Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Jehova, Nwapụta M’

‘Jehova, Nwapụta M’

‘Jehova, Nwapụta M’

“ONYE na-anwa obi bụ Jehova.” (Ilu 17:3) Nke ahụ kwesịrị nnọọ ịgba anyị nile ume. N’ihi gịnị? N’ihi na n’adịghị ka ụmụ mmadụ, bụ́ ndị na-adabere n’ihe anya na-ahụ na-ekpe ikpe, Nna anyị nke eluigwe “na-ele obi.”—1 Samuel 16:7.

N’ezie, anyị onwe anyị agadịghị amatacha ihe dị n’ime obi anyị. N’ihi gịnị? N’ihi na ‘obi anyị dị aghụghọ karịa ihe nile, ihe na-adịghị ngwọta ka ọ bụkwa, ònye ga-amara ya?’ Ma, Chineke maara ya, n’ihi na o kwuru, sị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova, na-enyocha obi, na-anwa akụrụ.” (Jeremaịa 17:9, 10) Ee, Jehova na-enyocha “obi”—nke gụnyere ihe anyị bụ n’ime—nakwa “akụrụ,” nke bụ́ echiche na mmetụta ndị kasị mie emie nke mmadụ.

N’ihi Gịnị Ka E Ji Ele Anyị Ule?

Ma o jughị anyị anya na Eze Devid oge ochie gwara Chineke, sị: “Nwaa m Jehova, nwapụtakwa m; nụchaa akụrụ m abụọ na obi m.” (Abụ Ọma 26:2) Ọ̀ pụtara na Devid enwetụghị ntụpọ n’omume na n’okwu ọnụ, nke ga-eme ka ọ ghara inwe ihe ga-atụ ya ụjọ ma ọ bụrụ na Jehova elee ya ule? Ee e! Dịkwa ka anyị nile, Devid ezughị okè, o enweghịkwa ike ime ka ndụ ya kwekọọ n’ụkpụrụ Chineke n’ụzọ zuru okè. Adịghị ike Devid mere ka o mee ọtụtụ mmehie dị oké njọ, ma n’agbanyeghị nke ahụ, o ‘jegharịrị n’izu okè nke obi.’ (1 Ndị Eze 9:4) N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịnabata ịdọ aka ná ntị na imezi ụzọ ya. O gosiri na ọ hụrụ nnọọ Jehova n’anya. O ji obi ya nile fee Chineke.

Gịnị banyere anyị taa? Jehova maara na anyị ezughị okè, makwara na anyị pụrụ imehie n’okwu ọnụ na n’omume. Ma, ọ naghị eji ikike o nwere ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu ekpebi ihe ndụ anyị ga-abụ. O kere anyị dị ka ndị nweere onwe ha ime nhọrọ, ọ na-akwanyekwara nnwere onwe ahụ anyị nwere ùgwù—bụ́ onyinye o ji obiọma ya nye anyị.

Ka o sina dị, Jehova pụrụ isi n’ụzọ ụfọdụ lee ụdị mmadụ anyị bụ n’ime ule mgbe ụfọdụ, gụnyere ebumnobi anyị. Ọ pụrụ ime nke a site n’inye anyị ohere igosipụta ihe dị anyị n’obi. Ọ pụkwara inye ohere ka ọnọdụ dị iche iche ma ọ bụ ọnwụnwa gosipụta ọchịchọ anyị ndị kasị mie emie. Nke a na-enye anyị ohere igosi Jehova otú anyị hụruru ya n’anya na otú anyị kwesịruru ntụkwasị obi nye ya. Ule dị otú ahụ Jehova kwere ka e lee anyị pụrụ igosi ụdị okwukwe anyị nwere, iji gosi ma ànyị ‘zuru ezu ma gbasie ike n’ụzọ nile, n’enweghị ihe ọ bụla kọrọ anyị.’—Jems 1:2-4.

Onye E Lere Okwukwe Ya Ule n’Oge Ochie

Ọ bụghị taa ka a malitere ile okwukwe na ebumnobi ndị ohu Jehova ule. Tụlee ihe banyere nna ochie bụ́ Ebreham. “Chineke nwara Ebreham.” (Jenesis 22:1) A dịla mbụ lee okwukwe Ebreham nwere n’ebe Chineke nọ ule tupu e kwuo okwu ndị ahụ. Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, Jehova gwara Ebreham ka ya na ezinụlọ ya si n’obodo Ọọ bara ọgaranya pụọ ma gaa n’obodo ọ na-amaghị. (Jenesis 11:31; Ọrụ 7:2-4) Ebreham, bụ́ onye o nwere ike ịbụ na o nwere ụlọ nke ya na Ọọ, azụghị ụlọ ọ bụla na Kenan, bụ́ ebe o biri ọtụtụ afọ. (Ndị Hibru 11:9) Nkwagharị Ebreham nọ na-akwagharị mere ka ọ dị mfe nri ịkọ ya na ezinụlọ ya, dịkwa mfe ha ịdaba n’aka ndị omekome, na ndị ọchịchị ebe ahụ bụ́ ndị na-ekpere arụsị. N’oge a nile, okwukwe Ebreham nọgidere na-esi ike.

Jehova leziri Ebreham ule ka ukwuu. “Biko, were nwa gị nwoke nke i nwere nanị ya, onye ị hụrụ n’anya, bụ́ Aịzik . . . suree ya ka ọ bụrụ àjà nsure ọkụ.” (Jenesis 22:2) Aịzik abụghị nwa nkịtị nye Ebreham. Ọ bụ nanị nwa Ebreham na nwunye ya bụ́ Sera nwere. Aịzik bụ nwa ahụ e kwere ná nkwa, bụ́ nanị nwa Ebreham ji nwee olileanya na “mkpụrụ” ya ga-eketa ala Kenan ma gọzie ọtụtụ mmadụ, dị ka nkwa Chineke si dị. A sị ka e kwuwe, Aịzik bụ nwa ahụ a tụrụ anya ka Ebreham mụọ, bụ́ onye Chineke mere ka a mụọ n’ụzọ ọrụ ebube!—Jenesis 15:2-4, 7.

Chee echiche otú ọ na-aghaghị isi siere Ebreham ike ịghọta iwu a. Jehova ọ̀ ga-achọ ka e were mmadụ nkịtị chụọrọ ya àjà? Olee ihe mere Jehova ga-eji nye Ebreham nwa n’agadi ya ma sịkwa ya jiri otu nwa ahụ chụọrọ ya àjà? *

N’agbanyeghị na azịza nke ajụjụ ndị a edochaghị Ebreham anya, o mere ihe a gwara ya mee ozugbo. O were ya abalị atọ irute n’ugwu ahụ Chineke gwara ya jee. O wuru ebe ịchụàjà n’ebe ahụ ma tụkwasị nkụ n’elu ya. Ugbu a ka ule nke okwukwe ya ruru. Ebreham weere mma ka o gbuo nwa ya, ma Jehova si n’aka otu mmụọ ozi kwụsị Ebreham igbu nwa ya ma kwuo, sị: “Ugbu a ka M maara na onye na-atụ egwu Chineke ka ị bụ, n’ihi na i gbochighị nwa gị nwoke, nke i nwere nanị ya, iwere ya nye m.” (Jenesis 22:3, 11, 12) Chee echiche ụdị obi ụtọ Ebreham ga-enwe mgbe ọ nụsịrị okwu ndị ahụ! Jehova ziri ezi ịgụ ya n’onye ezi omume n’ihi okwukwe ya tupu mgbe ahụ. (Jenesis 15:5, 6) Mgbe nke ahụ gasịrị, Ebreham wee were ebulu chụọrọ Chineke àjà n’ọnọdụ Aịzik. Jehova mesiziri nkwa o kwere banyere mkpụrụ Ebreham, ike. O doro anya na a bịara mara Ebreham dị ka enyi Jehova.—Jenesis 22:13-18; Jems 2:21-23.

A Na-elekwa Okwukwe Anyị Ule

Anyị nile maara na a ga-elerịrị ndị ohu Chineke ule taa. Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ n’ule nke anyị nwere ike ịbụ ihe Jehova kwere ka o mee kama ịbụ ihe ọ gwara anyị mee.

Pọl onyeozi dere, sị: “A ga-akpagbukwa ndị nile na-achọ ibi ndụ ná nsọpụrụ Chineke ná mmekọrịta nke ha na Kraịst Jizọs.” (2 Timoti 3:12) Mkpagbu dị otú ahụ pụrụ isi n’aka ụmụ akwụkwọ ibe anyị, ndị enyi, ndị agbata obi, ndị ikwu anyị ma ọ bụ ndị ọchịchị nụrụ akụkọ ụgha banyere anyị. O nwere ike ịgụnye okwu ọjọọ na iti ihe nakwa ime ka o siere Onye Kraịst ike ịkpata ihe ga-ezuru ya. Ezi Ndị Kraịst na-enwekwa nsogbu ndị ọzọ na-enwe—ndị dị ka ọrịa, ihe agaghị otú e chere ya, na ikpe na-ezighị ezi. A na-eji ọnwụnwa ndị dị otú ahụ ele okwukwe mmadụ ule.

Pita onyeozi kwuru ezi ihe ndị na-esi n’ile okwukwe mmadụ ule pụta: “E mewo ka unu ruo újú site n’ọnwụnwa dị iche iche, ka ọdịdị okwukwe unu nke e lere ule, nke bara oké uru karịa ọlaedo nke na-ala n’iyi n’agbanyeghị ịbụ nke e ji ọkụ nwapụta, wee bụrụ nke a hụrụ dị ka ihe na-akpata inye otuto na ịdị ebube na nsọpụrụ ná mkpughe nke Jizọs Kraịst.” (1 Pita 1:6, 7) Ee, e ji ihe isi ike ndị ule na-eweta tụnyere iji ọkụ anụcha ọlaedo. A na-eji ọkụ ahụ ewepụ ihe ndị na-adịghị mma dị n’ọlaedo ahụ ma mee ka ọ maa mma. Otú ahụ ka ọ dị okwukwe anyị mgbe e lere anyị ule.

Dị ka ihe atụ, ihe mberede ma ọ bụ ọdachi na-emere onwe ya nwere ike ịkpata ihe isi ike. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị nwere ezi okwukwe anaghị enwe nchegbu na-enweghị isi. Okwu na-emesi obi ike Jehova gwara anyị na-akasi ha obi: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.” (Ndị Hibru 13:5) Ha na-anọgide na-ebute ihe ndị metụtara ofufe Chineke ụzọ, na-enwe obi ike na Jehova Chineke ga-agọzi mgbalị ha na-etinye iji nweta ihe ndị dị ha nnọọ mkpa. Okwukwe ha na-enyere ha aka idi ihe isi ike ma na-enyere ha aka ịghara ime ka ọnọdụ ha ka njọ site n’inwe nchegbu na-enweghị isi.

Eziokwu ahụ bụ́ na ule nwere ike ime ka anyị mara ebe okwukwe anyị na-esighị ike nwekwara ike ịbara anyị uru ma ọ bụrụ na o mee ka anyị hụ mkpa ọ dị imeziwanye ihe n’akụkụ ndị ahụ. Mmadụ kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Olee otú m pụrụ isi wusikwuo okwukwe m ike? Ọ̀ dị m mkpa itinyekwu oge n’iji ekpere na-amụ Okwu Chineke ma na-atụgharị uche na ya? M̀ na-eji ohere m nwere iso ndị kwere ekwe ibe m na-ezukọ na-eme ihe nke ọma? M̀ na-adabere n’onwe m mgbe m kwesịrị ịgwa Jehova Chineke nsogbu m n’ekpere?’ Otú ọ dị, mmadụ ịjụ onwe ya ajụjụ ndị dị otú ahụ bụ nanị mmalite.

Mmadụ iwusikwu okwukwe ya ike pụrụ ịchọ onye ahụ n’aka inwekwu mmasị n’Okwu Chineke, na-enwe “agụụ maka mmiri ara a na-agwagbughị agwagbu nke dịịrị okwu ahụ.” (1 Pita 2:2; Ndị Hibru 5:12-14) Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike iyi onye ahụ ọbụ abụ kọwara, sị: “N’iwu Jehova ka ihe ụtọ ya dị; ọ bụkwa n’iwu Ya ka ọ na-atụgharị uche ehihie na abalị.”—Abụ Ọma 1:2.

Nke a chọrọ ihe karịrị ịgụ Bible. Ọ dị anyị mkpa iche echiche banyere ihe Okwu Chineke na-agwa anyị ma na-etinye ndụmọdụ ya n’ọrụ. (Jems 1:22-25) N’ihi ya, ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ ga-emikwu emi, ekpere anyị ga na-esikwu anyị n’obi, okwukwe anyị nwere n’ebe ọ nọ ga-esikwukwa ike.

Uru Okwukwe E Lere Ule Bara

Ịmata na okwukwe dị anyị ezigbo mkpa iji mee ka ihe anyị dị Chineke mma ga-enyere anyị nnọọ aka ime ka o sikwuo ike. Bible na-echetara anyị, sị: “Ma okwukwe adịghị ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị ya ezi mma, n’ihi na onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị, nakwa na ọ bụ onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Ya mere, anyị kwesịrị iyi nwoke ahụ rịọrọ Jizọs arịrịọ, sị: “Nyere m aka n’ebe okwukwe dị m mkpa!”—Mak 9:24.

Okwukwe anyị e lere ule pụkwara inyere ndị ọzọ aka. Dị ka ihe atụ, mgbe onye Onye Kraịst hụrụ n’anya nwụnahụrụ ya, okwukwe siri ike o nwere ná nkwa Chineke kwere maka mbilite n’ọnwụ na-enyere ya aka ịtachi obi. Ọ na-eru újú, ma ọ naghị ‘eru újú dị nnọọ ka ndị ọzọ si eru, bụ́ ndị na-enweghị olileanya.’ (1 Ndị Tesalonaịka 4:13, 14) Ndị na-ahụ otú okwukwe Onye Kraịst si na-enyere ya aka ịtachi obi nwere ike ịghọta na o nwere ihe bara nnọọ uru. Nke a nwere ike ime ka ha nwee ọchịchọ nke inwe okwukwe dị otú ahụ n’ime obi ha, na-akpali ha ịmụ Okwu Chineke na ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst.

Jehova maara na okwukwe e lere ule bara nnọọ uru. Ọzọkwa, okwukwe anyị e lere ule na-enyere anyị aka ịma ma okwukwe anyị ò nwere ike inyere anyị nnọọ aka ịtachi obi. Ọ na-enyere anyị aka ịchọpụta ebe okwukwe anyị na-esighị ike, na-eme ka anyị nwee ike imezi ya. N’ikpeazụ, anyị ịtachi obi ruo n’isi mgbe e lere anyị ule pụrụ inyere ndị ọzọ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ya mere, ka anyị na-eme ike anyị nile iji nọgide na-enwe okwukwe siri ike—bụ́ okwukwe ọ ga-abụ e lee ya ọtụtụ ule, ya abụrụ nke “a hụrụ dị ka ihe na-akpata inye otuto na ịdị ebube na nsọpụrụ ná mkpughe nke Jizọs Kraịst.”—1 Pita 1:7.

[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 11 Iji hụ ihe “àjà” ahụ e ji Aịzik chụọ pụtara, lee Ụlọ Nche, July 1, 1989, peeji nke 22.

[Foto dị na peeji nke 13]

Ọrụ okwukwe Ebreham rụrụ mere ka ọ bụrụ enyi Jehova

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Okwukwe anyị e lere ule pụrụ igosi ma ò nwere ike inyere anyị aka ịtachi obi

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 12]

Site n’akwụkwọ bụ́ Illustrated Edition of the Holy Scriptures, nke Cassell, Petter, na Galpin dere