Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Na-ahụ Ikpe Ziri Ezi n’Anya

Jehova Na-ahụ Ikpe Ziri Ezi n’Anya

Jehova Na-ahụ Ikpe Ziri Ezi n’Anya

“Mụ onwe m, Jehova, na-ahụ ikpe ziri ezi n’anya.”—AỊSAỊA 61:8.

1, 2. (a) Olee ihe okwu ndị bụ́ “ikpe ziri ezi” na “ikpe na-ezighị ezi” pụtara? (b) Olee ihe Bible kwuru banyere Jehova na àgwà ya bụ́ ikpe ziri ezi?

A NA-AKỌWA ikpe ziri ezi dị ka ‘eleghị mmadụ anya n’ihu, ime ihe ziri ezi, ime ihe kwekọrọ n’ihe e weere dị ka ihe ziri ezi na ihe dị mma.’ Ikpe na-ezighị ezi na-agụnye imejọ mmadụ, ịkpa ókè, ime ihe ọjọọ, imesi ndị ọzọ ike n’enweghị ihe ha mere.

2 Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ atọ na narị ise gara aga, Mozis dere banyere Eze Eluigwe na Ala, bụ́ Jehova, sị: “Ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi: Chineke Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke na-enweghị ajọ omume.” (Deuterọnọmi 32:4) Ihe karịrị narị afọ asaa ka nke ahụ gasịrị, Chineke nyere Aịzaịa ike mmụọ nsọ idetu okwu ndị a: “Mụ onwe m, Jehova, na-ahụ ikpe ziri ezi n’anya.” (Aịsaịa 61:8) Na narị afọ mbụ, Pọl tiziri mkpu, sị: “Chineke ọ̀ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi? Tụfịakwa!” (Ndị Rom 9:14) N’otu oge ahụ, Pita kwuru, sị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anara nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) Ee, “Jehova na-ahụ ezi ikpe n’anya.”—Abụ Ọma 37:28; Malakaị 3:6.

Ikpe Na-ezighị Ezi Achịwa Dị Ka Eze

3. Olee otú ikpe na-ezighị ezi si malite n’ụwa?

3 Mmadụ nile anaghị ekpe ikpe ziri ezi taa. A pụrụ ikpe anyị ikpe na-ezighị ezi n’ọnọdụ ọ bụla ná ndụ—n’ebe ọrụ anyị, n’ụlọ akwụkwọ, mgbe anyị na ndị ọchịchị na-emekọrịta ihe, nakwa n’ụzọ ndị ọzọ—ọbụna n’ezinụlọ anyị. N’ezie, ikpe na-ezighị ezi ndị dị otú ahụ abụghị ihe ọhụrụ. Ha malitere ịdị n’etiti ụmụ mmadụ mgbe nne na nna anyị mbụ nupụrụ isi ma mewe otú o si masị ha, n’ihi agbamume nke mmụọ ahụ na-enupụ isi mesịrị ghọọ Setan bụ́ Ekwensu. Adam, Iv, na Setan mere nnọọ ihe na-ezighị ezi mgbe ha ji onyinye magburu onwe ya Jehova nyere ha imere onwe ha mkpebi mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Omume ọjọọ ha ga-akpatara ụmụ mmadụ nile nnukwu ahụhụ na ọnwụ.—Jenesis 3:1-6; Ndị Rom 5:12; Ndị Hibru 2:14.

4. Olee mgbe ikpe na-ezighị ezi malitere n’etiti ụmụ mmadụ?

4 Kemgbe ihe dị ka puku afọ isii e nupụsịrị isi n’Iden, ikpe na-ezighị ezi erikpuola ụwa. Nke a abụghị ihe ijuanya n’ihi na ọ bụ Setan bụ chi nke ụwa a. (2 Ndị Kọrint 4:4) Ọ bụ onye ụgha na nna nke ụgha, onye nkwutọ na onye na-emegide Jehova. (Jọn 8:44) Ọ na-akwado ajọ ikpe na-ezighị ezi kemgbe ụwa. Dị ka ihe atụ, ọchịchị ọjọọ Setan chịrị ụmụ mmadụ tupu Iju Mmiri nke oge Noa so n’ihe mere Chineke ji hụ na “ihe ọjọọ nke mmadụ hiri nne n’ụwa, Ọ hụkwa na nchepụta nile ọ bụla nke echiche obi ya bụ nanị ihe ọjọọ ogologo ụbọchị nile.” (Jenesis 6:5) Ọ ka dịkwa otú ahụ n’oge Jizọs. O kwuru, sị: “Ihe ọjọọ nke ụbọchị nke ọ bụla ezuworo ya,” nke pụtara nsogbu ndị na-agbawa obi nke ya na ụbọchị nke ọ bụla so, dị ka ikpe na-ezighị ezi. (Matiu 6:34) Bible kwuru okwu ndị a dabara nnọọ adaba, sị: “Ihe nile e kere eke nọgidere na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu ruo ugbu a.”—Ndị Rom 8:22.

5. Olee ihe mere ikpe na-ezighị ezi ji dị n’oge anyị karịa ka ọ dịtụrụla n’oge ọ bụla ọzọ?

5 N’ihi ya, ihe ọjọọ ndị na-akpata ikpe na-ezighị anọwo na-eme kemgbe mmadụ dịwara ndụ n’ụwa. Ọnọdụ ahụ akala njọ ugbu a. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ajọ ụwa dị ugbu a nke na-adịghị asọpụrụ Chineke anọwo “n’ụbọchị ikpeazụ” ya kemgbe ọtụtụ afọ, na-enwe “oge pụrụ iche nke siri ike obibi” ka ọgwụgwụ ya na-eru nso. Bible buru amụma na n’oge a, ndị mmadụ ga-abụ “ndị hụrụ onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, . . . ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-adịghị njikere ime nkwekọrịta ọ bụla, ndị nkwutọ, ndị na-enweghị njide onwe onye, ndị na-eme ihe ike ike, ndị na-enweghị ịhụnanya maka ezi ihe, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu.” (2 Timoti 3:1-5) Àgwà ọjọọ ndị dị otú ahụ na-eduga n’ụdị ikpe na-ezighị ezi nile.

6, 7. Olee ajọ ikpe na-ezighị ezi ndị kparala ụmụ mmadụ aka ọjọọ n’oge anyị a?

6 A hụwo ikpe na-ezighị ezi otú a na-ahụtụbeghị ya mbụ kemgbe otu narị afọ gara aga. Otu ihe kpatara ya bụ na ọ dịbeghị mgbe ọzọ agha tisarala ụwa otú o si tisaa ya n’oge a. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme na-eme atụmatụ na Agha Ụwa nke Abụọ nanị tara isi ọnụ ọgụgụ mmadụ dị n’agbata nde iri ise na nde iri isii, ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụkwa ndị nkịtị—ụmụ nwoke, ụmụ nwanyị, na ụmụaka ndị aka ha dị ọcha. Kemgbe agha ahụ biri, e gbuola ọtụtụ nde ndị ọzọ n’agha dị iche iche, ihe kakwa ọtụtụ n’ime ndị a bụkwa ndị nkịtị. Setan na-akwalite ụdị ikpe na-ezighị ezi ahụ n’ihi na oké iwe ji ya, ebe ọ maara na Jehova ga-emeri ya n’isi nso. Amụma Bible si otú a kwuo ya: “Ekwensu arịdakwuruwo unu, na-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.”—Mkpughe 12:12.

7 Ego a na-emefu n’ụwa nile ná ngwá agha n’otu afọ eruola ihe dị ka otu puku ijeri dọla. Ọtụtụ nde mmadụ enweghị ihe ndị e ji ebi ndụ, n’ihi ya, cheedị echiche uru ego nile ahụ ga-aba ma a sị na e ji ha na-eme ihe ndị ga-eme ka udo dị. Ihe dị ka otu ijeri mmadụ anaghị eriju afọ, ebe ndị ọzọ na-atụfukwanụ ihe oriri atụfu. Dị ka Òtù Mba Ụwa si kwuo, agụụ na-egbu ihe dị ka nde ụmụaka ise kwa afọ. Lee ka nke ahụ si bụrụ ikpe na-ezighị ezi! Tụleekwa ọtụtụ ụmụaka aka ha dị ọcha a na-egbu site n’isikwopụ afọ ime. A na-ekwu na ọnụ ọgụgụ ụmụaka a na-esi otú a egbu kwa afọ dị n’agbata nde iri anọ na nde iri isii! Lee ajọ ikpe na-ezighị ezi nke ahụ bụ!

8. Olee nanị otú ụmụ mmadụ ga-esi nweta ezi ikpe ziri ezi?

8 Ndị ọchịchị bụ́ ụmụ mmadụ achọtabeghị ihe ngwọta nke ọtụtụ nsogbu ndị na-akpa ụmụ mmadụ ezé taa; mgbalị ụmụ mmadụ agakwanụghị eme ka ihe ka mma. Okwu Chineke kwuru na n’oge anyị “ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie ga-anọgide na-ajọwanye njọ, na-eduhie ma bụrụ ndị a na-eduhie.” (2 Timoti 3:13) Ikpe na-ezighị ezi eriela ndị mmadụ ahụ́ nke na ụmụ mmadụ agaghị akwụsịli ya. Ọ bụ nanị Chineke nke ikpe ziri ezi ga-akwụsịli ya. Ọ bụ nanị ya ga-ewepụli Setan, ndị mmụọ ọjọọ, na ndị ajọ mmadụ.—Jeremaịa 10:23, 24.

Nchegbu Ziri Ezi

9, 10. Olee ihe kụdara Esaf obi?

9 N’oge gara aga, ọbụna ndị so dee Bible jụrụ Chineke ihe mere ọ na-ejibeghị tinye aka n’ihe na-eme n’etiti ụmụ mmadụ ma weta ezi ikpe ziri ezi na ezi omume. Were otu nwoke dịrị ndụ n’oge Bible dị ka ihe atụ. Ihe e dere n’elu Abụ Ọma nke 73 kpọrọ aha bụ́ Esaf, nke nwere ike ịbụ aha nke otu ọbụ abụ bụ́ onye Livaị a ma ama n’oge Eze Devid ma ọ bụ ya abụrụ na ọ na-anọchi anya ndị ọbụ abụ nọ n’ezinụlọ nke Esaf bụ onyeisi ya. Esaf na ụmụ ya dere ọtụtụ abụ e ji mee ihe n’ofufe n’ihu ọha. N’agbanyeghị nke ahụ, n’otu oge ná ndụ ya, obi dara onye dere abụ ọma a mbà n’ihe metụtara ofufe ya. Ọ hụrụ otú ndị ajọ omume si na-aba ọgaranya, hụkwa na o yiri ka ihe nile ọ̀ na-ezuru ha ná ndụ, na ọ dịghịkwa ihe ọjọọ na-adakwasị ha.

10 Anyị na-agụ, sị: “Ekwosoro m ndị na-anya isi ekworo, ọ bụ udo nke ndị na-emebi iwu ka m na-ahụ. N’ihi na ọ dịghị mmekpa ahụ́ ọ bụla dị n’ọnwụ ha: ma ahụ́ ha mara abụba. Ha anọghị n’ahụhụ mmadụ ọzọ; a dịghị etikwa ha ihe otiti n’etiti mmadụ nile.” (Abụ Ọma 73:2-8) Ma ka oge na-aga, onye ahụ so dee Bible hụrụ na ihe ahụ ya chere ezighị ezi. (Abụ Ọma 73:15, 16) Ọbụ abụ ahụ gbalịrị ịgbanwe echiche ya, ma ọ matalighị ihe mere o ji yie ka ndị ajọ omume hà na-eme ihe ọjọọ n’enweghị ihe na-eme ha ebe ndị obi ha dị ọcha na-atakarị ahụhụ.

11. Olee ihe ọbụ abụ bụ́ Esaf mesịrị ghọta?

11 Nwoke oge ochie ahụ nke kwesịrị ntụkwasị obi mesịrị ghọta ihe na-echere ndị ajọ omume—na Jehova ga-emesi dozie ihe nile. (Abụ Ọma 73:17-19) Devid dere, sị: “Na-ele anya Jehova, na-edebekwa ụzọ Ya, Ọ ga-ebulikwa gị inweta ala; mgbe a na-ebipụ ndị na-emebi iwu, ị ga-ahụ.”—Abụ Ọma 37:9, 11, 34.

12. (a) Olee ihe bụ́ nzube Jehova banyere ajọ omume na ikpe na-ezighị ezi? (b) Olee otú i si lee ihe ahụ ga-ewepụ nsogbu nke ikpe na-ezighị ezi anya?

12 Ọ bụ nnọọ nzube Jehova iwepụ ajọ omume na ikpe na-ezighị ezi ajọ omume na-akpata n’ụwa n’oge nke Ya. Ọbụna Ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi kwesịrị ịdị na-echetara onwe ha nke ahụ mgbe nile. Jehova ga-ewepụ ndị na-eme ihe megidere uche ya, ọ ga-akwụghachikwa ndị na-eme ihe kwekọrọ na ya ụgwọ. “Anya Ya na-ahụ, mbubere anya Ya na-anwa ụmụ mmadụ. Jehova na-anwa onye ezi omume: ma onye na-emebi iwu na onye na-ahụ ihe ike n’anya ka mkpụrụ obi Ya na-akpọ asị. Ya mee ka igbudu zokwasị ndị na-emebi iwu dị ka mmiri ozuzo; ka ọkụ na brimstone na ifufe dị ọkụ bụrụ òkè . . . ha. N’ihi na onye ezi omume ka Jehova bụ; ezi omume ka Ọ hụrụ n’anya: ndị ziri ezi ga-ahụ ihu Ya.”—Abụ Ọma 11:4-7.

Ụwa Ọhụrụ nke Ikpe Ziri Ezi

13, 14. N’ihi gịnị ka ezi omume na ikpe ziri ezi ga-eji jupụta ebe nile n’ụwa ọhụrụ?

13 Mgbe Jehova bibiri ụwa ikpe na-ezighị ezi a nọ n’okpuru Setan, Ọ ga-eweta ụwa ọhụrụ dị ebube. Ọ bụ Alaeze Chineke dị n’eluigwe ga na-achị ya, bụ́ Alaeze ahụ Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere maka ya. Ezi omume na ikpe ziri ezi ga-anọchi ajọ omume na ikpe na-ezighị ezi, n’ihi na a ga-aza ekpere a n’ụzọ kasị zuo ezuo mgbe ahụ: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.”—Matiu 6:10.

14 Bible gwara anyị ụdị ọchịchị anyị ga-atụ anya ya, ụdị ọchịchị na-agụ ndị nile obi ha ziri ezi agụụ taa. Mgbe ahụ, Abụ Ọma 145:16 ga-emezu n’ụzọ kasị zuo ezuo: “Ị [Jehova Chineke] na-asaghe aka Gị, Ị na-ewerekwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.” Ọzọkwa, Aịsaịa 32:1 kwuru, sị: “Lee, n’ezi omume ka otu eze [Kraịst Jizọs n’eluigwe] ga-abụ eze, ndị isi kwa [ndị na-anọchi anya Kraịst n’ụwa], n’ikpe ziri ezi ka ha ga-abụ ndị isi.” Aịsaịa 9:7 buru amụma banyere Eze Jizọs Kraịst, sị: “Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ịbụ onyeisi Ya na udo Ya ga-agwụ, n’elu ocheeze Devid, na n’elu alaeze ya, ime ka o guzosie ike, na ịkwagide ya n’ikpe ziri ezi na n’ezi omume, site n’ugbu a wee ruo mgbe ebighị ebi. Ekworo Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-eme nke a.” Ị̀ pụrụ iji anya nke uche gị hụ ka i bi n’okpuru ọchịchị ikpe ziri ezi ahụ?

15. Olee ihe Jehova ga-emere ụmụ mmadụ n’ụwa ọhụrụ?

15 N’ụwa ọhụrụ Chineke, ọ dịkwaghị ihe ga-eme ka anyị kwuo ụdị okwu ahụ dị n’Eklisiastis 4:1: “Mụ onwe m wee laghachi hụ mmegbu nile a na-emegbu n’okpuru anyanwụ: ma, lee, anya mmiri nke ndị a na-emegbu, ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere; ma n’akụkụ ndị na-emegbu ha ka ike dị, ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere.” N’ezie, anyị agaghị ejili uche anyị na-ezughị okè ghọta kpọmkwem otú ụwa ọhụrụ ezi omume ahụ ga-adịru n’ebube. Ihe ọjọọ agaghị adịkwa, kama nke ahụ, ezi ihe ga-ejupụta ebe nile kwa ụbọchị. Ee, Jehova ga-emezi ihe nile e mebiri emebi, otú anyị na-echetụbedịghị n’echiche. Lee ka o si kwesị ekwesị na Jehova Chineke nyere Pita onyeozi ike mmụọ nsọ ide, sị: “E nwere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ndị anyị na-echere dị ka nkwa ya si dị, ezi omume gajekwa ibi n’ime ha”!—2 Pita 3:13.

16. Olee otú o si bụrụ na e hiwela “eluigwe ọhụrụ” ahụ, oleekwa otú o si bụrụ na a na-akwadebe “ụwa ọhụrụ” ahụ taa?

16 N’ezie, e hiwela “eluigwe ọhụrụ” ahụ, bụ́ Alaeze eluigwe Chineke nke dị n’aka Kraịst. A na-achịkọta ndị ga-abụ ntọala nke “ụwa ọhụrụ” ahụ, bụ́ ụmụ mmadụ ọhụrụ ndị obi ha ziri ezi ga-ebi n’ụwa, n’oge ikpeazụ a. Ọ fọrọ obere ka ha ruo nde mmadụ asaa, bụ́ ndị nọ n’ihe dị ka narị ala abụọ na iri atọ na ise nakwa n’ihe dị ka 100,000 ọgbakọ. Ọtụtụ nde mmadụ a anọwo na-amụ ụzọ ezi omume na ikpe ziri ezi nke Jehova, n’ihi ya kwa, ha dị n’otu n’ihi ịhụnanya Ndị Kraịst ha nwere. Ọ dịbeghị ndị dịrịla n’otu otú ha dịrịla n’ụwa, bụ́ ụdị ịdị n’otu ndị Setan na-achị na-ahụtụbeghị. Ịhụnanya na ịdị n’otu dị otú ahụ bụ ihe àmà nke ụdị ihe ọma ndị anyị ga-ahụ n’ụwa ọhụrụ nke Chineke, bụ́ nke a ga-eji ezi omume na ikpe ziri chịa.—Aịsaịa 2:2-4; Jọn 13:34, 35; Ndị Kọlọsi 3:14.

Mwakpo Setan Ga-akụ Afọ n’Ala

17. Olee ihe mere mwakpo ikpeazụ Setan ga-awakpo ndị Jehova ga-ejirịrị kụọ afọ n’ala?

17 N’oge na-adịghị anya, Setan na ndị na-eso ụzọ ya ga-awakpo ndị na-efe Jehova iji kpochapụ ha. (Ezikiel 38:14-23) Nke ahụ ga-eso n’ihe Jizọs kpọrọ “oké mkpagbu nke a na-enwebeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a, ee e, a gaghịkwa enwe ya ọzọ.” (Matiu 24:21) Setan ọ̀ ga-emezu nzube ya? Ee e. Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike, sị: “Jehova na-ahụ ezi ikpe n’anya, Ọ dịghị ahapụkwa ndị ebere Ya; ruo mgbe ebighị ebi ka a na-edebe ha: ma a ga-ebipụ mkpụrụ ndị na-emebi iwu. Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:28, 29.

18. (a) Olee ihe Chineke ga-eme mgbe Setan ga-abịa ịwakpo ndị Ya n’ọdịnihu? (b) Olee ihe mere o jiworo baara gị uru ịtụle isiokwu a dabeere na Bible banyere mmeri nke ikpe ziri ezi?

18 Mwakpo Setan na ndị òtù ya ga-awakpo ndị ohu Jehova ga-abụ mkparị ikpeazụ. Jehova si n’ọnụ Zekaraịa buo amụma, sị: “Onye na-emetụ unu aka na-emetụ nwa anya [M].” (Zekaraịa 2:8) Ọ ga-adị nnọọ ka mmadụ ịchọ ịrụba Jehova aka ná mkpụrụ anya. Ọ ga-eme ihe ozugbo ma kpochapụ ndị na-achọ ime ya. Ndị ohu Jehova bụ ndị kasị ahụ n’anya, ndị kasị dịrị n’otu, ndị kasị eme udo, ndị kasị erubere iwu isi n’ụwa. N’ihi ya, mwakpo ahụ a ga-awakpo ha agatụghị ekwesị ekwesị, ọ ga-abụ nnọọ ikpe na-ezighị ezi. Onye ukwu ahụ “na-ahụ ezi ikpe n’anya” agaghị anabata ya. Ya ịgbachitere ha ga-eme ka o bibie ndị iro nke ndị ya ruo mgbe ebighị ebi, iji chebe ikpe ziri ezi, na iji zọpụta ndị na-efe nanị ezi Chineke ahụ. Lee ihe ijuanya na ihe ọṅụ ndị ga-eme n’isi nso!—Ilu 2:21, 22.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee ihe mere ikpe na-ezighị ezi ji jupụta ebe nile?

• Olee ihe Jehova ga-eme iji wepụ ikpe na-ezighị ezi n’ụwa?

• Olee ihe metụrụ gị n’ahụ́ n’ihe ọmụmụ a banyere mmeri ikpe ziri ezi gaje imeri?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 23]

Ihe ọjọọ bara ụba tupu Iju Mmiri ahụ, o jukwara ebe nile “n’ụbọchị ikpeazụ” ndị a

[Foto dị na peeji nke 24, 25]

N’ụwa ọhụrụ Chineke, ikpe ziri ezi na ezi omume ga-anọchi ajọ omume