Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Oké Onyinye” E Nyere Poland

“Oké Onyinye” E Nyere Poland

“Oké Onyinye” E Nyere Poland

NA July 6, 1525, Eze Albrecht nke Hohenzollern kwuru na okpukpe Lutheran bụzi okpukpe mba ahụ. Ducal Prussia, bụ́ obodo nọ n’okpuru alaeze Poland n’oge ahụ, si otú ahụ ghọọ obodo mbụ dị na Europe nke nabatara ozizi Martin Luther.

Albrecht chọrọ ime Königsberg—nke bụ́ isi obodo Ebe Ọwụwa Anyanwụ Prussia—ebe okpukpe Protestant hiwere isi. O wuru mahadum n’obodo ahụ ma nye iwu ka e bipụta akwụkwọ okpukpe Lutheran n’asụsụ dị iche iche. N’afọ 1544, eze ahụ nyekwara iwu ka a na-agụrụ ndị Poland nọ n’okpuru ọchịchị ya akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ n’asụsụ ha. Otú ọ dị, ọ dịghị Bible e nwere mgbe ahụ n’asụsụ Polish.

Bible E Ji “Okwu Ndị E Ji Eme Ihe Kwa Ụbọchị” Sụgharịa

Iji dozie ọnọdụ ahụ, Albrecht malitere ịchọ onye nwere ike ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst gaa n’asụsụ Polish. Ihe dị ka n’afọ 1550, o were onye edemede, onye na-ere akwụkwọ, na onye na-ebi akwụkwụ nke aha ya bụ Jan Seklucjan n’ọrụ. Seklucjan gụsịrị akwụkwọ na Mahadum Leipzig ma bụrụ onye a ma ama nke na-eji ịgbasa ozizi ndị Protestant enye Chọọchị Katọlik nsogbu. N’ezie, tupu mgbe ahụ, ọ gara Königsberg ka e wee ghara ikpe ya ikpe maka nkwenkwe okpukpe ya.

Jan Seklucjan rụsiri ọrụ ike n’ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ n’asụsụ Polish. Nanị otu afọ e wesịrị Seklucjan n’ọrụ, e bipụtara mbipụta mbụ nke Oziọma Matiu. Bible a nwere ọtụtụ nkọwa na ihe odide etiti peeji ndị na-enye aka ma na-agwa onye na-agụ ya otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa amaokwu ụfọdụ. N’oge na-adịghị anya ka nke ahụ gasịrị, Seklucjan mere ka e bipụta Bible bú Matiu, Mak, Luk, na Jọn. O bipụtara Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst nanị n’ime afọ atọ.

Iji bipụta Bible ziri ezi, onye sụgharịrị Bible ahụ ji ihe odide Grik mee nsụgharị ahụ. Ọzọkwa, okwu mmalite nke mbipụta ya nke afọ 1551 kwuru na e leere anya ná nsụgharị ndị dị n’asụsụ Latin na “ndị dị n’asụsụ ndị ọzọ mgbe a na-asụgharị ya.” Stanisław Rospond, bụ́ onye dere akwụkwọ bụ́ Studies on the Polish Language of the 16th Century, kwuru na e ji “asụsụ dị ụtọ na nke na-aga werewere n’ọnụ” sụgharịa Bible ahụ. Rospond kwuru na onye sụgharịrị ya ejighị “okwu ndị gụrụ oké akwụkwọ” mee ihe. Kama nke ahụ, ọ gbalịrị iji okwu Polish ndị “yiri nnọọ okwu ndị e ji eme ihe kwa ụbọchị.”

Ọ bụ ezie na ọ bụ Seklucjan hụrụ maka ịsụgharị Bible a, ihe àmà na-egosi na ọ bụghị ya sụgharịrị ya n’onwe ya. Ònye bụzi ọkà mmụta sụgharịrị ya? Ọ bụ Stanisław Murzynowski, bụ́ onye o yiri ka ọ̀ dị afọ 23 mgbe Seklucjan were ya n’ọrụ a tara akpụ, sụgharịrị Bible ahụ.

A mụrụ Murzynowski n’ime obodo, ma mgbe o toruru ogo mmadụ, nna ya zigara ya na Königsberg iji mụọ asụsụ Grik na Hibru. Mgbe e mesịrị, Murzynowski banyere Mahadum Wittenberg, dị na Germany, bụ́ ebe ọ nọ ma eleghị anya hụ Martin Luther. Nwa akwụkwọ ahụ gere ntị n’ihe ndị Philipp Melanchthon kụziri, o dokwara anya na ọ bụ nwoke a nyeere ya aka ịghọta ma asụsụ Grik ma nke Hibru nke ọma. Mgbe Murzynowski gasịrị Ịtali gaa gụkwuo akwụkwọ, ọ lọghachiri na Königsberg ma malite ịrụrụ Eze Albrecht ọrụ.

Maria Kossowska kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ The Bible in the Polish Language na “Murzynowski rụsiri ọrụ ike ma rụpụta ihe ma ọ chọghị ka e too ya, ọ chọghị ọkwá dị elu, ma ọ bụ kwuo ka e dee aha ya na Bible ahụ ọ sụgharịrị.” N’ezie, nwa okorobịa a kwuru banyere nkà ya, sị: “Amaghị m asụsụ m ka edejọ ihe na ya, ma ọ bụ Latin ka ọ bụ Polish.” N’agbanyeghị obi abụọ Murzynowski nwere, ọ hụrụ nnọọ na ndị Poland nwetara Okwu Chineke. Onye ya na ya rụkọtara ọrụ, bụ́ Seklucjan, kwuru na Bible ahụ ha sụgharịrị bụ “oké onyinye” e nyere Poland.

Otu n’Ime Onyinye Ndị Kasị Ukwuu

A sụgharịala ọtụtụ Bible kemgbe a sụgharịchara nke Polish mbụ ahụ. N’afọ 1994, e bipụtara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, bipụtakwa New World Translation of the Holy Scriptures n’ozuzu ya n’afọ 1997 n’asụsụ Polish. Ndị sụgharịrị ya, bụ́ ndị na-anaraghị otuto, nwara ịsụgharị Okwu Chineke otú ọ ga-ezi ezi ma yiekwa asụsụ a na-asụ kwa ụbọchị n’oge a, kama iyi nke a sụrụ na narị afọ nke 16.

Taa, e nwere Bible n’ozuzu na akụkụ ya ụfọdụ n’ihe dị ka puku asụsụ abụọ na narị anọ. Ọ bụrụ na i nwere ike inweta nsụgharị ziri ezi nke Okwu Chineke n’asụsụ ala nna gị, ọ bụ onyinye kasịnụ ị pụrụ inweta, bụ́ onyinye nke Jehova Chineke nyere gị maka iduzi gị.—2 Timoti 3:15-17.

[Foto dị na peeji nke 20]

Nkume e ji echeta Stanisław Murzynowski, bụ́ onye sụgharịrị “Agba Ọhụrụ” n’asụsụ Polish

[Foto dị na peeji nke 21]

Isi 3 nke akwụkwọ Matiu, bụ́ nke Stanisław Murzynowski, sụgharịrị

[Ebe E Si Nweta Foto]

Dzięki uprzejmości Towarzystwa Naukowego Płockiego