Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nwee Mmasị n’Ihe E Kere Eke Mata Onye Kere Ya

Nwee Mmasị n’Ihe E Kere Eke Mata Onye Kere Ya

Nwee Mmasị n’Ihe E Kere Eke Mata Onye Kere Ya

O NWERE ike ịbụ na ị nụla banyere onye Ịtali na-ese ihe ma na-akpụ ihe bụ́ onye a na-akpọ Michelangelo. Ọ bụ ezie na ma eleghị anya ị hụtụbeghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị bụ́ ịgba o ji aka ya see, o nwere nnọọ ike ịbụ na i kwenyeere ọkọ akụkọ ihe mere eme nke kpọrọ onye Ịtali ahụ bụ́ ọkaibe “aka ochie na-enweghị atụ n’ise ihe.” Ọ dịghị mgbe a ga-agọnahụ onyinye a Michelangelo nwere. Ọ̀ dị onye ga-echetụ echiche ikwu na ihe ndị Michelangelo sere mara mma ma ghara ikweta na ọ bụ aka ochie n’ise ihe?

Chezienụ echiche banyere imerime ihe ndị dị ndụ dị mgbagwoju anya gbara anyị gburugburu n’ụwa. Ọ dabara adaba na akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times kwuru na otu prọfesọ n’ihe ọmụmụ nke ihe ndị dị ndụ kwuru, sị: “Akụkụ dị iche iche nke ihe ọmụmụ nke ihe ndị dị ndụ na-egosi nnọọ na e kere ihe ndị dị ndụ eke.” O kwukwara, sị: “Mgbe anyị lere ihe ndị dị ndụ anya, anyị na-ahụ ọtụtụ ihe ndị na-egosi na e kere ha eke.” Ọ̀ bụ ihe amamihe dị na ya inwe mmasị n’ihe e kere eke ma ghara ikele onye kere ya?

Pọl onyeozi, bụ́ onye leruru ihe ndị gbara ya gburugburu anya, kwuru banyere ndị ‘sọpụụrụ ma jeere ihe e kere eke ozi dị nsọ kama Onye ahụ nke kere ihe.’ (Ndị Rom 1:25) N’ihi ozizi evolushọn juru ebe nile, ụfọdụ anaghị ekweta na ihe e kere eke nwere nnọọ onye kere ya. Ma ozizi evolushọn ò kwekọrọ n’ezi ihe ọmụmụ sayensị? Christoph Schönborn, bụ́ achịbishọp Katọlik nke Vienna, kwuru n’akwụkwọ akụkọ The New York Times, sị: “Ozizi ọ bụla nke na-ekwu na ihe ndị e kere eke enweghị onye kere ha n’agbanyeghị imerime ihe àmà ndị na-egosi na e kere ha eke bụ ozizi na-enweghị isi, ọ bụghị sayensị.”

Ọ̀ Ga-eme Ka Ihe Ọmụmụ Sayensị Kwụsị?

Otú ọ dị, e nwere ndị na-eche na ikweta na e nwere ihe ndị na-egosi na e nwere Onye Okike “ga-eme ka ndị mmadụ kwụsị ime nnyocha.” Otu isiokwu dị na magazin New Scientist kwupụtara ụjọ dị otú ahụ, na-ekwusi ike na “sayensị agakwaghị abụ ihe na-enye nnọọ ndị mmadụ ohere ime ụdị nchọpụta ọ bụla ha chọrọ ime, n’ihi na ndị mmadụ ga na-akụnyezi aka n’okwu bụ́ ‘ọ bụ onye okike kere ya’ wee gharazie ime nnyocha.” Okwu ahụ ò rijuru afọ? Mbanụ. N’eziokwu, ịghara ikweta na e nwere onye okike bụ ihe ga-eme ka a ghara ime nnyocha. N’ihi gịnị?

Ikwere na ihe malitere ịdị na mberede, nakwa na ọ bụ evolushọn mere ka ihe nile dị ndụ dị n’eluigwe na n’ụwa dịrị bụ imechiri onwe anyị ụzọ ịghọta otú ihe nile si malite. N’aka nke ọzọ, ikwere na ọ bụ Onye Okike nwere ọgụgụ isi kere ihe ndị anyị na-ahụ gburugburu anyị pụrụ ime ka anyị chọwa ịmata ihe ndị o ji ọgụgụ isi ya kee n’eluigwe na ala a na-ahụ anya. Tụlee ihe atụ a: Ịmata na ọ bụ Leonardo da Vinci sere ihe osise a na-akpọ “Mona Lisa” emebeghị ka ndị na-amụ banyere ihe osise kwụsị ịchọ ịmata otú o si see ya na ihe ndị o ji see ya. N’otu aka ahụ, ikweta na e nwere Onye Okike ekwesịghị ime ka anyị ghara ịchọ ịmata otú o si kee ihe na otú ihe ndị o kere eke si dịrị mgbagwoju anya.

Kama Bible igbochi anyị imekwu nnyocha, ọ na-agba anyị ume ịchọ azịza nke ajụjụ ndị metụtara sayensị na Chineke. Eze Devid oge ochie chebaara ihe ndị dị n’ahụ́ ya dị mgbagwoju anya echiche. N’ihi ya, o kwuru, sị: “E jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ: oké ọrụ ka ọrụ Gị nile dị; mkpụrụ obi m makwaara ya nke ọma.” (Abụ Ọma 139:14) N’ezie, Bible kwuru na Onye Okike jụrụ nna ochie bụ́ Job, sị: “Ị̀ ghọtawo ruo obosara ụwa?” (Job 38:18) Nke ahụ adịghị egbochi ịjụ ajụjụ ma ọ bụ ime nchọpụta. Kama nke ahụ, ihe Onye Okike bụ́ Omenkà gwara anyị bụ ka anyị bịa mụọ banyere aka ọrụ ya. Tụleekwa oku a Aịzaịa onye amụma deturu, bụ́ nke na-agwa anyị ka anyị mụtakwuo banyere Onye kere ihe ndị gbara anyị gburugburu: “Welienụ anya unu elu, hụ: ọ̀ bụ Onye kere ihe ndị a?” N’ezie, Aịsaịa 40:26 kwuru na ọ bụ onye nwere ikike kasị ukwuu kere eluigwe na ala. Nke ahụ kwekọkwara n’ihe ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtarala banyere ihe ndị e kere eke na ikike.

N’eziokwu, inweta azịza maka ajụjụ ndị metụtara ihe ndị e kere eke anaghị adịcha mfe mgbe nile. Otu ihe mere o ji dị otú ahụ bụ na anyị apụghị ịghọta ihe nile, anyị aghọtachakwaghị ụwa nke anyị bi n’ime ya nke ọma. Job ghọtara nke a. O toro Onye Okike, bụ́ onye mere ka ụwa anyị ghara ịnọkwasị n’ihe a na-ahụ anya na mbara igwe, meekwa ka urukpuru mmiri juru kpuchie ụwa. (Job 26:7-9) Otú ọ dị, Job ghọtara na ihe ndị ahụ dị ebube ‘bụ nnọọ nanị nsọtụ ụzọ nile nke Onye Okike.’ (Job 26:14) O doro anya na Job chọrọ ịmụtakwu banyere ihe ndị gbara ya gburugburu dị n’ụwa. Devid kwetara na ihe ndị ahụ karịrị ya akarị mgbe o dere, sị: “Ọmụma ihe dị otú a dịkarịrị m ebube; ọ dịka elu, apụghị m iru ya.”—Abụ Ọma 139:6.

Ikweta na e nwere Onye Okike adịghị egbochi ọganihu nke ihe ọmụmụ sayensị. Ọ dịghị mgbe mmadụ ga-aghọtacha ihe nile banyere ihe ndị e kere eke na Onye kere ha. Otu eze oge ochie a ma ama n’ihi ihe ọmụma dị ukwuu o nwere ji umeala n’obi dee, sị: “Mgbe ebighị ebi ka O tinyeworo n’obi ha, ma ka O si tinye ya mmadụ agaghị achọpụta ọrụ ahụ nke Chineke rụworo site ná mmalite wee ruo na nsọtụ.”— Eklisiastis 3:11.

Chineke Ọ̀ Bụ “Chi Kere Ihe Ndị Sayensị Na-amaghị Otú Ha Si Malite”?

Ụfọdụ ndị na-ekwu na ndị mmadụ na-eji Chineke “ezere mmiri” mgbe ọ bụla ha na-enweghị ike iji ihe ọmụma sayensị kọwaa ihe. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ha na-ekwu na Onye Okike dị otú ahụ na-aghọ “Chi kere ihe ndị sayensị na-amaghị otú ha si malite,” ka à ga-asị na okwu ahụ bụ́ “Chineke” bụ ihe ga-apụ ndị mmadụ n’ọnụ mgbe ọ bụla ha na-aghọtaghị ihe ụfọdụ. Ma olee ihe bụ́ ihe ndị ahụ ha na-aghọtaghị? Hà bụ ụmụ obere ihe ndị anyị na-amaghị? Ee e, ha bụ ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ozizi evolushọn Darwin na-akọwalighị. Ha bụ ajụjụ ndị gbara ọkpụrụkpụ ndị mmadụ nwere banyere ozizi nke ihe isi n’otu ihe ghọọ ihe ọzọ nke ozizi evolushọn na-enwebeghị ike ịza. N’ezie, ndị kweere n’evolushọn, nke bụ́ ozizi na-enweghị ihe mgbakwasị ụkwụ, na-eji nnọọ ozizi Darwin emere “Chi kere ihe ndị sayensị na-amaghị otú ha si malite.”

Onye Okike nke Bible kwuru okwu banyere ya abụghị “Chi kere ihe ndị sayensị na-amaghị otú ha si malite.” Kama nke ahụ, ọ bụ ya kere ihe nile. Ọbụ abụ kwusiri nnọọ ike na ọ bụ Jehova kere ihe nile, na-asị: “Ndụ nile si gị n’aka, ọ bụkwa n’ihi ìhè gị ka anyị na-ahụ ìhè.” (Abụ Ọma 36:9, Today’s English Version) A kọwara ya nke ọma dị ka Onye “mere eluigwe na ụwa na oké osimiri na ihe nile dị n’ime ha.” (Ọrụ 4:24; 14:15; 17:24) Ka a sịkwa ihe mere otu onye nkụzi nke narị afọ mbụ ji dee na ọ bụ Chineke “kere ihe nile.”—Ndị Efesọs 3:9.

Ọzọkwa, Chineke guzobere “ụkpụrụ nile nke eluigwe,” iwu ebumpụta ụwa ndị na-achịkwa ikike na ihe ndị e kere eke, bụ́ iwu ndị ọkà mmụta sayensị ka na-amụ ihe banyere ha. (Job 38:33) Ihe ndị o kere zuru ezu ma nwee nzube, n’ihi na ha mezuru nzube ya nke ike ụwa ka ọtụtụ ihe dịgasị iche dị ndụ biri na ya.

Ihe E Kere Eke na Ọgụgụ Isi

N’ikpeazụ, anyị kwesịrị ịtụle ihe banyere ọgụgụ isi. Mgbe John Horgan, bụ́ onye na-ede ihe banyere sayensị na-ekwu banyere ozizi sayensị ndị anyị kwesịrị ikwere na ndị anyị na-ekwesịghị ikwere, o kwuru, sị: “Mgbe a na-enweghị ihe àmà doro anya kwadoro ozizi sayensị, ihere ekwesịghị ime anyị iji ọgụgụ isi anyị mee ihe.”

Ezi uche ọ̀ dị nnọọ n’ikwu na ndụ nọkatara dịrị? N’agbanyeghị otú e sirila gbasaa ozizi evolushọn, ọtụtụ ndị maara ihe, gụnyere ndị ọkà mmụta sayensị, ekwenyesiela ike na e nwere Onye Okike nwere ọgụgụ isi. Otu prọfesọ n’ihe ọmụmụ sayensị kwuru na ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ “bụ́ ndị na-eche echiche, kwenyesiri nnọọ ike na e kere ihe ndị dị ndụ eke.” Olee ihe mere o ji kwuo otú ahụ? Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ga-ekwere nnọọ ihe a Pọl onyeozi kwuru n’egbughị oge: “Ụlọ ọ bụla nwere onye wuru ya.” (Ndị Hibru 3:4) Pọl jizi okwu ezi uche dị na ya mechie ya, sị: “Onye wuru ihe nile bụ Chineke.” Bible eleghị ya anya dị ka ihe amamihe dị na ya ikweta na ụlọ nwere onye rụrụ ya ma kwerekwa na mkpụrụ ndụ dị mgbagwoju anya nọkatara pụtara onwe ya.

Bible na-ekwu banyere ndị na-ekwu na e nweghị Onye Okike, sị: “Onye nzuzu asịwo n’obi ya, Ọ dịghị Chineke ọ bụla dị.” (Abụ Ọma 14:1) N’ebe a, ọbụ abụ na-abara ndị na-ekwetabeghị na e nwere Onye Okike mba. Mmadụ nwere ike ịdị na-agbaso echiche nke ya kama iji uche ghere oghe chebara ihe echiche. N’aka nke ọzọ, onye maara ihe nke nwere ezi uche na-eji obi umeala ekweta na e nwere Onye Okike.—Aịsaịa 45:18.

Ọtụtụ ndị na-eche echiche kwetara na e nwere ọtụtụ ihe àmà ndị na-egosi na e nwere Onye Okike Kasị Elu.

I Nwere Ike Ịmata Onye Kere Ihe Nile

Ọ bụrụ na anyị kweere na e kere anyị eke, olee ihe mere e ji kee anyị? Gịnị bụ nzube nke ndụ anyị? Ihe ọmụmụ sayensị nanị agaghị enyeli azịza na-eju afọ maka ajụjụ ndị dị otú ahụ. Otú ọ dị, ajụjụ ndị a dị oké mkpa chọrọ azịza ndị ga-edo anya na ndị ga-eju afọ. Ọ bụ Bible ga-aza ajụjụ ndị a. Ọ na-akọwa Jehova dị ka Onye Okike nakwa dị ka Onye Na-ezube Ihe, onye nwere ezigbo ihe mere o ji na-eme ihe ndị ọ na-eme. Akwụkwọ Nsọ kpughere ihe Chineke zubere maka ụmụ mmadụ, na-ekwe anyị nkwa maka ọdịnihu ma na-eme ka anyị na-enwe olileanya.

Ma, ònye bụ Jehova? Olee ụdị Chineke ọ bụ? Ndịàmà Jehova na-agba gị ume ịmata Onye Okike anyị nwere ọgụgụ isi dị ka onye dị adị. Ị pụrụ ịmụ ihe banyere aha ya na àgwà ya na otú o si emeso ụmụ mmadụ omume. Site n’ihe ndị e dere n’Okwu ya, bụ́ Bible, ị ga-abịa ghọta ihe mere anyị kwesịrị iji too ya dị ka Onye Okike, ọ bụghị nanị inwe mmasị n’ihe ndị dị ebube o kere.—Abụ Ọma 86:12; Mkpughe 4:11.

[Foto dị na peeji nke 4]

Michelangelo

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

Ikwere na e nwere Onye Okike kwekọrọ n’ezi sayensị

[Foto dị na peeji nke 6]

Otú ihe ndị dị ndụ si dịgasịa iche na otú o si ekwe ha omume ịgbanwe iji kwekọọ n’ebe ha nọ na-egosi na ọ dị onye ji ọgụgụ isi kee ha n’ụdị dị iche iche

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ihe e kere eke nwere onye kere ya