Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Daniel

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Daniel

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Daniel

“AKWỤKWỌ bụ́ Holman Illustrated Bible Dictionary kwuru, sị: “Akwụkwọ Daniel bụ otu n’ime akwụkwọ Bible ndị dị nnọọ ụtọ ọgụgụ. Eziokwu ndị na-adịghị agbanwe agbanwe jupụtara n’ime ya.” Ihe ndị Daniel dekọrọ n’akwụkwọ ya bụ ihe ndị mere malite n’afọ 618 T.O.A., bụ́ mgbe Eze Nebukadneza nke Babịlọn bịara Jeruselem ma nọchibido ya ma kpụrụ “ụfọdụ n’ụmụ Izrel” gaa Babịlọn. (Daniel 1:1-3) Daniel so ná ndị a kpụụrụ, eleghịkwa anya, ọ dị nanị afọ iri na ụma mgbe ahụ. Daniel ka nọ na Babịlọn mgbe o dekọrọ ihe ndị ikpeazụ dị n’akwụkwọ ya. Mgbe ọ fọrọ nke nta ka Daniel ruo otu narị afọ, Chineke kwere ya nkwa, sị: “Ị ga-ezukwa ike, guzo ọtọ n’ebe e keworo nye gị, n’ọgwụgwụ ụbọchị ndị a.”—Daniel 12:13.

A kọrọ akụkọ ndị dị n’akụkụ nke mbụ nke akwụkwọ Daniel n’usoro ha si mee. E dere ya dị ka à ga-asị na onye dere ya na-akọ banyere onye ọzọ. Ma e dere akụkụ ikpeazụ ya otú na-egosi na onye dere ya na-akọ banyere onwe ya. Ọ bụ Daniel dere akwụkwọ a. O dekọrọ amụma banyere mba dị iche iche ndị chịrị ụwa, otú ha si bilie na otú ha si daa, deekwa mgbe Mezaịa ga-abịa, na ihe ndị na-eme n’oge anyị a. * Ma onye amụma ahụ merela agadi kọkwara ihe ụfọdụ ndị mere ná ndụ ya ma gwa anyị ihe ndị ga-agba anyị ume ịnọgide na-erubere Chineke isi ma na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya. Akwụkwọ Daniel dị ndụ ma na-akpa ike.—Ndị Hibru 4:12.

GỊNỊ KA AKỤKỤ AHỤ A KỌRỌ N’USORO HA SI MEE NA-AKỤZIRI ANYỊ?

(Daniel 1:1–6:28)

Ọ bụ n’afọ 617 T.O.A. Daniel na ndị enyi ya atọ bụ́ Shedrak, Mishak, na Abednego, nọ n’obí eze ndị Babịlọn. N’ime afọ atọ e ji kụziere ha ọdịnala na omenala ndị Babịlọn, ụmụ okorobịa ndị a nọgidere na-erubere Chineke isi. Ka ihe dị ka afọ asatọ gasịrị, Eze Nebukadneza rọrọ nrọ gbagwojuru ya anya. Daniel kọọrọ ya nrọ ahụ ma kọwaara ya isi ya. Nke a mere ka eze ahụ kwuo na Jehova bụ “Chineke nke chi nile, na Onye nwe ndị eze, na Onye na-ekpughe ihe nzuzo nile.” (Daniel 2:47) Ma ọ dịghị anya Nebukadneza echefuo ihe a o kwuru. Mgbe ndị enyi atọ Daniel jụrụ ịkpọ isiala nye nnukwute ihe oyiyi ahụ Nebukadneza guzobere, eze ahụ kwuru ka a tụba ha n’ime oké ọkụ na-enwu ajọ onwunwu. Ezi Chineke ahụ napụtara ha atọ, nke a mekwara ka Nebukadneza kweta na “ọ dịghị chi ọzọ nke pụrụ ịnapụta otú a.”—Daniel 3:29.

Nebukadneza rọkwara nrọ ọzọ dị omimi. Ọ hụrụ otu nnukwu osisi, bụ́ nke e gbuturu ma were ígwè kee ya agbụ ka ọ ghara ito ọzọ. Daniel kọwara isi nrọ ahụ. Nrọ ahụ mezuru nke mbụ ya mgbe isi mgbaka bịara Nebukadneza, e mesịakwa isi adị ya mma. Ka ọtụtụ iri afọ gasịrị, Eze Belshaza kpọrọ ndị isi ya oriri, iji kparịa Chineke, o weere iko ọlaedo na ọlaọcha ndị nna ya chịtara n’ụlọ nsọ Jehova ṅụọ mmanya. E gburu Belshaza n’abalị ahụ, Daraịọs onye Midia wee weghara alaeze ya. (Daniel 5:30, 31) N’oge Daraịọs na-achị, mgbe Daniel karịrịla iri afọ itoolu, ụfọdụ ndị ọchịchị meere onye amụma ahụ anyaụfụ ma kpaa nkata igbu ya. Ma Jehova napụtara ya “n’aka ọdụm.”—Daniel 6:27.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:11-15—Ọ̀ bụ ihe ọkụkụ ahụ ụmụ okorobịa ndị Juu anọ ahụ riri mere ha ji dị mma n’anya karịa ndị ọzọ? Ọ bụghị ya. Enweghị nri ga-eme ka ahụ́ dị mmadụ mma otú ahụ nanị n’ime ụbọchị iri. Ọ bụ Jehova mere ka ahụ́ dị ụmụ okoro ndị Hibru ahụ mma. Ọ bụ ụzọ Jehova si gọzie ha maka ịtụkwasị ya obi.—Ilu 10:22.

2:1—Olee mgbe Nebukadneza rọrọ nrọ banyere nnukwu ihe oyiyi ahụ? Ihe ndekọ ahụ kwuru na ihe a mere “n’afọ nke abụọ nke ọbụbụeze nke Nebukadneza.” Nebukadneza ghọrọ eze na 624 T.O.A. Nke a pụtara na afọ nke abụọ nke ọchịchị ya gaara amalite na 623 T.O.A., nke bụ́ ọtụtụ afọ tupu o busoo Juda agha. Ọ bụrụ n’oge ahụ, e nweghị otú ọ ga-esi bụrụ na Daniel nọ na Babịlọn ịkọwara ya nrọ ahụ. O yiri ka mgbe a malitere gụwa ‘afọ nke abụọ’ e kwuru okwu ya ebe a ọ̀ bụ na 607 T.O.A., bụ́ mgbe eze Babịlọn ahụ bibiri Jeruselem ma ghọọ onye na-achị ụwa.

2:32, 39—Olee otú alaeze ahụ bụ́ ọlaọcha ga-esi dị ala karịa nke ahụ bụ́ ọlaedo, oleekwa otú alaeze ahụ bụ́ ọla ga-esi dị ala karịa nke ọlaọcha ahụ? Alaeze ukwu nke ndị Midia na Peasia, bụ́ nke akụkụ ihe oyiyi ahụ bụ́ ọlaọcha na-anọchi anya ya, dị ala karịa Babịlọn, bụ́ isi ihe oyiyi ahụ nke bụ́ ọlaedo, n’ụdị na o nwetaghị ihe ùgwù nke ịkwatu ọchịchị alaeze Juda. Ọchịchị nke sochirinụ bụ Gris, bụ́ nke ọla na-anọchi anya ya. Gris dị ala karịa Midia na Peasia, dị nnọọ ka ọla dị ala karịa ọlaọcha. Ọ bụ ezie na Alaeze Ukwu Gris gbasara nnọọ ruo n’ebe dị anya karịa alaeze nke bu ya ụzọ, o nwetaghị ihe ùgwù nke ịtọhapụ ndị Chineke na Babịlọn dị nnọọ ka ọchịchị Midia na Peasia nwetara.

4:8, 9—Daniel ọ̀ ghọrọ onyeisi ndị odeakwụkwọ dị nsọ [“onyeisi nke ndị dibịa anwansi,” NW]? Ee e. Okwu ahụ bụ́ “onyeisi nke ndị dibịa anwansi” na-egosi ọkwá Daniel dị ka “onyeisi ndị nọchiri anya eze n’ịchị ndị amamihe nile nke Babịlọn.”—Daniel 2:48.

4:10, 11, 20-22—Gịnị ka osisi ahụ gbara agba Nebukadneza hụrụ ná nrọ ya na-anọchi anya ya? Ná mmezu mbụ ya, osisi ahụ nọchiri anya Nebukadneza, bụ́ onyeisi mba na-achị ụwa n’oge ahụ. Ma, ebe ọ bụ na ọchịchị ahụ ruru “nsọtụ ụwa,” ọ ghaghị ịbụ na osisi ahụ nọchiri anya ihe ọzọ ka nnọọ ukwuu. Daniel 4:17 na-egosi na e nwere ihe jikọrọ nrọ ahụ na ọchịchị nke “Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu” n’alaeze nke mmadụ. Osisi ahụ nọchikwara anya ọbụbụeze eluigwe na ala Jehova, karịsịa n’ihe banyere ụwa. N’ihi ya, nrọ ahụ nwere mmezu abụọ—n’ihe banyere ọchịchị Nebukadneza na n’ihe banyere ọbụbụeze Jehova.

4:16, 23, 25, 32, 33—Afọ ole ka “oge asaa” ahụ bụ? Mgbanwe nile mere n’ahụ́ Eze Nebukadneza gosiri na “oge asaa” ahụ kwesịrị ịkarị ụbọchị asaa nkịtị. Na nke Nebukadneza, oge asaa ahụ pụtara afọ asaa nke otu afọ n’ime ya nwere narị ụbọchị atọ na ụbọchị iri isii, ma ọ bụ nke ngụkọta ya bụ puku ụbọchị abụọ na narị ise na iri abụọ. Ná mmezu ya nke ka ukwuu, “oge asaa” ahụ bụ puku afọ abụọ narị afọ ise na iri afọ abụọ. (Ezikiel 4:6, 7) Afọ ndị a malitere mgbe e bibiri Jeruselem na 607 T.O.A., ọ bịakwara ná njedebe mgbe e chiri Jizọs eze n’eluigwe na 1914 O.A.—Luk 21:24.

6:6-10—Ebe ọ bụ na enweghị kpọmkwem otú Jehova chọrọ ka anyị si nọrọ mgbe anyị na-ekpegara ya ekpere, ọ̀ gaaraghị aka mma ma a sị na Daniel gara na nzuzo kpee ekpere ụbọchị iri atọ ahụ? Ọtụtụ mmadụ maara na Daniel na-ekpe ekpere ugboro atọ n’ụbọchị. Ọ bụdị ya mere ndị ahụ ji cheta ịkpa nkata iti iwu megidere mmadụ ikpe ekpere. Ọ bụrụ na Daniel agbanwee oge na otú o si ekpe ekpere, ndị ọzọ gaara ewere na o jila ụjọ mebie iwu Chineke, ọ gakwaara egosi na o jighị obi dum na-efe Jehova.

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

1:3-8. Otú ahụ Daniel na ndị enyi ya si kpebisie ike irubere Jehova isi na-eme ka anyị ghọta uru ọzụzụ ndị nne na nna ha nyere ha bara. Mgbe ndị nne na nna na-atụ egwu Chineke butere ihe ndị metụtara Chineke ụzọ ná ndụ ha ma kụziere ụmụ ha ime otu ihe ahụ, o yikarịrị ka ọzụzụ dị otú ahụ ọ̀ ga-enyere ụmụ ha ndị ahụ aka imeri ọnwụnwa na ule ndị nwere ike ịbịara ha n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ.

1:10-12. Daniel ghọtara ihe mere “onyeisi ndị onozi” ahụ ji tụọ egwu eze, ọ bụkwa ya mere ọ gaghị n’ihu ịrịọ ya ka o meere ya ihe ahụ ọ na-arịọ ya. Otú ọ dị, Daniel mesịrị gakwuru “onye nlekọta” e nyefere ọrụ ilekọta ha, bụ́ onye o lere anya na ọ nọ n’ọnọdụ ka mma ilebara ihe ọ na-ekwu anya. Mgbe anyị nwere ihe isi ike ụfọdụ, anyị kwesịrị iji nghọta, ezi uche na amamihe yiri nke ahụ mee ihe.

2:29, 30. Anyị kwesịrị iṅomi ihe nlereanya Daniel site n’ime ka otuto nile gaara Jehova maka ihe ọmụma, amamihe, na ike ọ bụla anyị nwere, bụ́ ndị anyị na-enweta site ná nri ime mmụọ ndị ọ na-enye anyị.

3:16-18. O yighị ka ụmụ okorobịa Hibru atọ ahụ hà gaara enwe ike ịgba isi akwara na ha agaghị akpọ isiala nye ihe oyiyi ahụ eze mere ma ọ bụrụ na ha ebughị ụzọ rube isi n’iwu Chineke n’ihe banyere ihe oriri ha na-eri. Anyị onwe anyị kwesịkwara ịgbalịsi ike hụ na anyị “na-ekwesị ntụkwasị obi n’ihe nile.”—1 Timoti 3:11.

4:24-27. Ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ, nke gụnyere ịkpọsa ikpe Chineke, chọrọ ka mmadụ nwee ụdị okwukwe na obi ike dị ka nke Daniel nwere mgbe ọ gwara Nebukadneza ihe ga-adakwasị ya na ihe o kwesịrị ime ka ‘ogologo mgbe wee dịịrị udo ya.’

5:30, 31. ‘Ilu ahụ a tụrụ megide eze Babịlọn’ mezuru. (Aịsaịa 14:3, 4, 12-15) Setan bụ́ Ekwensu, bụ́ onye mpako ya dị ka nke ndị eze Babịlọn, ga-enwetakwa mbibi na-eme ihere.—Daniel 4:30; 5:2-4, 23.

GỊNỊ KA ỌHỤỤ NDỊ AHỤ DANIEL HỤRỤ NA-EKPUGHERE ANYỊ?

(Daniel 7:1–12:13)

Mgbe Daniel hụrụ ọhụụ ya nke mbụ n’afọ 553 T.O.A., ọ gbafeela iri afọ asaa. Daniel hụrụ anụ ọhịa anọ buru ezigbo ibu, bụ́ ndị na-anọchi anya mba ndị na-achị ụwa malite n’oge ya ruo n’oge anyị a. Mgbe e gosiri ya ọhụụ eluigwe, ọ hụrụ “otu onye, nke dị ka nwa nke mmadụ” ka e nyere ya “ọchịchị ebighị ebi.” (Daniel 7:13, 14) Ka afọ abụọ gasịrị, Daniel hụkwara ọhụụ ọzọ metụtara ndị Midia na Peasia, Gris, na otu eze nke ghọrọ ‘eze nwere ihu dị ike.’—Daniel 8:23.

Ihe a nọzi ugbu a bụ n’afọ 539 T.O.A. Daraịọs onye Midia akwatuola ọchịchị Babịlọn, ma bụrụ eze ndị Kaldia. Daniel kpegaara Jehova ekpere ka o mee ka ndị ya laghachi n’ala ha. Mgbe ọ ka nọ na-ekpe ekpere, Jehova zitere mmụọ ozi ya bụ́ Gebriel ka ọ bịa mee ka Daniel “nwee uche ịghọta ihe” banyere ọbịbịa Mezaịa ahụ. (Daniel 9:20-25) E ruola n’afọ 536/535 T.O.A. Ndị Izrel fọdụrụnụ alaghachila Jeruselem. Ma e nwere ndị na-emegide ha ka ha na-arụ ụlọ nsọ ahụ. Nke a kpataara Daniel oké nchegbu. O kpegaara Jehova ekpere banyere ya, Jehova ezitekwa otu mmụọ ozi ọkwá ya dị elu ka ọ bịa gbaa Daniel ume. Mgbe mmụọ ozi ahụ gbasịrị Daniel ume, ya emee ka Daniel detuo amụma banyere ọgụ na mgba ga-adị n’etiti eze ugwu na eze ndịda, nke ha gbara iji mara onye nke n’ime ha ga-achị ụwa. Esemokwu a dị n’etiti eze abụọ ahụ malitere mgbe ndị ọchịagha anọ nọ n’okpuru Alexander Onye Ukwu kere alaeze nna ha ukwu n’etiti onwe ha ruokwa mgbe Maịkael, bụ́ onyeisi ukwu, “ga-eguzo ọtọ.”—Daniel 12:1.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

8:9—Gịnị ka “ala ahụ mara mma” na-anọchi anya ya? N’ebe a, “ala ahụ mara mma” na-anọchi anya ọnọdụ Ndị Kraịst e tere mmanụ mgbe ha nọ n’ụwa n’oge ọchịchị Anglo-America.

8:25—Onye bụ “onyeisi nke ndị isi”? Okwu Hibru ahụ bụ́ sar, bụ́ nke a sụgharịrị ịbụ “onyeisi,” pụtara n’ụzọ bụ́ isi “chiifu,” ma ọ bụ “onye nọ n’isi.” Utu aha ahụ bụ́ “Onyeisi nke ndị isi” bụ nanị Jehova Chineke na-aza ya—onye bụ́ Onyeisi ndị mmụọ ozi nile, nke gụnyere “Maịkael, bụ́ otu n’ime ndị isi ndị bụ́ isi.”—Daniel 10:13.

9:21—Gịnị mere Daniel ji kpọọ mmụọ ozi ahụ aha ya bụ Gebriel “onye ahụ”? Ọ bụ n’ihi na Gebriel bịakwutere ya n’ụdị mmadụ, bụ́kwa otú o si bịakwute ya ná mbụ.—Daniel 8:15-17.

9:27—Olee ọgbụgba ndụ e mere ka o “siere ọtụtụ mmadụ ike” ruo ná ngwụsị nke izu ikpeazụ nke izu iri asaa ahụ ma ọ bụ n’afọ 36 O.A.? E wepụrụ ọgbụgba ndụ Iwu ahụ na 33 O.A. bụ́ mgbe e gburu Jizọs. Ma site n’ikwe ka ọgbụgba ndụ ya na Ebreham nọgidere ndị Izrel anụ ahụ́ ruo afọ 36 O.A., Jehova nyekwuru ndị Juu ohere isonye n’Izrel ime mmụọ n’ihi na ha bụ mkpụrụ Ebreham. Ọgbụgba ndụ ya na Ebreham ahụ ka dịkwa irè maka “Izrel nke Chineke.”—Ndị Galeshịa 3:7-9, 14-18, 29; 6:16.

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

9:1-23; 10:11. Daniel bụ ‘onye a na-achọsi ike nke ukwuu’ n’ihi na ọ dị umeala n’obi, ọ na-atụ egwu Chineke, ọ bụ onye na-agba mbọ, nakwa onye na-ekpechi ekpere anya. Ọ bụkwa àgwà ndị a nyeere ya aka ịnọgidesi ike na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke ruo ọnwụ ya. Ka anyị kpebisie ike iṅomi ihe nlereanya Daniel.

9:17-19. Ọ bụrụgodị na anyị na-ekpe ekpere ka ụwa ọhụrụ Chineke, bụ́ nke “ezi omume gaje ibi n’ime ha” bịa, ihe bụ́ isi anyị kwesịrị ịdị na-ekpe ekpere maka ya ò kwesịghị ịbụ ka e doo aha Jehova nsọ ma wepụ ọbụbụeze ya n’ụta, karịa ịbụ nanị ka e wepụrụ anyị nsogbu na ihe isi ike nile?—2 Pita 3:13.

10:9-11, 18, 19. Anyị kwesịrị iṅomi mmụọ ozi ahụ bịara gbaa Daniel ume site n’ịgba ndị ọzọ ume nakwa site n’inyere ha aka na ịgwa ha okwu ga-akasi ha obi.

12:3. N’ụbọchị ikpeazụ ndị a, “ndị ahụ ndị nwere uche,” nke bụ́ Ndị Kraịst e tere mmanụ, anọwo kemgbe na-enwu dị ka “ihe ndị na-enye ìhè,” ha emeekwala “ọha mmadụ ka ha ghọọ ndị ezi omume,” tinyere “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ. (Ndị Filipaị 2:15; Mkpughe 7:9; Jọn 10:16) Ndị e tere mmanụ ga-amụke ‘dị ka kpakpando’ n’ụzọ zuru ezu n’oge Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst, mgbe ha ga-eso ya mee ka ụmụ mmadụ ndị na-erubere Chineke isi rite uru zuru ezu n’àjà mgbapụta ahụ. “Atụrụ ọzọ” ahụ kwesịrị ịnọgidesi ike na-eso ndị e tere mmanụ na-arụkọ ọrụ, na-eji obi ha nile na-akwado ha n’ụzọ ọ bụla.

Jehova ‘Na-agọzi Ndị Na-atụ Egwu Ya’

Gịnị ka akwụkwọ Daniel na-akụziri anyị banyere Chineke anyị na-efe? Chegodị echiche banyere amụma ndị e dekọrọ n’ime ya, ma ndị nke mezurulanụ ma ndị nke ka ga-emezu emezu. Ha nile na-egosi nnọọ na Jehova bụ Onye na-emezu okwu ya.—Aịsaịa 55:11.

Gịnị ka akụkụ akwụkwọ Daniel nke ahụ e dere dị ka akụkọ na-agwa anyị banyere Chineke? Chineke nyere ụmụ okorobịa Hibru anọ ahụ jụrụ ịnabata ndụ ndị Babịlọn ‘ihe ọmụma, ezi uche, na amamihe.’ (Daniel 1:17) Ezi Chineke ahụ zitere mmụọ ozi ya ka ọ bịa zọpụta Shedrak, Mishak, na Abednego n’oké ọkụ na-enwu ajọ onwunwu. A napụtara Daniel n’ọnụ ọdụm. Jehova ‘na-enyere ndị tụkwasịrị ya obi aka, ọ bụkwa ọta ha’ ọ ‘na-agọzikwa ndị na-atụ egwu ya.’—Abụ Ọma 115:9, 13.

[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 2 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịma ebe a tụlere akwụkwọ Daniel n’amaokwu n’amaokwu, lee akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!, bụ́ nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 18]

Gịnị mere Daniel ji bụrụ “onye a na-achọsi ike nke ukwuu”?