Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iso Ụzọ Kraịst Erute n’Eshia Maịnọ

Iso Ụzọ Kraịst Erute n’Eshia Maịnọ

Iso Ụzọ Kraịst Erute n’Eshia Maịnọ

NA Narị Afọ Mbụ O.A., e nwere ọtụtụ ọgbakọ Ndị Kraịst n’Eshia Maịnọ (nke ihe ka ukwuu n’ókèala ya dị n’ime mba Turkey nke oge a). Ọtụtụ ndị Juu na ndị Jentaịl nabatara ozi Ndị Kraịst. Otu akwụkwọ na-akọwa okwu ndị dị na Bible kwuru, sị: “E wezụga na Siria-Palestaịn, ọ bụ Eshia Maịnọ bụ ebe mbụ okpukpe Ndị Kraịst kasị gbasaa.”

Anyị ga-enwe ike ịmata otú Izo Ụzọ Kraịst si gbasaa n’ógbè a site n’ijikọta akụkọ sitere n’ebe dị iche iche. Ka anyị lee otú anyị nwere ike isi rite uru site n’ịtụle akụkọ ndị e nwere.

Ndị Kraịst Mbụ E Nwere n’Eshia Maịnọ

Ihe mbụ dị ịrịba àmà merenụ n’ihe banyere mgbasa nke Iso Ụzọ Kraịst n’Eshia Maịnọ mere na Pentikọst 33 O.A. mgbe ìgwè ndị na-asụ asụsụ dị iche iche nke gụnyere ndị Juu bi ná mba ọzọ (ndị Juu na-ebighị na Palestaịn) na ndị na-eso ụzọ ndị Juu gbakọrọ na Jeruselem. Ndịozi Jizọs ziri ndị a bịara abịa ozi ọma. Ihe ndekọ nke ihe mere n’ụbọchị ahụ kwuru na ụfọdụ si Kapadoshia, Pọntọs, ógbè Eshia, * Frijia, na Pamfilia—ógbè ndị mejupụtara ebe kasịnụ n’Eshia Maịnọ. Ihe dị ka puku mmadụ atọ bụ́ ndị gere ntị n’ozi Ndị Kraịst nabatara ya, e meekwa ha baptizim. Ha bu okpukpe ọhụrụ ahụ ha nabatara laa.—Ọrụ 2:5-11, 41.

Ihe ọzọ Bible kọọrọ anyị banyere Eshia Maịnọ dị n’ihe ndekọ banyere njem ozi ala ọzọ ndị Pọl onyeozi mere n’Eshia Maịnọ. Na njem mbụ Pọl mere n’ihe dị ka n’agbata afọ 47 na 48 O.A., ya na ndị ọrụ ibe ya ji ụgbọ mmiri site na Saịprọs gaa Eshia Maịnọ, kwụsị na Paga nke dị na Pamfilia. N’ime ime obodo Antiọk dị na Pisidia, ihe ịga nke ọma ha nwere n’ikwusa ozi ọma kpaliri ndị Juu imere ha anyaukwu na imegide ha. Mgbe Pọl gawara n’ebe ndịda nke ebe ọwụwa anyanwụ ịga Aịkoniọm, ndị Juu ndị ọzọ gbara izu ime ndị ozi ala ọzọ ahụ akaje. Ndị obodo Listra dị nso n’ebe ahụ bụ́ ndị na-agbanwe obi ha ngwa ngwa bu ụzọ kpọọ Pọl chi. Ma mgbe ndị Juu na-emegide Pọl si n’Antiọk na Aịkoniọm bịa, ìgwè mmadụ si n’obodo ahụ tụgidere Pọl nkume ma hapụ ya mgbe ha chere na ọ nwụọla! Mgbe nke ahụ gasịrị, Pọl na Banabas gaziri Dabe nke dị n’ógbè ndị Rom na-achị bụ́ Galeshia, bụ́ ebe ndị mmadụ na-asụ asụsụ ndị Likeonia. E hiwere ọgbakọ dị iche iche, ma họpụta ndị okenye na ha. Nke a ga-eme ka ị hụ na nanị ihe dị ka afọ 15 Pentikọst 33 O.A. gasịrị, Iso Ụzọ Kraịst agbanyela mkpọrọgwụ n’Eshia Maịnọ.—Ọrụ 13:13–14:26.

Na njem nke abụọ Pọl mere n’ihe dị ka afọ 49 ruo 52 O.A., ya na ndị ya na ha so buru ụzọ mee njem okporo ụzọ gaa Listra, eleghị anya gafee obodo ya bụ́ Tasọs dị na Silaịshia. Mgbe ha letaghachichara ụmụnna nọ na Listra ma gawa n’ebe ugwu, Pọl nwara “ikwu okwu ahụ” n’ógbè Bitinia na Eshia. Otú ọ dị, mmụọ nsọ ekweghị ya. A ga-ekwusa ozi ọma n’ógbè ndị ahụ ma e mesịa. Kama nke ahụ, Chineke duuru Pọl si n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ nke Eshia Maịnọ gaa Troas, bụ́ obodo dị n’ụsọ osimiri. Mgbe ahụ a gwara Pọl n’ọhụụ ka ọ gaa kwusaa ozi ọma na Europe.—Ọrụ 16:1-12; 22:3.

Na njem nke atọ Pọl mere n’ihe dị ka afọ 52 ruo 56 O.A., o sikwa Eshia Maịnọ gaa Efesọs, bụ́ obodo nwere ọdụ ụgbọ mmiri a ma ama n’Eshia. Ọ kwụsịrị ebe ahụ mgbe o si njem nke abụọ ya lọta. Otu ìgwè Ndị Kraịst nọ na-ekwusa ozi ọma n’obodo ahụ, Pọl na ndị ha na ya so sonyeere ìgwè ahụ ruo ihe dị ka afọ atọ. Pọl nwere ọtụtụ ihe isi ike, cheekwa ọtụtụ ihe ize ndụ ihu n’oge ahụ ọ nọrọ n’ebe ahụ, nke otu n’ime ha bụ ọgba aghara nke ndị Efesọs na-akpụ ọlaọcha malitere iji chebe ọrụ ịkpụ arụsị nke ha ji akpa ego.—Ọrụ 18:19-26; 19:1, 8-41; 20:31.

O doro anya na ozi ala ọzọ a ọ nọ n’Efesọs jee nwere ihe ịga nke ọma. Ọrụ 19:10 kwuru, sị: “Ndị nile bi n’ógbè Eshia nụrụ okwu Onyenwe anyị, ma ndị Juu ma ndị Grik.”

Ihe Ndị Mere n’Eshia Maịnọ

Mgbe oge Pọl ji apụ n’Efesọs na-eru nso, o degaara Ndị Kọrint akwụkwọ ozi, sị: “Ọgbakọ ndị dị n’Eshia na-ezitere unu ekele ha.” (1 Ndị Kọrint 16:19) Olee ọgbakọ ndị Pọl na-ekwu banyere ha? Eleghị anya ọ gụnyere ndị nke dị na Kọlọsi, Leodisia, na Haịrapọlis. (Ndị Kọlọsi 4:12-16) Akwụkwọ bụ́ Paul—His Story kwuru, sị: “O yiri ka ọ̀ bụ ndị Efesọs gara ozi ala ọzọ mere e ji nwee ndị bi na Smụana, Pagamọm, Sadis na Filadelfia. . . . Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha dị ihe karịrị otu narị na iri maịl abụọ (otu narị kilomita na iri itoolu na abụọ) site n’Efesọs, e nwekwara okporo ụzọ ndị mara mma jikọtara ha.”

N’ihi ya, ihe dị ka afọ 20 ka Pentikọst nke afọ 33 O.A. gasịrị, e nweela ọtụtụ ọgbakọ Ndị Kraịst n’ebe ndịda na n’ebe ọdịda anyanwụ nke Eshia Maịnọ. Gịnị banyere ógbè ndị ọzọ?

Ndị Pita Degaara Akwụkwọ Ozi Ya

Pita onyeozi dere akwụkwọ ozi mbụ ya o ji ike mmụọ nsọ dee ka afọ ụfọdụ gasịrị, n’ihe dị ka n’agbata afọ 62 na 64 O.A. O degaara ya Ndị Kraịst nọ na Pọntọs, Galeshia, Kapadoshia, Eshia, na Bitinia. O yiri ka akwụkwọ ozi Pita ọ̀ na-egosi na e nwere ọgbakọ Ndị Kraịst n’ógbè ndị a, ebe ọ bụ na o nyere ndị okenye ha ndụmọdụ ka ha ‘na-azụ ìgwè atụrụ’ ahụ. Olee mgbe e hiwere ọgbakọ ndị a?—1 Pita 1:1; 5:1-3.

N’ógbè ụfọdụ bụ́ ebe ndị natara akwụkwọ ozi Pita dere bi, dị ka Eshia na Galeshia bụ ebe ndị Pọl kwusara ozi ọma. Otú ọ dị, o kwusaghị ozi ọma na Kapadoshia ma ọ bụ Bitinia. Bible agwaghị anyị otú Iso Ụzọ Kraịst si ruo n’ógbè ndị ahụ, ma o nwere ike ịbụ site n’aka ndị Juu ma ọ bụ ndị na-eso ụzọ ndị Juu bụ́ ndị nọ na Jeruselem na Pentikọst afọ 33 O.A. ndị mesịkwara laghachi n’obodo ha. Otú o sina dị, ihe dị ka afọ 30 ka Pentikọst gasịrị, bụ́ mgbe Pita dere akwụkwọ ozi ya, dị ka otu ọkà mmụta kwuru, o yiri ka è nwere ọgbakọ “n’ebe nile n’Eshia Maịnọ.”

Ọgbakọ Asaa ahụ E Kwuru Banyere Ha ná Mkpughe

Isi ndị Juu nupụụrụ ndị Rom mere ka ha bibie Jeruselem n’afọ 70 O.A. O yiri ka Ndị Kraịst ụfọdụ si Judia hà mesịrị gaa biri n’Eshia Maịnọ. *

Ná ngwụsị nke narị afọ mbụ O.A., Jizọs Kraịst si n’aka Jọn onyeozi degara ọgbakọ asaa dị n’Eshia Maịnọ akwụkwọ ozi. Akwụkwọ ozi ndị a e degaara ọgbakọ ndị dị n’Efesọs, Smụana, Pagamọm, Taịataịra, Sadis, Filadelfia na Leodisia, na-egosi na Ndị Kraịst nọ n’akụkụ Eshia Maịnọ a nọ na-enwe nsogbu, dị ka omume rụrụ arụ, ịrọ òtù, na ndapụ n’ezi ofufe.—Mkpughe 1:9, 11; 2:14, 15, 20.

Ozi Sitere n’Obi nke E Ji Ịdị Umeala n’Obi Jee

O doro anya na ebe Iso Ụzọ Kraịst gbasaruru na narị afọ mbụ karịrị ebe ndị anyị na-agụta n’Ọrụ Ndịozi. Ndịozi a ma ama nke ọma bụ́ Pita na Pọl so ná ndị jere ozi ndị e dekọrọ n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi, ma ndị ọzọ a na-amaghị ọnụ ọgụgụ ha nọ n’ebe ndị ọzọ na-ekwusa ozi ọma. Otú Iso Ụzọ Kraịst si gbasaa n’Eshia Maịnọ gosiri na Ndị Kraịst oge mbụ ahụ ṅara ntị n’iwu Jizọs ahụ, bụ́: “Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.”—Matiu 28:19, 20.

N’otu aka ahụ taa, ọ bụ nanị ọnụ ọgụgụ dị nta nke akụkọ ozi Ndịàmà Jehova ji obi ha eje ka ụmụnna ha nọ n’ụwa nile maara. Dị ka ọ dị ọtụtụ ndị nkwusa kwesịrị ntụkwasị obi na narị afọ mbụ n’Eshia Maịnọ, ọtụtụ ndị na-ekwusa ozi ọma n’oge a abụghị ndị a ma ama. Ee, ha na-arụsi ọrụ ike ma na-ebi ndụ obi ụtọ, ha na-enwekwa afọ ojuju ịmara na ha ji nrubeisi na-eje ozi iji zọpụta ndị ọzọ.—1 Timoti 2:3-6.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 5 N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na n’isiokwu a, “Eshia” bụ ógbè ndị Rom na-achị nke dị n’akụkụ ebe ọdịda anyanwụ nke Eshia Maịnọ, ọ bụghị kọntinent a na-akpọ Eshia.

^ par. 17 Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Eusebius (260-340 O.A.) kwuru na tupu afọ 66 O.A., ọ dị mgbe “a chụpụrụ ndịozi na Judia, n’ihi ọtụtụ izu a na-agba igbu ha. Ma ha gara n’ala nile n’ike Kraịst iji kwusaa ozi ha.”

[Igbe dị na peeji nke 11]

ISO ỤZỌ KRAỊST OGE MBỤ NA BITINIA NA PỌNTỌS

Ógbè ndị Bitinia na Pọntọs e jikọtara ọnụ dị n’Ụsọ Oké Osimiri Ojii dị n’Eshia Maịnọ. A maara ọtụtụ ihe banyere ndụ e biri n’ógbè a site n’ihe Pliny nke Nta bụ́ otu onye n’ime ndị ọchịchị e nwere n’ebe ahụ degaara Eze Ukwu Trajan nke Rom.

Ihe dị ka afọ 50 ka e kesachara akwụkwọ ozi Pita n’ọgbakọ nile dị n’ógbè a, Pliny gwara Trajan ka ọ tụọrọ ya aro otú ya ga-esi akpaso Ndị Kraịst àgwà. Pliny dere, sị: “Anọtụbeghị m mgbe a na-ekpe Ndị Kraịst ikpe. N’ihi ya, amaghị m ụdị ahụhụ a na-ata ha.” “A na-akpụta ọtụtụ ndị mmadụ, ma ndị okenye ma ụmụaka, ma ndị ukwu ma ndị nta, ka e kpee ha ikpe, o yikwara ka ọ̀ ga-adịgide otú ahụ. Ọ bụghị nanị n’obodo ndị mepere emepe ka òtù nzuzo iberibe a barala, kamakwa ha abaakwala n’ime ime obodo dị iche iche site n’ibu ozi ha gaa n’ebe ndị ahụ.”

[Ihe Osise/Map dị na peeji nke 9]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

EBE NDỊ PỌL GARA

Njem Ozi Ala Ọzọ Ya nke Mbụ

SAỊPRỌS

PAMFILIA

Paga

Antịọk (nke Pisidia)

Aịkoniọm

Listra

Dabe

Njem Ozi Ala Ọzọ Ya nke Abụọ

SILAỊSHIA

Tasọs

Dabe

Listra

Aịkoniọm

Antịọk (nke Pisidia)

FRIJIA

GALESHIA

Troas

Njem Ozi Ala Ọzọ Ya nke Atọ

SILAỊSHIA

Tasọs

Dabe

Listra

Aịkoniọm

Antịọk (nke Pisidia)

Efesọs

ESHIA

Troas

[Ọgbakọ asaa]

Pagamọm

Taịataịra

Sadis

Smụana

Efesọs

Filadelfia

Leodisia

[Ebe ndị ọzọ]

Haịrapọlis

Kọlọsi

LISHIA

BITINIA

PỌNTỌS

KAPADOSHIA

[Foto dị na peeji nke 9]

Antiọk

[Foto dị na peeji nke 9]

Troas

[Ebe E Si Nweta Foto]

© 2003 BiblePlaces.com

[Foto dị na peeji nke 10]

Ebe a na-ekiri ihe n’Efesọs.—Ọrụ 19:29

[Foto dị na peeji nke 10]

Ebe ebe ịchụàjà chi bụ́ Zus dị na Pagamọm. Ndị Kraịst bi n’obodo ahụ bi “n’ebe ocheeze Setan dị.”—Mkpughe 2:13

[Ebe E Si Nweta Foto]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.