‘Ịmị Mkpụrụ n’Isi Awọ’
‘Ịmị Mkpụrụ n’Isi Awọ’
ỌTỤTỤ ndị bi n’ala ndị dị n’ógbè Mediterenian na-akụ nkwụ date gburugburu ụlọ ha. E ji ịma mma nke osisi ndị a na mkpụrụ ha na-atọ ụtọ mara ha. E wezụga nke ahụ, ha na-anọgide na-amị mkpụrụ ruo mgbe ha gaferela nnọọ otu narị afọ.
Eze Solomọn nke Izrel oge ochie ji abụ kwuo na ọdịdị otu nwata nwanyị Shulam mara mma yiri nkwụ. (Abụ nke Abụ 7:7) Akwụkwọ bụ́ Plants of the Bible kwuru, sị: “Okwu Hibru maka nkwụ date bụ ‘tàmâr.’ . . . Ọ bịara ghọọ ihe ndị Juu na-akpọ ihe na-adọrọ mmasị na ihe mara mma, ha na-agụkarịkwa ya ụmụ ha nwanyị n’aha.” Dị ka ihe atụ, a gụrụ nwa nwunye nna Solomọn nke mara mma aha ahụ bụ́ Tema. (2 Samuel 13:1) Ụfọdụ nne na nna ka na-agụ ụmụ ha aha ahụ.
Ọ bụghị nanị ụmụ nwanyị mara mma ka e ji tụnyere osisi nkwụ. Ọbụ abụ bụrụ, sị: “Onye ezi omume ga-awa igu dị ka nkwụ: dị ka osisi cedar n’ime Lebanọn ka ọ ga-ebu ibu. Ndị a kụworo n’ụlọ Jehova dị ka osisi ga-ama akwụkwọ n’ogige nile nke Chineke anyị. Ha ga-anọ na-amị mkpụrụ n’isi awọ; osisi nke mmiri dị ha n’ahụ́ hie nne, nke nwezukwara akwụkwọ ndụ, ka ha ga-abụ.”—Abụ Ọma 92:12-14.
N’ụzọ ihe atụ, ndị na-ejere Chineke ozi n’ikwesị ntụkwasị obi n’oge agadi ha yiri osisi nkwụ mara mma n’ọtụtụ ụzọ. Bible kwuru, sị: “Okpueze nke mara mma ka isi awọ bụ, n’ụzọ ezi omume ka a ga-ahụ ya.” (Ilu 16:31) Ọ bụ ezie na ike ọkpụkpụ aka nke ndị agadi nwere ike ibelata ka oge na-aga, ha pụrụ ịnọgide na-adị ike n’ofufe Chineke site n’ịmụchi Okwu Chineke, bụ́ Bible, anya. (Abụ Ọma 1:1-3; Jeremaịa 17:7, 8) N’ihi okwu ha ndị na-egosi amamihe na ezi ihe nlereanya ha, ndị agadi kwesịrị ntụkwasị obi na-agba nnọọ ndị ọzọ ume, ha na-anọgidekwa na-amị mkpụrụ site n’afọ ruo n’afọ. (Taịtọs 2:2-5; Ndị Hibru 13:15, 16) Dị ka nkwụ date, ndị agadi nwere ike ịmị mkpụrụ n’oge agadi ha.