ iche. Ọ dị Ndị Kraịst mkpa ịkwesị ntụkwasị obi na ịnọgide na-eme uche Chineke n’agbanyeghị ihe bụ́ olileanya ha.—5/1, peeji nke 30-31.
• Mgbe Jefta kwere Chineke nkwa, ihe o bu n’obi ọ̀ bụ iji ada ya chụọrọ Chineke àjà nsure ọkụ?
Ee e. Ihe Jefta bu n’obi bụ na ya ga-arara onye zutere ya nye ijere nanị Chineke ozi, bụ́ nke Iwu Mozis kwadoro. (1 Samuel 2:22) Ada Jefta nọgidere na-eje ozi n’ụlọikwuu ahụ iji mezuo nkwa nna ya, àjà dị otú ahụ ọ chụrụ abụghị obere ihe, n’ihi na ọ pụtara na ọ dịghị mgbe ọ ga-alụ di.—5/15, peeji nke 9-10.
• Olee ọrụ codex rụrụ ná mmalite Iso Ụzọ Kraịst?
O yiri ka ọ bụ akwụkwọ mpịakọta ka Ndị Kraịst jikarịrị mee ihe ruo ná ngwụsị nke narị afọ mbụ O.A. Malite na narị afọ nke abụọ O.A., ndị na-akwado ka e jiri codex na-eme ihe na ndị nke kwadoro ka a nọgide jiri akwụkwọ mpịakọta na-eme ihe nwere arụmụka kpụ ọkụ n’ọnụ. Ndị ọkà mmụta kweere na ojiji Ndị Kraịst jiri codex mee ihe nyere aka nke ukwuu n’ime ka ọtụtụ ndị malitezie iji ya na-eme ihe.—6/1, peeji nke 14-15.
• Gịnị bụ Kalenda Giza?
Ọ bụ otu mbadamba nkume e dere ihe n’elu ya, bụ́ nke a chọtara n’afọ 1908 ná mkpọmkpọ ebe nke obodo Giza. Ọtụtụ ndị weere ya dị ka ihe omume e nyere nwa akwụkwọ ka o mee n’ụlọ. Nkume ahụ kọwara ụzọ ka mfe isi depụta oge ihe ubi e nwere n’afọ, malite n’oge ịchịkọta ihe n’ubi n’ọnwa kwekọrọ na September na October, ọ kọwakwara ihe ọkụkụ dị iche iche a na-akụ n’ubi na ihe ndị a na-eme n’oge ọrụ ubi.—6/15, peeji nke 8.
• Olee ihe imehie megide mmụọ nsọ pụtara?
Mmadụ nwere ike imehie megide mmụọ nsọ Jehova, bụ́ mmehie na-enweghị mgbaghara. (Matiu 12:31) Ọ bụ Chineke ka ọ dịịrị ikpebi ma ànyị emeela mmehie na-enweghị mgbaghara, ọ pụkwara ịnara anyị mmụọ ya. (Abụ Ọma 51:11) Ọ bụrụ na mmehie anyị mere na-ewute anyị nke ukwuu, ọ pụrụ ịpụta nnọọ na anyị echegharịala, n’ihi ya kwa, anyị emehiebeghị megide mmụọ nsọ.—7/15, peeji nke 16-17.
N’ihi gịnị ka Eze Sọl ji jụọ onye mụrụ Devid n’agbanyeghị na ya na Devid ebula ụzọ nọọ? (1 Samuel 16:22; 17:58)
Ọ bụghị nanị aha nna Devid ka Sọl chọrọ ịmara. Ebe ọ bụ na Sọl ahụla Devid dị ka onye nwere okwukwe na obi ike, bụ́ onye ka merisịrị Golaịat, Sọl chọrọ ịma ụdị nwoke mụrụ nwatakịrị nwoke dị otú a. E nwere ike Sọl bu n’uche ime ka Jesi ma ọ bụ ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ ahụ sonye ná ndị agha.—8/1, peeji nke 31.