Ndị Nne na Nna—Jirinụ Ịhụnanya Na-azụ Ụmụ Unu
Ndị Nne na Nna—Jirinụ Ịhụnanya Na-azụ Ụmụ Unu
“Ka ihe nile unu na-eme na-ewere ọnọdụ n’ịhụnanya.”—1 NDỊ KỌRINT 16:14.
1. Olee otú obi na-adị ndị nne na nna ma ha hụ nwa ha a ka mụrụ ọhụrụ?
ỌTỤTỤ ndị nne na nna ga-ekweta na oge a mụrụ nwa ha so n’oge kasị nye ha obi ụtọ ná ndụ. Otu nne aha ya bụ́ Aleah kwuru, sị: “Anya mbụ m hụrụ nwa m nwanyị mgbe m mụsịrị ya nyere m obi ụtọ pụrụ iche. Ọ dị m ka ọ bụ ya bụ nwa kasị maa mma m hụtụrụla.” Ma oge dị otú a na-enye ọṅụ nwekwara ike ịkpatara ndị nne na nna nchegbu. Di Aleah kwuru, sị: “Ihe churu m ụra bụ ma m̀ ga-enwekwa ike ịzụ nwa m nwanyị a ịmara ihe ọ ga-eme banyere nsogbu ndị ọ gaje izute ná ndụ.” Ọtụtụ ndị nne na nna na-enwekwa nchegbu yiri nke ahụ, ha achọpụtakwala na ọ dị mkpa iji ịhụnanya na-azụ ụmụ ha. Ma Ndị Kraịst bụ́ ndị nne na nna, ndị chọrọ iji ịhụnanya zụọ ụmụ ha, na-enwe ọtụtụ ihe ndị na-adọghachi ha azụ. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị a?
2. Olee ihe ịma aka ndị ndị nne na nna na-eche ihu?
2 Anyị bi ugbu a ná ngwụsị nke ụbọchị ikpeazụ nke usoro ihe a. Dị ka e buru n’amụma, ịhụnanya kọrọ nnọọ ụkọ n’ụwa anyị a. Ọbụnadị n’ime ezinụlọ, ndị mmadụ bụzi “ndị na-enweghị obi mmadụ” ha aghọkwaala “ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, . . . ndị na-enweghị njide onwe onye, ndị na-eme ihe ike ike.” (2 Timoti 3:1-5) Iso ndị na-akpa ụdị àgwà ndị ahụ na-emekọ ihe kwa ụbọchị nwere ike ime ka Onye Kraịst malite ịkpaso ndị ezinụlọ ya àgwà ndị dị otú ahụ. Ihe ọzọkwa bụ na n’ihi na ụmụ mmadụ ezughị okè, mgbe ụfọdụ ndị nne na nna na-emefe ihe ụfọdụ emefe, ma ọ bụ kwuo ihe ga-egbu mmụọ ụmụ ha n’amaghị ama, ma ọ bụkwanụ ghara ịghọtacha otú ihe dị tupu ha ekpebie ihe ụfọdụ.—Ndị Rom 3:23; Jems 3:2, 8, 9.
3. Gịnị ga-enyere ndị nne na nna aka ịzụ ụmụ ha ka ha nwee obi ụtọ?
3 N’agbanyeghị ihe ịma aka ndị a, ndị nne na nna ka nwekwara ike ịzụ ụmụ ha ịbụ ndị nwere obi ụtọ na ndị na-atụ egwu Chineke. Olee otú ha ga-esi mee nke a? Ọ bụ site n’ịgbaso ndụmọdụ Bible bụ́: “Ka ihe nile unu na-eme na-ewere ọnọdụ n’ịhụnanya.” (1 Ndị Kọrint 16:14) N’eziokwu, ịhụnanya bụ “ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.” (Ndị Kọlọsi 3:14) Ka anyị tụlee ihe atọ e ji mara ịhụnanya, bụ́ nke Pọl onyeozi kọwara n’akwụkwọ ozi mbụ o degaara Ndị Kraịst nọ na Kọrint ma tụlee ụzọ dị iche iche ndị nne na nna pụrụ isi tinye àgwà a n’ọrụ ka ha na-azụ ụmụ ha.—1 Ndị Kọrint 13:4-8.
Mkpa Ọ Dị Inwe Ogologo Ntachi Obi
4. Gịnị mere ndị nne na nna ji kwesị inwe ogologo ntachi obi?
4 Pọl dere, sị: “Ịhụnanya nwere 1 Ndị Kọrint 13:4) Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “ogologo ntachi obi” na-enye echiche nke inwe ndidi na ịghara iwe iwe ọsọ ọsọ. Gịnị mere ndị nne na nna ji kwesị inwe ogologo ntachi obi? Obi abụọ adịghị ya na ọtụtụ ndị nne na nna ga-echeta ọtụtụ ihe ga-eme ka ha nwee ogologo ntachi obi. Ka anyị tụlee ole na ole n’ime ha. Ọ bụrụ na e nwere ihe nwatakịrị chọrọ ka e nye ya, ọ na-ara ahụ́ ya arịọ nanị otu ugbo maka ihe ahụ. Ọ bụrụgodị na nne ya ma ọ bụ nna ya gwara ya hoo haa na ya agaghị enye ya ihe ahụ, nwa ahụ nwere ike ịrịọ ihe ahụ ọtụtụ ugboro ọzọ, na-atụ anya na ihe nwere ike ịgbanwe. Ụmụaka ndị gaferela afọ iri na atọ nwere ike ịrụwa nne ma ọ bụ nna ha ụka ma ọ bụrụ na ha ekweghị ka ha mee ihe ụfọdụ ndị mụrụ ha maara na ọ gaghị abara ha uru. (Ilu 22:15) Dịkwa ka ọ na-adị anyị nile, ụmụaka na-emeghachikarị ihe ọjọọ ụfọdụ ndị ha mere.—Abụ Ọma 130:3.
ogologo ntachi obi.” (5. Gịnị ga-enyere ndị nne na nna aka inwe ogologo ntachi obi?
5 Gịnị ga-enyere ndị nne na nna aka inwere ụmụ ha ogologo ntachi obi na ndidi? Eze Solomọn dere, sị: “Ezi uche mmadụ na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ.” (Ilu 19:11) Ndị nne na nna na-aghọtakwu ihe mere ụmụ ha ji akpa àgwà ụfọdụ ha na-akpa site n’icheta na e nwekwara mgbe ha onwe ha naara ekwu “okwu dị ka nwa ọhụrụ, na-eche echiche dị ka nwa ọhụrụ, na-ele ihe anya dị ka nwa ọhụrụ.” (1 Ndị Kọrint 13:11) Ndị nne na nna, ùnu nwere ike icheta mgbe unu nyere nne ma ọ bụ nna unu nsogbu ka o meere unu otu ihe unu chọrọ? Mgbe unu bụ ụmụ okorobịa ma ọ bụ ụmụ agbọghọ, ọ̀ dị mgbe ọ dị unu ka ndị mụrụ unu adịghị aghọtacha otú ọ dị unu ma ọ bụ nsogbu ndị unu na-enwe? Ọ bụrụ na e nwere mgbe unu mere ihe ndị ahụ, eleghị anya, unu ghọtara ihe mere ụmụ unu ji na-eme ihe ụfọdụ ha na-eme na ihe mere o ji dị mkpa ka unu jiri ndidi na-echetara ha mgbe nile ihe mere unu ji jụ inye ha ihe ahụ ha chọrọ. (Ndị Kọlọsi 4:6) Cheta na Jehova gwara ndị nne na nna bụ́ ndị Izrel ka ha ‘zi’ ụmụ ha iwu ya. (Deuterọnọmi 6:6, 7) Okwu Hibru ahụ bụ́ “izi” pụtara “ikwughachi ihe ugboro ugboro,” “imesikwu okwu ike.” Nke a pụtara na o nwere ike ịdị mkpa ka ndị nne na nna kwughachi ihe ha kwuru ọtụtụ ugboro tupu nwa ha amụta itinye iwu Chineke n’ọrụ. Ọ na-adịkarịkwa mkpa ikwughachi ihe ugboro ugboro iji kụziere mmadụ ihe ndị ọzọ o kwesịrị ịmụta ná ndụ.
6. Gịnị mere o ji bụrụ na nne ma ọ bụ nna nwere ogologo ntachi obi abụghị onye na-ahapụ nwa ya ka o mewe ihe masịrị ya?
6 Otú ọ dị, nne ma ọ bụ nna nwere ogologo ntachi obi abụghị onye na-ahapụ nwa ya ka o mewe ihe ọ bụla masịrị ya. Okwu Chineke na-adọ anyị aka ná ntị, sị: “Nwata nke a na-ahapụ n’onwe ya na-eme ka ihere mee nne ya.” Iji gbochie ụdị ihe ahụ, ilu ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Mkpanaka na ịba mba na-enye amamihe.” (Ilu 29:15) Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị ụmụaka ka ndị nne na nna ha ekwesịghị ịbara ha mba. Ma ezinụlọ Ndị Kraịst ekwesịghị ịdị ka ọchịchị onye kwuo uche ya, dị ka a ga-asị na ikike ndị nne na nna nwere ịgwa ụmụ ha ihe ndị ha kwesịrị ime dabeere ma ụmụ ha hà chọrọ ime ya ma ọ bụ na ha achọghị. Kama nke ahụ, Jehova, bụ́ Onyeisi kasịnụ ezinụlọ nwere, nyere ndị nne na nna ikike iji ịhụnanya na-azụ ụmụ ha ma na-adọ ha aka ná ntị. (1 Ndị Kọrint 11:3; Ndị Efesọs 3:15; 6:1-4) N’ezie, ịdọ aka ná ntị nwere ihe jikọrọ ya na ihe ọzọ e ji ama ịhụnanya nke Pọl kwuru okwu ya.
Otú E Si Eji Ịhụnanya Adọ Aka Ná Ntị
7. N’ihi gịnị ka ndị nne na nna nwere obiọma ji adọ ụmụ ha aka ná ntị, oleekwa ihe ịdọ aka ná ntị dị otú ahụ gụnyere?
7 Pọl dere na “ịhụnanya nwere . . . obiọma.” (1 Ndị Kọrint 13:4) Ndị nne na nna nwere obiọma n’ezie kwesịrị ịdị na-adọ ụmụ ha aka ná ntị mgbe ọ bụla ha metere ihe e kwesịrị iji dọọ ha aka ná ntị. Ha na-eṅomi Jehova ma ha mee otú a. Pọl dere, sị: “Onye Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-adọ aka ná ntị.” Buru n’uche na ọ bụghị mgbe nile e kwuru okwu ịdọ aka ná ntị na Bible ka a na-ezo aka n’inye ntaramahụhụ. Inye ọzụzụ na ịkụziri mmadụ ihe sokwa n’ịdọ aka ná ntị. Olee ihe mere e ji enye ịdọ aka ná ntị dị otú ahụ? Pọl kwuru, sị: “Nye ndị e jiworo ya zụọ, ọ na-amịrị ha mkpụrụ udo, ya bụ, ezi omume.” (Ndị Hibru 12:6, 11) Mgbe ndị mụrụ ụmụ ji obiọma na-akụziri ụmụ ha ihe dị ka uche Chineke si dị, ha na-enye ha ohere ịghọ ndị toro eto na-eme udo na ndị nwere àgwà dị mma. Ọ bụrụ na ụmụaka anabata “ịdọ aka ná ntị nke Jehovah,” ha na-enweta amamihe, ihe ọmụma, na nghọta, nke bụ́ àgwà ndị bara uru karịa ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo.—Ilu 3:11-18.
8. Gịnị na-emekarị mgbe ndị nne na nna hapụrụ ịdọ ụmụ ha aka ná ntị?
8 N’aka nke ọzọ, ndị nne na nna na-adịghị adọ ụmụ ha aka ná ntị adịghị egosi ha obiọma. Jehova ji ike mmụọ nsọ ya mee ka Solomọn dee, sị: “Onye na-egbochi mkpanaka ya na-akpọ nwa ya asị: ma onye na-ahụ ya n’anya na-adọsi ya aka ná ntị ike.” (Ilu 13:24) Ụmụaka ndị ndị mụrụ ha na-adịghị adọ aka ná ntị mgbe kwesịrị ekwesị yiri ka há na-aghọ ndị na-achọ nanị ọdịmma onwe ha na ndị na-adịghị enwe obi ụtọ. Ma, a chọpụtara na ụmụaka ndị nne na nna ha na-egosi obiọma ma na-abara mba mgbe kwesịrịnụ na-aka eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, kara enwe ike iso ndị ọzọ emekọrịta ihe, karakwa enwe obi ụtọ. N’eziokwu, ndị nne na nna na-adọ ụmụ ha aka ná ntị na-egosi ha obiọma.
9. Gịnị ka ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-akụziri ụmụ ha, oleekwa otú ụmụ ha kwesịrị isi na-ele ihe ndị a gwara ha anya?
9 Gịnị ka iji obiọma na ịhụnanya na-adọ ụmụaka aka ná ntị gụnyere? Ọ dị mkpa ka ndị nne na nna gwa ụmụ ha kpọmkwem ihe ndị ha chọrọ ka ha na-eme. Dị ka ihe atụ, ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-esite n’oge ụmụ ha ka bụ ụmụ ọhụrụ kụziwere ha ụkpụrụ Bible ndị bụ́ isi, gụnyere mkpa ọ dị ha ịdị na-esonye n’ụzọ dị iche iche ndị Chineke si efe ya ofufe. (Ọpụpụ 20:12-17; Matiu 22:37-40; 28:19; Ndị Hibru 10:24, 25) Ọ dị mkpa ka ụmụaka mara na ihe ndị a bụ ihe iwu ji ha ime.
10, 11. Gịnị mere o ji dị mkpa ka ndị nne na nna na-echebara aro ụmụ ha echiche mgbe ha na-enye ha iwu ndị ha chọrọ ka ha na-agbaso n’ezinụlọ?
10 Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị mkpa na ndị nne na nna ga-amata echiche ụmụ ha mgbe ha na-ekpebi iwu ụfọdụ ha chọrọ ka ụmụ ha na-agbaso n’ezinụlọ. Ọ bụrụ na ndị na-eto eto etinye ọnụ n’okwu banyere iwu ndị a chọrọ ka ha na-edebe, ọ ga-adịrị ha mfe iji obi ha rube isi n’iwu ndị ahụ e nyere. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ndị mụrụ ụmụ ekpebie ịgwa ụmụ ha mgbe ha na-achọghị ka ha pụọ èzí, ha nwere ike iji aka ha họrọ kpọmkwem oge ha chọrọ ka ụmụaka ha nọrọ n’ụlọ. Ihe ọzọ ha nwekwara ike ime bụ ikwe ka ụmụ ha kwuo oge ha ga-achọ ịnọ n’ụlọ ma kwuo ihe mere ha ji họrọ oge ahụ. Ndị nne na nna ahụ nweziri ike ikwu oge ha onwe ha chọrọ ka ụmụ ha nọrọ n’ụlọ ma kọwaara ụmụ ha ihe mere ha ji chee na oge nke ahụ ka kwesị ekwesị. Dị ka e kwesịrị ịtụ anya ya, echiche ndị nne na nna pụrụ ịdị iche na nke ụmụ ha. Gịnịzi ka ndị nne na nna ga-eme mgbe ọ dị otú a? N’ọnọdụ ụfọdụ, ndị nne na nna ahụ nwere ike kpebie na ọ ka mma ime otú ahụ ụmụ ha si kwuo ma ọ bụrụhaala na ọ dịghị ụkpụrụ Bible ha
mebiri. Nke a ọ̀ na-egosi na ọ bụzi ụmụaka na-atụ ihe a ga-eme, ma ọ bụkwanụ na ndị nne na nna ahụ adịghị arụ ọrụ ha dị ka o kwesịrị?11 Iji zaa ajụjụ ahụ, ka anyị leba anya otú Jehova si jiri ịhụnanya mesoo Lọt na ezinụlọ ya ihe. Mgbe ndị mmụọ ozi si na Sọdọm dupụta Lọt, nwunye ya, na ụmụ ya abụọ, ha gwara ha sị: “Wepụga onwe gị jee ugwu ahụ, ka e wee ghara ikpochapụ gị.” Ma, Lọt zara, sị: “Ee e, biko, onyenwe m.” Lọt tụziri aro ebe ọzọ o nwere ike ịgbaga, sị: “Biko, lee, obodo a dị nso ịgbalaga n’ebe ahụ, nke ahụ bụkwa obodo nta: biko, ka m wepụga onwe m jee ebe ahụ.” Gịnị ka Jehova zara ya? Ọ zara ya, sị: “Lee, m hụwokwa gị ihu ọma n’okwu a.” (Jenesis 19:17-22) Nke a ọ̀ na-egosi na ọ bụ Lọt na-atụrụ Jehova ihe ọ ga-eme? Mbanụ! Jehova chebaara aro ahụ Lọt tụrụ echiche ma họrọ igosi ya obiọma n’okwu a. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ọ̀ dị mgbe ị na-echebara ihe ndị na-enye ụmụ gị nsogbu n’obi echiche mgbe ị na-enye ha iwu ndị ị chọrọ ka ha na-agbaso n’ezinụlọ gị?
12. Gịnị ga-enye aka mee ka ahụ́ ruo nwatakịrị ala?
12 N’ezie, ọ bụghị nanị na ụmụaka ga-ama ihe ndị a chọrọ ka ha mee, ọ dịkwa mkpa ka ha mara ntaramahụhụ a ga-enye ha ma ọ bụrụ na ha adaa iwu ndị ahụ. Ozugbo ụmụaka ghọtara ntaramahụhụ dịịrị ha ma ha daa iwu nke ọ bụla, o kwesịrị ka ndị mụrụ ha taa ha ahụhụ kwesịrị ihe ha mere. Ọ bụghị obiọma ka ndị nne na nna na-egosi ụmụ ha ma ọ bụrụ na ha na-ekwu nanị n’ọnụ na ha ga-enye ha ntaramahụhụ ma ghara inye ha ya mgbe ha metere ihe a ga-eji taa ha ahụhụ. Bible na-ekwu, sị: “N’ihi na emeghị ihe e kpere n’ikpe megide ọrụ ọjọọ ọsọ ọsọ, n’ihi nke a obi ụmụ mmadụ juru eju n’ime ha ime ihe ọjọọ.” (Eklisiastis 8:11) N’eziokwu, nne ma ọ bụ nna nwere ike ịghara inye nwa ya ntaramahụhụ n’ihu ọha ma ọ bụ n’ebe ụmụaka ndị ọzọ nọ ka o wee ghara imenye nwa ahụ ihere. Ma obi na-erukwu ụmụaka ala, ha na-ahụkwa ndị mụrụ ha n’anya ma na-akwanyekwuru ha ùgwù mgbe ha maara na “Ee” ha bụ ee, “Ee e” ha abụrụkwa ee e—ọ sọkwa ya ya bụrụ na nke a ga-ewetara ha ntaramahụhụ.—Matiu 5:37.
13, 14. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi ṅomie Jehova mgbe ha na-azụ ụmụ ha?
13 Ka ntaramahụhụ ahụ wee bụrụ nke e ji obiọma nye, e kwesịrị inye ya otú ọ ga-abara nwatakịrị ahụ uru. Pam na-ekwu, sị: “Ọ bụghị otu ụdị ntaramahụhụ ka anyị na-enye ụmụ anyị. Ntaramahụhụ e nyere otu onye anaghị eru onye nke ọzọ n’ahụ́.” Di ya, bụ́ Larry, na-ekwu, sị: “Ada anyị dị isi ike, o yikwara ka nanị ụdị ịdọ aka ná ntị na-eru ya n’ahụ́ bụ ịpịa ya ụtarị. Ma o nwere otú ị ga-esi baara nwa anyị nke obere mba ma ọ bụ lee ya anya, ya aghọta ihe ị chọrọ ka o mee.” N’ezie, ndị nne na nna nwere obiọma na-achọpụta ụdị ịdọ aka ná ntị kasị eru nwa ha nke ọ bụla n’ahụ́ ma na-enye ha ya.
14 Jehova setịpụụrụ ndị nne na nna ezi ihe nlereanya n’otú o si mara ebe onye nke ọ bụla Ndị Hibru 4:13) Tụkwasị na nke ahụ, ọ bụrụ na Jehova chọọ inye ụmụ mmadụ ntaramahụhụ, ọ dịghị emebiga ya ókè ma ọ bụ leghara àgwà ọjọọ anya. Kama, ọ na-adọ ndị ya aka ná ntị ruo “n’ókè kwesịrị ekwesị.” (Jeremaịa 30:11, NW) Ndị nne na nna, ùnu maara ebe ụmụ unu na-eme nke ọma na ebe ha na-adịghị eme nke ọma? Ihe a ị maara banyere ha ọ̀ na-enyere gị aka ịghọta otú ka mma isi jiri ịhụnanya zụọ ha? Ọ bụrụ otú ahụ, ị na-egosi na ị hụrụ ụmụ gị n’anya.
n’ime ndị ohu ya na-eme nke ọma na ebe ọ na-adịghị eme nke ọma. (Mee Ka Ọ Dịrị Ụmụ Gị Mfe Ịgwa Gị Ihe Dị Ha n’Obi
15, 16. Olee otú ndị nne na nna ga-esi mee ka ọ dịrị ụmụ ha mfe ikwu ihe dị ha n’obi, oleekwa ụzọ Ndị Kraịst mụrụ ụmụ chọpụtarala dị mma isi mee nke a?
15 Ihe ọzọ e ji mara ịhụnanya bụ na “ọ dịghị aṅụrịrị ajọ omume ọṅụ, kama ọ na-aṅụrịrị eziokwu ọṅụ.” (1 Ndị Kọrint 13:6) Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi zụọ ụmụ ha ka ha hụ ezi ihe na eziokwu n’anya? Otu ụzọ dị mkpa ha si eme nke a bụ site n’ịgba ha ume ka ha kwuo ihe dị ha n’obi, ọ sọkwa ya bụrụ na ihe nwa ahụ ga-ekwu ga-akpasu ndị mụrụ ya iwe. O kwere nghọta na obi na-atọ ndị nne na nna ụtọ mgbe ha nụrụ ka ụmụ ha na-ekwu ihe ndị na-egosi na ha ji iwu Jehova kpọrọ ihe. Mgbe ụfọdụ, ihe nwatakịrị ji obi ọcha kwuo pụrụ igosi ndị mụrụ ya na nwata ahụ bu ajọ ihe n’uche. (Jenesis 8:21) Olee ihe ndị mụrụ ya kwesịrị ime? Ihe mbụ ga-abata ha n’uche ime nwere ike ịbụ ịbara nwa ahụ mba maka ikwu ụdị ihe ahụ. Ọ bụrụ na ndị nne na nna emee otú ahụ, ụmụ ha nwere ike mụtazie ikwu nanị ihe nne na nna ha chọrọ ịnụ. N’ezie, ndị mụrụ ụmụ ekwesịghị igbu oge n’ịbara ụmụ ha mba ma ọ bụrụ na ha ekwuo okwu mkparị, ma e nwere ihe dị iche n’ịkụziri ụmụaka otú ha ga-esi jiri nkwanye ùgwù na-ekwu ihe dị ha n’obi na ịgwa ha kpọmkwem ihe ha kwesịrị ikwu.
16 Olee otú ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi mee ka ọ dịrị ụmụ ha mfe ikwu ihe dị ha n’obi? Aleah, bụ́ onye e kwuru okwu ya na mbụ, na-ekwu, sị, “Anyị mere ka ọ dịrị ụmụ anyị mfe ịdị na-agwa anyị ihe dị ha n’obi site n’ịghara ịbara ha mba ma ha kwuo ihe ụfọdụ na-ekwesịghị ekwesị.” Otu nna nke aha ya bụ Tom, na-ekwu sị: “Anyị gbara ada anyị ume ịgwa anyị ihe dị ya n’obi, ọbụna ma a sị na o kwetaghị n’ihe anyị onwe anyị kwuru. Anyị kweere na ọ bụrụ na anyị anabiri ya okwu n’ọnụ ma gwa ya mee ihe anyị chọrọ na iwe ga-ewe ya, ọ ga-akwụsịkwa ịdị na-agwa anyị kpọmkwem ihe dị ya n’obi. N’aka nke ọzọ, ige ya ntị mere ka ọ na-ege anyị ntị.” N’ezie, ụmụaka kwesịrị irubere ndị mụrụ ha isi. (Ilu 6:20) Ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha ịdị na-akparịta ụka n’ezochighị ihe ọ bụla na-enye nne na nna ndị a ohere inyere ụmụ ha aka inwe ezi uche. Vincent, bụ́ nna nwere ụmụ anọ, na-ekwu, sị: “Ọtụtụ mgbe, mkparịta ụka anyị na-abụ ịtụle uru na ọghọm dị n’ime otu ihe, ka ụmụ anyị nwee ike iji anya ha hụ ụzọ ka mma ịgbaso. Nke a nyeere ha aka ịdị na-eche echiche nke ọma.”—Ilu 1:1-4.
17. Olee ihe obi kwesịrị isi ndị mụrụ ụmụ ike na ụmụ ha ga-eme?
17 N’eziokwu, ọ dịghị nne ma ọ bụ nna ọ bụla ga-enwe ike itinyecha n’ọrụ ndụmọdụ nile e nyere na Bible banyere ịzụ ụmụ. Ma obi sie gị ike na ụmụ gị ga-enwe ekele dị ukwuu ma ha hụ ka ị na-agbalị inwere ha ogologo ntachi obi, igosi ha obiọma na iji ịhụnanya na-azụ ha. Jehova ga-agọzikwa mgbalị unu na-eme ime otú ahụ. (Ilu 3:33) Mgbalị nile Ndị Kraịst nwere ụmụ na-etinye bụ iji hụ na ụmụ ha mụtara ịhụ Jehova n’anya otú ha onwe ha hụrụ ya. Olee otú ndị nne na nna ga-esi ruo ihe mgbaru ọsọ a magburu onwe ya? Isiokwu na-esonụ ga-eleba anya kpọmkwem n’ụzọ ụfọdụ ha ga-esi mee ya.
Ì Chetara?
• Olee otú ịghọta ọnọdụ ụmụ ha ga-esi nyere nne ma ọ bụ nna aka inwe ogologo ntachi obi?
• Olee ihe jikọrọ obiọma na ịhụnanya?
• Gịnị mere o ji dị oké mkpa ka ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha na-akparịta ụka n’ezoroghị ibe ha ihe ọ bụla?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
Ndị nne na nna, ùnu nwere ike icheta otú ọ dị unu mgbe unu bụ ụmụaka?
[Foto dị na peeji nke 24]
Ị̀ na-eme ka ọ dịrị ụmụ gị mfe ịgwa gị ihe dị ha n’obi n’ezoghị ihe ọ bụla?