Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kụziere Ụmụ Gị Ịhụ Jehova n’Anya

Kụziere Ụmụ Gị Ịhụ Jehova n’Anya

Kụziere Ụmụ Gị Ịhụ Jehova n’Anya

“Dị ka akụ́ n’aka dike, otú a ka ụmụ a mụrụ na mgbe okorobịa dị.”—ABỤ ỌMA 127:4.

1, 2. Olee otú ụmụaka si dị ka “akụ́ n’aka dike”?

Ọ BỤRỤ na onye na-agba ụta achọọ ịgba otu ihe, ọ na-ebu ụzọ tinye akụ́ ya nke ọma n’eriri ụta ya, ma dọọ ụta ya otú ọ ga-enwe ike ịgbapụ akụ́ ahụ. N’agbanyeghị na aka nwere ike igbu ya mgbu mgbe ọ na-adọ ya, ọ na-elegide nnọọ anya n’ebe ọ chọrọ ịgba ụta ahụ. Ọ na-agbapụzi akụ́ ahụ. Akụ́ ahụ ọ̀ ga-aga n’ebe a chọrọ ka ọ gaa? E nwere ọtụtụ ihe ga-eme ka o mee otú ahụ, ha gụnyere, ma onye ahụ na-agba ụta ọ̀ ma agba, ebe ifufe chere ihu, nakwa otú akụ́ ya ahụ dị.

2 Eze Solomọn ji ụmụaka tụnyere “akụ́ n’aka dike.” (Abụ Ọma 127:4) Ka anyị tụlee ihe anyị nwere ike isi n’ihe atụ a mụta. Akụ́ anaghị adịte aka n’ụta onye chọrọ ịgbapụ ya. Ọ bụrụ na onye ahụ chọrọ ka akụ́ ahụ gaa n’ebe ọ chọrọ ka ọ gaa, ọ ga-agbapụrịrị ya ngwa ngwa. N’otu aka ahụ, ndị mụrụ ụmụ nwere nanị obere oge iji kụziere ụmụ ha otú ha ga-esi jiri obi ha dum hụ Jehova n’anya. Mgbe obere oge gasịrị, ụmụaka na-etolite ma hapụ ndị mụrụ ha. (Matiu 19:5) Akụ́ ahụ ndị mụrụ ụmụ gbapụrụ, ọ̀ ga-agbata ihe ha chọrọ ka ọ gbata—ya bụ, ụmụ ha hà ga-anọgide na-ahụ Chineke n’anya ọbụna mgbe ha si n’ụlọ nne na nna ha pụọ? E nwere ọtụtụ ihe ga-ekpebi nke ga-emenụ. Atọ n’ime ha bụ, otú ndị nne na nna a si mara ịzụ ụmụ, ebe ha nọ zụlite ụmụ ha, na otú ‘akụ́,’ ma ọ bụ nwa ahụ, si nabata ọzụzụ e nyere ya. Ka anyị tụlee ihe ndị a n’otu n’otu. Nke mbụ, anyị ga-eleba anya n’ihe ụfọdụ e ji ama nne ma ọ bụ nna maara ka e si azụ ụmụ.

Ndị Nne na Nna Maara Ka E Si Azụ Ụmụ Na-esetịpụ Ezi Ihe Nlereanya

3. Gịnị mere o ji dị mkpa ka ndị mụrụ ụmụ bụrụ ekwu eme?

3 Jizọs setịpụụrụ ndị nne na nna ihe nlereanya n’ụdị na o mere ihe ọ kụziri. (Jọn 13:15) N’aka nke ọzọ, ọ katọrọ ndị Farisii, bụ́ ndị “na-ekwu” ma ha “adịghị eme” ihe ha kwuru. (Matiu 23:3) Ndị nne na nna aghaghị ịbụ ekwu eme ma ọ bụrụ na ha chọrọ ka ụmụ ha hụ Jehova n’anya. Ịbụ ekwu ekwu eme eme abaghị uru ọ bụla dị nnọọ ka mmadụ ịchọ ịgba ụta na-enweghị eriri e ji kwee ya na-abaghị uru ọ bụla.—1 Jọn 3:18.

4. Olee ajụjụ ndị ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịjụ onwe ha, n’ihi gịnịkwa?

4 Gịnị mere o ji dị oké mkpa ka ndị nne na nna setịpụ ezi ihe nlereanya? Dị nnọọ ka ndị toro eto na-amụta ịhụ Chineke n’anya site n’iṅomi ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ, otú ahụkwa ka ụmụaka si amụta ịhụ Jehova n’anya site n’iṅomi ezi ihe nlereanya nke ndị mụrụ ha. Ndị ha na nwatakịrị na-akpa nwere ike ime ka nwa ahụ na-akpa ezi àgwà ma ọ bụ mebie “àgwà bara uru” o nwere. (1 Ndị Kọrint 15:33) Oge nwata ka dị nnọọ obere, nke bụ́kwa oge ọ ka na-etolite nnọọ etolite, nne na nna ya bụ ndị ha na ya na-anọkọ mgbe nile, omume ha kasịkwa ekpebi otú omume nwa ahụ ga-adị ma o too. N’ihi ya, o kwesịrị ka ndị nne na nna jụọ onwe ha, sị: ‘Olee ụdị mmadụ m bụ? Àna m akpa àgwà ga-eme ka nwa m malite ịkpa àgwà bara uru? Olee ihe nlereanya m na-esetịpụrụ nwa m n’ihe metụtara ikpe ekpere na ịmụ Bible?’

Ndị Nne na Nna Maara Ka E Si Azụ Ụmụ na Ụmụ Ha Na-ekpekọ Ekpere

5. Gịnị ka ụmụaka nwere ike ịmụta mgbe ndị mụrụ ha na-ekpe ekpere?

5 Ụmụ gị pụrụ isi n’ihe ndị ị na-ekwu n’ekpere gị mụta ọtụtụ ihe banyere Jehova. Ọ bụrụ na ha anụ ka ị na-ekele Chineke mgbe unu na-achọ iri nri, nakwa mgbe unu na-achọ inwe ọmụmụ ihe ezinụlọ, gịnị ka ha ga-echewe? O yikarịrị ka ha ga-amụta na ọ bụ Jehova na-enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa ná ndụ—na anyị kwesịkwara ikele ya n’ihi nke a. Ha ga-amụtakwa na ọ na-akụziri anyị eziokwu ndị sitere na Bible. Ihe ndị a nile bụcha ihe ndị dị oké mkpa.—Jems 1:17.

6. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi nyere ụmụ ha aka ịghọta na Jehova na-eche banyere ọdịmma onye ọ bụla n’ime ha n’otu n’otu?

6 Ma, ọ bụrụ na gị na ndị ezinụlọ gị na-ekpe ekpere n’oge ndị ọzọ na-abụghị nanị oge unu chọrọ iri nri ma ọ bụ mgbe unu chọrọ inwe ọmụmụ ihe ezinụlọ, ọ bụrụkwa na gị na ndị ezinụlọ gị na-anọ na-akparịta mkpa ndị unu nwere n’ezinụlọ, ọ ga-abakwuru ha uru. Ị ga-enyere ụmụ gị aka ịghọta na Jehova so n’ezinụlọ unu, nakwa na ọ na-eche banyere anyị nile n’otu n’otu. (Ndị Efesọs 6:18; 1 Pita 5:6, 7) Otu nna kwuru, sị: “Site ná mgbe a mụrụ nwa anyị nwanyị, anyị na ya na-ekpekọ ekpere. Ka ọ na-eto, anyị na-ekpe ekpere banyere ụdị ndị ya na ha kwesịrị ịdị na-akpa, na-etinyekwa ihe ndị ọzọ na-akpa ya n’ekpere. Ruokwa ụbọchị ọ lara n’ụlọ di ya, ọ dịghị ụbọchị anyị na ya na-ekpekọghị ekpere.” Gị na ụmụ gị ùnu nwere ike ịdị na-ekpekọ ekpere ọnụ kwa ụbọchị? Ì nwere ike inyere ha aka ile Jehova anya dị ka Enyi bu ọdịmma ha n’obi ọ bụghị nanị dị ka onye na-enye ha ihe ndị na-akpa ha na onye na-akụziri ha eziokwu Bible?—Ndị Filipaị 4:6, 7.

7. Gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị ịma ma ọ bụrụ na ha chọrọ ịgwa Jehova kpọmkwem ihe bụ́ nsogbu ụmụ ha na-enwe?

7 N’eziokwu, ka i wee nwee ike ịgwa Jehova n’ekpere kpọmkwem ihe ndị na-akpa nwa gị, ọ dị mkpa na ị ga-ama ihe ndị ha na nwa gị na-alụ ná ndụ. Lee ihe otu nna zụrụ ụmụ abụọ kwuru: “Ná ngwụsị izu ọ bụla, ana m ajụ onwe m ajụjụ abụọ: ‘Olee nsogbu ndị ụmụ m nwetara n’izu a? Oleekwa ihe ọma ndị mere ná ndụ ha?’” Ndị nne na nna, ùnu nwere ike ịjụ onwe unu ajụjụ ndị dị ka ndị a ma tinye ihe ndị unu chọpụtara n’ekpere mgbe unu na ụmụ unu na-ekpekọ ekpere? Ọ bụrụ na unu emee otú a, ọ bụghị nanị na unu na-akụziri ụmụ unu ịdị na-ekpegara Onye na-anụ ekpere, bụ́ Jehova ekpere kamakwa unu na-akụziri ha ịhụ ya n’anya.—Abụ Ọma 65:2.

Ndị Nne na Nna Maara Ka E Si Azụ Ụmụ Na-akụziri Ụmụ Ha Ịdị Na-amụchi Ihe Anya

8. Gịnị mere o ji dị mkpa ka ndị nne na nna nyere ụmụ ha aka ịmụta ịmụchi Okwu Chineke anya?

8 Olee otú àgwà nne ma ọ bụ nna nwere mgbe a bịara n’ihe banyere ọmụmụ Bible ga-esi ekpebi ụdị mmekọrịta ga-adị n’etiti nwa ha na Chineke? Ọ bụrụ na mmadụ abụọ achọọ ịnọgide na-adị ná mma, ihe dị mkpa abụghị nanị na ha ga na-ekwurịta okwu, kamakwa ọ dị mkpa na ha ga na-ege ibe ha ntị. Otu ụzọ anyị si ege Jehova ntị bụ site n’iji akwụkwọ ndị ahụ “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi” na-ebipụtara anyị na-amụ Bible. (Matiu 24:45-47; Ilu 4:1, 2) N’ihi ya, ndị nne na nna kwesịrị ịgba ụmụ ha ume ịmụchi Okwu Chineke anya ka ha wee nwee ike ime ka adịm ná mma ha na Jehova sie nnọọ ike.

9. Olee otú a pụrụ isi nyere ụmụaka aka ịmụta ịdị na-amụchi Bible anya?

9 Olee otú a pụrụ isi nyere ụmụaka aka ịmụta ịdị na-amụchi Bible anya? N’ebe a kwa, ụzọ kasị mma nne ma ọ bụ nna ga-esi mee ya bụ site n’isetịpụrụ ụmụ ya ezi ihe nlereanya. Ụmụ gị hà na-ahụ gị mgbe nile ka ị na-agụ Bible ma ọ bụ na-enwe ọmụmụ ihe nke onwe gị? Ọ bụ ezie na i ji ọrụ buru ibu n’aka, nke bụ́ ọrụ ilekọta ụmụ gị, i nwekwara ike ịdị na-eche mgbe ị ga-enwe ohere iji gụọ ma ọ bụ mụọ Bible. Ma jụọ onwe gị, sị, ‘Ụmụ m hà na-ahụkarị m ebe m na-ele televishọn?’ Ọ bụrụ na ha na-ahụkarị gị, ì nwere ike isi n’oge a iji ele televishọn wepụta oge ị ga-eji na-enwe ọmụmụ ihe n’onwe gị, si otú a na-esetịpụrụ ụmụ gị ezi ihe nlereanya?

10, 11. Gịnị mere o ji kwesị ekwesị ka ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha na-enwechi ọmụmụ Bible ezinụlọ anya?

10 Ụzọ ọzọ dị mkpa ndị nne na nna nwere ike isi kụziere ụmụ ha ịdị na-ege Jehova ntị bụ site n’ịhụ na ha na-enwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya. (Aịsaịa 30:21) Ma, ụfọdụ nwere ike ịjụ, sị, ‘Ọ̀ dị mkpa ka ụmụaka na ndị mụrụ ha na-enwe ọmụmụ Bible n’ụlọ ha ebe ọ bụ na ndị mụrụ ha na-akpọ ha agachi nzukọ ọgbakọ anya?’ E nwere ọtụtụ ihe dị mkpa mere o ji dị mma ime otú ahụ. Ọrụ bụ́ isi Jehova nyere ndị nne na nna bụ ịkụziri ụmụ ha ihe. (Ilu 1:8; Ndị Efesọs 6:4) Inwe ọmụmụ Bible ezinụlọ na-enyere ụmụaka aka ịghọta na ofufe Jehova abụghị ihe a na-eme nanị mgbe anyị na ndị ọzọ nọ kama ọ bụ ihe ezinụlọ kwesịrị ịdị na-eme.—Deuterọnọmi 6:6-9.

11 Tụkwasị na nke ahụ, ọmụmụ ihe ezinụlọ e duziri nke ọma na-enye ndị nne na nna ohere ịmata ihe ụmụ ha na-eche banyere ihe ndị ha na-amụta na Bible nakwa omume ụmụaka ahụ chere na ha kwesịrị ekwesị na ndị nke na-ekwesịghị ekwesị. Dị ka ihe atụ, mgbe ụmụaka ka dị obere, ndị mụrụ ha nwere ike iji akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ * na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ. N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na paragraf nile dị n’akwụkwọ ahụ, e nyere ụmụaka ohere ikwu ihe dị ha n’uche n’isiokwu a na-atụle. Ndị nne na nna ha nweziri ike iji akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e depụtara ebe ahụ nyere ụmụ ha aka ịzụ ikike nghọta ha “ịmata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ.”—Ndị Hibru 5:14.

12. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi mee ka ihe ha na-amụ n’ọmụmụ ihe ezinụlọ ha kwekọọ ná mkpa ụmụ ha na-enwe, oleekwa ihe ị chọpụtarala nyeere gị aka ime nke a?

12 Ka ụmụ gị na-eto, mee ka ọmụmụ ihe ezinụlọ unu kwekọọ ná mkpa ndị ha na-enwe. Lee otú otu di na nwunye si nyere ụmụ ha abụọ gaferela afọ iri na atọ aka ịghọta ma ò kwesịrị ekwesị ka ha gaa nnọkọ ịgba egwú ụmụ akwụkwọ ibe ha haziri ka ọ̀ bụ na o kwesịghị. Papa ha kwuru, sị: “Anyị gwara ụmụ anyị na mgbe ọzọ anyị ga-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ na mụ na mama ha ga-eme ka anyị bụ ụmụ ha, ebe ha onwe ha ga-eme ka hà bụ́ mama na papa anyị. Anyị gwara ụmụ anyị ka ji aka ha kpebie onye ga-abụ mama na onye ga-abụ papa. Ma ihe dị mkpa bụ na ha abụọ ga-agbakọ aka mee nnyocha n’isiokwu banyere ịga nnọkọ ịgba egwú ma kọwaara anyị ma ọ̀ dị mma ịga nnọkọ dị otú ahụ ma ọ bụ na ọ dịghị.” Gịnị meziri? Nna ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “O riri mụ na nwunye m ọnụ mgbe anyị hụrụ otú ụmụ anyị si jiri ihe e dere na Bible kọwaara anyị ihe mere o ji dị njọ ịga ụdị nnọkọ ịgba egwú ahụ. Ihe ọzọ nyekwara anyị obi ụtọ bụ ihe ndị ọzọ ha tụrụ aro anyị nwere ike ime kama ịga nnọkọ egwú ahụ. Nke a nyeere anyị aka dị ukwuu ịghọta ihe dị ụmụ anyị n’uche na ịmata ihe ndị na-agụ ha agụụ.” N’eziokwu, ịnọgide na-enwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya chọrọ mmadụ ịghara ịda mba na ịdị na-echepụta ihe ndị ga-eme ka o kwekọkwuo ná mkpa e nwere n’ezinụlọ, ma uru a na-erite na ya ruru mgbalị e tinyere na ya.—Ilu 23:15.

Meenụ Ka Ahụ́ Ruo Onye Ọ Bụla Nọ n’Ezinụlọ Unu Ala

13, 14. (a) Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi mee ka ahụ́ ruo onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ha ala? (b) Olee ihe ọma nwere ike ịpụta ma ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna ekweta na ya emezighị?

13 O yikarịrị ka akụ́ a gbapụrụ ọ̀ ga-aga ebe a chọrọ ka ọ gaa ma ọ bụrụ na onye gbapụrụ ya sara anya mmiri gbaa ya, gbaakwa ya mgbe ajọ ikuku na-adịghị eku. N’otu aka ahụ, o yiri ka ọ ga-adịrị ụmụaka mfe ịmụta ịhụ Jehova n’anya ma ọ bụrụ na ndị mụrụ ha emee ka ahụ́ ruo ha ala n’ụlọ ha. Jems dere, sị: “Mkpụrụ nke ezi omume bụ nke a na-agha n’ọnọdụ udo maka ndị na-eme udo.” (Jems 3:18) Olee otú ndị nne na nna ga-esi mee ka udo dịrị n’ezinụlọ ha? Di na nwunye kwesịrị ịhụ na ha na-ebi nnọọ n’udo. Ọ ga-adịrị di na nwunye hụrụ onwe ha n’anya ma na-akwanyere onwe ha ùgwù mfe ịkụziri ụmụ ha ịhụ ndị ọzọ n’anya ma na-akwanyere ha ùgwù, tinyekwara ịhụ Jehova n’anya. (Ndị Galeshia 6:7; Ndị Efesọs 5:33) Ịhụnanya na nkwanye ùgwù na-eme ka udo dị. Ọ na-adịkwara di na nwunye dị n’udo mfe ịgbakọ aka dozie nsogbu ọ bụla nwere ike ịdapụta n’ezinụlọ ha.

14 N’ezie, dị nnọọ ka a na-enweghị alụmdi na nwunye na-adịghị enwe nsogbu, otú ahụkwa ka a na-enweghị ezinụlọ nsogbu na-anaghị adị na ya n’ụwa taa. Mgbe ụfọdụ ndị nne na nna nwere ike ghara igosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ mgbe ha na-emeso ụmụ ha ihe. (Ndị Galeshia 5:22, 23) Ọ bụrụ na nke ahụ emee, gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị ime? Ọ bụrụ na ha ekweta na ha mehiere, ọ̀ ga-eme ka ụmụ ha ghara ịkwanyere ha ùgwù ruuru ha? Tụlee ihe a Pọl onyeozi mere. Ọ bụ nna ime mmụọ nke ọtụtụ ndị o ziri ozi ọma. (1 Ndị Kọrint 4:15) N’agbanyeghị nke ahụ, o kwetara n’ihu ọha na ọ dị mgbe ya mehiere ihe. (Ndị Rom 7:21-25) Ma, ịdị umeala n’obi ya na otú o si kwuo eziokwu mere ka anyị kwanyekwuoro ya ùgwù kama ileda ya anya. N’agbanyeghị ebe ndị ọ na-emezighị, obi siri Pọl ike mgbe o degaara ọgbakọ dị na Kọrint akwụkwọ ozi, sị: “Bụrụnụ ndị na-eṅomi m, ọbụna dị ka m bụ onye na-eṅomi Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 11:1) Ọ bụrụ na unu ana-ekweta mgbe unu mejọrọ, o yikarịrị ka ụmụ unu hà ga-eleghara ebe ndị ahụ unu na-emezighị anya.

15, 16. Gịnị mere o ji kwesị ekwesị ka ndị nne na nna zụọ ụmụ ha ịhụ Ndị Kraịst ibe ha n’anya, oleekwa otú ha pụrụ isi mee nke a?

15 Olee ihe ọzọ ndị mụrụ ụmụ nwere ike ime iji hụ na ezinụlọ ha ghọrọ ebe ụmụ ha ga-anọ mụta ịhụ Jehova n’anya? Jọn onyeozi dere, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla ekwuo, sị: ‘Ahụrụ m Chineke n’anya,’ ma na-akpọkwa nwanna ya asị, ọ bụ onye ụgha. N’ihi na onye na-adịghị ahụ nwanna ya n’anya, bụ́ onye ọ hụworo, apụghị ịdị na-ahụ Chineke n’anya, bụ́ onye ọ na-ahụbeghị.” (1 Jọn 4:20, 21) N’ihi ya, mgbe ị na-akụziri ụmụ gị ka ha hụ ụmụnna ha ndị nọ n’ọgbakọ n’anya, ị na-akụziri ha ịhụ Chineke n’anya. Ndị nne na nna kwesịrị ịjụ onwe ha, sị, ‘Ihe m na-adị na-ekwukarị banyere ndị nọ n’ọgbakọ, ọ̀ bụ okwu na-agba ume ka ọ bụ ịkatọ ha?’ Olee otú ị ga-esi mara nke ị na-eme? Gee ntị nke ọma mgbe ụmụ gị na-akọ banyere ọmụmụ ihe anyị na banyere ndị nọ n’ọgbakọ unu. O yikarịrị ka ị ga-esi n’ọnụ ụmụ gị nụ ụfọdụ ihe ndị i kwurula banyere ndị nọ n’ọgbakọ.

16 Gịnị ka ndị nne na nna nwere ike ime iji nyere ụmụ ha aka ịhụ ụmụnna ha ndị nọ n’ọgbakọ n’anya? Otu nna aha ya bụ Peter, onye mụrụ ụmụ nwoke abụọ gaferela afọ iri na atọ, kwuru, sị: “Malite mgbe ụmụ anyị dị obere, anyị na-adị na-akpọ ụmụnna ndị bụ́ ezi ihe nlereanya n’ọgbakọ oriri n’ụlọ anyị nakwa ka ha bịa soro anyị nọkọọ, nke a ewetakwarala anyị obi ụtọ dị ukwuu. Ụmụ anyị etoola, ha na ndị hụrụ Jehova n’anya kpakọrịtakwara nnọọ ka ha na-eto, ha ahụkwala na ijere Chineke ozi bụ ihe na-enye obi ụtọ ná ndụ.” Dennis, onye mụrụ ụmụ nwanyị ise, na-ekwu, sị, “Anyị gbara ụmụ anyị ume ka ha mete ndị nọ n’ọgbakọ anyị rụrụla ọrụ ọsụ ụzọ ọtụtụ afọ enyi. Mgbe ọ bụla o kwekwara mee, anyị na-akpọ ndị nlekọta na ndị nwunye ha oriri n’ụlọ anyị.” Ì nwere ike ibute ụzọ n’inyere ụmụ gị aka iwere ndị nọ n’ọgbakọ dị ka ndị ezinụlọ unu?—Mak 10:29, 30.

Ọrụ Dịịrị Ụmụaka

17. Olee mkpebi ụmụaka na-aghaghị imecha mee?

17 Ka anyị laghachi n’ihe atụ nke onye ahụ na-agba ụta. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịma otú e si agbapụ akụ́, ma o yiri ka ọ gaghị enwe ike ịgbaru akụ́ ahụ ebe ọ chọrọ ma ọ bụrụ na akụ́ ahụ ọ chọrọ ịgba gbagọrọ agbagọ ma ọ bụ rọjie arọjie. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ndị nne na nna ga-agbalịsi nnọọ ike ịhụ na ha rọziri akụ́ rọjiri arọji, site n’ịgbalị ịgbazi echiche nwa ha. Ma, mee elu mee ala, ọ bụ ụmụaka ga-ekpebi ma ha ga-ekwe ka ụwa a rọjie ha ịdị ka ya ma ọ bụ kwe ka Jehova mee ka ‘okporo ụzọ ha zie ezie.’—Ilu 3:5, 6; Ndị Rom 12:2.

18. Olee otú mkpebi nwatakịrị mere si emetụta ndị ọzọ?

18 Ọ bụ ezie na ọ bụ ndị nne na nna ka nnukwu ọrụ ịzụlite ụmụ ha “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova” dị n’isi, ọ bụ nwa nke ọ bụla ka ọ dị n’aka ikpebi ihe ọ ga-abụ n’ikpeazụ. (Ndị Efesọs 6:4) N’ihi ya, ọ dị mkpa ka ụmụaka jụọ onwe ha, sị, ‘M̀ ga-anabata ọzụzụ a ndị mụrụ m ji ịhụnanya na-enye m?’ Ọ bụrụ na ị nabata ya, ọ pụtara na ị họọrọ ụzọ kasị mma ná ndụ. Ị ga-eme ka ndị mụrụ gị ṅụrịa. Nke kasị nke bụ na ị ga-eme ka obi Jehova ṅụrịa.—Ilu 27:11.

[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 11 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

Ì Chetara?

• Olee otú ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi setịpụrụ ụmụ ha ezi ihe nlereanya n’ihe gbasara ikpe ekpere na ịmụ Bible?

• Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi mee ka ezinụlọ ha bụrụ ebe ahụ́ ruru onye ọ bụla ala?

• Olee mkpebi ụmụaka ga-emerịrị n’onwe ha, oleekwa otú mkpebi ha si emetụta ndị ọzọ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 28]

Ị̀ na-esetịpụrụ nwa gị ezi ihe nlereanya ma a bịa n’inwe ọmụmụ ihe nke onwe gị?

[Foto dị na peeji nke 29]

A na-enwe nnọọ obi ụtọ n’ime ezinụlọ ebe ahụ́ ruru onye ọ bụla ala